Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 1/15 p. 32
  • Ị̀ Dị Ka Otu N’ime Ndị a?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Dị Ka Otu N’ime Ndị a?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 1/15 p. 32

Ị̀ Dị Ka Otu N’ime Ndị a?

‘ỌKA mma ịbụ ọdụm otu ụbọchị kama ịbụ nwa atụrụ ruo otu narị afọ.’ E kwuwo na ọ bụ Benito Mussolini, bụ́ onye bụbu onye ọchịchị aka ike nke Itali, kwuru okwu ndị ahụ.

Dị ka Mussolini, ọtụtụ ndị ga-asị ka a ghara ịkpọ ha ụmụ atụrụ na atụrụ. Otú ọ dị, onye ọbụ abụ ahụ bụ́ eze nke Israel oge ochie, bụ́ Devid, kwupụtara, sị: “Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ. . . . N’akụkụ mmiri nke izu ike ka ọ na-edu m nwayọọ.” (Abụ Ọma 23:​1, 2) Ee, Jehova Chineke bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, onye na-enye ndị ya nlekọta dị nro dị ka à ga-asị na ha bụ atụrụ ndị na-adịghị emerụ mmadụ ahụ.

E kwuru okwu banyere ndị Chineke dị ka atụrụ ihe atụ n’Abụ Ọma 95:7, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “N’ihi na ya onwe ya [Jehova] bụ Chineke anyị: anyị onwe anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dị ka atụrụ, bụrụkwa ìgwè atụrụ nke aka ya.” Ụfọdụ pụrụ ịtụworị anya na onye ọbụ abụ ahụ ga-ekwu okwu banyere “atụrụ nke ọ na-azụ” na “ndị nke aka ya.” Ma n’ebe a ihe a na-ekwu dị iche, e sikwa otú a mee ka a mata ndị Jehova dị ka atụrụ ya. Ha na-erite uru nke ndị bụ ndị Chineke na-azụ dị ka atụrụ, ọ na-edukwa ha site n’aka ịhụnanya.

Ọkpara Jehova, bụ́ Jisọs Kraịst, bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ. Ọ na-ezokarị aka n’ebe ndị mmadụ nọ dị ka atụrụ. Dị ka ihe atụ, Jisọs kwuru banyere “ìgwè atụrụ nta” nakwa banyere “atụrụ ọzọ” ya. (Luk 12:32; Jọn 10:​14-⁠16) Banyere ndị na-eso ụzọ ya dị umeala n’obi, ndị yiri atụrụ, Jisọs kwuru, sị: “Atụrụ nke m na-anụ olu m, mụ onwe m makwaara ha, ha na-esokwa m: mụ onwe m na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi; ha agaghị alakwa n’iyi ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi, ọ dịghịkwa onye ọ bụla ga-anapụ ha n’aka m.” (Jọn 10:​27, 28) N’aka onye ọchịchị dị obi ebere, ndị nọ ya n’okpuru na-erite uru site n’ike ya, amara, nduzi, na nchebe ya.​—⁠Mkpughe 1:16, 20; 2:1.

Ọ dịghị onye pụrụ ịnapụ ndị yiri atụrụ n’ezie n’aka nchebe nke Jisọs. Taa, ọ na-ekewa ndị mmadụ dị ka “ụmụ ewu” ndị na-enweghị amara ya ma ọ bụ “atụrụ” ndị ga-enweta ndụ ebighị ebi n’okpuru ọchịchị nke Alaeze eluigwe Chineke. (Matiu 25:​31-⁠46) Ị̀ ga-aghọ otu n’ime atụrụ ndị ahụ a gọziri agọzi?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Garo Nalbandian

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya