Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 10/1 p. 24-25
  • Inwupụta Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè n’Ime Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inwupụta Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè n’Ime Ụwa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Ụlọ Akwụkwọ Ọsụ Ụzọ ná mbaCentral African Republic
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 10/1 p. 24-25

Inwupụta Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè n’Ime Ụwa

N’IME ụwa e metọrọ emetọ site n’omume na-ezighị ezi na nke rụrụ arụ, ezi ndị Kraịst n’ụwa nile ga-abụ isi iyi nke ìhè. Ha ga-abụ ndị na-enye ìhè n’ụwa gbara ọchịchịrị. (Ndị Filipaị 2:15) Ọtụtụ puku dị njikere ime nke a dị ka ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị nkwusa oge nile. Ọnụ ọgụgụ buru ibu n’ime ha etinyewo ogologo afọ n’ije ozi nke a, ha abụwo ndị a kwụghachiri ụgwọ site n’ịhụ ka ụdị mmadụ dị iche iche na-eme mgbanwe ná ndụ ha ịghọ ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst.—Matiu 28:19.

Iji gbaa ndị ọsụ ụzọ a ume ịnọgide n’ozi nke a dị nsọ na imeziwanye nkà izi ha, Ndịàmà Jehova ahaziwo Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ. Ọ bụ ọmụmụ ihe ụbọchị iri dabeere na Bible nke a haziri iji nyere ndị ọsụ ụzọ aka n’akụkụ atọ: isoro Jehova na-eje ije dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst; ijupụta n’ịhụnanya maka òtù ụmụnna dum; inwupụta dị ka ndị na-enye ìhè n’ime ụwa.

Ụlọ Akwụkwọ Ọsụ Ụzọ ná mbaCentral African Republic

Na Bangui, bụ́ isi obodo nke mba Central African Republic, 48 ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi 2 zukọrọ n’ọnwa August nke afọ 1991. Ụmụ akwụkwọ ndị ahụ gaje ịnata ntụziaka na aro ndị bara uru maka ọrụ ha. Gịnị bụ ihe na-akpali mmasị banyere klasị nke Bangui ahụ?

Na nke mbụ, 21 n’ime ụmụ akwụkwọ ndị ahụ ka na-aga n’ụlọ akwụkwọ ụwa. Mgbe ha ka na-aga akwụkwọ, ha nwere ike iwepụta ohere maka ije ozi ọsụ ụzọ oge nile. Ha ji ọnwa ha nọ n’ezumike, ngwụsị izu ha nwere ohere, na oge ehihie mee ihe ime nkwusa na izi ihe.

Ndị a na-eto eto ahụwo ịdị mkpa nke ijere Onye Okike ha ozi ugbu a. (Eklisiastis 12:1; tụlee 1 Ndị Kọrint 7:29.) Ihe e kwesịrị ịrịba ama bụ eziokwu ahụ bụ na 12 n’ime ha nwere ndị nne na nna na-ekweghị ekwe. N’ebe obibi ha, nanị ha nọ n’eziokwu. Ụmụ nwoke abụọ na-eto eto, bụ́ ndị otu nne ji, bụ ndị nna ha manyere ka ha pụọ n’ụlọ ya n’ihi okwukwe ha. Otu ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ nọ n’ọgbakọ ha kpọbatara ụmụ okorobịa abụọ n’ebe obibi ha.

Ọnọdụ ahụ dị iche nye Michée na Sulamithe Kaleb. Ha abụọ bụ ndị ọsụ ụzọ, ha na-agakwa akwụkwọ, ma ndị mụrụ ha bụ Ndịàmà Jehova. N’ezie, nna ha bụ nwa akwụkwọ n’otu klasị ahụ!

Ọgbakọ ndị dị na Bangui kekwaara òkè n’ụlọ akwụkwọ ahụ, kama ọ bụ n’ụzọ dị iche. Ha hụrụ maka mkpa ihe onwunwe, dị ka ihe oriri. E nyere onyinye ego, tinyere ọkụkọ, shụga, osikapa, na ụtara akpụ iji nye ndị klasị ahụ ihe oriri.

Ọgbakọ ndị dị nso haziri ndị na-esi nri iji kwadebe nri dị mfe ma na-atọ ụtọ. A ma mba Central African Republic ama maka ngunza, ihe oriri nke na-atọ onye ọ bụla ụtọ. Gịnị ka e ji esi ya? Akwụkwọ akpụ, mmanụ nri, ịyabasị, mkpụrụ garlic, na bọta ahụekere buru ibu, nakwa inwe ndidi ka o ghee nke ọma. Ìgwè ọ bụla na-esi nri nwere ụzọ nke ya pụrụ iche isi kwadebe ya. Ọ gara nnọọ nke ọma; ọ dịghị onye ọ na-etoghị akpịrị.

E wezụga na Bangui, e nwere klasị abụọ ndị ọzọ, otu na Bouar, ọzọkwa na Bambari, na-eweta ngụkọta ọnụ ọgụgụ nke ụmụ akwụkwọ ahụ na 68. N’ime afọ abụọ gara aga, mba Central African Republic ahụwo ịrị elu n’ọnụ ọgụgụ nke ndị ọsụ ụzọ. N’ọnwa January 1992, e nwere 149 ndị ọsụ ụzọ oge nile na 17 ndị ọsụ pụrụ iche tinyere 78 ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Nke a akpatawo ịrị elu n’ọrụ a na-arụ ná mba ahụ nke nwere ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu ná ndị nkwusa, hour, nletaghachi, na ọmụmụ Bible. Mgbe e nwekwuru ndị ọrụ, owuwe ihe ubi na-amụba.—Aịsaịa 60:21, 22; Matiu 9:37, 38.

Anyị na-ekele Jehova Chineke maka ndokwa ndị a nakwa nzukọ elu ala ya maka ime ndokwa inwe klasị ndị a. Ha na-enyere ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi aka inwupụta dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa nke a gbara ọchịchịrị.

[Foto dị na peeji nke 24]

Iri ụmụ akwụkwọ abụọ na otu nke Ụlọ Akwụkwọ Ọsụ Ụzọ bụ́ ndị ka nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elu

[Foto dị na peeji nke 25]

Ụmụ okorobịa abụọ ndị a pụrụn’ebe obibi ha n’ihi eziokwu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya