Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 2/15 p. 32
  • Mgbidi Ndị Na-akpali Oké Mmasị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbidi Ndị Na-akpali Oké Mmasị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 2/15 p. 32

Mgbidi Ndị Na-akpali Oké Mmasị

Ndị bịara abịa na-enwe mmasị ná mgbidi nke Osimiri Mediterranean dị na Caesarea, bụ́ ọdụ ụgbọ mmiri ochie dị n’akụkụ mmiri Israel. Herọd Onye Ukwu wuru ọdụ ụgbọ mmiri a ma nye obodo ukwu a aha n’ịkwanyere Caesar Augustus ùgwù.

Ndị ọkà mmụta n’ihe e gwupụtara n’ala ekpughewo ọtụtụ ihe nke obodo ahụ, tinyere ụlọ egwuregwu ukwu ya. Ha abanyewokwa n’ime mmiri iji mata otú e si wuo ọdụ ụgbọ mmiri ahụ n’akụkụ mmiri ahụ jupụtara n’ájá uzuzu.

Akwụkwọ The New York Times (January 8, 1991) kọrọ banyere nchọpụta nke mgbidi n’ihe ndị fọrọ n’obieze nke sepụtara isi ya n’ime osimiri na mbụ. Ihe ndị a pụrụ iche n’ihi na ihe e dere na ha kpọrọ aha ụfọdụ ndị eze ndị Rom bụ́ ndị a na-amaghị na mbụ. A kpọtụkwara “onye na-ahụ maka” ụgbọ, nke bụ “ihe odide mbụ a chopụtaworo nke metụtara ọdụ ụgbọ mmiri ahụ.”

Ndị na-amụ Bible maara na Pọl onyeozi mere njem ụgbọ mmiri gaa n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ ná ngwụsị nke njem ozi ala ọzọ abụọ. N’ebe a o sooro Filip onye na-ezisa ozi ọma nọrọ, ahụmahụ ya pụrụ inyeworị ndị na-eso ụzọ nile agbamume. (Ọrụ 18:21, 22; 21:7, 8, 16) Anyị pụrụ ịgụ ọtụtụ n’ime ahụmahụ ndị a na-akpali akpali n’akwụkwọ Bible bụ́ Ọrụ Ndị Ozi.

Ya mere mgbidi ndị a dị n’akụkụ mmiri abụghị ihe ochie nke akụkọ ihe mere eme. Ha na-echetaghachiri ndị Kraịst banyere ụmụnna ha oge gboo, bụ́ ndị gbasara ozi ọma ahụ n’ụzọ dị irè n’ọdụ ụgbọ mmiri a na “ruokwa ebe nile ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:8.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Garo Nalbandian

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya