E Meghee Ihe Ndekọ Mgbe Ochie E Zoro Ezo
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’ITALI
“E meghee ihe ndekọ mgbe ochie nke Òtù Njụta Okwukwe.” Otú a ka usoro mgbasa ozi si kọọ na Vatican ekwewo ka ndị ọkà mmụta nwee ike inweta ihe ndekọ mgbe ochie nke Òtù Na-ahụ Maka Ozizi Chọọchị, bụ́ nke a maara ruo na 1965 dị ka Òtù Dị Nsọ.
E KWURU na e kwesịrị ịtụle ihe ahụ e mere “n’ịdabere n’usoro dị ogologo, a hazikwara ahazi nke idegharị akụkọ ihe mere eme nke John Paul nke Abụọ chọrọ ka e dechaa tupu afọ 2000.”a N’ihi gịnị ka e ji nwee mmasị dị ukwuu n’ihe ndekọ mgbe ochie ndị a? Olee ihe nzuzo a na-eche dị na ha?
Popu Paul nke Atọ hiwere Òtù Dị Nsọ ahụ na 1542. A kpọkwara òtù a nke popu nke na-ahụ maka ịkwụsị “ịjụ okwukwe” Òtù Njụta Okwukwe nke Rom, iji mee ka ọ dị iche n’ebe Òtù Njụta Okwukwe nke Spain dị bụ́ nke a malitere na 1478.b Òtù ndị kadinal nke e hiwere na 1542 gaje “ịhụ maka okwu banyere ịjụ okwukwe n’ime Krisendọm dum,” ka Adriano Prosperi, bụ́ ọkà n’okwu ahụ na-akọwa. N’ime Òtù Njụta Okwukwe ndị na-arụ ọrụ na narị afọ nke 16, ọ bụ nanị Òtù Njụta Okwukwe nke Rom ka na-arụ ọrụ, ọ bụ ezie na o nwere aha dị iche na ọrụ dị iche.
E nwetara ihe ndekọ dị iche iche nke Òtù Njụta Okwukwe ahụ. Ka oge na-aga, ha ghọrọ ihe ndekọ mgbe ochie e zoro ezo nke Òtù Dị Nsọ ahụ. Na 1559 ụfọdụ ndị bi na Rom, bụ́ ndị nupụrụ isi iji “mee ememe ncheta” ọnwụ Popu Paul nke Anọ, bụ́ onye e lere anya dị ka onye nkwado bụ́ isi nke Òtù Njụta Okwukwe nke Rom ahụ, kwakọọrọ ụfọdụ ihe ndekọ mgbe ochie ndị ahụ. Na 1810, mgbe o merisịrị Rom, Napoléon Mbụ buuru ihe ndekọ mgbe ochie ndị ahụ gaa Paris. Ma n’oge ahụ ma n’oge e mesịrị nyeghachi ha popu, a tụfuru ma ọ bụ bibie ọtụtụ ihe ndị dị n’ime ha.
Gịnị Dị n’Ime Ha?
Ihe karịrị ihe odide 4,300 ndị mejupụtara ihe ndekọ mgbe ochie ahụ jupụtara ọnụ ụlọ abụọ dị nso na St. Peter’s Basilica. Dị ka kadinal Joseph Ratzinger—onyeisi òtù Vatican a—si kwuo, ihe ndị dị n’ihe ndekọ mgbe ochie ndị ahụ metụtara okwu banyere akụkọ ihe mere eme n’ụzọ ụfọdụ ma “bụrụ n’ụzọ bụ́ isi nke metụtara nkà mmụta okpukpe.”
Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwekọrịtara na a pụghị ịtụ anya ka ihe ndekọ mgbe ochie ndị ahụ kpughee ihe dị ukwuu. Prọfesọ Prosperi na-akọwa na ihe ndị e dekọrọ e kwuru ná nzukọ Òtù Njụta Okwukwe nke Rom dị na ha ma na “akwụkwọ ndị e tinyere n’ụlọikpe, akwụkwọ ikpe, na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ usoro nile e ji kpee ikpe na-efu efu. E bibiri ihe ka ukwuu n’ime ha n’agbata 1815 na 1817 na Paris n’ikwekọ n’iwu nke Monsignor Marino Marini nyere, bụ́ onye e si na Rom zipụ ka o nwetaghachi akwụkwọ ndị Napoléon wepụrụ.”
Vatican ekwewo ka ndị ọkà mmụta nwee ike inweta ihe odide ndị a chịkọtara tupu Leo nke Iri na Atọ anwụọ na July 1903. Iji nwee ike inweta ha, ndị nnyocha aghaghị iweta akwụkwọ nkọwa sitere n’aka ndị isi okpukpe ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ.
Nkatọ
Ọ bụ ezie na ndị mmadụ n’ọha nwere obi ụtọ mgbe ha nụrụ akụkọ banyere mmeghe nke e meghere ihe ndekọ mgbe ochie ndị ahụ, e nwere ndị katọrọ ya. N’iche ihe mere o ji bụrụ nanị ihe odide ndị dị laa azụ tupu 1903 ka e wepụtara, ọkà mmụta okpukpe Katọlik bụ́ Hans Küng na-ajụ, sị: “Ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ bụ kpọmkwem na 1903 ka ọ malitere ịdọrọ mmasị karị, ebe ọ bụ na n’afọ ahụ Popu Pius nke Iri, bụ́ onye ka rịgosịịrị n’ọkwá popu, malitere ịlụso Echiche Ọgbara Ọhụrụ agha, bụ́ nke gaje ịta isi ọtụtụ ndị ọkà mmụta okpukpe ma mee ka ihe siere ndị bishọp Itali, France, na Germany ike, na-ekewapụ ọtụtụ ndị n’ebe chọọchị dị?”
Nye ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere iwu bụ́ Italo Mereu, n’agbanyeghị mgbanwe ha gbanwere aha ya na mmeghe ha meghere ihe ndekọ mgbe ochie ndị ahụ, “ọrụ [Òtù Na-ahụ Maka Ozizi Chọọchị] na-arụ bụ ọrụ Òtù Njụta Okwukwe nke oge ochie ahụ, ya na ụzọ ochie ya nke ime ihe,” dị ka ekweghị ka ndị ahụ na-eme nnyocha hụ ihe odide ndị na-ezo aka n’ebe ha nọ.
‘Ọ Dịghị Ihe Zoro Ezo nke A Na-agaghị Amata’
Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme n’ozuzu ha ekweghị na ha ga-achọpụta ihe ọ bụla ga-aghọ ihe akụkọ ‘n’ihe ndekọ mgbe ochie nke Òtù Njụta Okwukwe’ ahụ. Ma, ka o sina dị ọ dị ịrịba ama na iwu ji Chọọchị Katọlik ịnakwere echiche ọha na eze.
Otú ọ dị, echiche dị nnọọ mkpa karị bụ nke Chineke. Mgbe oge ruru ọ ga-eme ihe o kpere n’ikpe n’isi okpukpe nke zọọrọ na ya bụ nke ndị Kraịst ma nọrọ na-emebi iwu Chineke, nke na-emebikwa nzube nke ozizi Jisọs ruo ọtụtụ narị afọ site n’inwe Njụta Okwukwe ndị jọgburu onwe ha. N’ime ha, a tara ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha ahụhụ n’ụzọ dị egwu ma gbuo ha, nanị n’ihi na ha ekweghị n’ozizi ma ọ bụ omume nke chọọchị.—Matiu 26:52; Jọn 14:15; Ndị Rom 14:12.
N’agbanyeghị otú ndị ọkà mmụta nyocharuru ihe ndekọ mgbe ochie ndị ahụ, ọ ga-anọgide na-abụ nke na-ezughị ezu. N’aka nke ọzọ, “ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’ihu [Chineke]: kama ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya Ya, bụ́ Onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.” (Ndị Hibru 4:13) Ọ bụ ya mere Jisọs, mgbe ọ na-ezo aka n’ebe ndị ndú okpukpe megidere ya nọ, pụrụ ịgwa ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu atụla egwu ha: n’ihi na ọ dịghị ihe ọ bụla e kpuchiworo ekpuchi, nke a na-agaghị ekpughe; ọ dịghịkwa ihe e zoro ezo, nke a na-agaghị ama.”—Matiu 10:26.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
b Ọ bụ ezie na usoro ha ji eme ihe na ihe ndị ha na-arụpụta dịtụ iche, òtù abụọ ndị a malitere ọhụrụ ma e jiri ha tụnyere Òtù Njụta Okwukwe nke oge ochie bụ́ nke maliteworo na 1231 n’Itali na France.
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 14]
Obí nke Òtù Dị Nsọ ahụ, dị na Rome, Itali
Ihe Ndị E Sere: Site n’akwụkwọ bụ́ Bildersaal deutscher Geschichte ▲