Gịnị Ka Ịmara Aha Chineke Gụnyere?
IHE okike a na-ahụ anya na-egosipụta ịdị adị nke Chineke, ma ọ dịghị ekpughe aha Chineke. (Abụ Ọma 19:1; Ndị Rom 1:20) Ka mmadụ wee mara aha Chineke na-egosipụta ihe karịrị nanị ịmata okwu ahụ. (2 Ihe Emere 6:33) Ọ pụtara ịmara Onye ahụ n’ezie—nzube ya, ọrụ ya, na àgwà ya dị iche iche dị ka e si kpughee ya n’Okwu ya. (Tụlee 1 Ndị Eze 8:41-43; 9:3, 7; Nehemaịa 9:10.) E mere ihe atụ nke a n’ihe banyere Mosis, bụ́ nwoke Jehova ‘maara n’aha,’ ya bụ, maara n’ụzọ chiri anya. (Ọpụpụ 33:12) Mosis nwere ihe ùgwù nke ịhụ ngosipụta nke ebube Jehova na tinyekwara ‘ịkpọku aha Jehova.’ (Ọpụpụ 34:5) Nkwupụta ahụ abụghị nanị nkwughachi nke aha Jehova kama ọ bụ okwu banyere àgwà Chineke na ọrụ ya nile. “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, onye na-eme amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsọsọ, onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị; ọ na-ewere ajọ omume nke ndị bụ nna leta ụmụ ha, letakwa ụmụ ụmụ, leta ụmụ ụmụ nke atọ, letakwa nke anọ.” (Ọpụpụ 34:6, 7) N’otu aka ahụ, abụ Mosis nke nwere okwu bụ “n’ihi na aha Jehova ka m ga-akpọsa,” na-ekwupụtaghi mmeso nke Jehova mesoro ndị Israel ma kọwaa ọdịdị ya.—Deuterọnọmi 32:3-44.
Mgbe Jisọs Kraịst nọ n’elu ala, o ‘mere ka aha Nna ya pụta ìhè’ nye ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 17:6, 26) Ọ bụ ezie na tupu oge ahụ na ha amawo aha ahụ, matakwa ọrụ di iche iche nke Chineke dị ka e dekọrọ ha na Akwụkwọ Nsọ Hibru, ndị a na-eso ụzọ matara Jehova n’ụzọ kaa mma ma dịkwa ukwu site n’Onye ahụ “na-adabere n’obi Nna ya.” (Jọn 1:18) Kraịst Jisọs nọchitere anya Nna ya n’ụzọ zuru okè, na-arụ ọrụ nke Nna ya, na-ekwukwa, ọ bụghị ihe ya onwe ya chepụtara, kama okwu nile nke Nna ya. (Jọn 10:37, 38; 12:50; 14:10, 11, 24) Ọ bụ ya mere Jisọs pụrụ ikwu sị, “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.”—Jọn 14:9.
Nke a gosipụtara n’ụzọ pụtara ìhè na nanị ndị maara aha Chineke n’eziokwu bụ ndị na-ejere ya ozi ná nrubeisi. (Tụlee 1 Jọn 4:8; 5:2, 3.) Ya mere, nkwa Jehova na-ekwe n’Abụ Ọma 91:14 metụtara ụdị ndị ahụ: “M ga-eme ka ọ nọọ n’ebe dị elu, n’ihi na ọ mawo aha m.” Aha ahụ n’onwe ya abụghị ọgwụ majik, ma Onye e ji aha ahụ mara pụrụ iweta nchebe nye ndị na-asọpụrụ ya. Otú a, aha ahụ nọchiri anya Chineke n’onwe ya. Ọ bụ ya mere ilu ji kwuo, sị: “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọ n’elu.” (Ilu 18:10) Nke a bụ ihe ndị na-atụkwasị Jehova ibu ha na-eme. (Abụ Ọma 55:22) N’otu aka ahụ, inwe ịhụnanya maka (Abụ Ọma 5:11), ịbụ abụ otuto nye (Abụ Ọma 7:17), ịkpọku (Jenesis 12:8), inwe ekele maka (1 Ihe Emere 16:35), ịṅụ iyi site (Deuterọnọmi 6:13), icheta (Abụ Ọma 119:55), ịtụ egwu (Abụ Ọma 61:5), ịchọ (Abụ Ọma 83:16), ịtụkwasị obi n’ime (Abụ Ọma 33:21), ibuli elu (Abụ Ọma 34:3), na inwe olileanya n’ime (Abụ Ọma 52:9) aha ahụ ga-abụ ime ihe ndị a nile n’ebe Jehova n’onwe ya nọ. Ikwutọ aha Chineke bụ ikwulu Chineke.—Levitikọs 24:11, 15, 16.
Jehova na-enwe ekworo n’ebe aha ya dị, ọ dịghị anakwere ịma aka ma ọ bụ ekwesịghị ntụkwasị obi n’okwu banyere ife ofufe. (Ọpụpụ 34:14; Ezikiel 5:13) E nyere ndị Israel iwu ka ha ghara ọbụna ịkpọtụ aha nke chi ndị ọzọ. (Ọpụpụ 23:13) Ebe ọ bụ na aha nke chi ụgha dị iche iche pụtara n’ime Akwụkwọ nsọ, o doro anya na izo aka ahụ metụtara ịkpọtụ aha nke chi ụgha n’ụzọ ife ofufe.
Ọdịda nke ndị Israel dara dị ka ndị a kpọkwasịrị aha Chineke ibi ndụ dị ka iwu ezi omume ya si dị pụtara mmejọ ma ọ bụ mmetọ nke aha Chineke. (Ezikiel 43:8; Emọs 2:7) Ebe ekwesịghị ntụkwasị obi ndị Israel mere ka Chineke taa ha ahụhụ, nke a nyekwara ohere maka aha ya ịbụ ihe mba ndị ọzọ na-akpọ n’enweghị nsọpụrụ. (Tụlee Abụ Ọma 74:10, 18; Aịsaịa 52:5.) Enweghị ike ịghọta na ịta ahụhụ ahụ sitere n’ebe Jehova nọ, mba ndị a chere n’ụzọ na-ezighị ezi na ahụhụ ndị a dakwasịri Israel n’ihi adịghị ike nke Jehova ichebe ndị ya. Iji wepụ aha ya n’ụdị nkọcha ahụ, Jehova mere ihe n’ihi aha ya ma kpọhachi ihe fọdụrụ nke Israel gaa n’ala ha.—Ezikiel 36:22-24.
Site n’igosipụta onwe ya n’ụzọ pụrụ iche, Jehova mere aha ya ka ọ bụrụ ihe a na-echeta. N’ebe nile nke a mere, e wuru ebe ịchụàjà.—Ọpụpụ 20:24; tụlee 2 Samuel 24:16-18.
Aha nke Ọkpara Chineke
N’ihi ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, Jisọs Kraịst bụ onye Nna ya nyeghachiri ụgwọ ọrụ, na-anata ọnọdụ dị elu nakwa “aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu.” (Ndị Filipaị 2:5-11) Ndị nile chọrọ ndụ kwesịrị ịmata ihe aha ahụ nọchiri anya ya (Ọrụ 4:12), tinyere ọnọdụ Jisọs dị ka Onye ọkà ikpe (Jọn 5:22), Eze (Mkpughe 19:16), Onye Isi Nchụàjà (Ndị Hibru 6:20), Onye Mgbapụta (Matiu 20:28), na Onye Na-eduba ná nzọpụta.—Ndị Hibru 2:10.
Kraịst Jisọs dị ka “Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile” ga-edukwa usuu ndị agha nke eluigwe ibu agha n’ezi omume. Dị ka onye na-emezu ịbọ ọ́bọ̀ nke Chineke, ọ ga na-egosipụta ike na àgwà nke ndị na-alụso ya ọgụ na-amaghị. Ya mere, n’ụzo kwesịrị ekwesị, “o nwekwara aha e deworo, nke ọ na-adịghị onye ọ bụla matara, ma ọ bụghị ya onwe ya.”—Mkpughe 19:11-16.
Ụzọ Dị Iche Iche E Si EJi Okwu ahụ Bụ “Aha” Eme Ihe
A pụrụ ‘ịkpọkwasị’ mmadụ, obodo, ma ọ bụ ụlọ otu aha. Jekọb, mgbe ọ na-ekuchi nwa Josef kwuru, si: “Ka a kpọọkwa n’isi ha aha nke m, na aha nna m ha, bụ́ Abraham na Aịsak.” (Jenesis 48:16; leekwa Aịsaịa 4:1; 44:5.) Ịkpọkwasị ndị Israel aha Jehova gosiri na ha bụ ndị ya. (Deuterọnọmi 28:10; 2 Ihe Emere 7:14; Aịsaịa 43:7; 63:19; Daniel 9:19) Jehova kpọkwasịkwara aha ya n’isi Jerusalem na ụlọ nsọ ya, si otú a na-anakwere ha dị ka ebe nzukọ ziri ezi maka ofufe ya. (2 Ndị Eze 21:4, 7) Joab họọrọ ịghara imeri obodo Raba n’ụzọ zuru ezu iji mee ka a ghara ịkpọkwasị aha ya n’obodo ahụ, ya bụ, ka a ghara inye ya otuto dị ka onye meriri ya.—2 Samuel 12:28.
A ‘gụpụrụ’ aha nke onye nọ n’ọnụ ọnwụ nke na-enweghị nwa nwoke, dị ka a pụrụ ikwu ya. (Ọnụ Ọgụgụ 27:4; 2 Samuel 18:18) Ya mere, ndokwa nke mmadụ ịhụ nwunye nwanne ya nwoke nke Iwu Mosis gosipụtara rụrụ ọrụ ichebe aha nwoke nwụrụ anwụ. (Deuterọnọmi 25:5, 6) N’aka nke ọzọ, mbibi nke mba, ndị mmadụ, ma ọ bụ ezinụlọ pụtara mkpochapụ nke aha ha.—Deuterọnọmi 7:24; 9:14; Joshua 7:9; 1 Samuel 24:21; Abụ Ọma 9:5.
Ikwu okwu ma ọ bụ ime ihe ‘n’aha nke’ onye ọzọ na-apụta ime otú ahụ dị ka onye nnọchianya nke onye ahụ. (Ọpụpụ 5:23; Deuterọnọmi 10:8; 18:5, 7, 19-22; 1 Samuel 17:45; Esta 3:12; 8:8, 10) N’otu aka ahụ, ịnabata mmadụ n’aha nke onye ọzọ na-egosipụta nnabata nke onye ahụ. Ya mere, ‘ịnakwere onye amụma n’aha onye amụma’ ga-egosipụta ịnara onye amụma n’ihi ya ịbụ onye dị otú ahụ. (Matiu 10:41, King James Version, NW) Imekwa baptism baa “n’aha nke Nna, na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ” ga-apụta ịmata Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ.—Matiu 28:19.