Bible Ọ̀ Bụ n’Ezie Onyinye Sitere n’Aka Chineke?
“EKWERE m na Bible bụ onyinye kasị mma Chineke nyeworo mmadụ.” Ọ bụ onye isi ala nke 16 nke United States bụ́ Abraham Lincoln kwuru okwu ahụ.a Ọ bụghị nanị ya nwere ekele maka akwụkwọ nke a meworo ochie.
Nwa amaala Britain na narị afọ nke 19 bụ́ William E. Gladstone kwuru, sị: “E ji Ọdịiche nke Mmalite mara Bible, ọdịiche a na-apụghị ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-ekewapụkwa ya n’ebe akwụkwọ ndị ọzọ dị.” N’otu echiche ahụ, nwa amaala America na narị afọ nke 18 bụ́ Patrick Henry sịrị: “Bible karịrị akwụkwọ nile ọ bụla ọzọ e biworo.” Ma eleghị anya, n’ihi ịbụ onye Akwụkwọ nsọ masịrị nke ukwuu, onye ọchịchị alaeze ukwu France bụ́ Napoléon Bonaparte kwuru, sị: “Bible abụghị akwụkwọ nkịtị, kama Ihe E Kere Eke Dị Ndụ, na-enwe ike nke na-emeri ihe nile na-emegide ya.”
Nye ụfọdụ ndị, Bible abụwo isi iyi nke enyemaka na nkasi obi. Onye òtù Nzukọ America bụ́ ọchịagha Robert E. Lee kwuru, sị: “N’ihe nile na-eju m anya ma na-enye m nsogbu, Bible adabeghị ada n’inye m ìhè na ume.” N’ihi nghọta o nwekwara maka akwụkwọ a, onye isi ala U.S. bụ́ John Quincy Adams sịrị: “Ruo ọtụtụ afọ, emewo m ya ihe m na-eme mgbe nile ịgụzu Bible otu ugbo kwa afọ.”
Ọ bụrụ na Onye Kasị Elu enyewo ihe a kpọrọ mmadụ Bible, e kwesịrị inwe ihe àmà na o sitere na mmụọ nsọ Chineke. O kwesịrị ịdị elu karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ. Ka Bible wee bụrụ ezi isi iyi nke ume na ntụziaka, ọ ghaghịkwa ịbụ ihe kwesịrị ndabere kpam kpam. Ya mere, ajụjụ ahụ ka dịkwa, Bible ọ̀ bụ n’ezie onyinye sitere n’aka Chineke? Ka anyị chọzịe ugbu a azịza nye ajụjụ ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
[Foto ndị dị na peeji nke 3]
William E. Gladstone
[Ebe E Si Nweta Foto]
U.S. National Archives photo
Abraham Lincoln
[Ebe E Si Nweta Foto]
U.S. National Archives photo
Patrick Henry
[Ebe E Si Nweta Foto]
Harper’s U.S. History
Napoléon Bonaparte
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ọ bụ E. Ronald sere ya
John Quincy Adams
[Ebe E Si Nweta Foto]
Harper’s U.S. History
Robert E. Lee
[Ebe E Si Nweta Foto]
U.S. National Archives photo