Ikpe Na Ogbugbu Nke “Onye Jụrụ Okwukwe”
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’ITALI
OCHE dị elu, dị ebube nke ndị ọkàikpe dị n’otu akụkụ nke ụlọikpe ahụ a na-atụ ụjọ ya. E ji ihe mkpuchi nke ákwà ojii, nke dịkwasịrị n’elu otu nnukwute obe e ji osisi mee nke jupụtara ọnụ ụlọ ikpe ahụ, wee kpuchie oche onye isi oche nke dị n’etiti. Ebe onye a na-ekpe ikpe na-eguzo dị n’ihu ya.
Otú a ka e si akọwakarị ụlọikpe Njụta Okwukwe na-atụ ụjọ nke ndị Katọlik. Ebubo na-atụ ụjọ e boro ndị ahụ nwere ihe ndabara ọjọọ na-azara ọnụ ha bụ “ịjụ okwukwe,” okwu na-enye mmadụ echiche mmekpọ ọnụ na ogbugbu site n’ịgba ọkụ n’elu osisi. Njụta Okwukwe ahụ (nke sitere na ngwaa Latin bụ́ inquiro, “ịjụta banyere”) bụ ụlọikpe pụrụ iche nke okpukpe nke e guzobere iji kpochapụ ịjụ okwukwe, ya bụ, echiche ma ọ bụ ozizi ndị na-ekwekọghị n’ozizi ọdịnala nke Roman Katọlik.
Akwụkwọ ndị Katọlik na-ekwu na e guzobere ya ná nkebi ná nkebi. Popu Lucius nke Atọ guzobere Njụta Okwukwe na Kansụl nke Veronica na 1184, ndị popu ndị ọzọ mekwara ka nhazi na usoro ya zuo okè—ma ọ bụrụ na a pụrụ iji okwu dị otú ahụ kọwaa ihe omume ahụ na-atụ ụjọ. Na narị afọ nke 13, Popu Gregory nke Itoolu guzobere ụlọikpe njụta okwukwe n’akụkụ dị iche iche na Europe.
E guzobere Njụta Okwukwe nke Spain ahụ na-eme ihere na 1478 site n’iwu popu nke Popu Sixtus nke Anọ nyere mgbe ndị eze na-achị achị bụ́ Ferdinand na Isabella rịọrọ maka ya. E guzobere ya iji lụọ ọgụ megide ndị Marrano, bụ́ ndị Juu mere ka a ga-asị na a tọghatawo ha gaa n’okpukpe Katọlik iji gbanarị mkpagbu; ndị Morisco, bụ́ ndị so n’okpukpe Alakụba ndị a tọghatara gaa n’okpukpe Katọlik n’ihi otu ihe ahụ; na ndị Spain jụrụ okwukwe. N’ihi ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè ya, nnukwute onye njụta okwukwe mbụ na Spain, bụ́ Tomás de Torquemada, bụ́ onye friar so n’òtù Dominic, ghọrọ ihe atụ nke ụdị kasị njọ nke Njụta Okwukwe.
Na 1542, Popu Paul nke Atọ guzobere Njụta Okwukwe nke Rom, nke na-achị ụwa nile nke ndị Katọlik. Ọ họpụtara otu ụlọikpe etiti nke nwere ndị kadinal isii, ndị a kpọrọ Ọgbakọ Njụta Okwukwe nke Rom Dị Nsọ na nke Ụwa Nile, bụ́ òtù okpukpe nke ghọrọ “ọchịchị na-emenye ụjọ nke jiri egwu mejupụta Rom dum.” (Dizionario Enciclopedico Italiano) Ogbugbu nke ndị jụrụ okwukwe menyere ala ndị ahụ ụjọ bụ́ ebe usoro ọchịchị ndị Katọlik na-achị.
Ikpe na Auto-da-fé
Akụkọ ihe mere eme na-anwapụta na ndị njụta okwukwe mekpọrọ ndị e boro ebubo ịjụ okwukwe ọnụ iji mee ka ha mee nkwupụta. Ná mgbalị ibelata ikpe ọmụma nke Njụta Okwukwe ahụ, ndị Katọlik na-enye nkọwa edewo na n’oge ahụ, mmekpọ ọnụ bụ ihe a na-ahụkarịkwa n’ụlọikpe ụwa. Ma nke ahụ ọ̀ na-agọpụ omume dị otú ahụ nke ndị ozi sị na ha bụ ndị nnọchiteanya Kraịst? Ọ̀ bụ na ha ekwesịghị igosiworị ọmịiko ahụ Kraịst gosiri n’ebe ndị iro ya nọ? Iji lee nke a anya n’ụzọ ezi uche dị na ya, anyị pụrụ ịtụgharị uche n’otu ajụjụ dị mfe: Kraịst Jisọs ọ̀ gaara ejiworị mmekpọ ọnụ mee ihe n’ahụ ndị nwere echiche dị iche n’ozizi ya? Jisọs sịrị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-emenụ ihe ọma nye ndị na-akpọ unu asị.”—Luk 6:27.
Njụta Okwukwe ahụ emeghị ka onye e boro ebubo nweta ikpe ziri ezi. N’omume, onye njụta okwukwe nwere ike a na-akparaghị ókè. “Inyo mmadụ enyo, ebubo, ọbụna na a sịrị, ezuolara onye njụta okwukwe iji kpọọ mmadụ ịbịa n’ihu ya.” (Enciclopedia Cattolica) Italo Mereu, ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere iwu, na-akwado na ọ bụ usoro ọchịchị ndị Katọlik n’onwe ya chepụtara ma nakwere usoro ikpe ikpe njụta okwukwe, na-agbahapụ usoro ibo ebubo oge ochie nke ndị Rom hiwere. Iwu ndị Rom chọrọ ka onye ebubo nwapụta ebubo ya. Ọ bụrụ na e nwere obi abụọ ọ bụla, ọ ka mma ịtọhapụ kama ịnọ n’ihe ize ndụ nke ịma onye aka ya dị ọcha ikpe. Usoro ọchịchị ndị Katọlik ji echiche bụ na inyo mmadụ enyo pụtara ikpe ọmụma dochie ụkpụrụ a bụ isi, ọ bụkwa onye na-azara ọnụ ya ga-egosipụta na aka ya dị ọcha. A na-ezochi aha ndị na-agba akaebe mmegide (ndị mgbaàmà), onye ọkàiwu mgbachitere, mgbe ọ dị nke e nwere, nọ n’ihe ize ndụ nke inweta aha ọjọọ na ịtụfu ọkwá ya ma ọ bụrụ na o nwee ike ikpepụta onye ahụ jụrụ okwukwe. N’ihi ya, ka Enciclopedia Cattolica na-ekweta, “onye e boro ebubo enweghị nchebe n’ezie. Ihe ọkàiwu ahụ pụrụ ime agwụla ịdụ onye ahụ ikpe mara ọdụ ime nkwupụta!”
Ikpe ahụ na-ejedebe n’auto-da-fé, okwu Portuguese nke pụtara “omume nke okwukwe.” Gịnị ka ọ bụ? Ihe osise nke otu oge na-egosi na ndị na-azara ọnụ ha bụ́ ndị ihe ọjọọ na-echere, ndị e boro ebubo ịjụ okwukwe na-aghọ ndị e ji mere ihe nkiri na-atụ oké ụjọ. Akwụkwọ Dizionario Ecclesiastico na-akọwa auto-da-fé dị ka “ihe omume ihu ọha nke ịdịghachi n’otu nke ndị jụrụ okwukwe a mara ikpe na ndị chegharịrịnụ na-eme” mgbe a gụpụtasịrị amamikpe ha.
A na-eyigharị ọmụma ikpe na ogbugbu nke ndị jụrụ okwukwe ka e wee nwee ike jikọta ọtụtụ n’otu ihe nkiri na-awụ akpata oyi n’ahụ n’ihe dị ka ugbo abụọ n’afọ ma ọ bụ karị. A na-edupụta ogologo ahịrị nke ndị jụrụ okwukwe n’ihu ndị nkiri, bụ́ ndị ji ngwakọta nke ụjọ na mmasị obi ọjọọ na-ekere òkè. A na-eme ka ndị a mara ikpe rịgokwasị n’elu otu ihe mgbakwasị n’etiti ámá buru ibu, a na-agụpụtakwa amamikpe ha n’olu dara ụda. A na-atọhapụ ndị kwugharịrị, ya bụ, jụ ozizi ịjụ okwukwe, pụọ n’ọdachi nke nkewapụ ma maa ha ikpe ntaramahụhụ dị iche iche gụnyere nga mkpụrụ ọka. A na-enyefe ndị na-ekwugharịghị ma mee nkwupụta n’ikpeazụ gwa onye ụkọchukwu n’aka ndị ọchịchị ka a nyagbuo, kwụgbuo, ma ọ bụ bepụ ha isi, nke ịgba ọkụ ga-esochi. A na-agba ndị na-echegharịghị ọkụ ná ndụ. Ogbugbu ahụ n’onwe ya na-ewere ọnọdụ oge ụfọdụ n’ihu, mgbe ihe nkiri ọha na eze ọzọ gasịrị.
Ọrụ nke Njụta Okwukwe ndị Rom bụ nke a na-ezo ezo karịsịa. Ọbụna taa, a dịghị ekwe ka ndị ọkà mmụta chọọ ihe ọmụma n’ebe ndebe ihe mgbe ochie ya. Otú ọ dị, nnyocha e ji ndidi mee emewo ka ọtụtụ ihe odide ikpe ikpe nke ụlọikpe ndị Rom pụta ìhè. Gịnị ka ha na-ekpughe?
Ikpe nke Onye Ụkọchukwu Gbagotere n’Ọkwá
Pietro Carnesecchi, onye a mụrụ na Florence ná mmalite nke narị afọ nke 16, nwere ọganihu dị ngwa n’ọrụ okpukpe ya n’ụlọikpe Popu Clement nke Asaa, bụ́ onye họpụtara ya dị ka odeakwụkwọ ya. Otú ọ dị, ọrụ Carnesecchi bịara ná njedebe mberede mgbe popu ahụ nwụrụ. Ka e mesịrị, ọ bịara mara ndị isi na ndị ụkọchukwu bụ́ ndị, dị ka ya, nakweere ozizi ụfọdụ nke Mgbanwe Ndị Protestant na-akụzi. N’ihi ya, e kpere ya ikpe ugboro atọ. N’ịbụ onye a mara ikpe ọnwụ, e bere ya isi, gbaakwa ozu ya ọkụ.
Ndị na-enye nkọwa kọwara mkpọrọ a tụrụ Carnesecchi dị ka ọ dị ndụ ọnwụ ka mma. Iji mebie nguzogide ya, e mekpọrọ ya ọnụ ma kwụọ ya agụụ. Na September 21, 1567, e mere auto-da-fé ya na-atụ egwu n’ihu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị kadinal nile nọ na Rom. A gụpụtaara Carnesecchi amamikpe ya ka o guzo n’elu ihe mgbakwasị n’ihu ìgwè mmadụ. O jiri okwu a na-ejikarị eme ihe na ekpere ndị a na-ekpegara ndị so n’ụlọikpe ọha, bụ́ ebe a na-achọ inyefe onye ahụ jụrụ okwukwe wee mechie, iji ‘webilata amamikpe ahụ n’ahụ ya ma ghara ịkpasu ọnwụ ma ọ bụ ọbara gabigara ókè.’ Nke a ọ́ bụghị ihu abụọ kasịnụ? Ndị njụta okwukwe ahụ chọrọ ikpochapụ ndị jụrụ okwukwe ma, n’otu mgbe ahụ, na-eme ka a ga-asị na ha na-arịọ ndị ọchịchị ka ha mee ebere, si otú a na-achọ aha ọma ma na-ezere ibu arọ nke ikpe ọmụma ọbara. Mgbe a gụpụtasịrị amamikpe Carnesecchi, e mere ka o yikwasị sanbenito—uwe iru újú odo odo nke e sere obe na-acha ọbara ọbara n’elu ya maka ndị chegharịrị ma ọ bụ nke dị ojii e sere ire ọkụ na ọtụtụ ekwensu n’elu ya maka ndị na-echegharịghị. A na-emezu ihe ahụ e kpere n’ikpe ụbọchị iri n’ihu.
N’ihi gịnị ka e ji bo onye a bụbu odeakwụkwọ popu ebubo ịjụ okwukwe? Ụzọ ndị e si kpee ya ikpe, bụ́ ndị a chọtara ná ngwụsị nke narị afọ gara aga, na-ekpughe na a mara ya ikpe n’ebubo 34 ndị kwekọrọ n’ozizi ndị ọ gbaghara. Ụfọdụ n’ime ha bụ nkụzi pọgatrị, ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ndị ụkọchukwu na ndị nọn, imepụta ahụ na ọbara Kraịst, ịkwọ aka n’isi, nkwupụta, mgbochi ihe oriri, mgbaghara mmehie, na ikpegara “ndị senti” ekpere. Ebubo nke asatọ na-adọrọ mmasị karịsịa. (Lee igbe, na peji nke 19.) Site n’ịma ndị nakweere nanị “okwu Chineke ndị e kwupụtara n’Akwụkwọ Nsọ” dị ka ihe ndabere nke nkwenkwe ikpe ọnwụ, Njụta Okwukwe gosiri n’ụzọ doro anya na Chọọchị Katọlik adịghị ewere Bible Nsọ dị ka nanị akwụkwọ sitere n’ike mmụọ nsọ. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ n’ime ozizi chọọchị ahụ dabeere, ọ bụghị n’Akwụkwọ Nsọ, kama n’ọdịnala chọọchị.
Ogbugbu nke Nwa Akwụkwọ Na-eto Eto
Akụkọ ndụ dị mkpirikpi ma na-emetụ n’ahụ nke Pomponio Algieri, onye a mụrụ na nso nso Naples na 1531, abụghị nke a ma ama, ma ọ pụtawo ìhè site n’oge dị anya gara aga, n’ihi nnyocha ịdị uchu nke akụkọ ihe mere mere nke ọtụtụ ndị ọkà mmụta. Site ná mmekọrịta ya na ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ si n’akụkụ dị iche iche nke Europe mgbe ọ na-agụ akwụkwọ na Mahadum Padua, e mere ka Algieri bịa mata ndị a sị na ha jụrụ okwukwe na ozizi ndị nke Mgbanwe Ndị Protestant. Mmasị o nwere n’Akwụkwọ Nsọ toro.
Ọ malitere ikwere na nanị Bible sitere n’ike mmụọ nsọ, n’ihi ya kwa, ọ jụrụ ọtụtụ ozizi ndị Katọlik, dị ka ime nkwupụta, ịkwọ aka n’isi, pọgatrị, imepụta ahụ na ọbara Kraịst, na nrịọchitere nke “ndị senti,” tinyere nkụzi bụ na popu bụ onye nnọchiteanya Kraịst.
Njụta Okwukwe jidere Algieri ma kpee ya ikpe na Padua. Ọ gwara ndị njụta okwukwe ya, sị: “Eji m obi m na-alaghachi n’ụlọ mkpọrọ, ikekwe ọbụna ruo ọnwụ m ma ọ bụrụ na ọ bụ uche Chineke. Site n’ebube ya, Chineke ga-enyekwu onye ọ bụla nghọta. M ga-eji obi ọcha die mmekpọ ọnụ ọ bụla n’ihi na Kraịst, Onye Nkasi Obi zuru okè nke mkpụrụ obi a na-eti ihe otiti, onye bụ nghọta na ezi ìhè m, nwere ike iwepụ ọchịchịrị nile.” Mgbe ọ gasịrị, Njụta Okwukwe nke Rom nwetara ikike ikpe ya ikpe ma maa ya ikpe ọnwụ.
Algieri dị afọ 25 mgbe ọ nwụrụ. Ụbọchị e gburu ya na Rom, ọ jụrụ ime nkwupụta ma ọ bụ ịnara Oriri Nsọ. Ihe e ji gbuo ya bụ nke obi ọjọọ ọbụna karịa otú ọ na-adị. E jighị ùkwù nkụ gbaa ya ọkụ. Kama nke ahụ, a dọkwasịrị otu nnukwute ite nke jupụtara n’ihe ndị na-ere ọkụ—mmanụ, pitch, na resin—n’elu ihe mgbakwasị ahụ n’ebe ìgwè mmadụ ga-ahụzu ya. N’ịbụ onye e kere agbụ́, a sụnyere nwa okorobịa ahụ n’ime ya wee mụnye ihe ndị dị n’ime ya ọkụ. E ji nwayọọ nwayọọ gbaa ya ọkụ ná ndụ.
Ihe Ọzọ Wetara Oké Ikpe Ọmụma
Carnesecchi, Algieri, na ndị ọzọ Njụta Okwukwe gburu nwere nghọta na-ezughị ezu nke Akwụkwọ Nsọ. Ihe ọmụma ka “ga-abakwa ụba” na “mgbe ọgwụgwụ” nke usoro ihe a. Ka o sina dị, ha dị njikere ịnwụ n’ihi ntakịrị ‘ezi ihe ọmụma’ ha nwere ike inweta site n’Okwu Chineke.—Daniel 12:4.
Ọbụna ndị Protestant, tinyere ụfọdụ Ndị Mgbanwe ha, gburu ndị na-ekwenyeghị site n’ịgba ha ọkụ n’elu osisi ma ọ bụ mee ka e gbuo ndị Katọlik site n’ichigharịkwuru ndị ọchịchị ụwa. Dị ka ihe atụ, Calvin, ọ bụ ezie na ọ ka nwee mmasị ná mbepụ isi, mere ka a gbaa Michael Servetus ọkụ ná ndụ dị ka onye jụrụ okwukwe Atọ n’Ime Otu.
Eziokwu ahụ bụ na mkpagbu na ogbugbu nke ndị jụrụ okwukwe bụ ihe zuru ndị Katọlik na ndị Protestant ọnụ adịghị eme ma ọlị ka omume ndị ahụ ghara ịbụ ihe ọjọọ. Ma oké ụta ọzọ dịịrị usoro ọchịchị okpukpe—maka ịzọrọ inwe ngọpụ Akwụkwọ Nsọ maka ogbugbu ndị ahụ nakwa n’ihi imezi ka a ga-asị na Chineke n’onwe ya nyere iwu ka e mee ihe ndị ahụ. Nke a ọ́ dịghị ewetara aha Chineke ụta? Ọtụtụ ndị ọkà mmụta na-akwado na Augustine, “Nna Chọọchị” a ma ama nke Katọlik, bụ onye mbụ kwadoro ụkpụrụ nke mmanye “okpukpe,” ya bụ, iji ike lụsoo ịjụ okwukwe ọgụ. Ná mgbalị iji Bible gọpụ omume ahụ, o hotara okwu ndị dị n’ilu Jisọs ahụ a na-achọta na Luk 14:16-24: “Rụgidekwa mmadụ ka ha bata.” N’ụzọ doro anya, okwu ndị a, ndị Augustine hịgharịrị, gosiri ile ọbịa mmesapụ aka, ọ bụghị mmanye obi ọjọọ.
E kwesịrị ịrịba ama na ọbụna mgbe Njụta Okwukwe ahụ dị irè, ndị nkwado nke ikwe ibe nọrọ nke okpukpe rụrụ ụka megide mkpagbu nke ndị jụrụ okwukwe, na-ehota ilu nke ọka na ata. (Matiu 13:24-30, 36-43) Otu n’ime ha bụ Desiderius Erasmus, onye Rotterdam, onye kwuru na Chineke, Onye Nwe ubi ahụ, chọrọ ka e kwe ka ndị jụrụ okwukwe, bụ́ ata ahụ, nọrọ. N’aka nke ọzọ, Martin Luther, kpalitere ime ihe ike megide ndị nọ n’ọkwá dị ala na-ekwenyeghị, e gbukwara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100,000.
N’ịmata oké ụta dịịrị okpukpe ndị nke Krisendọm bụ́ ndị kwadoro mkpagbu nke ndị a sị na ha jụrụ okwukwe, gịnị ka e kwesịrị ịkpali anyị ime? N’ezie anyị kwesịrị inwe mmasị ịchọ ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke. Jisọs kwuru na akara nke ezi onye Kraịst ga-abụ ịhụnanya ya maka Chineke na onye agbata obi—ịhụnanya nke o doro anya na ọ na-agaghị enye ohere maka ime ihe ike.—Matiu 22:37-40; Jọn 13:34, 35; 17:3.
[Igbe dị na peeji nke 19]
Ebubo Ụfọdụ A Mara Carnesecchi Ikpe na Ha
8. “[Ị nọgidewo na-ekwu] na ọ dịghị ihe ọzọ e kwesịrị ikwere ma e wezụga okwu Chineke nke e kwupụtara n’Akwụkwọ Nsọ.”
12. “[I kwenyewo] na ime nkwupụta nke sakrament abụghị de jure Divino [dị ka iwu Chineke si dị], na ọ bụghị Kraịst guzobere ya ma ọ bụ bụrụ nke Akwụkwọ Nsọ kwadoro, na ụdị nkwupụta ọ bụla adịghịkwa mkpa ma e wezụga nke e kwupụtaara Chineke n’onwe ya.”
15. “I mewo ka e nwee obi abụọ banyere pọgatrị.”
16. “I werewo akwụkwọ Maccabees, bụ́ nke na-ekwu banyere ikpere ndị nwụrụ anwụ ekpere, ịbụ nke apọkrịfa.”
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 16]
The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck