“Tupu A Mụpụta Ugwu Nile”
“EBE obibi ka gị onwe gị bụworo anyị n’ọgbọ nile. Tupu a mụpụta ugwu nile ma ọ bụ tupu ị kpụpụta elu ala na ụwa, site na mgbe ebighị ebi ruo na mgbe ebighị ebi, gị onwe gị bụ Chineke.” (Abụ Ọma 90:1, 2, New International Version) Ọ bụ Onye Okike anyị ka a gwara okwu ndị ahụ, leekwa ihe nkasi obi ha bụ—karịsịa n’oge a, mgbe o yiri ka ọ dịghị ihe ọ bụla na-adịgide adịgide!
N’ọnọdụ akụ na ụba na-adakpọ adakpọ, mmadụ ole na ole na-enwe obi ike banyere ọdịnihu. Oké mmụba a na-enwe ná mpụ na ịṅụ ọgwụ ọjọọ agbanwewo obodo ụfọdụ ịghọ ọgbọ agha. Ọbụna njikọ ahụ meworo ochie, bụ́ ezinụlọ, na-adakpọ adakpọ. Anyị na-anụ ihe ọhụrụ ndị dị ka ezinụlọ ndị na-edina ụdị onwe ha. Ezinụlọ ndị e nwere nanị nne ma ọ bụ nna na-amụba n’ọnụ ọgụgụ, ọtụtụ mgbe nanị nne ma ọ bụ nna ahụ na-anagide oké ihe isi ike. E tisawo udo nke ọtụtụ ezinụlọ site n’ihe arụ ndị dị otú ahụ, dị ka mmadụ iti onye ọ na-alụ ihe na imetọ ụmụaka.
Ònye ga-eduzi anyị ịgabiga oge ihe isi ike ndị a? Leenụ, e nweghị ụkọ ndụmọdụ site n’aka ndị ọkà n’akparamagwa, agụmakwụkwọ, na ndị ọzọ, ma ihe ka ọtụtụ n’ime ya na-emegiderịta onwe ha. Ruo otu ọgbọ zuru ezu n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa, Dr. Benjamin Spock bụ onye ndụmọdụ kasị pụta ìhè n’okwu banyere inye ụmụaka ọzụzụ. Mgbe ahụ o kwetara na ndụmọdụ ya abụwo nke hiere ụzọ!
Lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya karị inwe Chineke dị ka “ebe obibi” anyị! N’oge ndị a nke ọgba aghara, ọ bụ nkume nke guzosiri ike, na-adị “site na mgbe ebighị ebi ruo na mgbe ebighị ebi.” O kwuru banyere onwe ya site n’ọnụ onye amụma bụ́ Malakaị, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.” (Malakaị 3:6) Ụkpụrụ nile nke Chineke, dị ka e dekọrọ ha na Bible, bụ ndị a pụrụ ịdabere na ha kpam kpam. Ọ dịwo adị “tupu a mụpụta ugwu nile,” ndụmọdụ ya, nke a pụrụ inweta n’Akwụkwọ Nsọ, dabeere n’amamihe ebighị ebi ya. Ọ bụ kpọmkwem ihe dị anyị mkpa iji nweta obi ụtọ na ihe ịga nke ọma.
Mgbe ahụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya inwe obi ike n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Na-amụ ya iji rite uru site n’amamihe Chineke. Tụkwasị obi n’ihe ị na-amụta, kwekwa ka ọ bụrụ ìhè iduzi gị n’okporo ụzọ nke ndụ. (Abụ Ọma 119:105) Ọ bụ nanị ndị na-eme otú ahụ nwere ihe mere ha ga-eji nwee obi ike n’ọdịnihu, nweekwa ezi udo nke uche.