Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 2/1 p. 20-24
  • Ndokwa Enyemaka na-egosi Ịhụnanya Ndị Kraịst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndokwa Enyemaka na-egosi Ịhụnanya Ndị Kraịst
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Sweden
  • Finland
  • Denmark
  • The Netherlands
  • Switzerland
  • Austria
  • Itali
  • Ihe Oriri Maka Ọtụtụ Puku Ndị Bịara Mgbakọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 2/1 p. 20-24

Ndokwa Enyemaka na-egosi Ịhụnanya Ndị Kraịst

“HỤNỤ òtù ndị bụ ụmụnna n’anya,” ka Pita onyeozi gbara ndị Kraịst ibe ya ume ime. (1 Pita 2:17) Ịhụnanya dị otú ahụ gaje ịgabiga ókèala nke agbụrụ, nke ọha mmadụ, na nke mba, na-adọkọta ndị mmadụ ọnụ n’ime ezi òtù ụmụnna. Mgbe mkpa ihe onwunwe bilitere n’etiti ndị Kraịst mbụ, ịhụnanya kpaliri ọtụtụ ndị inye ndị ozi ahụ ihe a tụkọtara atụkọta maka ikesara ndị ahụ nọ ná mkpa. Ihe ndekọ ahụ na-asị na “ha nwekọkwara ihe nile.”​—⁠Ọrụ 2:41-⁠45; 4:32.

Ịhụnanya dị otú ahụ pụtara ìhè mgbe Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, ná ngwụsị nke 1991, kpọkuru ọtụtụ alaka dị iche iche nke Watch Tower Society n’Ọdịda Anyanwụ Europe inye ụmụnna ha nọ ná mkpa n’Ọwụwa Anyanwụ Europe ihe oriri na uwe oyiyi, tinyere akụkụ ụfọdụ nke ebe ahụ bụbu Soviet Union. Anyị na-ewepụta n’ebe a ọtụtụ akụkọ sitere n’ụfọdụ alaka ndị o metụtara.

Sweden

Na December 5, 1991, e zipụrụ otu akwụkwọ ozi na-akọwa mkpa ahụ nye 348 ọgbakọ nile dị na Sweden. E nwetara nzaghachi ozugbo. N’ime ụbọchị ole na ole, ụgbọ obu ngwongwo nke mbụ dịtụ nta buliri njem ya ịga St. Petersburg, Russia, bụrụ nke e bujuru ntụ ọka, abụba e ji esi ihe, anụ ehi a gbara n’iko, mmiri ara ehi dị ntụ ntụ, na ihe ndị dị otú ahụ dị 15 tọn n’ịdị arọ. Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ buturu ngwongwo dị na gwongworo ndị ahụ ma kesaa ngwa ngwa ùkwù ahụ dị 750 n’ọnụ ọgụgụ nye ndị ahụ nọ ná mkpa. Ka e mesịrị, ụgbọ obu ngwongwo abụọ ọzọ dịtụ nta buuru nri gaa Russia. Ná ngụkọta, e bupụrụ site na Sweden ngwongwo ịdị arọ ha karịrị 51.5 tọn.

Ịdị njikere inye uwe na akpụkpọ ụkwụ n’onyinye karịrị ihe nile a tụrụ anya ya. Ùkwù uwe rịrị elu ngwa ngwa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche. Ọtụtụ ndị Kraịst nyere uwe site n’ebe nkwakọba uwe ha. Ndị ọzọ zụrụ ihe ndị dị ọhụrụ. Otu nwanna zụrụ uwe oyiyi suit ise. Mgbe onye ahụ na-ere ahịa n’ụlọ ahịa, bụ́ onye nwere ihe iju anya ghọtara nzube ya, o nyere onyinye uwe oyiyi suit ise ọzọ. Nwanna ọzọ zụrụ otu igbe sọks, ihe ndị a na-ekpunye n’aka, na ibe ákwà ndị a na-atụhị n’olu. Mgbe ọ kọwara nzube ya, onye nwe ya nyere ya uwe oyiyi suit 30 ndị ọhụrụ n’ọnụ ahịa a na-ere abụọ. Onye na-ere ahịa n’ụlọ ahịa ebe a na-ere ihe ndị e ji eme egwuregwu nyere 100 akpụkpọ ụkwụ ndị ọhụrụ, na akpụkpọ ụkwụ ndị a na-eyi arụ ọrụ.

Mgbe ahụ e wetara ihe a nile n’alaka maka ịhọpụtasị ha n’ụdị n’ụdị, ikegharị ha n’ùkwù, na ịdọnye ha n’ime ụgbọ ala. Uwe oyiyi​—⁠nke hà ka ihe 40 ụgbọ obu ngwongwo dịtụ nta ga-ebuli⁠—​jupụtara akụkụ ndị dị ukwuu n’alaka ahụ! Ụmụnna ndị ikom na ndị inyom rụrụ ọrụ ruo ọtụtụ izu ịhọpụtasị ma kwakọba ha n’usoro maka ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka na itinye ha na katọn. E jiri ụgbọ obu ngwongwo 15 dị iche iche mee ihe iburu uwe oyiyi ndị ahụ gaa Russia, Ukraine, na Estonia n’enweghị nsogbu ọ bụla.

Otu nwanna nwoke nyara otu n’ime gwongworo Society ugbo asatọ gaa n’ebe ahụ bụbu Soviet Union kwuru, sị: “Nnabata ụmụnna anyị nyere anyị n’ebe ndị anyị jere bụ oké nkwụghachi ụgwọ. Ha makụrụ anyị ma sutụ anyị ọnụ, n’agbanyeghịkwa obere ihe ha nwere, ha nyere anyị ezigbo ihe mmụta n’inye ihe n’obi ọma nke ndị Kraịst.”

Finland

N’agbanyeghị oké nsogbu azụmahịa, enweghị ọrụ zuru ebe nile, na nsogbu ọnọdụ akụ na ụba dị na Finland, ịdị njikere e nwere n’ihe dị ka 18,000 ụmụnna ndị Finland inyere ụmụnna ha nọ n’ebe bụbu Soviet Union aka abụwo nke dị ukwuu. Ha zigara ihe karịrị 58 tọn nri n’ime katọn dị 4,850 gaa St. Petersburg, Estonia, Latvia, Lithuania, na Kaliningrad. Ha jikwa uwe oyiyi dị 12 kubik mita fachie ebe ndị e nwere oghere na gwongworo ndị ahụ. E nyekwara 25 ụgbọ ala nta na ndị dịtụ nta na-ebu ibu, bụ́ ndị a gbatụworo nke nta, maka iji ha mee ihe n’ọrụ Alaeze ahụ.

Ụfọdụ n’ime igbe nri ndị ahụ rutere otu ọgbakọ nke ihe mejupụtara ya bụ 14 ndị nkwusa na Slanti n’ógbè nke St. Petersburg. Ha jiri akwụkwọ ozi kọwapụta ekele dị ukwuu ha nwere. “Anyị nwere ụmụnna nwanyị iri meworo agadi n’ọgbakọ anyị. Ọtụtụ n’ime anyị na-arịasi ọrịa ike, anyị apụghịkwa ịkwụ n’ahiri ruo ọtụtụ hour iji nweta nri. Otú ọ dị, Nna anyị nke eluigwe adịghị eme ka anyị nwee ihe mere anyị ga-eji nwee nkụda aka n’oge ndị a siri ike, kama ọ na-eji ọṅụ na-emeju obi anyị. Anyị na-eduzi 43 ọmụmụ Bible ebe obibi.” Mgbe otu nwanna nwanyị na St. Petersburg natara ngwugwu ihe enyemaka nke ya, o metụrụ ya nke ukwuu nke na o bere ákwá ruo hour abụọ tupu o na-emepe ya.

Denmark

N’obere mba nke a dị n’ụzọ e si abanye n’Osimiri Baltic, ihe dị ka 16,000 Ndịàmà nke Jehova bịakọtara ọnụ wee ziga na Ukraine 19 gwongworo bu 64 tọn nri n’ime 4,200 igbe dị iche iche; 4,600 igbe àkwà ndị dị oké ọnụ ahịa; na 2,269 akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ. Otu nwanna nwoke na Germany kwere ka alaka ahụ jiri gwongworo ise mee ihe, bụ́ nke o mesịrị nye ụmụnna ndị nọ na Ukraine n’onyinye. Mgbe ọ lọghachitere, otu n’ime ndị nyara ụgbọ ala ndị ahụ kwuru, sị: “Anyị chọpụtara na anyị jiri ihe dị ukwuu lọta karịa ka anyị jiri jee. Ịhụnanya na mmụọ nke ịchụ àjà nke ụmụnna anyị ndị Ukraine gosiri mere ka okwukwe anyị sie ike nke ukwuu.”

Ndị ahụ nyara ụgbọ ala ahụ nọọrọ ná nche maka ndị ohi n’ogologo ụzọ ahụ dị n’ebe ahụ bụbu Soviet Union. Ụbọchị ole na ole tupu gwongworo ndị nke si Denmark agafee, ndị ohi ezuwo ohi n’ụzọ ahụ. Ndị ohi ji ụgbọ elu helicopter na égbè na-awụpụ mgbọ akwụsịwo ahịrị gwongworo bu nri nke si n’aka òtù ọzọ na-agbatara ndị nọ ná mkpa ọsọ enyemaka. Ha buuru gwongworo ise ahụ nile, na-ahapụ ndị na-anya ha n’akụkụ okporo ụzọ. N’agbanyeghị ihe ize ndụ dị otú ahụ, ihe nile e bupụrụ site n’alaka Denmark rutere ụmụnna ndị ahụ n’enweghị nsogbu ọ bụla. N’iji kwụghachi, ha mere ka otu onye nyara ụgbọ ala ahụ jiri ihe odide sonu lọta, bụ́ nke e jiri ihe isi ike dị ukwuu dee n’asụsụ Bekee: “Ezi ụmụnna ndị ikom na ndị inyom Denmark: Anyị anatawo ihe enyemaka unu. Jehova ga-akwụghachi unu ụgwọ.”

The Netherlands

Alaka nke The Netherlands zipụrụ 52 tọn nri ná ngwugwu dị 2,600. E ji ahịrị ụgbọ ala abụọ ndị dị iche bugaa ha Ukraine. N’oge nke ọ bụla a hapụrụ gwongworo isii ahụ n’azụ, ebe ụmụnna ndị Germany nyeworo ha n’onyinye maka ọrụ Alaeze ahụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ụmụnna ndị Ukraine zipụrụ ihe ka na nri ahụ gaa Moscow, Siberia, na ebe ndị ọzọ e nwere mkpa dị ukwuu. Ọzọkwa, ụmụnna ndị Dutch nyekwara onyinye ákwà na akpụkpọ ụkwụ dị 736 kubik mita. E ji gwongworo 11 soro n’ahịrị nke otu ụgbọ ala nta mmadụ nwe n’aka ya so n’azụ bute ya na Lviv nke dị na Ukraine.

Mgbe a gbaworo ogologo oge gabiga Germany na Poland, ahịrị ụgbọ ala ndị ahụ gafere n’ụzọ dị mfe ebe ndị ọrụ Ukraine nọ, bụ́ ndị na-ahụ maka ihe na-abata abata ma ọ bụ na-apụ apụ, ma ruo ná mpụta mpụta Lviv n’elekere 3.00 nke ụtụtụ. Ndị ahụ na-anya ụgbọ ala na-akọ, sị: “N’oge na-adịghị anya, ìgwè ụmụnna dị 140 n’ọnụ ọgụgụ nọ n’ebe ahụ ibutu ihe ndị dị n’ime ụgbọ obu ngwongwo ndị ahụ. Tupu a na-amalite ọrụ ahụ, ụmụnna ndị a dị umeala n’obi gosiri ndabere ha n’ebe Jehova nọ, na-ekpe ekpere n’ịdị n’otu. Mgbe a rụsịrị ọrụ ahụ, ha zukọkwara ọzọ maka ikpe ekpere ekele nye Jehova. Mgbe anyị nụsịrị ụtọ nke ile ọbịa nke ụmụnna ndị ebe ahụ, bụ́ ndị nyere n’ụba obere ihe ha nwere, e dupụrụ anyị n’ebe okporo ụzọ ukwu dị, ebe ha kpere ekpere n’akụkụ ụzọ ahụ tupu ha ahapụ anyị.

“N’ogologo ụzọ ahụ mgbe anyị na-ala, e nwere ọtụtụ ihe a ga-echeghachi echiche azụ banyere ha​—⁠ile ọbịa nke ụmụna anyị na Germany na Poland, na nke ụmụnna anyị na Lviv; okwukwe ha siri ike na àgwà ha nke ikpe ekpere; ile ọbịa ha nke inye ụlọ obibi na nri n’oge ha nọ ná mkpa n’onwe ha; ngosipụta ha gosipụtara ịdị n’otu na ịnọ nso; na ekele ha. Anyị chekwara echiche banyere ụmụnna anyị ndị ikom na ndị inyom nọ n’ụlọ, bụ́ ndị nyeworo ihe n’ụba nke ukwuu.”

Switzerland

Alaka nke Switzerland meghere akụkọ nke ya site n’ihota Jemes 2:​15, 16: “Ọ bụrụ na nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị gba ọtọ, n’enweghịkwa ihe oriri ga-ezuru ya kwa ụbọchị, ma otu onye n’etiti unu sị ha, Labanụ n’udo, nyaanụ ọkụ, rijuokwanụ afọ; ma unu enyeghị ha ihe na-akpa ahụ ha; uru gịnị ka ọ bara?” Mgbe ahụ akụkọ ahụ gara n’ihu: “Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ batara n’obi mgbe Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova kpọrọ anyị òkù inye ụmụnna anyị nọ ná mkpa enyemaka ihe onwunwe.

“Ozugbo ahụ onye ọ bụla banyere n’ọrụ! Nanị n’ime ụbọchị abụọ, e ji gwongworo atọ sitere na Germany bụ́ nke a gaje inye n’onyinye maka ọrụ n’ebe ahụ, zigaa na Ukraine 12 tọn nri n’ime 600 ngwugwu dị iche iche. Akụkọ a nụrụ na ha nile erutewo n’enweghị nsogbu ọ bụla mere ka e nwee ọṅụ dị ukwuu n’etiti ụmụnna anyị n’ebe a. N’otu oge a, ọgbakọ dị iche iche nakọtara uwe oyiyi, n’oge na-adịghịkwa anya alaka anyị jupụtara na katọn, igbe mpịanye ihe a na-ebu n’aka, na akpa dị iche iche! Ndị nke ihe dị n’ime ha bụ uwe oyiyi ụmụaka gụnyere ihe ụfọdụ ụmụaka ji egwu egwuregwu sitere Switzerland maka ndị enyi a na-amaghị ama n’ime ime Ebe Ugwu. E tinyekwara ọtụtụ ógbè ihe nracha chocolate n’etiti okpukpu ákwà.”

Olee otú a ga-esi buga ihe a nile? Akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “Alaka dị na France gbataara anyị ọsọ enyemaka site n’inye anyị ụgbọ obu ngwongwo abụọ dịtụ nta na ndị ọkwọ ụgbọ ala anọ. Tụkwasị na nke ahụ, a hụkwara mkpa nke iji otu gwongworo si n’alaka anyị na anọ ndị ọzọkwa nke ụmụnna nọ n’ebe a nwe buru 72 tọn ndị ahụ gaa Ukraine.” Ahịrị ụgbọ ala ahụ nke dị 150 mita n’ogologo, ruru ebe ndebe ihe dị na Lviv, n’enweghị nsogbu ọ bụla, bụ́ ebe ihe dị ka narị ụmụnna ndị si ebe ahụ cheere iji butuo ihe ndị dị n’ime gwongworo ndị ahụ. Ndị ahụ nyara ụgbọ ala ndị ahụ kọrọ na ihe mgbochi nke asụsụ egbochighị ihe ọ bụla n’ihi na ihu ha gosipụtara ekele dị omimi.

Austria

Ụmụnna ndị Austria zipụrụ 48.5 tọn nri, katọn uwe oyiyi dị 5,114 na 6,700 akpụkpọ ụkwụ, gaa Lviv na Uzhgorod ndị dị na Ukraine. Ha zipụkwara nri dị 7 tọn, 1,418 igbe uwe, na 465 akpụkpọ ụkwụ, gaa Belgrade, Mostar, Osijek, Sarajevo, na Zagreb dị n’ebe bụbu Yugoslavia. Alaka ahụ na-akọ, sị: “Anyị bujuru ngwongwo n’ụgbọ obu ngwongwo 12 dịtụ nta, nke mere njem dị 34,000 kilomita. Ọ bụ otu nwanna nwoke na nwa ya nwoke nwere gwongworo e ji achụ nta ego mere ihe ka ukwuu ná mbuga ihe nke a.”

Banyere uwe ndị e nyere n’onyinye, akụkọ ahụ gara n’ihu, sị: “Anyị jiri otu Ụlọ Nzukọ Mgbakọ mee ihe dị ka ebe dị n’etiti a na-ebusa ihe. Ọtụtụ ihe gwongworo butere nọgidere na-ezo ka mmiri, ruo mgbe ọ na-adịghịkwa ohere dịnụ. Dị ka ọ dị n’ụbọchị Mosis, e gbochiri ndị mmadụ ịdị na-ewetakwu ihe. (Ọpụpụ 36:6) Ọbụna ụfọdụ ndị mmadụ na-abụghị Ndịàmà nke Jehova nyere onyinye ego, ‘n’ihi na,’ dị ka ha kwuru, ‘n’ụzọ nke a anyị maara na ndị ahụ nwere mkpa ga-enweta ya.’ Anyị nwetakwara ọtụtụ katọn dị nnọọ mkpa ndị ihe na-adịghị site n’aka ụlọ ọrụ ndị ụwa n’akwụghị ụgwọ ọ bụla.” Ụmụnna ndị ikom na ndị inyom, bụ́ ndị họpụtasịrị ma kwajuo ihe nile bụ ndị dị site na 9 ruo 80 afọ ndụ. Ọbụna ha nwara ịhọpụta eriri olu tie na uwe ahụ ndị kwekọrọ na uwe oyiyi suit nke ọ bụla.

Akụkọ ahụ na-ekwu, sị: “Ndị ọchịchị n’Austria na n’ókèala dị iche iche nyere aka nke ukwuu n’ime ka mbuga nke ihe enyemaka dị iche iche kwe omume na n’inye akwụkwọ ikike dị iche iche ndị dị mkpa ka e wee nwee ike ibuga ihe nile n’enweghị oké nsogbu.”

Itali

Site na Rom e ji ahịrị gwongworo abụọ ndị buru ibu buru ihe dị ukwuu dị ka 188 tọn nke ihe oriri gabiga Austria, Czechoslovakia, na Poland ruo ebe bụbu Soviet Union. Ahịrị ụgbọ nke ọ bụla gụnyere ndị ọkwọ ụgbọ ala isii, otu onye na-arụzi ụgbọ ala mebiri emebi, onye na-arụzi ọkụ eletrik ụgbọ ala, onye ntụgharị okwu, onye ọrụ na-ahụ maka mbugharị ngwongwo, onye na-esi nri, onye dọkita, onye ji ụgbọ ala jeep na-edu ahịrị ahụ, na otu nwanna nwoke bu ụgbọ a rụkwasịrị ụlọ ntú maka ihi ụra.

E nwetara nri ahụ site n’aka ụlọ ọrụ asaa na-ere ihe. Alaka ahụ na-akọ, sị: “Mgbe ndị ahụ resịrị anyị ihe nụrụ ihe kpatara ihe omume ahụ, ụfọdụ n’ime ha nwere ọchịchọ nke ikere òkè. Ndị ụwa ahụ resịrị anyị ihe nyere onyinye nke ọtụtụ narị kilogram nke nri pasta na osikapa, tinyerekwa igbe ndị a na-akwanye ihe. Ndị ọzọkwa nyere onyinye nke taya ụgbọ ala e mere maka ịgba na snow maka gwongworo ndị ahụ ma ọ bụ chọọ ịtụnye onyinye ego.

“Ụmụnna nọ n’Itali nwere ekele maka ohere nke a nke inye aka. Ụmụaka chọrọ inyekwa aka. Otu nwatakịrị nwoke gbara afọ ise zipụrụ otu onyinye ntakịrị nke o nwere olileanya na ọ ga-azụta ‘otu iko azụ tuna buru ibu nke ukwuu maka ụmụnna nọ na Russia.’ Otu nwatakịrị nwanyị natara ego site n’aka nne na nna papa ya maka akara ọma o nwetara n’ụlọ akwụkwọ iji zụtara ndị mụrụ ya onyinye. ‘Ma,’ ka o dere, ‘mgbe m ghọtara na ọtụtụ n’ime ụmụnna m enweghị ihe nile mara mma iri bụ́ ndị m nwere, m chere na ihe onyinye kasị mma m pụrụ ịzụtara ndị mụrụ m bụ inyere ụmụnna ndị ahụ aka.’ O tinyere ego gbara nnọọ ọkpụrụkpụ n’ime igbe onyinye. ‘Enwere m olileanya ịnọgide na-enweta akara ọma, ka m wee nwee ike inyekwu ego,’ ka ọ sịrị.” Akụkọ si n’alaka ahụ mechiri site n’ịsị na akwụkwọ ozi nke ezi ekele sitere n’aka ụmụnna na Ukraine, ọtụtụ okwu ekele nke ụmụnna ndị Itali, na ahụmahụ ndị dị mma e nwere n’ịkwadebe na ibuga ihe ndị ahụ bụ nke na-akpali akpali, nke na-agba ume, na nke na-eme ka a dị n’otu.

Ihe Oriri Maka Ọtụtụ Puku Ndị Bịara Mgbakọ

Mgbakọ mba nile mbụ nke Ndịàmà Jehova n’ebe bụbu Soviet Union bụ nke e mere na Kirov Stadium na St. Petersburg na Russia, June 26-⁠28, 1992. Mgbakọ nke a dị ịrịba ama, nke isiokwu ya bụ “Ndị Na-enye Ìhè,” bụ nke ndị bịara ya karịrị 46,200 sitere 28 mba dị iche iche. O nyere ohere ọzọ iji gosipụta ịhụnanya ndị Kraịst maka “òtù ndị bụ ụmụnna.”​—⁠1 Pita 2:17.

E nyere ọtụtụ puku ndị bịara mgbakọ site n’ebe bụbu U.S.S.R ọtụtụ tọn ihe oriri bụ́ ndị si Denmark, Finland, Sweden, na ala ndị ọzọ na Ọdịda Anyanwụ Europe n’efu, bụ́ ndị a ga-eri n’oge mgbakọ ahụ. Ka ha na-ahapụ mgbakọ ahụ ná ngwụsi nke nnọkọ ikpeazụ, e kechiiri ha nri ná ngwungwu maka ihe ha ga-eri n’ụzọ ha si alaghachi n’ebe obibi ha.

Akụkọ ndị a kọrọ n’ebe a na-egosi na inye ihe ahụ abụbeghị gaa n’otu ebe​—⁠n’ebe ọwụwa anyanwụ⁠—​nanị. E nwewo nnyerịta ihe. Ihe oriri na uwe gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ, ee, ma gaa n’ebe ọdịda anyanwụ ọ bụ okwu ịhụnanya na-eme ka obi na-ekpo ọkụ na ahụmahụ ndị na-akpali okwukwe nke na-egosipụta nnọgidesi ike na ikwesi ntụkwasị obi nke ọtụtụ puku ndị na-efe Jehova n’oge ndị ahụ nke ihe nrụgide na ihe isi ike. Otú a, akụkụ abụọ ahụ enwewo ahụmahụ nke eziokwu nke okwu ndị ahụ nke Jisọs: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”​—⁠Ọrụ 20:35.

[Ihe Osise dị na peeji nke/Foto dị na peeji nke 21]

1. Site na Finland: St. Petersburg, Russia; Tallinn na Tartu, Estonia; Riga, Latvia; Vilnius na Kaunus, Lithuania; Kaliningrad, Russia; Petrozavodsk, Karelia

2. Site na The Netherlands: Lviv, Ukraine

3. Site na Sweden: St. Petersburg, Russia; Lviv, Ukraine; Nevinnomyssk, Russia

4. Site na Denmark: St. Petersburg, Russia; Lviv, Ukraine

5. Site n’Austria: Lviv, Ukraine; Belgrade, Mostar, Osijek, Sarajevo, Zagreb (n’ebe bụbu Yugoslavia)

6. Site na Switzerland: Lviv, Ukraine

7. Site n’Itali: Lviv, Ukraine

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ọtụtụ katọn uwe oyiyi n’alaka Sweden

Ịdọnye ngwongwo ihe enyemaka n’ụgbọ ala

Ihe oriri n’otu ngwungwu

Anụ bacon na ham sitere Denmark

Ahịrị 11 gwongworo na 1 ụgbọ ala nta

Ngwugwu na igbe mpịanye ihe a na-esekpụ n’aka n’alaka Austria

Ibutu ihe na gwongworo na Lviv, Ukraine

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya