Ihe Ịma Aka Nke Ikwusa Ozi Ọma N’ọdụ Ụgbọ Mmiri So Ná Ndị Kasị Ibu N’ụwa
ROTTERDAM, nke dị n’ebe osimiri Rhine, bụ́ osimiri kasị ekwo ekwo na Europe, si aba nye n’Osimiri Ebe Ugwu, nwere ọdịiche nke ịbụ otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri ndị kasị ibu n’ụwa. N’ịbụ nke ụgbọ mmiri ndị na-esi n’ihe dị ka 500 ụlọ ọrụ ụgbọ mmiri na-abịa na ya n’ebe a, Rotterdam nwere ụzọ njem na-aga n’ihe karịrị 800 akụkụ dị iche iche n’ụwa. Ọ bụ n’ezie ọdụ ụgbọ mmiri zuru ụwa ọnụ.
Otú ọ dị, ọdụ ụgbọ mmiri ndị Netherlands nke a dị 650 afọ abụghị nanị ebe ụgbọ mmiri si n’ebe dị iche iche na-agafe. Ọ bụkwa ebe ndị mmadụ na-ezute onwe ha. Ọtụtụ ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-abịa kwa ehihie na abalị site n’akụkụ nile nke ụwa. Ndị ọrụ ụgbọ mmiri ndị a agbanahụghị anya Ndịàmà Jehova nọ na Netherlands. Dị ka Ndịàmà nọ n’ebe ndị ọzọ, ha na-achọ ụzọ ndị ha ga-esi na-ekwusa ozi kasị mma e nwere n’ụwa—na Alaeze Chineke ga-agbanwe ụwa ịghọ Paradaịs n’oge na-adịghị anya—nye ụdị ndị nile, gụnyere ndị ọrụ ụgbọ mmiri.—Daniel 2:44; Luk 23:43; 1 Timoti 4:10.
“Ọrụ Ije Ozi Ala Ọzọ A Sụgharịrị Isi”
N’afọ ole na ole gara aga, Watch Tower Society dị na Netherlands gwara ndị nkwusa isii na-eje ozi oge nile, ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ, ka ha na-arụ ọrụ site n’ụgbọ mmiri ruo n’ụgbọ mmiri n’akụkụ nile nke ọdụ mmiri Rotterdam. Ndị ọsụ ụzọ ahụ nakweere ohere ahụ. Ha natara ndị isi ọdụ ụgbọ mmiri ahụ akwụkwọ nkọwa, nyochaa ọdụ ụgbọ mmiri, ha matakwara n’oge na-adịghị anya na ha nwere ọrụ na-ama aka.
“Ọ dị ka ọrụ ije ozi ala ọzọ a sụgharịrị isi,” ka Meinard kwuru, bụ́ onye na-ahazi ọrụ nkwusa ahụ. Gịnị ka o bu n’uche? “Dị ka ọ na-adịkarị onye ozi ala ọzọ na-eme ogologo njem iji jekwuru ndị mmadụ, ma n’ọnọdụ nke anyị ndị mmadụ na-eme ogologo njem iji bịakwute anyị.” O kwukwara, sị, “ma eleghị anya ókèala ebe anyị na-ekwusa ozi ọma zuru ụwa nile ọnụ n’ụzọ ọ bụla i si lee ya anya.” Akwụkwọ afọ Rotterdam Europoort nke 1985 kwuru na n’afọ 1983, afọ ndị ọsụ ụzọ malitere ọrụ nke a pụrụ iche, ọdụ ụgbọ mmiri Rotterdam nabatara 30,820 ụgbọ ndị na-aga na mmiri ndị sitere na 71 mba dị iche iche. Nke ahụ bụ ihe zuru ụwa nile ọnụ!
N’ụzọ kwesịrị ekwesị, “ndị ozi ala ọzọ nke ọdụ ụgbọ mmiri”—dị ka ndị ọrụ ụgbọ mmiri malitere ịkpọ ha n’oge na-adịghị anya—dịkwa ka ndị sitere n’akụkụ nile nke ụwa. Geert, Peter, na nwunye ya, bụ́ Karin, bụ ndị Netherlands; Daniël na Meinard sitere Indonesia; Solomon bụkwa onye Etiopịa. Ọbụbụ ha bụ ndị Europe, Esia na Africa gabigara ihe mgbochi nke asụsụ asatọ, ma iji nwee ihe ịga nke ọma n’ọrụ nke a, ha nwere ihe mgbochi ndị ha ga-eleba anya na ha.
“Chọọchị ahụ A Na-agba Agba”
“Ị pụghị nnọọ ịga n’ọdụ ụgbọ mmiri, rịgoro n’elu osisi e ji abanye n’ụgbọ, ma banye n’ime ụgbọ,” ka Peter, bụ́ onye dị 32 afọ, onye bụbu onye ọrụ ụgbọ mmiri, kwuru. “Ọ dị mkpa ka i nweta akwụkwọ ikike ebe ahụ.” Nke ahụ ga-enye gị ikike ịbịa n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ na ikike ịbanye n’ụgbọ mmiri. “Nke ahụ bụ oké imezu iwu,” ka Peter chetara, “ma mgbe anyị nwetara akwụkwọ ikike asatọ, ndị bucha foto anyị na stampụ ndị e biri ebi, anyị dị njikere iji ike anyị nile malite ọrụ.” Ha kewara ọdụ ụgbọ mmiri ahụ dị 37 kilomita gaa n’akụkụ atọ, nke ọ bụla dị n’okpuru nlekọta ndị ọsụ ụzọ abụọ.
Otú ọ dị, olee ihe ị ga-eme banyere ìgwè asụsụ nke ndị ọrụ ụgbọ mmiri sitere n’ọtụtụ mba na-asụ? Ọ bụ ezie na ndị ọsụ ụzọ ahụ kwakọjuru akwụkwọ Bible ndị dị na 30 asụsụ ma buru ókè o kwere omume n’ịnyịnya ígwè ha, ọ dịghị mgbe o yiri ka ọ na-ezu. “Ọ dịghị mgbe ị ga-ama kpọmkwem asụsụ nke dị gị mkpa,” ka Solomon dị 30 afọ ji ihu ọchị cheta. “Ọ na-adabakarị na ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-achọ akwụkwọ ndị dị n’asụsụ ị na-ejighị bịa, mgbe ahụkwa ha na-agwa gị na ụgbọ ha na-apụ na hour atọ ma ọ bụ karịa.” N’achọghị ime ka olileanya ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ dakpọọ, otu n’ime ndị ọsụ ụzọ ahụ na-agbapụ, weta akwụkwọ nke kwesịrị ekwesị, gbaghachi azụ, ma nyefee ha n’aka ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ na-achọ ha. “Mgbe otu nsogbu ahụ bilitere ka anyị na-eme nkwusa n’akụkụ ọdụ ụgbọ mmiri ahụ na-ewe hour atọ ma e jiri ịnyịnya ígwè gaa ya,” ka Peter kwuru, “o doro anya na ọ dị mkpa ka anyị jiri ụzọ ọzọ mee ihe.”
Otu ụbọchị ụfọdụ Ndịàmà bi n’ebe ọdụ ụgbọ mmiri ahụ mere ihe tụrụ ndị ọsụ ụzọ ahụ n’anya site n’inye ha ụgbọ ịnyịnya ígwè na-adọkpụ, nke ọ bụla hà ka ọkwá ịsa ahụ. Ndị ọsụ ụzọ ji akwụkwọ ndị dị n’asụsụ ọ bụla ha pụrụ inweta kwajuo n’ụgbọ ahụ, kokwasị ha n’ịnyịnya ígwè ha, ma tinye isi n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. N’oge na-adịghị anya ụgbọ ndị ahụ ghọrọ ihe onye ọ bụla maara. “Ha aghọwo ihe e ji amata na anyị nọ ya,” ka otu onye n’ime ndị ọsụ ụzọ ahụ kwuru. “Mgbe otu onye na-emepe geti hụrụ ka anyị na-abịa, ọ na-emepe geti, na-efere anyị aka ka anyị bata, ma na-eti mkpu, sị: ‘Lee chọọchị ahụ a na-agba agba!’” N’oge ndị ọzọ, mgbe otu onye nche hụrụ “chọọchị ahụ a na-agba agba” ka ọ na-abịa n’ebe ọ nọ, ọ na-emepe geti ma kwuo, sị: “Ndị Poland abụọ na otu onye China!” Ihe ọmụma ndị dị otú ahụ na-enye aka na-enyere ndị ọsụ ụzọ ahụ aka ịbanye n’ụgbọ mmiri ahụ na-eji akwụkwọ ndị dị n’asụsụ kwesịrị ekwesị. Ma ha aghaghịkwa ịga n’oge kwesịrị ekwesị. N’ihi gịnị?
Iji Ozi Bịara n’Oge Mee Nleta n’Oge
Ndị ọsụ ụzọ ahụ pụrụ ịgwa ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ mmiri okwu nanị n’oge ha nwere nzurutụ ike n’oge ụtụtụ na n’oge ehihie ma ọ bụ n’oge nri ehihie. Otú ọ dị, onye na-esi nri nwere oge ịrụ ọrụ dị iche, a pụkwara ịchọta onye na-anya ụgbọ mmiri na ndị isi ndị ọzọ n’oge ọ bụla n’ụbọchị. Ọzọkwa, ndị ọsụ ụzọ anyị mụtara na ụgbọ mmiri ndị Britain na-akwụsị na Rotterdam na-eji oge ndị Britain eme ihe (nke ji otu hour dị iche na nke Netherlands), nke mere na ndị ọrụ ha na-aga n’ụlọ ebe a na-anọ eri ihe mgbe ndị ọrụ na-abụghị ndị Britain na-alaghachi ịmalite ọrụ. O doro anya na nye onye na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ n’ọdụ ụgbọ mmiri, elekere na-edebe oge nke ọma bụ ihe dị mkpa.
Otú ọ dị, ndị ọrụ ụgbọ mmiri hà dị njikere iji oge nzurutụ ike ha mee ihe maka inwe nkwurịta okwu na Bible? “Dị ka ọ na-adịkarị, ana m achọpụta na ha nwere obi ghere oghe n’ebe ozi Alaeze ahụ dị,” ka Geert dị 31 afọ kwuru. “Ma eleghị anya nke ahụ bụ n’ihi na ha na-eji anya ha ahụ ọdịda nke ọchịchị mmadụ dara.” Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ gwara Geert na ikpó ihe oriri ndị ha busaworo maka ndị Etiopịa na-anwụ n’agụụ ka dọ n’ebe ahụ ọtụtụ ọnwa mgbe ha bịaghachiri ọzọ, nanị na mgbe ahụ ihe oriri ndị ahụ eretọwo, òké ejupụtawokwa na ha. “Ka a sịkwa ihe mere na ọtụtụ ndị ọrụ ụgbọ mmiri enweghị olileanya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị,” ka Geert kwuru. “Ya mere nkwa Bible nke otu ọchịchị ga-achị ihe nile a kpọrọ mmadụ na-adọrọ mmasị ha.”
Peter kwenyere na nke ahụ. “Otu onye Germany na-anya ụgbọ mmiri sịrị na n’afọ iri gara aga ndị ọrụ ya gaara achụpụ m n’ụgbọ mmiri ahụ, ma ọnọdụ ụwa ndị na-agbanwe agbanwe taa akpaliwo mmasị ha n’ozi Bible na-abịa n’oge ya.” Otu onye Korea na-esi nri n’ụgbọ mmiri kwuru na n’oge agha Iran na Iraq, oké ụgbọ mmiri ọ na-arụ ọrụ na ya bụ nke otu rọket tụtara ma nwuru ọkụ n’ógbè Persian Gulf. O kwere nkwa na ọ bụrụ na ya adị ndụ, ọ ga-achọ Chineke. Ọ lanarịrị. Mgbe ndị ọsụ ụzọ ahụ zutere ya na Rotterdam mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ chọrọ ka e wetara ya akwụkwọ nile dị n’asụsụ Korea ndị ha pụrụ inwetara ya.
Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ụgbọ mmiri ndị ahụ na-anọ n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ ruo ọtụtụ ụbọchị. Nke a na-enye ndị ọsụ ụzọ ahụ ohere ịlaghachi ugbo abụọ, atọ, ma ọ bụ karịa iji nọgide na-enwe nkwurịta okwu na Bible mgbe a gbasara ọrụ. Ma, mgbe ụgbọ mmiri nwere nsogbu injin, ọ pụrụ ịnọgide n’apụghị apụ ruo izu atọ. “Nke ahụ dịịrị ụlọ ọrụ ahụ njọ,” ka otu onye ọsụ ụzọ ji ọchị kwuo, “ma dịrị mma maka ọrụ anyị.” Mgbe ahụ, e wezụga ịnọgide na-enwe nkwurịta okwu na Bible, ndị ọsụ ụzọ na-emekwa ndokwa igosi otu n’ime ihe nkiri Society, “Bible—Akwụkwọ Dịịrị Ọgbọ Nke A,” n’ụlọ oriri ha. Ụfọdụ ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-abịakwa nzukọ nke òtù dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-eme n’asụsụ ala ọzọ na Rotterdam. Nke a na-adịgide otú ahụ ruo mgbe a rụziri injin ahụ. Mgbe ahụ a ghaghị imechi Bible. A na-atọpụ ụdọ ndị jigidere ụgbọ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri ahụ na-esikwa n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ pụọ—ma ọ dịghị apụ n’uche ndị ọsụ ụzọ ahụ.
Akụkọ Ndị Na-agba Ume nke Ndị Ọrụ Ụgbọ Mmiri Na-akọ
Site n’ihe ndị e depụtara n’akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ usoro ígwè ọrụ kọmpụta nke ndị na-elekọta ọdụ ụgbọ mmiri ahụ, ndị ọsụ ụzọ ọdụ ụgbọ mmiri ahụ na-amata banyere ọbịbịa na ọlịla nke ụgbọ mmiri ndị ha letaworo. Ozugbo nke ọ bụla n’ime ha bịara ọzọ, ndị ọsụ ụzọ ahụ na-enwe ọchịchọ ijekwuru ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ ịchọpụta ihe meworo kemgbe ha ji laa. Lee aha akụkọ ndị na-agba ume ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ na-akọ!
Otu onye ọrụ ụgbọ mmiri nyefere akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala n’aka mmadụ ise bụ́ ndị ọrụ ụgbọ mmiri ibe ya mgbe ụgbọ mmiri ya nyụrụ ọkụ na mmiri, ha isii nwekwara ọmụmụ Bible. Ọ gụnyere isiakwụkwọ ahụ na-ekwu banyere ndụ ezinụlọ n’ime kaseti ma kpọghachi ya n’ụlọ oriri ha maka abamuru nke ndị ọrụ ụgbọ mmiri nile. N’ime ụgbọ mmiri ọzọ, otu onye ọrụ ụgbọ mmiri bịaworo n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze dị nso n’ọdụ ụgbọ mmiri Antwerp mapawara n’ahụ ájá nke ụlọ oriri ha otu akwụkwọ bu okwu ndị ahụ bụ “Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova” ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo. Mgbe ahụ ọ kpọrọ ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ òkù ka ha bịa mgbe ọ ga-eduzi ọmụmụ Bible. Tupu o wepụ akwụkwọ mmapawa ahụ, ọ kpọrọ ndị ọrụ ahụ òkù ka ha bịa na nzukọ ọzọ ọ gaje inwe. N’izu na-esonụ, akwụkwọ mmapawa ahụ na ndị ọrụ pụtakwara ìhè ọzọ.
Ndị ọsụ ụzọ ahụ chọpụtakwara na ụfọdụ ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ adịghị ahazi akwụkwọ ha. “Mgbe anyị banyere n’ọnụ ụlọ nke Isaac, bụ́ onye isi ọrụ redio sitere Ebe Ugwu Africa, o siri ike ịchọta oche,” ka Meinard kọrọ. “Magazin, akwụkwọ, na concordance Society jupụtara n’ebe nile—sapee asape.” Isaac nwere ajụjụ ndị o depụtaworo ọ ga-ajụ, ebe ọ bụ na ọ nọwo na-eche mbịaghachi nke ndị ọsụ ụzọ ahụ.
Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ọrụ ụgbọ mmiri adịghị echere ka ndị ọsụ ụzọ kpọtụrụ ha. N’otu abalị, telifonu Geert kụrụ mgbe ọ labaworo ụra.
“Ònyekwa bụ onye nke a?” ka Geert tamuru ka ọ na-eweli aka telifonu ahụ.
“Ndewo, ọ bụ enyi gị!” ka otu olu ji ọṅụ kwuo.
Geert gbalịrị icheta onye ọ pụrụ ịbụ.
“Ọ bụ enyi gị ahụ i zutere n’ụgbọ mmiri,” ka olu ahụ kwuru ọzọ.
“Ihe na-akụ ugbu a bụ elekere anya atọ nke ụtụtụ!” ka Geert kwuru.
“Ee, ma ị gwara m ka m kpọọ gị ozugbo ụgbọ mmiri m bịara ọzọ na Rotterdam. Ugbu a, abịawo m!” Mgbe ntakịrị oge gasịrị, Geert biliri ije zute enyi ya nke a nwere mmasị n’Okwu Chineke.
“Zipụ Nri Gị”
Ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ na-ekwupụtakwa obi ekele ha nwere n’akwụkwọ ozi ha na-edegara ndị ọsụ ụzọ ahụ. Nke a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị ha na-ekwu:
‘Amalitewo m ịgụ akwụkwọ ahụ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala . . . Ugbu a ana m aghọta ọtụtụ ihe m na-aghọtaghị na mbụ. Ana m enwe olileanya na ụgbọ anyị ga-abịaghachi na Rotterdam.’—Angelo.
‘Agụrụ m akwụkwọ ahụ, ana m ezitekwara unu ajụjụ ka unu wee zaa ha n’akwụkwọ ozi unu.’—Alberta.
‘Ugbu a ana m agụ Bible kwa ụbọchị. Obi dị m ụtọ ịbụ enyi unu. Ịchọta ndị enyi duziri m gaa n’ebe Chineke nọ bụ ihe kasị mma meworo ná ndụ m.’—Nickey.
Akwụkwọ ozi ndị ahụ na-akpali obi na-echetara ndị ọsụ ụzọ ahụ ihe Bible kwuru n’Eklisiastis 11:1, sị: “Zipụ nri gị n’elu mmiri: n’ihi na mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị ị ga-ahụ ya.” Karịsịa ha na-enwe ọṅụ mgbe ha matara na ụfọdụ ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-ewere ọnọdụ ha n’ebe Jehova nọ.
Dị ka ihe atụ, a kpaliri onye Poland bụ onye ọrụ ụgbọ mmiri, bụ́ Stanislav, site n’ihe ọ na-amụta n’akwụkwọ Society. O mere ngwa ngwa wee nweta otu obere ebe ndebe akwụkwọ nke akwụkwọ Bible ma, mgbe ọ ka nọ na mmiri, mụọ nke ọ bụla n’ime ha. “Mgbe anyị natara ozi ya ọzọ,” ka Meinard kwuru, “o dere na e mewo ya baptism.”
Folkert, bụ́ onye na-anya ụgbọ mmiri n’obere osimiri, nụrụ ozi Alaeze nke mbụ ya na Rotterdam. Kwa ọnwa abụọ ọ bụla, ọ na-abịa n’ọdụ ụgbọ mmiri nọruo otu izu ma na-enwe ọmụmụ Bible ruo ụbọchị asaa zuru ezu. Mgbe ahụ, tupu ọ hapụ ịmalite njem ọzọ ga-ewe ọnwa abụọ, ndị ọsụ ụzọ ahụ na-enye ya adres Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị n’ụzọ ụgbọ mmiri ọ ga-esi agafe. Folkert jere n’ụlọ nzukọ ndị ahụ, a kpalikwara ya site ná nnabata e nyere ya. N’oge na-adịghị anya, onye a na-anya ụgbọ mmiri mere baptism, ugbu a o jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi.
Mike, bụ́ onye agha mmiri so n’òtù British Navy, ezutewo Ndịàmà na mbụ ma na-enwekwa ọmụmụ Bible mgbe ọ ka nọ na mmiri. N’otu oge, mgbe ụgbọ agha mmiri ọ rụrụ ọrụ na ya kwụsịrị na Rotterdam, o ji ịnyịnya ígwè ya a na-apịachi apịachi mee ihe irute n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze. O nwere mmasị site n’ịhụnanya na ịdị n’otu ọ hụrụ, ọ gwakwara ndị enyi ya ahụ na o kpebiwo ịhapụ ọrụ ya. Ọ bụ ezie na ọ forọ nanị afọ anọ ka ọ malite ịnata ụgwọ dị mma a na-akwụ ndị lara ezumike nka, ọ rapagidesiri ike ná mkpebi ya ma mesịa mee baptism.
Meinard kwuru, sị: “Ọchịchọ nke Mike, Stanislav, Folkert, na ndị ọzọ chọrọ ijere Jehova ozi na-akpali anyị ịnọgide na-achọ ndị ọrụ ụgbọ mmiri dị ka ha n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ.”
Ị̀ Pụrụ Ikere Òkè?
Ileghachi anya azụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ nke ikwusa ozi ọma n’otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri kasị ibu n’ụwa, “ndị ozi ala ọzọ nke ọdụ ụgbọ mmiri” isii ahụ ji obi ha nile kweta—ọrụ ahụ abụwo nke na-ama aka ma bụrụ nke na-akwụghachi ụgwọ ọrụ. “Mgbe ụbọchị ọ bụla anyị kwusara ozi ọma gasịrị,” ka Meinard chịkọtara, “anyị na-agbara ígwè anyị laa n’ebe anyị bi na-enwe mmetụta na ụfọdụ n’ime ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ na-echere ọbịbịa anyị ọzọ.”
Ọ̀ pụrụ ịbụ na e nwere ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-echere ka e leta ha n’ọdụ ụgbọ mmiri dị n’ógbè ebe i bi? Ma eleghị anya ndị okenye nọ n’ọgbakọ unu pụrụ ime ndokwa ka i nwee ike ikere òkè n’ọrụ nke a na-ama aka ma na-akwụghachi ụgwọ ọrụ.
[Igbe dị na peeji nke 20]
IJE N’ÓKÈALA EBE A MACHIBIDORO ỌRỤ ANYỊ
N’otu afọ na-adịbeghị anya gara aga, ihe karịrị 2,500 ụgbọ mmiri sitere ná mba ebe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu kwụsịrị na Rotterdam. Ndị ọsụ ụzọ ọdụ ụgbọ mmiri ahụ hụrụ nke ahụ dị ka ohere iji jiri ozi Bible jee n’ókèala ndị a.
N’otu n’ime ụgbọ mmiri ndị Esia mbụ ha jere leta, ndị ọsụ ụzọ ahụ tinyere 23 akwụkwọ dum ha bu, na-eme ka iwe wee ụfọdụ ndị ọrụ ahụ n’ihi na ha enweghị ike inweta otu mkpụrụ. Otu nwatakịrị nwoke na-esi nri n’ụgbọ mmiri ndị Esia ọzọ dị akọ karị. Mgbe ọ natara akwụkwọ n’aka otu onye ọsụ ụzọ, o weghachiri ya n’akwụkwọ a fụchiri afụchi, na-ede adres n’elu ya. Onye ọsụ ụzọ ahụ ghọtara ihe o mere. Ọ bụ ihe dị oké ize ndụ nwatakịrị nwoke ahụ iwere akwụkwọ ahụ n’aka ya. N’otu ụbọchị ahụ e zipụrụ ya na post ọfis ịga Ime Ime Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.
N’ime ụgbọ mmiri sitere Africa, otu onye ọrụ ụgbọ mmiri ji aha akwụkwọ ndị Ndịàmà nọ n’obodo ya chọrọ. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, mgbe ọ bụla onye ọrụ ụgbọ mmiri latara ụlọ, akpa o ji kwanye ákwà ya na-ejupụta n’akwụkwọ. Onye ọrụ ụgbọ mmiri sitere ná mba Africa ọzọ nwere nkụda mmụọ nke ukwuu mgbe onye ọsụ ụzọ na-amụrụ ya ihe nwere ike inye ya nanị mkpụrụ akwụkwọ atọ nke akwụkwọ ahụ bụ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ. “Nke ahụ enweghị ebe o ruru!” ka onye ọrụ ụgbọ mmiri ahụ tiri ná mkpu, na-emegharị ógwè aka ya n’enweghị nchekwube. “Ụmụnna anyị ndị nọ n’obodo chọrọ 1,000!” Maka ọdịmma ya, ndị ọsụ ụzọ ahụ gbara ya ume iwere nanị 20 n’otu oge.
Ma eleghị anya nke kasị emetụ n’obi bụ mgbe ndị ọsụ ụzọ ahụ matara na otu ụgbọ mmiri sitere ná mba ebe a na-akpagbu Ndịàmà n’ihi okwukwe ha bịara, na ọtụtụ ndị enweghịkwa ọrụ ha na-arụ na ihe onwunwe. Mgbe ha chọpụtara na onye na-eje ozi n’ụgbọ ahụ bụ Onyeàmà, ha kpọtụụrụ onye na-anya ụgbọ mmiri ahụ ma rịọ ya ka o kwe ka ha ziga ihe inyeaka n’ime ụgbọ mmiri ya. Onye na-anya ụgbọ mmiri ahụ kwetara, mgbe ụbọchị ole na ole gasịkwara, e zipụụrụ Ndịàmà nọ ná mba ahụ otu narị nnukwu akpa uwe, akpụkpọ ụkwụ, na ngwongwo ndị ọzọ.
[Igbe dị na peeji nke 21]
IME NKWUSA SITE N’ỤGBỌ RUO N’ỤGBỌ —IHE BỤ ECHICHE NKE OTU NWANYỊ
“Na mbụ, alara m azụ isonyere Peter,” ka Karin chetara, onye nanị ya bụ nwanyị so ná ndị ọsụ ụzọ ahụ, “n’ihi na anụwo m akụkọ na ndị ọrụ ụgbọ mmiri na-emekarị aghara, na mmanya na-egbukarị ha. Otú ọ dị, achọpụtawo m na ọtụtụ n’ime ha dị nwayọọ. Ọtụtụ mgbe, mgbe onye ọrụ ụgbọ mmiri matara na anyị bụ di na nwunye, ọ na-ewepụta foto nwunye ya na ụmụ ya ma malite ịkọrọ anyị banyere ezinụlọ ya. N’ụzọ dị otú ahụ, anyị etinyewo ọtụtụ mkpụrụ akwụkwọ nke akwụkwọ ahụ bụ Ime Ka Ndu Ezi-na-ulo Gi Nwe Obi-utọ.”
Ime nleta n’ụgbọ mmiri dị ka di na nwunye na-emekwa ka ọ dị mfe karị ijekwuru nwunye ndị ọrụ ụgbọ mmiri na ndị inyom ndị ọzọ na-arụ ọrụ mgbe ụfọdụ dị ka ndị nọọsụ. “Dị ka ọ na-adịkarị, ha adịghị achọkarị ịhụ ndị ha na-amaghị,” ka Karin kwuru, “ma mgbe ha hụrụ m, ha na-enwekarị ọchịchọ isonye ná nkwurịta okwu.”
Gịnị bụ ihe ịma aka kasị ukwuu n’ọrụ ya? “Ụdọ e ji arị elu,” ka Karin zara. “Akpọrọ m mpempe ihe ndị ahụ asị.” Ò meriri ihe ahụ na-atụ ya ụjọ? “Ee. N’otu oge mgbe m na-ala azụ ịrịgo n’otu, otu ìgwè ndị ọrụ ụgbọ mmiri sitere Paraguay lere m anya ma tie mkpu, sị: ‘Ị ga-arịnwu ya. Nanị tụkwasị Chineke obi.’ N’ezie,” ka Karin ji ọchị kwuo, “mgbe ha kwụsịrị nke ahụ, ọ dịghị ihe ọzọ m pụrụ ime e wezụga ịrị ya.” Di ya nke nọ na-ele ya kwuru, sị: “Mgbe afọ anọ na iji ụdọ rịa elu ọtụtụ mgbe gasịrị, ugbu a ọ na-arị ha dị ka onye ọrụ ụgbọ mmiri.”
Karin na dị ya, bụ́ Peter, gara klasị nke 89 nke Watchtower Bible School of Gilead e mere na United States. Na September 28, 1990, ha gara n’ebe ọhụrụ e kenyere ha ọrụ, Ecuador, bụ́ mba nwere ọdụ ụgbọ mmiri. Ha kwesịrị inwe ahụ iru ala.
[Igbe dị na peeji nke 22]
Ị̀ BỤ ONYE ỌRỤ ỤGBỌ MMIRI?
Ị̀ chọrọ ịga nzukọ Ndịàmà Jehova nke a na-enwe n’asụsụ Bekee mgbe ụgbọ mmiri unu kwụsịrị n’otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri ndị bụ isi e nwere n’ụwa? Mgbe ahụ debe ihe ndekọ adres ọhụrụ nke a nke Ụlọ Nzukọ Alaeze na oge ha ji enwe nzukọ n’ebe dị nso:
Hamburg, Schellingstr. 7-9; Saturday, 4:00 p.m.; phone: 040-4208413
Hong Kong, 26 Leighton Road; Sunday, 9:00 a.m.; phone: 5774159
Marseilles, 5 Bis, rue Antoine Maille; Sunday, 10:00 a.m.; phone: 91 79 27 89
Naples, Castel Volturno (40 km north of Naples), Via Napoli, corner of Via Salerno, Parco Campania; Sunday, 2:45 p.m.; phone: 081/5097292
New York, 512 W. 20 Street; Sunday, 10:00 a.m.; phone: 212-627-2873
Rotterdam, Putsestraat 20; Sunday, 10:00 a.m.; phone: 010-41 65 653
Tokyo, 5-5-8 Mita, Minato-ku; Sunday, 4:00 p.m.; phone: 03-3453-0404
Vancouver, 1526 Robson Street; Sunday, 10:00 a.m.; phone: 604-689-9796