Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 1/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ezigbo Ndụmọdụ Maka Ndị Na-alụbeghị Di Ma Ọ bụ Nwunye Na Ndị Lụrụla
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Jiri Oge Ị Na-alụbeghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Mee Ihe Bara uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye n’Oge Ihe Isi Ike Ọnọdụ Akụ̀ na Ụba
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ndị Na-alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ma Nwee Afọ Ojuju n’Ozi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 1/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka onye Kraịst pụrụ ime mgbe ọ na-enweghị ike ịchọta di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ekwesị?

Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị Kraịst mere nraranye, anyị ka pụkwara inwe nkụda mmụọ mgbe anyị nwere olileanya siri ike maka ihe nke anyị na-enweghị ike inweta. A kọwapụtara mmetụta anyị nke ọma n’Ilu 13:12, bụ́ nke na-asị: “Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa.” Nke a abụwo mmetụta nke ụfọdụ ndị Kraịst nweworo mgbe ha chọworo ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ha apụghị ịchọta onye kwesịrị ekwesị ha ga-alụ. Nke a bụ otú ọ na-adị karịsịa nye ndị ahụ Pọl onyeozi kọwara dị ka ndị ‘na-ere ọkụ n’agụụ ha.’​—⁠1 Ndị Kọrint 7:9.

Jehova tinyere n’ime ụmụ mmadụ ọchịchọ nke ịchọta ezigbo di ma ọ bụ nwunye. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na mmetụta dị otú ahụ na-agụsi ọtụtụ ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye agụụ ike. (Jenesis 2:18) Mmetụta ndị a dị mma pụrụ ịbụ ndị a na-eme ka ha dịwanye ike n’ọdịnala ndị na-atụkwasị oké ịdị mkpa n’alụmdi na nwunye (ma ọ bụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye mgbe e ruru afọ ndụ ụfọdụ) ma ọ bụ mgbe ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nọ n’etiti ndị di na nwunye na-enwe obi ụtọ n’ime ọgbakọ. Otú ọ dị, ọ dịghị mma ikwere ka nchegbu dịruo ogologo oge. Ya mere, olee ụzọ ndị Kraịst obi ha ziri ezi pụrụ isi merie ọnọdụ ahụ n’abụghị ndị nke ahụ nyere nsogbu n’obi nke ukwuu?

Imeri ya adịghị mfe, ndị ọzọ ekwesịghịkwa iwere nchegbu nke a dị ka ọ bụ nnọọ imebiga ihe ókè ma ọ bụ obere ihe isi ike. Ma ruo n’ókè dị ukwuu, inwe ike ịnagide ma ọ bụ idozi ọnọdụ ahụ dabeere n’ihe ndị onye ahụ na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye pụrụ ime.

Anyị na-achọta otu isi ihe n’ụkpụrụ Bible nke a dị irè: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Onye kwuru nke ahụ bụ nwoke ahụ na-alụghị nwunye, bụ́ Jisọs Kraịst, ihe o kwuru dokwara ya anya. Imere ndị ọzọ ihe site ná nzube nke na-adịghị achọ ọdimma onwe ya bụ ọgwụ dị mma iji nyere onye ọ bụla n’ime anyị aka imeri mmetụta nile na-apụta site ná nchere a na-echere ruo ogologo oge. Gịnị ka nke a pụtara nye onye Kraịst nke na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye?

Wepụta ohere ime ihe ndị dị mma maka ezinụlọ nke i si na ya pụta nakwa maka ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ, mụbaakwa ihe omume gị n’ije ozi ahụ. Ndụmọdụ nke a adịghị asị, ‘Jide ọrụ n’aka, ị ga-echezọkwa ihe banyere ịlụ di ma ọ bụ nwunye.’ Ee e. N’itinye uche gị ná nchụso ndị Kraịst ndị a na-arụpụta ihe, ị pụrụ ịchọpụta na ị ‘ga-eguzosi ike n’obi gị, nweekwa ike ime ihe gị onwe gị na-achọ,’ ị pụkwara iji ọnọdụ ị nọ na ya ugbu a mee ihe n’ụzọ bara uru.​—⁠1 Ndị Kọrint 7:37.

Ụfọdụ ndị nweworo oké ọchịchọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ekwewo ka nke a ghọọ ihe na-eri ha nri n’ahụ. Ọbụna na ha emebigawo ihe ókè dị ka ime mkpọsa maka di ma ọ bụ nwunye n’akwụkwọ akụkọ. Otú ọ dị, lee otú o si kara mma nke ukwuu ịtụkwasị uche karị n’ịghọta uru ndị a pụrụ irite n’oge a na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye.​—⁠Biko lee isiokwu ndị bụ “Ndị Na-alụghị Di na Nwunye ma Zuo Okè Ije Ozi Chineke” na “Ịnọ n’Alụghị Di na Nwunye​—⁠Ụzọ Ndụ nke Na-enyeghachi Ụgwọ Ọrụ” n’Ụlọ Nche nke November 15, 1987 nakwa “Alụmdi na Nwunye Ọ̀ Bụ Nanị Ụzọ Bụ Isi E Si Enweta Obi Ụtọ?” n’Ụlọ Nche nke May 15, 1992.

Kpegara Jehova ekpere maka enyemaka iji nọgide n’ọnọdụ nke alụghị di ma ọ bụ nwunye. (Ndị Filipaị 4:​6, 7, 13) Ọtụtụ ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye achọpụtawo na site n’iji oge ha na-amụ ihe ma na-atụgharị uche n’Okwu Chineke nakwa ịga ma kere òkè ná nzukọ nile nke ndị Kraịst, ha enwetawo ‘izu ike nye mkpụrụ obi ha,’ dị ka Jisọs kwere ndị na-eso ụzọ ya ná nkwa. (Matiu 11:​28-⁠30) Nke a enyeworo ha aka iwulite ọnọdụ ime mmụọ, ka ha wee bụrụ ndị ga-abụ ndị di ma ọ bụ nwunye dị mma karị ma ọ bụrụ na ha emesịa chọta onye kwesịrị ekwesị ha ga-alụ.

Echezọla mgbe ọ bụla na Jehova na-aghọta ọnọdụ nke ndị nile na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-ejere ya ozi. Ọ maara na ọ pụrụ ịbụ na ị dịghị eche na ọnọdụ ị nọ na ya ugbu a bụ ihe ị ga-ahọrọ. Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya makwaara banyere ihe ndị ga-abụ maka ọdịmma gị n’ụzọ na-adịgide adịgide, ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ mmetụta uche. N’otu aka ahụ ị pụrụ ịmara nke a dị ka ihe na-aghaghị ime: Site n’iji ndidi na-echere Jehova nakwa site n’itinye ụkpụrụ nile nke Okwu ya n’ọrụ ná ndụ ị na-adị kwa ụbọchị, ị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-egbo mkpa gị ndị kasị dị mkpa n’ụzọ nke ga-abụ maka ọdịmma ebighị ebi gị.​—⁠Tụlee Abụ Ọma 145:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya