Ụdị Ihe Nchọpụta Dị Iche na Bahamas
DỊ KA nkume nzọkwasị ụkwụ ndị gabigara oké osimiri na-egbuke egbuke nke na-acha anụnụ anụnụ nke dị n’etiti Florida na Cuba, usoro mgbasa ozi ụwa lekwasịrị Bahamas anya n’ụzọ a na-emetụbeghị mbụ na 1992. N’ihi gịnị? N’ihi na ọtụtụ ndị ọchịchị na-ele Bahamas anya dị ka ala mbụ Christopher Columbus hụrụ ná njem ya mere ihe akụkọ na 1492, bụ́ mgbe ọ chọpụtara kọntinenti nile nke America. Ememe 500 afọ nke Columbus ịzọ ụkwụ n’ala n’October 12 dọtara mmasị mba dị iche iche.
Ka o sina dị, oké mkpali nke ememe narị afọ ise ahụ agaghị n’enweghị ihe ndọghachi azụ. Ka ọ na-agwa nzukọ nke 23 nke òtù National Conference of Black Lawyers, a kọrọ na John Carew (prọfesọ nke ihe ọmụma mba dị iche iche) kwuru na Columbus “kpatara oké igbu ọchụ n’ókèala Caribbean ahụ.”—The Nassau Guardian.
Taa, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime 250,000 ụmụ amaala bi na Bahamas pụrụ ịkọ usoro ọmụmụ ya laa azụ ná ndị obodo ahụ dị n’udo bụ́ ndị Columbus zutere ma kọwaa dị ka “ndị gbasiri ike, nwee ọmarịcha ahụ na ihu mara nnọọ mma.” Gịnị mere ndị ahụ bi n’agwaetiti a? Akwụkwọ bụ́ A History of the Bahamas na-aza, sị: “N’agbata afọ 1500 na 1520, e buuru mmadụ dum bi na Bahamas, ma eleghị anya ihe dị ka 20,000 ndị Lucayo laa” dị ka ohu ịrụ ọrụ n’ebe ndị Spain na-egwupụta ọlaedo na Hispaniola.
Ebe e si otú a mee ka mmadụ ghara ibikwa na ya, ndị Britain, e mesịakwa ìgwè ndị buru ibu nke “ndị nguzosi ike n’ihe” “chọpụtaghachiri” Bahamas. Ndị nguzosi ike n’ihe ahụ bụ karịsịa ndị nwere ugbo si n’ógbè ukwu dị iche iche nke America. N’ihi iguzosi ike n’ihe nye Ọchịchị Britain, ha gbapụrụ iji ghara iso lụọ agha nnwere onwe na-achọ ịmalite na kọntinenti ahụ. Ndị Bahamas nke taa bụ karịsịa ụmụ nke ndị nkwabata ndị a na ndị ohu ha. Mgbe a tọhapụrụ ha, ọtụtụ n’ime ndị ohu ahụ nọgidere na-aza aha ndị nwebu ha.
Ụdị Ihe Nchọpụta Ọzọ
Ihe ịrụ ụka adịkebeghị ya na Columbus lere onwe ya anya dị ka onye a pụrụ ịkpọ onye ozi ala ọzọ. A kọrọ na ọ sịrị: “Chineke mere m onye na-eje ozi nke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. . . . O gosiri m ebe m ga-achọta ya.” Ma, mbibi nke sochiri nwapụtara ihe dị iche. “Eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” nke ezi omume nke Chineke kwere nkwa ya aghaghị ichere maka ụdị ihe nchọpụta dị iche.—2 Pita 3:13.
Na 1926, Edward McKenzie na nwunye ya rutere Bahamas. N’adịghị ka ndị nchọpụta ndị ọzọ bu ha ụzọ, di na nwunye nke a dị obi umeala bụ́ ndị si Jamaica bịara ịchọ ndị nwere obi eziokwu ndị ha pụrụ inyefe akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Ha bụ ndị mbụ wetara ozi ọma Alaeze Chineke na Bahamas. (Matiu 13:44; 24:14) E mesịa n’afọ ahụ ndị Jamaica abụọ ọzọ, Clarence Walters na Rachel Gregory sonyeere ha. Ka ọ na-erule 1928 e nwere ndị nkwusa Alaeze asaa na Bahamas. Ruo afọ anọ ha rụsiri ọrụ ike n’ikwusara ndị agwaetiti ahụ ozi ọma.
Mgbe ahụ E. P. Roberts bịara, bụ́ ọkà okwu dị ike nke si Trinidad. Okwu ihu ọha ndị o kwuru n’ụlọ nzukọ ndị a ma ama mere ihe dị ukwuu ịchụpụsị nkwenkwe ụgha ma jiri eziokwu Bible kpalie obi ọtụtụ ndị. Otu onye ji oké mmasị nọdụ ala n’etiti ndị na-ege ntị n’otu n’ime nzukọ ndị ahụ bụ Donald Oscar Murray, nke e mesịrị jiri ịhụnanya mara dị ka D. O. O mesịrị bute ụzọ n’ọrụ ahụ.
Onye ozi ala ọzọ bụ Nancy Porter na-echeta nke ọma otú D. O. Murray si kwuo okwu banyere ekpere ndị si n’ala ala obi o kpere maka enyemaka n’ọrụ nkwusa ahụ. Na 1947, Nancy na di ya, George, tinyere abụọ ndị ọzọ, ghọrọ ndị ozi ala ọzọ mbụ nke Watch Tower Society zigara na Bahamas. Ọ na-echeta, sị: “Nzukọ mbụ anyị gara bụ ihe m chere na ọ dịghị mgbe anyị ga-echezọ ya. E nwere ihe dị ka mmadụ itoolu ma ọ bụ iri bịara. Nwanna Murray bụ onye isi oche ma meghee n’ekpere, na-ekele Jehova maka nrute nke ndị ozi ala ọzọ ahụ. Ọ sịrị na e nwere mkpa maka enyemaka, ‘anyị ekpewokwa ekpere maka enyemaka ruo ogologo oge.’ Society ekwewo nkwa izite enyemaka, ugbu a anyị nọkwa ebe a. Ekpere ahụ metụrụ anyị n’ahụ nke ukwuu nke na o mere ka anyị nwee mmetụta nke na anyị chọrọ ịnọrọ ghara ịchọ ịla mgbe ọ bụla.” Ugbu a, mgbe ihe dị ka 45 afọ gafeworo, n’agbanyeghịkwa ọnwụ nke di ya, Nwanna Nwanyị Porter ka na-ebugara ndị agwaetiti ahụ ozi nkasi obi nke Alaeze.
Karịsịa kemgbe 1947 ka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na Bahamas riteworo uru nke ukwuu site ná ndị ozi oge nile na ndị ọzọ jiworo ụgbọ mmiri leta agwaetiti ndị ahụ. Ọtụtụ mgbe ọ na-adị mkpa ha ịgafe ụsọ osimiri bụ ájá ájá nke dị aghụghọ na mmiri na-emighị emi ma na-amatụ ebili wee rịgota n’elu ụsọ osimiri iji wegara ndị bi n’ebe ndị dịpụrụ adịpụ ozi ọma ahụ. Mgbalị ndị mbụ ahụ na-amịpụta mkpụrụ ọbụna ruo taa.
E ruru ọnọdụ dị ịrịba ama na 1950. Na December nke afọ ahụ, Nathan H. Knorr, onye isi oche Watch Tower Society n’oge ahụ, na odeakwụkwọ ya, Milton G. Henschel, letara Bahamas nke mbụ ha. Knorr gwara 312 mmadụ okwu, bụ́ ndị jupụtara n’ụlọ nzukọ Mother’s Club Hall, bụ ụlọ nta e ji osisi wuo n’okporo ámá Jail Alley. Ọtụtụ ndị a ma ama nọ ya, gụnyere otu onye so ná ndị ome iwu na onye editọ nke otu akwụkwọ akụkọ a na-ebi kwa ụbọchị. N’abalị ahụ, Nwanna Knorr mara ọkwa nhiwe nke alaka ụlọ ọrụ Society na Bahamas.
Nzaghachi Ndị Àgwàetiti ahụ n’Ụzọ Enyi
Ndị Bahamas ahụ nwere àgwà enyi n’ozuzu ha egewo ntị n’ozi Alaeze ahụ. Ma, ọ ka bụkwa ihe ịma aka irute ha nile. Gịnị mere o ji dị otú a? Ọ bụ ezie na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị ahụ bi n’isi obodo, bụ́ Nassau, na na Grand Bahama dị ya n’akụkụ, ndị ọzọ bisasịrị ebisasị n’agwaetiti 15 dum n’ime ndị ka ibu na ụfọdụ n’ime 700 agwaetiti nta ndị ọzọ mejupụtara ìgwè agwaetiti nke a.
N’ihi ịhụ mkpa e nwere, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke Ndịàmà bi n’obodo ahụ na n’ebe ndị ọzọ akwagawo n’ógbè agwaetiti ndị dị nta iji nye aka n’ọrụ nkwusa ahụ. N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ha emewo otú ahụ site n’ịchụ àjà dị ukwuu na mmefu nke onwe ha. Ma e nyeghachiwo ụgwọ ọrụ n’ụba nke ukwuu maka mgbalị nile ha.
Otu di na nwunye ka lụrụ ọhụrụ kwagara n’agwaetiti ukwu bụ Andros. Ka ha na-ekwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ otu ụbọchị, ha zutere onye Haiti kwabatara akwabata. E nwere ọtụtụ puku ndị a na Bahamas. Nwoke ahụ kwere ozugbo inwe ọmụmụ Bible ebe obibi. A malitere otu kpọmkwem n’abalị ahụ, na-eji akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala nke Bekee na nke French. N’uhuruchi na-esonụ, ọ bịara nzukọ ndị Kraịst nke mbụ ya. Ngwa ngwa, nwoke ahụ kwụsịrị ise sịga, nwee ọganihu dị ngwa, ma malite ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ.
N’ụtụtụ ụbọchị a gaje ime nwoke a baptism, ọ natara otu tepụ site n’aka ezinụlọ ya na Haiti, ọ bụ ezie na ọ nataghị ozi ha eri afọ ise. Gịnị ka ha nwere ịgwa ya? Ha kọrọ otú ha siworo ghọọ Ndịàmà Jehova. Ha kọwara na nwanne ya nwanyị abụrụworị ọsụ ụzọ oge nile, ma ọ bụ onye nkwusa oge nile, ha gbakwara ya ume ịchọta Ndịàmà wee soro ha mụọ Bible. Ọ baghị uru ikwuwe na e mere nwoke ahụ baptism ebe ọ na-enwe obi ike zuru ezu na ya na-eme ihe nke ziri ezi.
Nzaghachi ịnụ ọkụ n’obi ndị dị otú a emewo Ndịàmà obodo ahụ obi ụtọ. Ọnụ ọgụgụ ha nọgidere na-arị elu anakwerewo ọrụ ahụ dị ka ndị nkwusa oge nile, nke a etinyewokwa ihe n’uto ahụ. Ọ bụ ya mere na na 1988 ọnụ ọgụgụ ndị mkpọsa Alaeze na Bahamas ruru 1,000. Taa, n’ọgbakọ 19, e nwere ihe dị ka 1,300 ndị nkwusa Alaeze, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’agwaetiti nile ndị bụ isi.
A Kwadebere Ha Maka Ọdịnihu
N’ihi uto n’ọnụ ọgụgụ ha, Ndịàmà ahụ enwewo ihe isi ike ịchọta ebe buru ibu ha ga-akwụli ụgwọ ya bụ́ nke ga-abata mgbakọ kwa afọ ha. A ghaghị ime mgbakọ abụọ n’agwaetiti ndị dị iche iji hụ maka ìgwè mmadụ ahụ. Otú a, e mere atụmatụ iwu Ụlọ Mgbakọ na alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ. A malitere ọrụ na December 1989. Ọtụtụ narị ndị ọrụ afọ ofufo si mba nile na n’obodo ahụ rụrụ ọrụ n’ihe owuwu ahụ ‘site ná mkpụrụ obi dum dị ka ha na-arụrụ Jehova.’—Kọlọsi 3:23.
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na mgbakọta Ndịàmà kasị ibu na nke kasị obi ụtọ na Bahamas ruo taa weere ọnọdụ n’oge a raara alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ na Ụlọ Mgbakọ ahụ nye na February 8 na 9, 1992. Ịtụ anya oké ihe nọ na-arị elu ka ụmụnna n’akụkụ nile nke agwaetiti ndị ahụ mere nkwadebe maka ememe ahụ. Ihu igwe jụrụ oyi n’ụzọ ọ na-adịbughị adị, mmiri zokwara n’abalị tupu usoro ihe omume nraranye ahụ. Ma ọ dịghị ihe ọ bụla pụrụ ịbịada ọṅụ nke ìgwè mmadụ ahụ dị 2,714 na-aṅụrị ọṅụ ka John E. Barr, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, kwuru okwu nraranye ahụ, nke isiokwu ya bụ “Abụ Ịba Ụba nke Ọchịchị Chineke.”
Obi mmadụ nile jupụtara n’ekele nye Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, maka oge nke ọṅụ na mkpali dị otú a. Ndị bịara kpebisikwuru ike itinye ume ha nile n’ọrụ nkụzi ime mmụọ nke mere ka mgbasa nke a a na-ahụ anya dị mkpa.
Ma ihe Columbus chọpụtara ọ̀ bụ ebe mmalite maka ọnọdụ ka mma nye agwaetiti ndị a ka ga-anọgide bụrụ nke a na-arụ ụka ya. Ka o sina dị, e jikọrọ Ndịàmà Jehova na Bahamas n’obi ekele ha nye Chineke maka iweta ndị mkpọsa Alaeze ndị mmụọ ha nke iji onwe onye achụ àjà kwaliri ha iji obi ike banye n’ihe a na-amaghị ama ma weta ozi ọma ahụ dị ebube ná mmiri ime mmụọ ọ na-adịbeghị ụgbọ gbara ya. Ọrụ ha na “nchọpụta” ha arụpụtaworo ndị nile na-achọ eziokwu na Bahamas akụ̀ ime mmụọ na-enweghị atụ.
[Map/Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]
Grand Bahama
Abaco
Andros
New Providence
Nassau
Eleuthera
Cat Island
Great Exuma
Rum Cay
San Salvador
Long Island
Crooked Island
Acklins Island
Mayaguana
Little Inagua
Great Inagua
CARIBBEAN SEA
FLORIDA
CUBA
[Foto]
Ime nkwusa n’Ahịa Straw
Ịrịgota n’elu ụsọ osimiri iji kerịta ozi ọma ahụ
Alaka ụlọ ọrụ ahụ dị n’elu ugwu nke chere Ụlọ Mgbakọ ahụ ihu