Ndị Ozi Ala Ọzọ nke Micronesia
Ọ BỤ ezie na e kewapụrụ ha site ná mgbasapụ buru ibu nke Osimiri Pacific ahụ yiri nke na-enweghị ọgwụgwụ, ndị ozi ala ọzọ nke Micronesia ka na-enwekwa ike izukọta kwa afọ maka “nnọkọ ezinụlọ.” Oleekwa ebe ndị nzisa ozi ọma ndị a nile sitere n’agwaetiti dịpụrụ adịpụ na-ezukọ? N’ụzọ kwesịrị ekwesị, n’ebe ahụ gọọmenti ime obodo kpọworo Jehovah Street—adres nke alaka ụlọ ọrụ Guam bụ́ nke ha na-eje ozi n’okpuru ya.
Na June 1992, 56 ndị ozi ala ọzọ zukọtara n’alaka ụlọ ọrụ ahụ iji gaa Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-enye Ìhè.” Ọchị na nkwurịta okwu na-enye obi ụtọ jupụtara ebe nile ka ha na-ezuteghachi ndị enyi ochie ha ma na-eme ndị ọhụrụ. Dị ka ọ na-adị mgbe nile, ha haziri onwe ha n’elu stepụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ maka ise foto ìgwè, mgbe ahụ ha nọdụkwara ala n’ogologo table atọ e ji eme oriri irikọ nri ndị ozi ala ọzọ ha na-eri kwa afọ, nke pụrụ iche n’afọ a site ná nleta nke Albert Schroeder, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi.
Nye ọtụtụ n’ime ndị ozi ala ọzọ ahụ, nzukọ kwa afọ nke a a na-enwe na Guam bụ nanị ohere ha nwere ịhapụ ntakịrị ebe obibi ha dị n’ebe okpomọkụ. Ha dịkwa ntakịrị n’ezie. Agwaetiti Ebeye, bụ́ otu n’ime Agwaetiti ndị dị na Marshall, dị nanị 32 hekta. Ebe obibi ndị ozi ala ọzọ nke Majuro dị na Marshall nakwa ebe obibi Kiribati dị n’Agwaetiti Gilbert dịcha n’elu ala toro ogologo ma dị warara nke dị n’etiti mmiri, bụ́ nke na-eruchaghị 0.8 kilomita n’obosara. Ya mere ndị ozi ala ọzọ ahụ na-eji oge njem obi ụtọ ahụ ha ji aga Guam eme ihe kasị mma.
Ọ bụ ezie na echiche nke ime nkwusa n’agwaetiti ebe okpomọkụ dịpụrụ adịpụ na-ada ka ihe na-adọrọ mmasị, n’ikwu eziokwu ọ bụ ihe ịma aka nke mmadụ ole na ole na-enwe ike imeri. N’ụzọ na-akpali mmasị, nanị 7 n’ime 56 ndị ozi ala ọzọ ahụ sitere n’ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead. Ihe ka ọtụtụ sitere Hawaii ma ọ bụ Phillipines bụ́ ebe ha bụ ndị ozi ọsụ ụzọ ọ mawooro ahụ ibi ndụ n’ebe okpomọkụ, ha sikwa kpọmkwem ná mba ala nna ha gaa n’ebe ndị e kenyere ha ọrụ ije ozi ala ọzọ.
N’ihi na agwaetiti ndị ahụ nke Micronesia dị nso n’ebe ụwa kewara ụzọ abụọ, ndị ozi ala ọzọ na-anagide okpomọkụ na ikuku mmiri na-akpabi ume iji wee jiri ozi ọma ahụ ruo na nke ndị bi n’ebe ahụ. Nkwurịta okwu pụrụ ọbụna ịbụ ihe ịma aka dị ukwuu karị. Agwaetiti ma ọ bụ ìgwè agwaetiti nke ọ bụla nwere asụsụ nke ya—ụfọdụ bụ ndị a na-amaghị, nke na e dekọghị ha ọbụna n’akwụkwọ ọkọwa okwu—ọ pụkwara iwe ọtụtụ afọ tupu onye bịara ọhụrụ enwee ike ịsụ ha nke ọma. Iji nyere ndị nọ n’agwaetiti ndị a nwere ọdịnala dịgasị iche iche aka ịghọta Bible, alaka ụlọ ọrụ Guam na-ebipụta akwụkwọ n’asụsụ 11, a na-asụ 9 n’ime ha kpọmkwem na Micronesia.
Agwaetiti ụfọdụ dịpụrụ iche kpam kpam nke na a pụrụ irute na ha nanị site n’ụgbọ epeepe. Ebe obibi ndị ozi ala ọzọ nke Tol dị na Chuuk (Truk) dị n’agwaetiti dị otú ahụ, ndị ozi ala ọzọ nọkwa n’ebe ahụ na-adabere n’ebe ígwè ọrụ ndị na-adọta ike anyanwụ dị inye ha ọkụ eletrik nanị maka hour ole na ole kwa ụbọchị.
Ná ngụkọta, e nwere 14 ebe obibi ndị ozi ala ọzọ n’akụkụ nile nke Micronesia, bụ́ nke ga-aharu ka ókèala kọntinent United States n’ibu. N’ime ihe karịrị 400,000 mmadụ ndị bi n’ógbè ahụ, 1,000 bụ ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ, ndị a haziri gaa na 20 ọgbakọ na 3 ìgwè ndị dịpụrụ iche.
Ọ bụ ezie na ndị Micronesia n’ozuzu ha nwere omume enyi, omenala okpukpe ndị ebe ahụ na nrụgide ezinụlọ na-egbu mmụọ nke ọtụtụ ndị pụọ n’ịnakwere eziokwu nke Alaeze Chineke. Ya mere ọ bụ ezie na ọrụ nkwusa ahụ na-amụba n’ebe ahụ nile (1,000 ndị nkwusa alaeze ahụ na-eduzi ihe karịrị 2,000 ọmụmụ Bible), ọgbakọ na ìgwè ụfọdụ ka dịkwa ntakịrị. Dị ka ihe atụ, e nwere nanị ndị nkwusa 5 n’agwaetiti nke Tinian, nanị ndị nkwusa 7 n’agwaetiti nke Nauru, ọgbakọ ndị dịkwa na Yap, Kosrae, na Rota nwere ihe na-erughị 40 ndị nkwusa n’otu n’otu. Otú o sina dị, ndị ozi ala ọzọ ụfọdụ anọwo n’ọrụ ha ruo ihe karịrị 20 afọ. N’ụzọ dị ịrịba ama, ndị ozi ala ọzọ isii nile ahụ nọ n’agwaetiti Belau anọwo n’ebe ahụ ọ dịkarịa ala 12 afọ.
Nye ndị ahụ tachiworo obi, ụgwọ ọrụ ha dị ukwuu. E nwere ohere ndị na-adapụta kwa ụbọchị ịhụ ihe ịtụnanya nke ịma mma nke ihe ndị Jehova kere. Agwaetiti ndị ahụ ala ha na-eme nri nke Micronesia gbasara dị ka obere ọla na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ n’elu mmiri na-acha anụnụ anụnụ nke Pacific. Ọtụtụ kilomita nke ụsọ osimiri ndị mmadụ na-ejupụtaghị na ala ndị kpụkọrọ gburugburu mmiri, bụ́ ndị jupụtara n’azụ ndị tụrụ àgwà, na-adọrọ mmasị nke ndị na-eji ihe e ji eku ume ná mmiri eme ihe ije mee nchọgharị n’ụfọdụ akụkụ ime mmiri ndị kasị maa mma ogwugwu n’ụwa. Ná ngwụsị nke ụbọchị ọ bụlakwa, a na-ahụ ọdịda anyanwụ nke na-akpali akpali n’osimiri ahụ.
Otú ọ dị, ụgwọ ọrụ kasị ukwuu bụ ihe ùgwù nke ijere Jehova ozi site n’ịgwa ndị ọzọ banyere nkwa ya ndị dị ebube maka ọdịnihu. N’ihi na ndị ozi ala ọzọ nke Micronesia nọgidere na-achọ inweta ụgwọ ọrụ ahụ, ha na-emezu okwu ndị ahụ dị n’Aịsaịa 42:12: “Ka ha nye Jehova nsọpụrụ, gosikwa otuto ya n’agwaetiti nile.”
[Map/Foto dị na peeji nke 31]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Barrigada, Guam
Santa Rita, Guam
Koror, Belau
Dublon, Chuuk (Truk)
Moen, Chuuk (Truk)
Faro Tol, Chuuk (Truk)
Tarawa, Kiribati
Lelu, Kosrae
Ebeye
Marshall Islands
Majuro
Kolonia, Pohnpei
Songsong, Rota
Chalan Kanoa, Saipan
Yap
MICRONESIA
MELANESIA
CAROLINE ISLANDS
PACIFIC OCEAN
PHILIPPINES
NEW GUINEA
EQUATOR
[Foto]
Ndị ozi ala ọzọ zukọrọ na Guam, June 1992