E Weghachiwo Aha Chineke
“OWEWO ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 60 afọ ka aha Chineke, ‘JHWH,’ bụ́ Chineke ọ bụghị nanị nke ndị Juu kamakwa nke ndị Kraịst, wee bụrụ nke e tinyere n’ebe onye na-ese ihe tinyere ya na mbụ.” Nke ahụ bụ otú akwụkwọ akụkọ German bụ́ Schwarzwälder Bote si kwuo okwu banyere mweghachi e weghachiri aha Chineke n’ihu nke ụlọ nzukọ obodo dị na Horb, bụ́ ebe ndịda Germany. Ma gịnị mere e ji wepụ aha ahụ?
Akwụkwọ akụkọ ahụ kọro na ebe mpụta ụlọ nzukọ obodo ahụ bụ nke e ji ihe osise e ji chọọ ihu ya mma tee ya dị ka ihe ịchọ mma. Ihe ọzọ e tinyekwara bụ Tetragrammaton, nke bụ mkpụrụ okwu Hibru anọ ahụ nke sụpere aha Chineke.
“Aha nke a, nke pụtara ihe karịrị 6,000 ugboro n’ime Bible,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ gara n’ihu na-ekwu, “bụ ‘Jehova’ ma ọ bụ ihe yiri nke a n’asụsụ German. Otú e si akpọpụta ya kpọmkwem edoghị anya n’ihi na Hibru a na-ede ede nwere nanị mgbochi ume. Onye na-agụ ya na-agbakwụnye ụdaume.”
Otú ọ dị, na 1934 ndị nnọchianya nke òtù Nazi Party kpebiri na Tetragrammaton “ekwenyekọghị n’echiche dị ugbu a,” n’ihi nke a, e kwesịkwara itechi ya ihe. Ọ bụ ihe obi ụtọ, na e weghachiwo Tetragrammaton ahụ. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru, sị: “Taa ihu [ụlọ nzukọ obodo ahụ], bụ́ nke e ji ihe omume akụkọ ihe mere eme, ihe akara e ji mara obodo, na ihe osise, chọọ mma, bụ ebe mmadụ kwesịrị ịhụ na Horb.”