Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 12/15 p. 19-20
  • Ụlọikpe Kasị Elu nke Nigeria Akwado Nnwere Onwe Okpukpe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụlọikpe Kasị Elu nke Nigeria Akwado Nnwere Onwe Okpukpe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Site n’Ụlọikpe gaa n’Ụlọikpe
  • Nnwere Onwe Okpukpe Emerie
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 12/15 p. 19-20

Ụlọikpe Kasị Elu nke Nigeria Akwado Nnwere Onwe Okpukpe

NDỊ obodo gara kwakọrọ ihe onye ọrụ ugbo wetara n’ubi. Ndị ọzọ wakwasịrị ụlọ onye na-edo blọkụ ma buru ngwá ọrụ ya. Ndị ọzọ kwa gbochiri otu nwanyị ịzụ na ire ahịa. Gịnị kpatara mmerụ ndị dị otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na ndị e mere ya, ndị bụcha Ndịàmà Jehova, agaghị ekere òkè n’òtù ọgbọ dị iche iche. ‘Na gịnị?’ ka ị pụrụ ịjụ.

Òtù ọgbọ bụ nke ndị a mụrụ n’ihe dị ka n’otu oge na n’otu obodo ahụ, ndị na-abụkarị ụmụ nwoke, mejupụtara. Òtù ọgbọ jupụtara n’ebe ọwụwa anyanwụ Nigeria. Ha pụrụ iwepụta ego maka ọrụ obodo, ma ha pụkwara itinye aka n’ikpere arụsị, meekwa ihe omume okpukpe ndị ọzọ nke mgbaasị iji gosi na ndị nọ na ha etoruwo ogo mmadụ. N’ihi na Bible na-emegide ihe omume ndị dị otú ahụ maka ezi ndị Kraịst, Ndịàmà Jehova enweghị òkè ọ bụla n’òtù ndị dị otú ahụ.—1 Ndị Kọrint 10:20, 21; 1 Jọn 5:21.

Samuel Okogbue rụrụ ọrụ dị ka onye na-akwa ákwà n’Aba, Nigeria. Ná mmalite 1978, ndị so n’Òtù Ọgbọ Ụmụnkalụ nke Alayi siri ọnwụ na ọ ga-akwụ “taks” iji nye aka iwu otu ebe nlekọta ahụ ike. Dị ka ezi onye Kraịst, Samuel na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji nyere ndị ọzọ aka, ma n’ihi akọ na uche ya ọ jụrụ inwe ihe ga-ejikọ ya na òtù ọgbọ. N’April 22 n’afọ ahụ, mmadụ isii nọ n’òtù ahụ wabara n’ụlọ ahịa ya ma buru ígwè o ji akwa ákwà n’ike, bụ́ nke ha sịrị na ha ga-ejigide ruo mgbe o wetara ego ahụ. Samuel mere nzọrọ na iwu ejighị ya ịkwụ ihe ọ bụla ebe ọ bụ na ya esoghị n’òtù ha. Mgbe ọ na-apụghị inwetaghachi ígwè o ji akwa ákwà, Samuel wegara okwu ahụ ụlọikpe.

Site n’Ụlọikpe gaa n’Ụlọikpe

N’Ụlọikpe Majie Ukwu, òtù ọgbọ ahụ rụrụ ụka na n’ihi afọ ndụ ya, Samuel bụ otu n’ime ha ozugbo a mụrụ ya, nweekwa ibu ọrụ nke ịkwụ taks ọ bụla ha kenyere onwe ha. Ọzọ, omenala obodo kwuru na ọ bụrụ na onye òtù ha akwụghị taks, a ga-eburu ihe onwunwe ya ruo mgbe ọ kwụrụ ya.

Ụlọikpe ahụ jụrụ. Na February 28, 1980, o kwubiri na a gaghị amanye Samuel amanye isonye n’òtù ọgbọ. Majie Ukwu ahụ kwuru, sị: “Omenala nke napụrụ nwa amaala nnwere onwe ime nhọrọ nke òtù na-emegide M[paghara] nke 37 nke Usoro Iwu Federal Republic of Nigeria, n’ihi ya ọ pụghịkwa inwe ikike nke Iwu.”

Òtù ọgbọ ahụ weere okwu gaa n’Ụlọikpe Dị Elu ma merie. N’ebe ahụ ọkàikpe nyere Samuel iwu ịkwụ taks ahụ, na-ekwu na ọ bụ nanị ụzọ isi tụnye ụtụ n’ọganihu ógbè obodo ahụ.

Mgbe ahụ Samuel tinyere akwụkwọ mkpegharị ikpe nke ihe o lere anya dị ka ikpe na-ezighị ezi. Ụlọikpe Mkpegharị gbanwere mkpebi Ụlọikpe Dị Elu ahụ, na-ekpelara Samuel. N’achọghị ịnakwere mmeri, òtù ọgbọ ahụ weere okwu ahụ gaa Ụlọikpe Kasị Elu nke Nigeria.

Ka ọ dị ugbu a, ndị so n’òtù ahụ anọwo n’ọrụ n’obodo Samuel. Site n’ịrụ ụka na Ndịàmà na-emegide ọrụ obodo nile, ha mere ka onye isi obodo machie ọrụ nile nke Ndịàmà Jehova n’ógbè ahụ iwu. Ọkụ ékwé obodo mara ọkwa na a ga-eri onye ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na Ndịàmà Jehova nha. Ndịàmà sitere n’obodo ndị dị nso batara n’okwu ahụ ma mee ka ihe doo ndị okenye obodo ahụ anya. Ha kọwara na ndị Chineke esighị n’ụzọ ọ bụla na-emegide ọganihu obodo. N’ezie, Samuel wepụtara akwụkwọ risit n’ụlọikpe, bụ́ ndị na-anwapụta na ọ tụwo ụtụ n’ọrụ ụfọdụ nke obodo bụ́ ndị ọ na-abụghị òtù ọgbọ wepụtara ego ha. Ndị okenye obodo gbanwezịrị mkpebi ha nke ịkpapụ Ndịàmà iche.

Nnwere Onwe Okpukpe Emerie

N’October 21, 1991, ndị ọkà ikpe ise nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Nigeria ji otu olu kpelaara Samuel ikpe. Ka ọ na-asa okwu mbara ná mkpebi ikpe bụ isi nke Ọkàikpe Paul Nwokedi nyere, Ọkàikpe Abubakar Wali kwuru, sị: “Ọ bụghị ụtụ ahụ [taks ahụ a manyere amanye] ka onye ahụ a kpụtara [Samuel] jụrụ kama ọ bụ isonye n’òtù, klọb, ma ọ bụ njikọ ndị ọgbọ, n’ihi na nke a megidere nkwenkwe okpukpe ya, ebe ọ bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova.”

Ọkàikpe ahụ gara n’ihu, sị: “Usoro Iwu 1963, mpaghara nke 24(1) nyere ụmụ afọ nile nke Nigeria nnwere onwe ọchịchọ, echiche, na okpukpe. O ruuru onye ahụ a kpụtara ijigide nkwenkwe okpukpe ya, echiche ya, na ọchịchọ ya nke gbochiri ya isonye n’òtù Ọgbọ ahụ. Omenala ọ bụla chọrọ ihe dị iche na-emegide Usoro Iwu ahụ, n’ihi ya kwa a gaghị eji ya mee ihe n’akụkụ ahụ.”

Ná mkpirikpi, ụlọikpe ahụ kwubiri na ọ dịghị onye a pụrụ iji iwu rụgide isonye òtù ọgbọ, ọbụna ma ọ bụrụ na isonye na ya bụ omenala obodo. O kwubikwara na ọ dịghị onye a pụrụ iji iwu rụgide ịtụ ụtụ site n’òtù nke ọ na-esoghị na ya, ọbụna mgbe ụtụ ndị ahụ bụ maka ọganihu obodo. Ya mere na ọbụna n’okwu dị nta dị otú a, a kwadoro nnwere onwe okpukpe maka mmadụ nile na Nigeria

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya