Ndị Cathar—Hà Bụ Ndị Kraịst E Gburu Maka Okwukwe Ha?
“GBUO ha nile; Chineke ga-amata ndị nke Ya.” N’ụbọchị oge okpomọkụ ahụ nke afọ 1209, e gbukpọrọ ọtụtụ ndị bi na Béziers, ná ndịda France. Onye mọnk bụ́ Arnold Amalric, bụ́ onye a họpụtara dị ka onye ozi nke popu nke bụ onye isi ndị agha ntụte nke Katọlik, emeghị ebere ọ bụla. Mgbe ndị ikom ya jụrụ otú ha ga-esi amata ndị Katọlik na ndị jụrụ okwukwe, a kọrọ na o nyere nzaghachi ahụ a ma ama nke e hotara n’elu. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ ndị Katọlik na-agwagbu ya ka ọ bụrụ: “Unu echegbula onwe unu. Ekwere m na nanị ole na ole ka a ga-atọghata.” N’agbanyeghị ihe bụ azịza ya kpọmkwem, ihe si na nke ahụ pụta bụ mgbukpọ nke ọ dịkarịa ala 20,000 ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka n’aka nke ihe dị ka 300,000 ndị agha ntụte, nke ndị ụkọchukwu nwere ọkwá ukwu nke Katọlik Chọọchị duru.
Gịnị kpatara mgbukpọ a? Ọ bụ nnọọ mmalite nke Agha Ntụte ndị Albigense nke Pope Innocent nke Atọ lụrụ megide ndị ahụ a kpọrọ ndị jụrụ okwukwe n’ógbè nke Languedoc, n’etiti ebe ndịda nke France. Tupu ya ebie ihe dị ka 20 afọ n’ihu, eleghị anya otu nde mmadụ—Ndị Cathar, ndị òtù Waldo, na ọbụna ọtụtụ ndị Katọlik—nwụrụ.
Enweghị Nkwekọrịta Okpukpe na Europe Mgbe Ochie
Uto gara ngwa ngwa nke azụmahịa na narị afọ nke 11 O.A., wetara mgbanwe ndị dị ukwuu n’akụkụ ọha mmadụ na akụ̀ na ụba nke Europe mgbe ochie. Obodo dị iche iche bilitere ịbụ ebe ọnụ ọgụgụ na-eto eto nke ndị ọrụ aka na ndị ahịa bi. Nke a wetara ohere maka echiche ndị ọhụrụ. Enweghị nkwekọrịta okpukpe gbanyere mkpọrọgwụ na Languedoc, bụ́ ebe ikwe ka ibe nọrọ dị ịrịba ama na oké mmepeanya nwere ọganihu nke a na-enwetụbeghị ebe ọzọ na Europe. Obodo ukwu nke Toulouse na Languedoc bụ isi obodo ukwu nke atọ kasị baa ọgaranya na Europe. Ọ bụ ụwa ebe ndị na-arọ abụ uri jupụtara, ndị okwu uri ụfọdụ n’ime ha rụtụrụ aka n’isiokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe.
Ịkọwa ọnọdụ okpukpe dị na narị afọ nke 11 na 12, akwụkwọ bụ́ Revue d’histoire et de philosophie religieuses na-asị: “Na narị afọ nke 12, dịkwa ka narị afọ nke bu ya ụzọ, a nọgidere na-enyo omume nke ndị ụkọchukwu, ụba ha, ịbụ ndị a pụrụ iji ego zụta, na omume ha rụrụ arụ enyo, ma ọ bụ n’ụzọ bụ isi akụ̀ na ụba ha na ike ha, njikọ aka nzuzo nke ha na ndị ọchịchị, na ha imezu nzube ha ka a katọrọ.”
Ndị Nkwusa Na-ejegharị Ejegharị
Ọbụna Pope Innocent nke Atọ matara na omume rụrụ arụ jupụtara ebe nile n’ime chọọchị ka ụta dịịrị maka ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ndị nkwusa na-ejegharị ejegharị nupụrụ isi na Europe, karịsịa n’ebe ndịda France na n’ebe ugwu Itali. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị a bụcha ndị Cathar ma ọ bụ ndị òtù Waldo. Ọ baara ndị ụkọchukwu mba maka ịghara ịkụziri ndị mmadụ ihe, na-asị: “Ụmụ ahụ na-achọ iri achịcha nke ọ na-adịghị emetụ unu n’ahụ ịnyawara ha.” Ma, kama ịkwalite nkụzi Bible maka ndị ahụ, Innocent zọọrọ na “nke ahụ bụ ịdị omimi nke Akwụkwọ Nsọ Chineke, nke na ọ bụghị nanị ndị nkịtị na ndị na-amaghị akwụkwọ, kama ọbụnadị ndị dị nkọ ma gụọ akwụkwọ, etoruchaghị etoru ịgbalị ịghọta ya.” A machibidoro mmadụ nile ịgụ Bible e wezụga ndị ụkọchukwu, kweekwa ka a gụọ ya nanị na Latin.
Iji lusoo nkwusa njegharị nke ndị ahụ nupụrụ isi ọgụ, popu kwadoro nguzobe nke Òtù Ndị Nkwusa nke Ndị Brọda, ma ọ bụ ndị òtù Dominic. N’ụzọ dị iche na ndị ụkọchukwu bara ọgaranya nke Katọlik, ndị brọda a ga-abụ ndị nkwusa na-ejegharị ejegharị e nyere ọrụ ichebe ọdịnala Katọlik megide “ndị jụrụ okwukwe” ahụ n’ebe ndịda France. Popu zipụkwara ndị nnọchianya nke popu isoro ndị Cathar tụgharịa uche ma gbalịa iweghachi ha n’ime ogige Katọlik. Ebe mgbalị ndị a dara, e gbuokwa otu n’ime ndị ozi ya, dị ka e chere site n’aka otu onye jụrụ okwukwe, Innocent nke Atọ nyere iwu maka Agha Ntụte nke ndị Albigense na 1209. Albi bụ otu n’ime obodo ebe ndị Cathar bara ụba karịsịa, ya mere ndị dere ihe e mere na chọọchị zoro aka n’ebe ndị Cathar nọ dị ka ndị Albingense (asụsụ French, Albigeois) ma jiri okwu ahụ mee ihe banyere ‘ndị nile jụrụ okwukwe’ n’ógbè ahụ, tinyere ndị òtù Waldo. (Lee igbe dị n’okpuru.)
Olee Ndị Bụ Ndị Cathar?
Okwu ahụ bụ́ “cathar” sitere n’okwu Grik bụ́ ka·tha·rosʹ, nke pụtara “ịdị ọcha.” Site na narị afọ nke 11 ruo nke 14, okpukpe Cathar gbasara karịsịa na Lombardy, ebe ugwu nke Itali, nakwa na Languedoc. Nkwenkwe ndị Cathar bụ ngwakọta nke ozizi dualism na gnosticism nke ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ a tụbatara ma eleghị anya site n’aka ndị ahịa na ndị ozi ala ọzọ si mba ọzọ. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-akọwa ozizi dualism nke ndị Cathar dị ka ikwere “ụkpụrụ abụọ: otu nke ọma, na-eduzi ihe nile bụ ihe ime mmụọ, nke ọzọ bụ nke ọjọọ, na-ahụ maka ụwa a na-ahụ anya, tinyere ahụ mmadụ.” Ndị Cathar kweere na Setan kere ụwa a na-ahụ anya, bụ́ nke a mara ikpe mbibi nke a na-agaghị akachapụ. Olileanya ha bụ ịlanarị site n’ụwa ọjọọ ahụ a na-ahụ anya.
E kewara ndị Cathar n’òtù abụọ, ndị zuru okè na ndị kwere ekwe. A na-eji ememe nke baptism ime mmụọ, nke a na-akpọ consolamentum webata ndị zuru okè n’òtù ahụ. A na-eme nke a site n’ibikwasị aka, mgbe otu afọ nke nnwale gasịrị. E chere na ememe ahụ na-atọhapụ onye ahụ site n’ịchịisi Setan, mee ka ọ dị ọcha site ná mmehie nile, ma nye ya mmụọ nsọ. Nke a welitere aha ahụ bụ́ “izu okè,” nke e ji eme ihe banyere ndị dị nnọọ nta gụrụ akwụkwọ, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị ozi nye ndị kwere ekwe. Ndị ahụ zuru okè na-aṅụ iyi nke ịnapụ onwe onye ihe, ịdị ọcha, na ịda ogbenye. Ọ bụrụ na ọ lụwo di ma ọ bụ nwunye, onye zuru okè aghaghị ịhapụ di ma ọ bụ nwunye ya, ebe ndị Cathar kweere na inwe mmekọahụ bụ mmehie mbụ ahụ.
Ndị kwere ekwe bụ ndị, ọ bụ ezie na ha adịghị ebi ndụ ịta onwe ha ahụhụ, ha nakwerekwaararị nkụzi ndị Cathar. Site n’igbu ikpere n’ala ná nsọpụrụ nye ndị zuru okè n’ememe okpukpe a na-akpọ melioramentum, onye ahụ kwere ekwe na-arịọ maka mgbaghara na ngọzi. Iji nyere onwe ha aka ibi ndụ kwesịrị ekwesị, ndị kwere ekwe na-esoro ndị zuru okè abanye na convenenza, ma ọ bụ nkwekọrịta, na-enye ohere maka ime baptism ime mmụọ mgbe a nọ n’ọnụ ọnwụ, ma ọ bụ consolamentum.
Omume Ha n’Ebe Bible Dị
Ọ bụ ezie na ndị Cathar na-ehota Bible n’ụzọ dị ukwuu, ha lere ya anya n’ụzọ bụ isi dị ka isi iyi nke akụkọ na-emeghị eme na akụkọ ifo. Ha chere na akụkụ ka ukwuu nke Akwụkwọ Nsọ Hibru sitere n’aka Ekwensu. Ha jiri akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik mee ihe, dị ka akụkụ ndị na-enye ọdịiche dị n’etiti anụ ahụ na mmụọ, iji kwadoo nkà ihe ọmụma nke ozizi dualism ha. N’Ekpere Onyenwe Anyị, ha na-ekpe maka “nri karịrị nke a na-ahụ anya” (nke pụtara “nri ime mmụọ”) kama ịbụ ‘nri anyị taa,’ ebe nri a na-ahụ anya bụ ihe ọjọọ a na-apụghị izere ezere n’anya ha.
Ọtụtụ nkụzi ndị Cathar na-ekwu ihe dị iche na Bible kpọmkwem. Dị ka ihe atụ, ha kweere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na ịlọ ụwa. (Tụlee Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4, 20.) Ha dabekwaara nkwenkwe ha n’ihe odide aprokrịfa. Ka o sina dị, ebe ọ bụ na ndị Cathar sụgharịrị akụkụ ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ gaa n’ọtụtụ asụsụ obodo, ruo n’ókè ụfọdụ, ha mere ka Bible bụrụ akwụkwọ a maara nke ọma karị n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya.
Ha Abụghị Ndị Kraịst
Ndị zuru okè lere onwe ha anya dị ka ndị o ruuru ịnọchi ndị ozi, n’ihi nke ahụkwa, kpọọ onwe ha “ndị Kraịst,” na-emesi nke a ike site n’ịgbakwụnye “ezi” ma ọ bụ “ọma.” Otú ọ dị, n’eziokwu, ọtụtụ nkwenkwe nke ndị Cathar bụ ihe ọhụrụ nye Iso Ụzọ Kraịst. Ọ bụ ezie na ndị Cathar matara Jisọs dị ka Ọkpara Chineke, ha ekweghị na ọ bịara n’anụ ahụ na n’àjà mgbapụta ya. N’ịkọwahie nkatọ Bible katọrọ anụ ahụ na ụwa, ha lere ihe nile anya dị ka ihe sitere n’ajọ ihe. Ya mere ha nọgidere na-ekwusi ike na Jisọs pụrụ nanị inweworị ahụ mmụọ nakwa na mgbe ọ nọ n’elu ala o yiri nanị ka o nwere ahụ anụ ahụ. Dị ka ndị narị afọ mbụ dapụrụ n’ezi ofufe, ndị Cathar bụcha ‘ndị na-adịghị ekwupụta na Jisọs Kraịst bịara n’anụ ahụ.’—2 Jọn 7.
N’akwụkwọ ya bụ́ Medieval Heresy, M. D. Lambert na-ede na okpukpe Cathar “jiri ịta onwe onye ahụhụ nke a na-aghaghị ime dochie ụkpụrụ omume ọma ndị Kraịst, . . . wepụ mgbapụta site n’ịjụ ikwere ike nzọpụta nke [ọnwụ Kraịst].” Ọ na-eche na “ezi mmekọrịta nke ndị zuru okè bụ ọrụ nke ndị nkụzi na-ata onwe ha ahụhụ nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ, ndị bonze na ndị fakir nke China ma ọ bụ India, nkà nke ihe omimi Orphieus, ma ọ bụ ndị nkụzi nke ozizi Gnosticism.” Na nkwenkwe ndị Cathar, nzọpụta na-adabere, ọ bụghị n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, kama na consolamentum ahụ, ma ọ bụ baptism n’ime mmụọ nsọ. Nye ndị e si otú ahụ mee ka ha dị ọcha, ọnwụ ga-atọhapụ ha site n’ihe a na-ahụ anya.
Agha Ntụte Na-adịghị Nsọ
Ụzọ ndụ nke ndị Cathar dọọrọ mmasị nke ndị nkịtị, bụ́ ndị ịna ihe nrigbu na omume rụrụ arụ gbasazuru ebe nile nke ndị ụkọchukwu gwụworo ike. Ndị ahụ zuru okè jikọrọ Chọọchị Katọlik na usoro ọchịchị ya na “ụlọ nzukọ ahụ nke Setan” na “nne nke ndị na-akwa iko” nke Mkpughe 3:9 na 17:5. Okpukpe Cathar nọ na-aga n’ihu, na-anọchikwa chọọchị ahụ dị n’ebe ndịda France. Mmeghachi omume nke Pope Innocent nke Atọ bụ ịmalite na iji ego kwadoo ihe ahụ a kpọrọ Agha Ntụte ndị Albigense, bụ́ agha ntụte nke mbụ a haziri n’ime Krisendọm megide ndị zọọrọ ịbụ ndị Kraịst.
Site n’akwụkwọ ozi na ndị ozi, popu ahụ yiri ndị eze Katọlik, ndị isi, ndị duke, ndị knight nke Europe egwu. O kwere ndị nile ga-alụ ọgụ ikpochapụ ịjụ okwukwe ahụ “site n’ụzọ ọ bụla” nkwa mgbaghara mmehie na akụ̀ na ụba nke Languedoc. E legharaghị ọkpụkpọ òkù ya anya. N’ịbụ nke ndị ụkọchukwu na ndị mọnk Katọlik gbagotere n’ọkwá duru, ìgwè gwara ọgwa nke ndị agha ntụte sitere n’ebe ugwu France, Flanders, na Germany tinyere isi ná ndịda gbada Ndagwurugwu Rhône.
Mbibi nke Béziers kara akara mmalite nke agha mmeri nke bibiri Languedoc n’oké mbibi nke ọkụ na ọbara. Ndị agha ntụte ahụ akpịrị ọbara na-akpọ nkụ merichara Albi, Carcassonne, Castres, Foix, Narbonne, Termes, na Toulouse. N’ebe ndị ahụ e wusiri ike nke Cathar dị ka Cassès, Minerve, na Lavaur, a gbachara ọtụtụ narị nke ndị ahụ zuru okè ọkụ n’elu osisi. Dị ka onye mọnk dere ihe merenụ bụ́ Pierre des Vaux-de-Cernay si kwuo, ndị agha ntụte ahụ ‘ji ọṅụ sitere ha n’obi gbaa ndị ahụ zuru okè ọkụ ná ndụ.’ Na 1229, mgbe 20 afọ nke ọgba aghara na mbibi gasịrị, Languedoc batara n’okpuru Ọchịchị ndị France. Ma ogbugbu ahụ agwụbeghị.
Njụta Okwukwe ahụ Etie Ihe Otiti Na-akpata Ọnwụ
Na 1231, Pope Gregory nke Itoolu guzobere Njụta Okwukwe nke popu iji kwadoo ịlụ agha ahụ.a Usoro Njụta Okwukwe ahụ na mbụ dabeere ná nkatọ na mmanye, e mesịakwa, n’usoro ịta ahụhụ. Nzube ya bụ ikpochapụ ihe mma agha na-enweghị ike ibibi. Ndị ikpe nke Njụta Okwukwe—ndị bụ́ n’ụzọ ka ukwuu ndị brọda nke Dominic na Francis—bụ́ nanị popu ka ha na-aṅa ntị. Igbu mmadụ site n’ịgba ọkụ bụ ntaramahụhụ a kwadoro n’iwu maka ịjụ okwukwe. Nke ahụ bụ ịnụbiga ọkụ n’obi ókè na mmekpọ ọnụ nke ndị Njụta Okwukwe ahụ nke na nnupụisi tiwapụrụ, gụnyere ebe ndị ọzọ, n’Albi na Toulouse. N’Avignonet, e gburu ndị òtù nile nke òtù ikpe Njụta Okwukwe,
Na 1244 nchịli aka elu nke ebe ugwu siri ike nke Montségur, bụ́ ebe mgbaba ikpeazụ nke ọtụtụ ndị ahụ zuru okè, bụ ebe ọnwụ nọrọ gbuo okpukpe Cathar. Ihe dị ka 200 ndị ikom na ndị inyom nwụrụ site n’ịbụ ndị a gbara ọtụtụ n’ime ha ọkụ n’elu osisi. Ruo ọtụtụ afọ, Njụta Okwukwe ahụ gbuchapụrụ ndị Cathar fọdụrụnụ. A kọrọ na a gbara onye Cathar ikpeazụ ọkụ n’elu osisi na Languedoc na 1330. Akwụkwọ bụ́ Medieval Heresy na-asị: “Ọdịda nke okpukpe Cathar bụ ihe kasịnụ nke Njụta Okwukwe ahụ rụzuru.”
Ndị Cathar abụtụghị nnọọ ezi ndị Kraịst. Ma nkatọ ha katọrọ Chọọchị Katọlik ò mere ka mkpochapụ obi ọjọọ e kpochapuṛụ ha site n’aka ndị ahụ a kpọrọ ndị Kraịst zie ezie? Ndị Katọlik kpagburu ma gbuo ha asọpụrụghị Chineke na Kraịst, ha anọchiteghịkwa anya ezi Iso Ụzọ Kraịst n’ụzọ ziri ezi ka ha gburu ma taa ọtụtụ iri puku nke ndị nupụrụ isi ahụhụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ihe ọmụma sakwuru mbara banyere Njụta Okwukwe nke mgbe ochie, lee “Njụta Okwukwe ahụ Na-atụ Egwu” na Teta! (Bekee) nke April 22, 1986, nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania bipụtara, peji nke 20-23.
[Igbe dị na peeji nke 28]
NDỊ ÒTÙ WALDO
Ka ọ na-aga ná ngwụsị nke narị afọ nke 12 O.A., Pierre Valdès, ma ọ bụ Peter Waldo, onye azụmahia bara ọgaranya nke Lyons, jiri ego kwadoo nsụgharị ndị mbụ nke ụfọdụ akụkụ nke Bible gaa n’asụsụ obodo dị iche iche nke Provençal, bụ́ asụsụ obodo a na-asụ n’ebe ndịda na n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke France. Dị ka onye Katọlik nwere obi eziokwu, ọ hapụrụ azụmahịa ya ma rara onwe ya nye n’ikwusa Oziọma ahụ. N’ịbụ ndị kpọrọ omume rụrụ arụ nke òtù ndị ụkọchukwu asị, ọtụtụ ndị Katọlik ndị ọzọ sooro ya ma ghọọ ndị nkwusa na-ejegharị ejegharị.
N’oge na-adịghị anya Waldo zutere ibu agha site n’aka ndị ụkọchukwu ógbè ya, bụ́ ndị rụgidere popu ka ọ machibido ịgba àmà ihu ọha ya iwu. Ihe a kọrọ ọ zaghachiri bụ: “Anyị kwesịrị irubere Chineke isi karịa mmadụ.” (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 5:29.) N’ihi nnọgidesi ike ya, a chụpụrụ Waldo na chọọchị. Ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị a kpọrọ ndị òtù Waldo, ma ọ bụ Ndị Ogbenye nke Lyons, ji ịnụ ọkụ n’obi gbalịa ịgbaso ihe nlereanya ya, na-adị abụọ abụọ na-eme nkwusa n’ebe obibi nke ndị mmadụ. Nke a rụpụtara mgbasa dị ngwa nke ozizi ha n’ebe nile nke ebe ndịda, ebe ọwụwa anyanwụ, na akụkụ ụfọdụ nke ebe ugwu France, nakwa ebe ugwu Itali.
Karịsịa, ha kwadoro mbidoghachi nke nkwenkwe na omume nke Iso Ụzọ Kraịst oge mbụ. Ha kwugidere, gụnyere ozizi ndị ọzọ, pọgatri, ekpere maka ndị nwụrụ anwụ, ofufe Meri, ikpegara “ndị saint” ekpere, ime ọpịpịa, ịkpọ isiala nye obe, Eucharist, na baptism ụmụ ọhụrụ.b
Nkụzi nke ndị òtù Waldo dị nnọọ iche na nkụzi dualism na-abụghị nke ndị Kraịst nke ndị Cathar, bụ́ ndị a na-eche na ha bụ ọtụtụ mgbe. Nghọtahie nke a bụ n’ụzọ bụ isi n’ihi na ndị Katọlik na-agbaso echiche ndị ọzọ mgba bụ́ ndị maara ụma gbalịa ijikọ nkwusa ndị òtù Waldo na nke ndị Albigense, ma ọ bụ ndị Cathar.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
b Maka inwetakwu ihe ọmụma banyere ndị òtù Waldo, lee isiokwu bụ́ “Ndị Òtù Waldo—Ndị Jụrụ Okwukwe Ka Hà Bụ Ndị Na-achọ Eziokwu” n’Ụlọ Nche (Bekee) nke August 1, 1981, peji nke 12-15.
[Foto dị na peeji nke 29]
Puku asaa nwụrụ n’ime Chọọchị nke St. Mary Magdalene na Béziers, bụ́ ebe ndị agha ntụte gburu 20,000 ndị ikom, ndị inyom na ụmụaka