Ịhụ Jehova n’Anya Na-akpali Ezi Ofufe
“Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile o nyere n’iwu.” —1 JỌN 5:3.
1, 2. Ọ̀ bụ nzube dị aṅaa ka anyị kwesịrị iji jeere Jehova ozi?
OTU ìgwè nke 80 ndị ọbịa sitere Japan na-eme ngagharị n’otu Ụlọ Mgbakọ Ndịàmà Jehova na California, U.S.A. Gburugburu ebe ndị mara mma, gụnyere otu ubi a gbara ogige nke jupụtara n’ọtụtụ nnụnụ blue jay, nduru, na asha, mere ka ha nwee mmetụta nke ịnọkwu Onye Okike Ukwu ha, bụ́ Jehova Chineke, nso karị. N’oge na-adịghị anya onye dugharịrị ha chọpụtara na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile nọ n’ìgwè ahụ na-eje ozi oge nile dị ka ọsụ ụzọ. Ya mere mgbe e mesịrị, a jụrụ ìgwè ahụ otu ajụjụ nke a jụworo ọtụtụ ugbo, sị: “N’ihi gịnị ka e ji nwee ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ otú a na Japan?” Ruo oge ụfọdụ, ọ dịghị onye kwuru okwu. E mesịa, otu nwa agbọghọ nyere azịza, sị: “N’ihi na anyị hụrụ Jehova n’anya.”
2 Ịhụ Jehova n’anya—lee ka nke a si akpali anyị ịnụ ọkụ n’obi n’ije ozi ya! N’eziokwu, ọ bụghị mmadụ nile ga-enwe ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ. N’ezie, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ihe karịrị nde ndị nkwusa Alaeze anọ anyị nwere enwebeghị ike ime ohere maka ihe ùgwù nke a. Ma ọtụtụ ndị ọnọdụ ha nyere ohere maka ya na-anara ya. Ndị fọdụrụ n’ime anyị pụkwara ‘ịtụkwasị Jehova obi, meekwa ezi ihe,’ na-egosipụta ịhụnanya anyị site n’ikere òkè ụfọdụ n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ. (Abụ Ọma 37:3, 4) Ndị nile raara onwe ha nye bụ́ ndị na-efe Jehova ofufe pụkwara ikere òkè n’imesi mmụọ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ ike, na-enye ndị ahụ na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ nkwado ịhụnanya.—Matiu 24:14; 28:19.
3. Ọdịiche dị aṅaa ka a ga-arịba ama n’etiti ndị na-asị na ha bụ ndị Kristian na Ndịàmà Jehova?
3 N’ụzọ dị iche n’ihe ka n’ọtụtụ ndị na-asị na ha bụ ndị Kristian, bụ́ ndị ahụ na-eru ala site n’ile okpukpe anya nanị dị ka ihe mgbakwụnye ná ndụ ha, Ndịàmà Jehova na-egosipụta ịhụnanya siri ike maka Chineke bụ́ nke na-akpali ha ịnọgide ‘na-achọ alaeze ya, na ezi omume ya.’ Nke a emewo ka ọ dị mkpa iji ihe chụọ àjà, ma lee ka àjà ahụ siworo bụrụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ! (Matiu 6:33; 16:24) O kwekọwo n’iwu mbụ ahụ kasị ukwuu, nke e wepụtara na nke mbụ ya site n’aka Mosis, nke Jisọs Kraịst kwughachikwara, sị: “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], bụ́ Chineke anyị, Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] bụ otu: ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum.”—Mak 12:29, 30; Deuterọnọmi 6:4, 5.
4, 5. Olee ndị a ga-ele anya dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka a pụrụ isi gosipụta ikwesị ntụkwasị obi?
4 N’isi nso a, otu n’ime ndị na-arụ ọrụ n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova gwara F. W. Franz, bụ́ onye isi oche dị 98 afọ nke Watch Tower Society, bụ́ onye tinyeworo ihe karịrị 70 afọ n’ije ozi oge nile, sị: “Ị bụwo ezi ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi, Nwanna Franz.” Nwanna Franz zaghachikwara, sị: “Ee! Ị ghaghị ikwesị ntụkwasị obi.” Nke ahụ chịkọtara okwu ahụ dum. N’agbanyeghị akụkụ nke ịrụ ọrụ Alaeze anyị na-eje ozi na ya, anyị pụrụ ikwesị ntụkwasị obi.—1 Ndị Kọrint 4:2; Ndị Galetia 3:9.
5 N’eziokwu, ọtụtụ ndị ga-achọ ime ihe ka nnọọ ukwuu n’ije ozi Jehova, ma ibu ọrụ ndị Akwụkwọ nsọ kwadoro ma ọ bụ nsogbu ahụ ike pụrụ igbochilatatụ ha. Otú ọ dị, a gaghị ewere ndị ahụ na-enweghị ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala karị. Ụfọdụ anọwo na-eguzosi ike n’ihe n’okpuru ule ndị sikarịsịrị ike, ọtụtụ mgbekwa ruo ọtụtụ afọ. Ee, ha ekwesịwo ntụkwasị obi! Ha egosipụtawo ịhụnanya maka Jehova ma jiri ịdị uchu jee ozi n’iji obi ha nile kwadoo nhazi nile ya nke usoro ọchịchị Chineke. Ha enwewo mmasị dị ukwuu n’ọrụ ndị ọsụ ụzọ, nyekwa ndị ga-abanye n’ọrụ ọsụ ụzọ agbamume, bụ́ ndị na-abụ ọtụtụ mgbe ụmụ nke ha, ka ha rụọ ọrụ iji were ọrụ ọsụ ụzọ dị ka ọrụ ha ga-arụ ná ndụ nke karịrị ọrụ ọ bụla ọzọ.—Tụlee Deuterọnọmi 30:19, 20.
6, 7. Olee ụzọ ụkpụrụ ahụ e setịpụrụ na 1 Samuel 30:16-25 si dị irè taa?
6 Ịrụkọ ọrụ n’otu n’ịhụnanya nke ndị Chineke nile taa bụ nke a pụrụ iji ihe ndekọ dị na 1 Samuel 30:16-25 mee ihe atụ ya. N’ibu agha megide ndị Amalek, “Devid wee tigbuo ha site n’uhuruchi wee ruo anyasị echi ya,” kwarakwa ọtụtụ ihe nlụta n’agha. Mgbe ha lọghachiri n’ọmụma ụlọikwuu, ụfọdụ n’ime ndị agha Devid kwuru ka a ghara inye ndị na-esoghị ha zọọ ije ahụ banye n’ọgbọ agha ahụ kporo ọkụ nke ọ bụla n’ihe ndị a lụtara n’agha. Ma Devid zara, sị: “Ònye ga-egekwa unu ntị n’okwu a? N’ihi na dị ka òkè nke onye na-arịda n’agha si dị, otú a ka òkè nke onye na-anọdụ n’akụkụ ihe anyị dị: ha ga-ekekọ n’otu.”
7 Otu ụkpụrụ ahụ dị irè taa. Ndị ọsụ ụzọ na-ebute ụzọ n’obubu agha ime mmụọ anyị. Ma ndị ọzọ nile nọ n’ime ọgbakọ na-eji iguzosi ike n’ihe na obi ha dum na-enye nkwado. Ihe sitekwara n’ọrụ ha jikọrọ aka rụọ n’afọ 1991 ka e gosipụtara na chaatị nke na-eso ugbu a.
Akụkọ Ozi Pụrụ Iche
8. (a) Gịnị ka akụkọ ozi ụwa dum na-egosipụta banyere ngụkọta ndị nkwusa na hour ole ha tinyere n’ijere Jehova ozi? (b) Ihe ndị dị aṅaa na-akpali mmasị ka ị rịbara ama maka mba ndị na-apụta ọhụrụ n’akụkọ ozi ahụ?
8 Ee, peji anọ ndị bu ụzọ na magazin nke a egosiwo otú mgbalị ndị nile ji ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova ofufe jikọrọ aka tinye siworo mee ka e nwee mmụba zuru ụwa ọnụ nke na-akpali akpali n’afọ 1991. Ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ 4,278,820 ndị nkwusa Alaeze ka e dekọrọ—bụ́ ịrị elu 6.5 pasenti. Ndị a tinyere 951,870,021 hour (ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ijeri!) n’ije ozi ahụ. Rịbakwa oké mgbalị ụmụnna anyị ndị nwere ihe mgbochi na mbụ tinyere, bụ́ ndị na-apụta ugbu a n’akụkọ ozi ụwa nile—Bulgaria, Cameroon, Czechoslovakia, Ethiopia, Mozambique, Nicaragua, Rwanda, na U.S.S.R.
9, 10. (a) Olee otú ndị ọsụ ụzọ siworo meghachi omume n’ihe ịma aka nke oge ndị siri ike? (b) Agbamume dị aṅaa ka e nyere maka ịbanye n’ije ozi ọsụ ụzọ?
9 N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga mmụọ ọrụ ọsụ ụzọ agbasawo n’ụwa nile. Ọbụna ná mba ebe a ka nyere nnwere onwe maka ofufe n’oge na-adịbeghị anya gara aga, ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ na-amụba amụba. Ọnọdụ akụ na ụba ndị dị oké njọ adịghị egbochi Ndịàmà ndị a obi siri ike itinye ihe nile ha nwere n’ofufe Jehova. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 11:23, 27.) Ná nkezi kwa ọnwa, 14 pasenti nke ndị nkwusa nile nke Alaeze anọwo n’ọrụ ọsụ ụzọ. Ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị ọsụ ụzọ bụ 780,202, nke bụ 18 pasenti magburu onwe ya nke ndị nkwusa nile.
10 Ka ndị ọzọ na-ahụta ọṅụ ndị ọsụ ụzọ na-enwe, a na-agbakwa ha ume ịnakwere ije ozi nke a. Ọ bụrụ na ị malitebeghị ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, ịhụnanya i nwere maka Jehova ọ̀ pụrụ ịkpali gị ịsị, dị ka anyị na-agụ n’Aịsaịa 6:8, “Lee m; ziga m”? Ma ọ bụ site n’ọmụmụ Bible i ji ịdị uchu na-amụ, Okwu Chineke ọ̀ pụrụ ịkpali ọchịchọ dị ọkụ n’obi gị, nke na ị ghaghị iwere nzọụkwụ nke na-esonụ nke ịbanye n’ije ozi ọsụ ụzọ? Ọbụna n’oge ọnwụnwa, okwu Jehova kpaliri Jeremaịa, nke na ọ pụghị ijighachi ya azụ.—Jeremaịa 20:9.
Ijere Ihe A Kpọrọ Mmadụ Ozi Ịhụnanya
11. Olee otú ọrụ ọmụmụ Bible ebe obibi siworo mụbaa?
11 Otu n’ime ihe ndị pụtara ìhè n’akụkọ ozi afọ ahụ bụ ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ ọmụmụ Bible ebe obibi ndị e duziri mgbe nile n’efu kwa ọnwa gburugburu ụwa, bụ́ 3,947,261. Nke a bụ ndokwa ịhụnanya nke Ndịàmà Jehova na-eji esochi ndị nwere mmasị ha chọtara n’ọrụ ụlọ n’ụlọ ha. Anyị nwere obi ụtọ iduziri ndị sitere ná mba dị iche iche na agbụrụ dị iche iche ọmụmụ Bible, na-eji otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ Pọl onyeozi gosipụtara na-arụ ọrụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na o were ọtụtụ hour nke izi eziokwu ahụ ka o wee ‘gbazuoro ma ndị Juu ma ndị Grik àmà.’ (Ọrụ 20:20, 21) Ọ bụ otu ihe ahụ taa. Ndịàmà Jehova na-enyere ‘ụdị mmadụ nile aka ka a zọpụta ha, ka ha nweekwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’—1 Timoti 2:4.
12-14. Akụkọ ozi ndị dị aṅaa na-enye ọṅụ ka a na-enweta site na Europe?
12 Lee ka akụkọ ozi nke ọrụ ọmụmụ Bible rịwanyere elu n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe si na-akpali akpali! Ruo ọtụtụ iri afọ ụmụnna anyị n’ebe ahụ ezukọwo n’ìgwè ndị dị nta, na-enwe ma eleghị anya nanị otu Ụlọ Nche meworo ochie nke e jiworo mee ihe ruo ogologo oge, nke e ji ígwè obibi akwụkwọ bụ mimeograph bipụta, maka ìgwè ahụ dum. Ma ugbu a Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible na-enuba ná mba ndị a n’ụba. Ọ na-eme ka e cheta Abụ nke Abụ 2:4, King James Version: “Ọ [Kraịst Jisọs] mere ka m bata n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ [ime mmụọ], ọkọlọtọ ya n’elu m bụkwa ịhụnanya.” N’ihi inwe magazin ndị nke ha, a na-akwadebe ọtụtụ nke ọma ịdị “na-ekwuzi okwu nke eziokwu ahụ.”—2 Timoti 2:15.
13 Otu ọgbakọ nwere 103 ndị nkwusa na St. Petersburg, Russia, n’isi nso nyere akụkọ ihe karịrị 300 ọmụmụ Bible ebe obibi. Dị ka ihe sitere ná mgbalị ọmụmụ Bible nke a, e mere 53 Ndịàmà ọhụrụ baptism n’ime nanị ọnwa asatọ. Ihe karịrị ọkara ndị nọ n’ọgbakọ ahụ anọwo n’eziokwu ọnwa asatọ ma ọ bụ oge dị ala karị! Ha enweghịkwa ndị okenye ọ bụla—nanị otu ohu na-eje ozi ilekọta ọganihu ime mmụọ ha.
14 Otu onye a na-eduziri ọmụmụ Bible jụrụ otu onye nkwusa Alaeze n’Estonia ma ò nwere ike ịkpọta ụfọdụ ndị enyi ya n’ọmụmụ ihe ahụ. Mgbe Onyeàmà ahụ rutere n’ebe obibi ahụ n’izu na-esonụ, ọ hụrụ ihe karịrị 50 mmadụ zukọrọnụ! N’ihi ya, e nwere mkpa maka ndokwa ndị pụrụ iche iji nọgide na-elekọta ndị nile ahụ nwere mmasị.
15. Gịnị ka a ga-ekwu banyere ọnụ ọgụgụ ndị bịara Ememe Ncheta na ndị e mere baptism?
15 Ọtụtụ ndị a na-eduziri ọmụmụ ihe na-enweta na nke mbụ ya ụtọ nke isonyere ndị Kraịst site n’ịbịa Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs. N’afọ a gara aga, ọnụ ọgụgụ ndị bịara gafere 10,000,000 na nke mbụ ya, ebe 10,650,158 zukọrọ gburugburu ụwa n’ime 66,207 ọgbakọ maka ememe nke a na-enye ọṅụ. N’ọtụtụ mba Latin-America, Africa, na Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, e nwere ọnụ ọgụgụ ndị bịara bụ́ ndị ji okpukpu atọ ma ọ bụ anọ gafee ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze. Ugbu a anyị aghaghị ịmalite ịkwadebe maka Ememe Ncheta a ga-eme n’afọ a na Friday, April 17. E nwere olileanya na ọtụtụ ndị ọhụrụ a na-eduziri ọmụmụ Bible na-abịa Ememe Ncheta ga-anọgide na-enwe ọganihu ruo baptism. Banyere baptism, na 1991 anyị hụkwara ka ihe karịrị 300,000 gosipụtara nrara ha raara onwe ha nye Jehova Chineke site n’ịbụ ndị e mikpuru ná mmiri.
Ndị Hụrụ Nnwere Onwe Chineke n’Anya
16. Akụkọ ozi ndị dị aṅaa na-akpali akpali ka a na-enweta site ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya”?
16 Otu ihe kwesịrị ịrịba ama n’afọ ije ozi 1991 abụwo usoro Mgbakọ Distrikti “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya,” bụ́ ndị e mesịworo ugbu a n’Ebe Ugwu Ụwa ma ọ na-aga n’ihu banye n’afọ 1992 n’Ebe Ndịda Ụwa. Na nke mbụ ya, e mere usoro ihe omume mgbakọ ahụ n’ozuzu ya n’ọtụtụ n’ime mba Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, bụ́ ebe ụmụnna anyị na-enwe ọṅụ iji nnwere onwe ha nwetara ọhụrụ na-eto Jehova. N’October 1991 ngụkọ ọnụ ọgụgụ e nyere akụkọ ya na 705 mgbakọ ndị mbụ e mere ná 54 mba bụ 4,774,937.
17, 18. (a) Nnwere onwe ndị dị aṅaa ka ndị na-efe Jehova ofufe na-enwe, na-atụkwa anya ha? (b) Olee otú nnwere onwe Chineke na-enye si dị iche ná nnwere onwe nke ụwa na-enye?
17 Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:32) Taa, eziokwu Bible emewo ka ọtụtụ nde mmadụ pụọ n’ohu nkwenkwe dị iche iche nke Krisendọm. Ọtụtụ nde mmadụ ndị a amụtawo na ndokwa Jehova mere nke bụ àjà mgbapụta Jisọs ga-eme ka o kwe omume ime ka ihe a kpọrọ mmadụ “pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” (Ndị Rom 8:19-22) Lee aha oké nnwere onwe nke ahụ ga-abụ—ibi ndụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime paradaịs elu ala, na-enwe ịkpa ókè ndị kwesịrị ekwesị nke Jehova ji ịhụnanya na-ekpebi!—Aịsaịa 25:6-8; tụlee Ọrụ Ndị Ọzọ 17:24-26.
18 Nnwere onwe ndị Ndịàmà Jehova na-enwe ugbu a, na-enwekwa olileanya inwe n’ụzọ ka ukwuu n’usoro ihe ọhụrụ Chineke, sitere n’aka Chineke anyị bụ́ Jehova. (2 Ndị Kọrint 3:17) Ha adabereghị n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ mgbanwe ọchịchị ọ bụla. (Jemes 1:17) Iji nọrọ ná nche megide nghọtahie ọ bụla n’isi ihe nke a, baaji mgbakọ 1991 nke Ndịàmà Jehova tinyere n’efe ha ná mba ụfọdụ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe bu okwu ndị ahụ bụ “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe Chineke n’Anya,” kama ịbụ nanị “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya.”
Ịhụnanya Dị Ike Maka Jehova
19. Olee otú isoro Jehova nwee mmekọrịta chiri anya site n’ekpere si enye anyị nkwado?
19 Ịhụnanya anyị nwere maka Jehova na obi anyị tụkwasịrị ya ga-eme ka anyị nọrọ ya nso n’ekpere. Ọ bụ mekọrịta nke a chiri anya ha nwere n’ebe Jehova nọ nyewooro ụmụnna anyị aka ịnagide ọtụtụ ihe isi ike na mkpagbu. (Abụ Ọma 25:14, 15) N’oge ya nke ule kasị ukwuu, Jisọs nọgidere na-eso Nna ya na-enwe mmekọrịta chiri anya site n’ekpere. (Luk 22:39-46) Isoro Jehova nwee mmekọrịta chiri anya site n’ekpere n’ụzọ dị otú a kwadoro Stifen gabiga ihe mgbu nke ọnwụ ya n’ihi okwukwe ya. N’ileli anya n’eluigwe mgbe a na-akwado iji nkume tụgbuo ya, ọ sịrị: “Lee, ana m ahụ eluigwe ka e megheworo ha, na Nwa nke mmadụ [Jisọs] ka ọ na-eguzo n’aka nri Chineke.”—Ọrụ 7:56.
20-22. Olee otú otu ahụmahụ si enye ihe atụ nke na Chineke na-anụ ekpere?
20 Dị ka ndị na-efe Jehova ofufe nweworo ahụmahụ ya ọtụtụ mgbe, Jehova na-aza ekpere ndị kwekọrọ n’uche ya. Dị ka ihe atụ, n’otu mba dị n’Africa ebe a machibidoro ọrụ Ndịàmà iwu, otu onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nke ji bọs na-aga n’ebe ugwu bu otu nnukwu akpa akwụkwọ Alaeze na envelop ndị ọ ga-ekesa. Onye na-elekọta ụgbọ ahụ bụ́ onye na-ebukpu ibu nile na bọs ahụ jụrụ nwanna nwoke ahụ, sị: “Gịnị dị n’ime akpa ahụ?” Nwanna nwoke ahụ kwuru ihe mbụ batara ya n’uche: “Akwụkwọ ozi.”
21 N’ụzọ, bọs ahụ ji ọsọ gbafere ebe ndị uwe ojii na-enyochasị ụgbọ ala, ndị uwe ojii na-ahụ na e nweghị ihe ize ndụ n’okporo ụzọ chụkwara ya ọsọ ma kwụsị ya, na-eche na o bu ahịa iwu. Ha nyere iwu ka ndị nile e bu si na bọs ahụ rịtuo nakwa ka e nyochaa ibu nile. Nke a bụ ihe ọdachi! Nwanna nwoke ahụ gapụtụrụ nke nta site n’ìgwè mmadụ ahụ na-eme ntamu, wee gbunye ikpere n’ala, kpegara Jehova ekpere. Mgbe o sonyeghachiri ìgwè mmadụ ahụ, a na-emeghe ibu nke onye njem ọ bụla ma jiri nlezianya na-enyocha ihe ndị dị n’ime ya. Mgbe a chọrọ imepe akpa nke nwanna nwoke ahụ, ọ kpọkuru Jehova maka enyemaka n’ekwupụtaghị okwu.
22 “Ònye nwe akpa nke a, gịnịkwa dị n’ime ya?” ka onye uwe ojii ahụ tiri mkpu jụọ. Tupu nwanna nwoke ahụ emeghee ọnụ ikwu okwu, onye nlekọta ụgbọ ala ahụ zara sị: “Ọ bụ akwụkwọ ozi sitere na —— post ọfịs na-aga —— post ọfịs.” “Ọ dị mma,” ka onye uwe ojii ahụ kwuru. O buliri akpa ahụ ma nye ya onye nlekọta ụgbọ ala ahụ. “Hụ na i debere ya n’ebe ọ na-adịghị ihe ga-eme ya n’ụzọ,” ka o nyere ya iwu. Onye ọsụ ụzọ ahụ pụrụ iche gbukwara ikpere n’ala ọzọ ma kelee Onye ahụ Na-anụ Ekpere.—Abụ Ọma 65:2; Ilu 15:29.
23. Gịnị ka Jehova gosipụtaworo, ma ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o ji na-ekwere ka mkpagbu werezuo ọnọdụ ya mgbe ụfọdụ?
23 Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ndị na-efe Jehova ofufe nweere onwe ha kpam kpam pụọ n’ọdachi ndị na-ewere ọnọdụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ma n’oge Bible ma n’oge a, Jehova egosipụtawo na ya pụrụ ịzọpụta ndị ya. Ma n’ụzọ kwekọrọ n’idozi ihe iseokwu nke iguzosi ike n’ezi ihe, mgbe ụfọdụ ọ na-eyi ka ọ na-ekwe ka mkpagbu were ọnọdụ ruo n’ozuzu ya. (Tụlee Matiu 26:39.) Ọzọ, Jehova adịghị ekpuchisị ndị ya pụọ n’ihe ọghọm, agha ime obodo, ma ọ bụ imempụ, ọ bụ ezie na itinye amamihe dị irè nke dabeere na Bible n’ọrụ pụrụ inye aka. (Ilu 22:3; Eklisiastis 9:11) Otú ọ dị, obi pụrụ isi anyị ike na ma à zọpụtara anyị site n’ọnọdụ ndị na-eweta ọnwụnwa ma ọ bụ na a zọpụtaghị anyị, a ga-enyeghachi ụgwọ ọrụ maka anyị ikwesị ntụkwasị obi anyị, ọbụna site ná mbilite n’ọnwụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.—Matiu 10:21, 22; 24:13.
24. Onyinye ịhụnanya ndị dị aṅaa ka Jehova nyeworo, oleekwa otú anyị pụrụ isi nara ịhụnanya ya?
24 Lee ka ha si dị ebube bụ́ onyinye ịhụnanya ndị Jehova na-enye! Onyinye o nyere ihe a kpọrọ mmadụ ụwa nke a na ihe nile dị n’elu ya bụ ngosipụta pụtara ìhè nke ịhụnanya ya. (Abụ Ọma 104:1, 13-16; 115:16) Onyinye ọmịiko Chineke nyekwara Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ site ná mmehie na ọnwụ bụ onyinye ịhụnanya kasị ukwuu e nyeworo. “N’ime nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ime anyị, na Chineke ewerewo Ọkpara ọ mụrụ nanị ya zite n’ụwa, ka anyị wee dị ndụ site n’aka ya. N’ime nke a ka ịhụnanya dị, ọ bụghị na anyị onwe anyị hụrụ Chineke n’anya, kama ọ bụ na ya onwe ya hụrụ anyị n’anya, wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie anyị.” (1 Jọn 4:9, 10) Iji nara ịhụnanya ahụ, ka obi sie anyị ike na “ọnwụ, ma ọ bụ ndụ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ịbụ isi dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ ihe gaje ịdị, ma ọ bụ ike dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị n’elu, ma ọ bụ ihe dị omimi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke, agaghị apụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke, nke dị n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 8:38, 39.
Ịtụleghachi Isiokwu Nke A
◻ Gịnị ka ikwesị ntụkwasị obi pụtara?
◻ N’akụkụ ịrụ ọrụ ndị dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ igosipụta ịhụnanya anyị maka Jehova?
◻ Olee akụkụ dị iche iche nke akụkọ ozi afọ ije ozi ahụ nke masịrị gị karịsịa?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele maka onyinye ịhụnanya ndị Jehova na-enye?
[Igbe dị na peeji nke 15]
GỊNỊ MERE E JI NWEE ỌTỤTỤ NDỊ ỌSỤ ỤZỌ OTÚ A?
A kọrọ na ruo 2,600 afọ ndị Japan ji ịnụ ọkụ n’obi na-efe ndị ọchịchị alaeze ukwu ha. N’agha ndị e buru nanị na narị afọ nke 20 nke a, ihe karịrị nde ndị Japan atọ so na-ebu agha chụrụ ndụ ha n’àjà, n’ihi na ha chere na e nweghị nsọpụrụ dị elu karịa ịnwụ n’ihi onye ọchịchị alaeze ukwu ha bụ chi. Ma ibu agha nke ndị Buddha na Shinto dara ada n’Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe nke ahụ gasịkwara onye ọchịchị alaeze ukwu ahụ gọnarịrị ịbụ chi ya. Gịnị pụrụ ịnọchi ịtọgbọ chakoo nke a n’ụzọ okpukpe? Ọ bụ ihe obi ụtọ na ọmụmụ Bible ebe obibi nke ndị ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova na e mesịa nke Ndịàmà bụ ụmụ amaala duziri enyeworo ọtụtụ ndị aka ịchọta ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova, na ịrara ndụ ha nye ya. Nraranye nke a pụtara ihe dị ukwuu nye Ndịàmà ahụ bụ ndị Japan. Ọ bụrụ na n’oge mbụ ha ga-achụ ndụ ha n’àjà nye onye ọchịchị alaeze ukwu bụ chi, lee ka ha ga-esi jiri ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu ugbu a tinye ume ha nile dị ka ndị ọsụ ụzọ n’ife Chineke ahụ dị ndụ na Onye Okike nke eluigwe na ala—bụ́ Eze Onyenwe anyị Jehova—ofufe!
[Chaatị dị na peeji nke 10-13]
AKỤKỌ AFỌ IJE OZI 1991 NKE NDỊÀMÀ JEHOVA N’ỤWA NILE
(Lee Ụlọ Nche a nke e biri ebi)
[Foto dị na peeji nke 16]
Ndị hụrụ nnwere onwe Chineke n’anya —ndị na-efe Jehova ofufe ná mgbakọ e mere na Prague, August 9-11, 1991