Inye Nghọta na Namibia
N’ASỤSỤ ole ka ị nụworo okwu ahụ bụ “Adịghị m aghọta”? “Hi nokuzuva,” ka nwanyị Herero ahụ sịrị, na-eyi uwe ọdịnala ogologo nakwa ịchafụ isi e kere dị ka mpi. “Nghi udite ko,” ka nwa agbọghọ Kwanyama ahụ ji ọchị zaghachi. “Kandi uvite ko,” ka onye Ndonga bi n’ime ime obodo zara, na-akpọ n’ubu. “Kapi na kuzuvha,” ka onye Kwangali na-azụ ewu kwuru.
Ndị a nile na-ekwu, “Adịghị m aghọta.” Lee ka nke a si egosipụta na Ndịàmà Jehova na Namibia na-eche nsogbu asụsụ siri oké ike ihu mgbe ha chọrọ irute 1,370,000 ndị mmadụ bi n’ókèala nke a gbasapụrụ agbasapụ nke ihe dị ka 824,000 square kilomita!
Ka asịkwanụ! Ọ bụghị nanị ndị Herero na Nama kamakwa ndị Ovambo, Kavango, Tswana, Caprivian, Himba, Bushman, na Damara nke Namibia nwechara asụsụ nke aka ha. N’ụzọ dị iche na nke ahụ, Ndịàmà ahụ ji akwụkwọ ndị dabeere na Bible nanị n’asụsụ Bekee na Afrikaans. N’ụzọ doro anya, ka ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ụmụ mmadụ wee nwee ike ịghọta eziokwu ahụ, ọrụ nsụgharị dị mkpa. Nke a malitere n’ụzọ dị nta ọtụtụ afọ gara aga na Windhoek, bụ́ isi obodo nke ihe a na-akpọ South-West Africa ná mgbe ahụ.
“Na Windhoek, e nwere nguzogide siri ike n’ọrụ ịgba àmà anyị site na chọọchi na ndị uwe ojii,” ka Dick Waldron na-echeta. N’ịbụ onye nwunye ya bụ́ Coralie sonyeere, ọ bịara obodo a na 1953 dị ka onye gụsịworo akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead. “E kweghị ka anyị banye n’ógbè ebe ndị isi ojii bi, a na-enyekwa anyị nsogbu mgbe ụfọdụ mgbe a hụrụ ka anyị na-agwa ndị isi ojii okwu. Emesịa anyị chọtara ebe a na-adịghị enye anyị nsogbu—n’okpo mmiri takọrọ atakọ nke Osimiri Gammans! Nke a dị nnọọ na mpụga nke obodo. N’ịbụ ebe e zochiri n’okpuru ọhịa osisi acacia, anyị duziri ọmụmụ Bible n’ebe ahụ.”
Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a sụgharịrị akwụkwọ dị iche iche nke Watch Tower na nke mbụ ya gaa n’asụsụ dị iche iche nke obodo a. Ha gụnyere ụfọdụ trakti n’asụsụ Kwanyama na akwụkwọ nta bụ́ “Ozi Ọma Nka Nke Ala-Eze” n’asụsụ Nama. Nwanna Waldron chetara ahụmahụ na-atọ ọchị banyere akwụkwọ nta nke a, bụ nke onye nwere mmasị na-enye aka n’ịsụgharị. Apụghị ịchọta n’asụsụ Nama, ahịrị okwu ya na, “Adam bụ nwoke zuru okè” bụ otu. Ya mere nwoke ahụ nwere mmasị kwuru, sị: “Nanị dee na Adam dị ka mkpụrụ osisi peach chara acha. Ndị Nama ga-aghọta na ọ bụ onye zuru okè.” Mgbe ahụ, nke a bụ otú e si malite inye ọtụtụ ndị n’etiti ụmụ amaala Namibia nghọta nke Akwụkwọ Nsọ.—Tụlee Daniel 11:33.
Irute n’Ihe Omume Dị Mkpa
E rutere n’ihe omume dị mkpa ná mmalite afọ ndị 1970 mgbe a sụgharịrị akwụkwọ bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi gaa n’asụsụ Ndonga na Kwanyama. Ndị a bụ asụsụ abụọ bụ isi nke ọtụtụ ndị Namibia bi na Ovamboland, nke dị n’ebe dị ka 700 kilomita n’ebe ugwu nke Windhoek, na-asụ. Mgbe ahụ e guzobere ebe obibi nke ndị ọsụ ụzọ oge nile na Ondangwa, bụ́ otu ime obodo nta nke Ovamboland. Iji nyere ndị nwere mmasị bi n’akụkụ ebe a aka irite uru site ná nkwurịta okwu Bible a na-enwe kwa izu nke dabeere n’Ụlọ Nche, e kenyere ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-eje ozi na Ovamboland ọrụ ịsụgharị ngụpụta nke isiokwu ndị dịịrị ọmụmụ n’asụsụ Bekee gaa n’asụsụ Ndonga na Kwanyama.
“Ọfis” ebe a na-eme nsụgharị bụ akụkụ e kewapụrụ ekewapụ nke ụlọ ebe a na-akwọsa ụgbọ ala, bụ́ ebe a na-ebipụta Ụlọ Nche ndị a sụgharịworo n’ígwè meworo ochie nke e ji na-ebipụta otu ihe ugboro ugboro. Ọ dịghị mfe mmadụ itinye uche ya nile n’ọrụ a siri ike, ebe ọnọdụ dịnụ bụ nke mgbe ochie, ikuku oge okpomọkụ na-anọkwa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ dị n’agbata 100 na 110 degrees Fahrenheit. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụ n’ebe a ka a sụgharịrị akwụkwọ nta ndị ọhụrụ na akwụkwọ ahụ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighi Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.
Ka a na-eguzobe ọgbakọ dị iche iche na Ovamboland na akụkụ ndị ọzọ na Namibia, nzaghachi e nwetara bụ ụdị nke a chọrọ gburugburu ebe ka buo ibu na ebe ka mma. Ọzọ, a chọrọ ebe dị n’etiti nke ga-eme ka e lebara mkpa ndị dị n’akụkụ ndị ọzọ nke mba ahụ anya. Ka ọ dị ugbu a, ịkpọasị megide ọrụ nkwusa Alaeze anyị ebelatawo. Ya mere a natara ikike ịmalite iwu ihe owuwu n’ala buru ibu nke otu onye n’ime Ndịàmà Jehova na Windhoek nyere dị ka onyinye. N’oge na-adịghị anya, e nyere ihe karịrị 40 ndị ọrụ afọ ofufo ebe obibi n’ime ogige ebe owuwu ihe ahụ, na December 1990 e wusịkwara ọfịs nke ndị nsụgharị okwu.
Ugbu a, n’ọfịs na ọnụ ụlọ ndị na-enye ntụsara ahụ, bụ́ ndị dị n’ụlọ ọgbara ọhụrụ nke a, ọrụ nke iwetara ọtụtụ ndị nghọta na-aga nnọọ n’ihu ngwa ngwa. A nọgidewo na-asụgharị akwụkwọ ọhụrụ gaa n’asụsụ Herero na Kwangali. Banyere Ndonga na Kwanyama, bụ́ ndị a na-ebipụtakọ isiokwu ha n’ime otu mbipụta Ụlọ Nche otu ugbo n’ọnwa na-apụtazi ugbu a n’àgwà dị iche iche. Ọ na-enwe isiokwu nile maka ọmụmụ ihe nakwa isiokwu ndị ọzọ. N’ezie, nke a bụ ihe dị nnọọ iche site ná mmalite dị nta n’okpo mmiri ahụ takọrọ atakọ ọtụtụ afọ gaworo aga.
“Adịghị m aghọta” bụ nke a na-adịghị anụkebe ugbu a. Kama nke ahụ, ihe karịrị 600 Ndịàmà nke Jehova na Namibia nwere obi ekele dị omimi n’ebe Nna ha nke bi n’eluigwe nọ, ha pụkwara ikwu ugbu a, sị: “Mkpughepụ okwu gị nile na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.”—Abụ Ọma 119:130.
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Ikwusa ozi ọma ahụ n’etiti ndị Herero
Ịsụgharị akwụkwọ ndị Kraịst iji mee ka ndị Namibia rite uru
Ọfis dị iche iche ebe a na-eme nsụgharị na Namibia