Ịmụkwasị Ìhè N’ọnụnọ Nke Kraịst
“Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, . . . ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya.”—MATIU 25:31, 32.
1. Gịnị ka ndị ụkọchukwu Krisendọm kọwaworo okwu ndị dị na Matiu 24:3 ịbụ?
ỤBỌCHỊ atọ tupu ọnwụ Jisọs, mmadụ anọ ná ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya ma jụọ ya n’ụzọ iji ihe akpọrọ ihe, sị: “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-abụ? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọbịbịa [Greek, pa·rou·siʹa] gị, na nke ọgwụgwụ ụwa?” Eri ọtụtụ narị afọ, ndị ndú okpukpe na ndị edemede nke Krisendọm akọwawo okwu ndị a nke Jisọs na Matiu 24:3 (King James Version) ịpụta na ọ ga-abịa ọzọ n’anụ ahụ ka ihe nile a kpọrọ mmadụ hụ ya anya. N’ihi nke a, ha akụziwo na nlọghachi Kraịst ga-enwe ngosipụta na oké ememe nke ịma mma. Ha na-akpọ ya ọbịbịa nke abụọ nke Kraịst. Ma echiche ndị ha nwere hà ziri ezi?
2, 3. (a) Ọdịiche dị aṅaa ka Mpịakọta nke 2 nke Studies in the Scriptures mere n’etiti okwu ndị ahụ bụ “ọbịbịa” na “ọnụnọ”? (b) Gịnị ka ndị Jehova mesịrị ghọta banyere ihe pa·rou·siʹa Kraịst pụtara?
2 Ka ọ na-erule 1889, dị ka ndị na-enye ìhè nke narị afọ nke 19, ndị Jehova e tere mmanụ enwetaworị mgbazi olu n’okwu metụtara nlọghachi Kraịst. Ná mpịakọta nke 2 nke akwụkwọ bụ́ Studies in the Scriptures, peji nke 158 ruo 161, Charles T. Russell, onye isi oche mbụ nke Watch Tower Bible and Tract Society dere, sị: “Parousia . . . na-egosipụta ọnụnọ, e kwesịghịkwa ịsụgharị ya ịbụ ọbịbịa, dị ka ọ dị na Bible Bekee ọtụtụ ji eme ihe . . . ‘Emphatic Diaglott,’ bụ́ nsụgharị Agba Ọhụrụ nke bara oké uru, dere parousia n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ịbụ ọnụnọ . . . , ọ bụghị nke ọbịbịa, dị ka ọ ka nọ n’ụzọ, kama ọ bụ ọnụnọ, dị ka mgbe ọ bịarutesịrị, [Jisọs] na-asị, ‘Dị ka ọ dị n’ụbọchị Noa, otú ahụ ka ọ ga-adịkwa na parousia [ọnụnọ] nke Nwa nke mmadụ.’ Rịba ama na myirịta ahụ e nwere abụghị n’etiti ọbịbịa Noa na ọbịbịa nke Onyenwe anyị . . . Ya mere, ọdịiche e nwere bụ n’etiti oge nke ọnụnọ Noa n’etiti ndị ahụ ‘tupu iju mmiri ahụ,’ na oge ọnụnọ Kraịst n’ụwa, ná mpụta ya nke abụọ, ‘tupu ọkụ ahụ’—bụ́ oké nsogbu nke Ụbọchị Onyenwe anyị [Jehova] nke ọgbọ nke a ga-eji bịa ná njedebe.”—Matiu 24:37.
3 Ya mere ndị Jehova nke narị afọ nke 19 ghọtara nke ọma na pa·rou·siʹa nke Kraịst ga-abụ nke a na-agaghị ahụ anya. Ha bịarukwara ná nghọta bụ na ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl ga-ewere ọnọdụ n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke 1914. Ka ìhè ime mmụọ na-agawanye n’ihu, ha mesịrị ghọta na e mere Jisọs Kraịst eze n’eluigwe dị ka Eze nke Alaeze ahụ n’otu afọ ahụ, bụ́ 1914.—Ilu 4:18; Daniel 7:13, 14; Luk 21:24; Mkpughe 11:15.
“Ọnụnọ nke Onyenwe Anyị”
4. “Ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst” na-ezo aka na gịnị?
4 Ya mere, n’oge anyị, gịnị ka okwu Bible ahụ bụ “ọnụnọ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst” pụtara? (1 Ndị Tesalọnaịka 5:23, NW) Otu akwụkwọ kwuru na okwu ahụ bụ “ọnụnọ,” pa·rou·siʹa, “ghọrọ okwu e ji eme ihe maka nleta nke onye nọ n’ọkwá dị elu, karị[sịa], ndị eze na ndị ọchịchị alaeze ukwu ịbịa leta otu ógbè.” Ya mere okwu a na-ezo aka n’ọnụnọ ịchị achị nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dị ka Eze, malite na 1914 na mgbe ọ gafesịrị, ozugbo e mesịrị ya eze n’eluigwe. Ọ nọ anọ n’ụzọ a na-apụghị ịhụ ya anya iji ‘nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro ya,’ na-achị achị dị ka Eze iji mezuo iwu amụma ahụ. (Abụ Ọma 110:2) Ruo ihe dị ka 79 afọ, ụmụ mmadụ n’ụwa anọwo na-enwe mmetụta nke ọnụnọ ịchị achị Kraịst anya na-adịghị ahụ.
5. Ihe ndị dị aṅaa mere n’oge pa·rou·siʹa ka a ga-atụle n’isiokwu atọ nke magazin a?
5 N’usoro a nke isiokwu atọ, anyị ga-atụle ihe àmà ndị na-akpali akpali nke ihe ndị Alaeze Kraịst na-arụzu n’oge a. Na mbụ, anyị ga-ewepụta ọtụtụ amụma Bible ndị na-ekwu maka ihe omume ndị werewooro ọnọdụ ma ọ bụ ọbụna na-ewere ọnọdụ ugbu a. Nke abụọ, anyị ga-akọwa oké ọrụ nke ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke Jisọs ji na-eme ihe n’oge a nile nke ọnụnọ ịchị achị ya, na-arụzu. (Matiu 24:45-47) Isiokwu nke atọ ga-akọwara anyị ngwụsị nke dị ebube, oge nke “mkpagbu ukwu” ahụ. Nke ahụ bụ oge mgbe Jisọs ga-abịa dị ka Onye Na-eme Ihe Jehova Kpere n’Ikpe iji bibie ndị ajọ omume ma zọpụta ndị ezi omume. (Matiu 24:21, 29-31) Pọl onyeozi kọwara oge ahụ nke mbibi dị ka nke “inyeghachi unu bụ́ ndị a na-akpagbu, ahụ efè, anyị na unu, n’ime mkpughe nke Onyenwe anyị Jisọs site n’eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi nke ike ya, n’ime ọkụ na-ere ere, na-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-amataghị Chineke, ha na ndị na-aṅaghị ntị ozi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs.”—2 Ndị Tesalọnaịka 1:7, 8.
Ihe Ịrịba Ama Ahụ
6. Ihe ịrịba ama dị aṅaa nke ọtụtụ ihe mejupụtara ka a kọwara na Matiu isi 24 na 25?
6 Narị afọ iri na itoolu gara aga, ndị na-eso ụzọ Jisọs bụ́ ndị na-enye ìhè jụrụ ya maka ihe ịrịba ama, ma ọ bụ ihe àmà, nke ọnụnọ ya dị n’ihu n’ike Alaeze. Azịza ya, nke e dekọrọ n’isi nke 24 na 25 nke Matiu, nyere amụma banyere ihe ịrịba ama nke ọtụtụ ihe mejupụtara, nke a na-emezu ihe nile dị na ya ugbu a n’ụzọ metụtara mba nile. Mmezu nke ihe ịrịba ama ahụ na-aka akara oge ihe isi ike na oké ule. Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iduhie unu. N’ihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa n’aha m, sị, Mụ onwe m bụ Kraịst ahụ; ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ. Unu gaje ịnụ okwu agha dị iche iche na akụkọ agha dị iche iche: leenụ ka unu ghara ịtụ ụjọ: n’ihi na ihe ndị a aghaghị ịpụta; ma ọgwụgwụ ihe nile akaerughị.”—Matiu 24:4-6.
7. Akụkụ ndị dị aṅaa nke ihe ịrịba ama ahụ ka anyị hụworo mmezu ya eri 1914?
7 Jisọs bukwara amụma na a ga-enwe agha n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-enwetụbeghị mbụ. Ná mmezu ya, a kpọwo abụọ n’ime ndị a agha ụwa, otu bụ site na 1914 ruo 1918, nke abụọ kwa bụ site na 1939 ruo 1945. Ọzọkwa, ọ sịrị na a ga-enwe ụkọ nri na ala ọma jijiji n’ebe dị iche iche. A ga-akpagbu ezi ndị Kraịst nke ukwuu. N’ịbụ eziokwu nke amụma ahụ, Ndịàmà Jehova, ndị na-enye ìhè n’oge a, enwetawo mkpagbu n’iri afọ asatọ gaworonụ ka ha na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke “n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.” (Matiu 24:7-14) Akwụkwọ Yearbook of Jehovah’s Witnesses nke ọ bụla na-etinye ihe n’ihe àmà nke na a na-emezu akụkụ ndị a nke ihe ịrịba ama ahụ.
8, 9. (a) Gịnị ka ọnụnọ ịchị achị Jisọs gụnyere? (b) Gịnị ka amụma Jisọs banyere Kraịst ụgha na-egosi banyere ebe na otú ọnụnọ ya ga-adị?
8 Ebe ọbụbụeze Jisọs na-ejikọta ụwa nile, ezi ofufe na-agbasa na kọntinenti nile. Ọnụnọ (pa·rou·siʹa) ịchị achị ya bụ oge inyocha ụwa nile. (1 Pita 2:12) Ma è nwere isi obodo ma ọ bụ ebe a pụrụ ijekwuru Jisọs? Jisọs zara nke a site n’ibu amụma na n’ịtụ anya ọnụnọ ya, ndị Kraịst ụgha ga-ebilite. Ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ndị mmadụ agwa unu, sị, ‘Lee! Ọ [Kraịst] nọ n’ọhịa,’ unu apụla; ‘Lee! Ọ nọ n’ụlọ dị n’ime,’ unu ekwela ya. N’ihi na dị nnọọ ka àmụ̀mà na-esi n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ apụta ma gburu ruo akụkụ ebe ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka ọnụnọ [pa·rou·siʹa] Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:24, 26, 27, NW.
9 Karịa onye ọ bụla ọzọ n’ụwa, Jisọs, “Nwa nke mmadụ,” maara ebe a ga-achọta ya mgbe ọnụnọ ya malitere n’ezie. Ọ gaghị anọ ebe a ma ọ bụ n’ebe ahụ ma ọ bụ n’ebe ọ bụla kpọmkwem n’ụwa. Ọ gaghị egosi onwe ya n’ebe dịpụrụ adịpụ, “n’ọhịa,” ka ndị ga-achọ Mesaịa ahụ wee nwee ike ịbịakwute ya n’ebe ahụ, ebe ndị isi ọchịchị nke ala ahụ na-agaghị ahụ ya, ebe ndị na-eso ụzọ ya pụrụ ịnọ mee nkwadebe n’okpuru nduzi ya, na-ejikere ịkwatu ọchịchị ma guzobe ya dị ka Onye Ọchịchị bụ́ Mesaịa nke ụwa. Ọzọkwa, ọ gaghị ezo onwe ya ezo “n’ụlọ dị n’ime,” ebe ọ nọ abụrụ nke nanị mmadụ ole na ole a họpụtara maara, ka o wee nwee ike ịnọ n’ebe ahụ, ebe a na-agaghị ahụ ya anya ma chọta ya, soro ndị ọzọ jikọọ aka ma mee atụmatụ nzuzo maka ịkwatu ọchịchị nile nke ụwa ma mee ka e tee ya mmanụ dị ka Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ee e!
10. Olee otú àmụ̀mà dị iche iche nke eziokwu Bible siworo gbuo n’ụzọ zuru ụwa ọnụ?
10 N’ụzọ megidere nke ahụ, a gaghị enwe ihe a ga-ezo ezo banyere ọbịbịa Jisọs bịaworo dị ka Eze, ná mmalite ọnụnọ ịchị achị ya. Dị ka Jisọs buru n’amụma, n’ụzọ zuru ụwa ọnụ, àmụ̀mà nke eziokwu Bible anọgidewo na-egbu n’ókèala dị ukwuu site n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ. N’ezie, dị ka ndị na-enye ìhè n’oge ndị a, Ndịàmà Jehova na-egosipụta onwe ha ịbụ “ìhè nke mba nile, ịbụ ihe nzọpụta [nke Jehova] ruo nsọtụ ụwa.”—Aịsaịa 49:6.
Ọrụ Ndị Mmụọ Ozi
11. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka e si jiri ìgwè ndị mmụọ ozi na-enwupụta ìhè nke Alaeze ahụ? (b) Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ìgwè dị aṅaa ka a chịkọbataworo òtù ọka ahụ?
11 Akụkụ ihe odide ndị ọzọ ndị metụtara ọnụnọ Jisọs na-akọwa ya dị ka onye usuu ndị mmụọ ozi ga-esonyere, ma ọ bụ onye ‘na-ezipụ’ ha. (Matiu 16:27; 24:31) N’ihe atụ nke ọka na ata, Jisọs kwuru na “ubi ahụ bụ ụwa” nakwa na “owuwe ihe ubi bụ ọgwụgwụ oge a; ndị ahụ na-ewe ihe ubi bụ ndị mmụọ ozi.” Otú ọ dị, nke a apụtaghị na n’oge ọnụnọ ya n’ike na ebube Alaeze, na ọ na-eji nanị ndị ozi bụ ndị mmụọ ozi eme ihe n’ozi ndị a na-eje n’ụwa. Na-amalite na 1919, ndị mmụọ ozi n’okpuru nduzi Jisọs kewapụrụ òtù ọka ahụ nke ndị e tere mmanụ e ji mmụọ nsọ mụta, bụ́ ndị ihe mere n’Agha Ụwa nke Mbụ chụsasịworo, a kwadebekwara ndị a maka irukwa ọrụ n’aha Eze ahụ. (Matiu 13:38-43) N’afọ ndị 1920, ọtụtụ ndị ọzọ weere nguzo ha maka Alaeze Chineke nke e guzobeworo ma bụrụ ndị e ji mmụọ Chineke tee mmanụ. N’ụzọ dị irè, a tụkwasịrị ndị a e tere mmanụ n’ọkwá nke ihe ahụ fọdụrụ nke dịbu adị. Ná ngụkọta, ha mejupụtara òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche maka ụbọchị anyị.
12. N’ọrụ dị aṅaa nke ime ka a dị ọcha ka ndị mmụọ ozi kerewooro òkè, gịnịkwa ka ọ rụpụtawooro ụwa?
12 Ihe atụ ọzọ nke nkere òkè ndị mmụọ ozi n’oge ọnụnọ Jisọs na mgbe e mesịrị ya eze na 1914 bụ nke e dekọrọ ná Mkpughe 12:7-9: “Maịkael [Jisọs Kraịst] na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide dragọn ahụ, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya wee buo agha; ha enweghịkwa ike, a hụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.” Otú a, e mewo ka eluigwe nke dị n’elu dị ọcha ugbu a, na-ahapụ nanị ógbè elu ala nke Alaeze ahụ ịbụ nke a ga-emesịa mee ka ọ dị ọcha kpam kpam maka ido aha Jehova nsọ. N’afọ nke a bụ 1993, ịdọ aka ná ntị ahụ nke Chineke dịkwa irè: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa . . . n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”—Mkpughe 12:12.
Mbilite n’Ọnwụ Ịga Eluigwe
13, 14. (a) Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ nọwo na-aga n’ihu site 1918? (b) Gịnị ka Pọl na Jọn na-ekpughe banyere ihe fọdụrụnụ e tere mmanụ taa?
13 Ihe omume ọzọ dị ịtụnanya n’oge ọnụnọ Kraịst bụ mmalite nke mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe. Pọl onyeozi gosiri na ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ bụ́ ndị daworo n’ụra ọnwụ eri ogologo mgbe n’ili ha ga-abụ ndị mbụ a ga-eme ka ha dị ndụ ma soro Kraịst Jisọs biri n’ógbè ndị bụ mmụọ. E nyewo ihe àmà eri ọtụtụ afọ gara aga iji gosi na o yiri ka nke a o mere malite na 1918 gaa n’ihu, Pọl na-ede, sị: “A ga-eme ka mmadụ nile dị ndụ n’ime Kraịst. Kama onye ọ bụla n’ọkwá nke ya: Kraịst bụ́ mkpụrụ mbụ, e mesịa, ndị bụ nke Kraịst n’oge nke ọnụnọ [pa·rou·siʹa] ya.” (1 Ndị Kọrint 15:22, 23, NW) E mesiri mbilite n’ọnwụ nke ndị e tere mmanụ n’oge ọnụnọ Kraịst ike ná 1 Ndị Tesalọnaịka 4:15-17: “Nke a ka anyị na-agwa unu site n’okwu Jehova, na anyị ndị dị ndụ bụ́ ndị lanarịrị ruo n’ọnụnọ [pa·rou·siʹa] nke Onyenwe anyị agaghị ebu ndị daworo n’ụra ọnwụ ụzọ ma ọlị . . . Ndị nwụrụ n’ime Kraịst ga-ebukwa ụzọ si n’ọnwụ bilie: mgbe ahụ anyị onwe anyị, bụ́ ndị nọ ná ndụ, ndị a na-ahapụ, anyị na ha ka a ga-ewelikọ n’igwe ojii, izute Onyenwe anyị n’ime mbara eluigwe.” E nwere 144,000 ndị dịịrị Kraịst dị ka ndị e tere mmanụ bụ́ ndị ga-emesịa nweta ụgwọ ọrụ nke a magburu onwe ya.—Mkpughe 14:1.
14 Dị ka Pọl na-egosi, ndị so n’ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ bụ́ ndị nọ ndụ taa agaghị abanye n’Alaeze ahụ tupu ndị Kraịst oge gboo e tere mmanụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi e gburu n’ihi okwukwe ha na ndị na-eso ụzọ. Jọn onyeozi gara n’ihu ịkọwa ndị ahụ e tere mmanụ ndị nwụrụ n’oge a n’ụzọ dị otú a: “Ngọzi na-adịrị ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị ga-anwụ anwụ n’ime Onyenwe anyị site n’ugbu a: ee, ka mmụọ nsọ na-ekwu, ka ha wee si ná ndọgbu nile ha dọgburu onwe ha n’ọrụ zuru ike; n’ihi na ọrụ nile ha na-eso ha gaa,” ya bụ, n’ịdị adị ha mgbe ha bilitesịrị n’ọnwụ. (Mkpughe 14:13) Pọl na-asịkwa; “Lee, agwa m unu ihe omimi: ọ bụghị anyị nile ga-ada n’ụra ọnwụ, ma a ga-enwo anyị nile, n’oge dịkarịsịrị nta, n’otu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ikpeazụ: n’ihi na a ga-afụ opi, a ga-emekwa ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie n’apụghị ire ure, a ga-enwokwa anyị onwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:51, 52) Ị̀ hụlanụ ọrụ ebube dị ịtụnanya nke ahụ bụ!
15, 16. (a) Ihe atụ dị aṅaa ka Jisọs nyere na Luk 19:11-15, n’ihi gịnịkwa? (b) Olee otú amụma nke a siworo na-emezu?
15 N’otu mgbe ka Jisọs na-ekwusara otu ìgwè nke ụmụ azụ ya banyere Alaeze Chineke, o ji ihe ịma atụ mee ihe iji nyere ha aka ịgbazi echiche ndị na-ezighị ezi ha nwere. Ihe ndekọ ahụ na-agụ, sị: “Ha na-eche na alaeze Chineke gaje ịpụta ìhè ngwa ngwa. Ya mere ọ sịrị, Otu nwoke a mazuuru aha ya gara ala dị anya, ịnara alaeze nye onwe ya, na ịlaghachi. O wee kpọọ mmadụ iri n’ime ndị ohu ya, nye ha [iri pound ise], sị ha, Zụọnụ ahịa ruo mgbe m ga-abịa. . . . O wee ruo, mgbe ọ lọghachiri ọzọ, mgbe ọ natasịrị alaeze ya, na ọ sịrị ka a kpọọ ndị ohu ahụ, ndị o nyererịị ego ahụ, ka ha bịakwute ya, ka o wee mara ihe ha zụtararịị n’ahịa.”—Luk 19:11-15.
16 Jisọs bụ “nwoke” ahụ nke gara eluigwe, bụ́ “ala dị anya” ebe ọ ga-anata alaeze. Ọ natara Alaeze ahụ na 1914. Ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, Kraịst dị ka Eze, soro ndị na-asị na ha bụ ụmụ azụ ya mee mpịazi iji hụ ihe ha meworo n’ilekọta ọdịmma Alaeze ahụ e nyeworo ha n’aka ilekọta. A họọrọ mmadụ ole na ole ndị kwesịrị ntụkwasị obi ịnata ịja mma nke onyenwenụ ahụ, bụ́: “I mere nke ọma, ezi ohu: n’ihi na a hụrụ na i kwesịrị ka a tụkwasị gị obi n’ihe dịkarịsịrị nta, gị bụrụ onye ga-achị obodo iri.” (Luk 19:17) Oge a nke ọnụnọ Kraịst gụnyere ịga n’ihu na-arụsi ọrụ nkwusa Alaeze ike, tinyere mkpọsa nke ikpe Chineke megide ndị mmebi iwu, na ilekọtakwa ọrụ a so n’ikike e tinyere n’aka “ezi ohu” ahụ.
Nkwusa Zuru Ụwa Ọnụ
17. Ọṅụ dị aṅaa na-aka pa·rou·siʹa ahụ akara?
17 Olee ihe ọzọ ga-eme n’oge nke a nke pa·rou·siʹa? Ọ ga-abụ oge oké ọṅụ n’ọrụ nkwusa na n’inyere ndị ọhụrụ aka ịkwadebe maka nlanarị gabiga oké mkpagbu ahụ na-abịanụ. Ndị a nke “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị na-enyere ihe ahụ fọdụrụnụ aka, na-aghọ “akwụkwọ ozi ime ka mmadụ mara anyị.” (Mkpughe 7:9; 2 Ndị Kọrint 3:1-3) Pọl hotara ọṅụ nke ọrụ owuwe ihe ubi nke a mgbe ọ na-asị: “Gịnị bụ olileanya anyị ma ọ bụ ọṅụ anyị ma ọ bụ okpueze nke ite egwú ọṅụ anyị—leenụ, ọ́ bụghị unu n’ezie—n’ihu Onyenwe anyị Jisọs n’ọnụnọ [pa·rou·siʹa] ya?”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:19, NW.
Nọgide Na-adị Ọcha, Na-adịghịkwa Ịta Ụta
18. (a) Ekpere dị aṅaa nke Pọl na-ezo aka na pa·rou·siʹa ahụ? (b) Mmụọ dị aṅaa ka anyị nile na-aghaghị igosipụta n’oge a, n’ụzọ ndị dịkwa aṅaa?
18 Pọl kpekwara ekpere maka ime ka ndị dị ndụ n’oge a nke ọnụnọ Kraịst dị nsọ: “Ka Chineke nke udo mee ka unu dị nsọ kpam kpam. Ka e meekwa n’ụzọ nile ka ahụ ike nke mmụọ na mkpụrụ obi na anụ ahụ unu ụmụnna bụrụ nke e chebere n’ụzọ a na-apụghị ịta ụta n’ọnụnọ [pa·rou·siʹa] nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:23, NW) Ee, taa, ma ànyị so n’ihe fọdụrụnụ e tere mmanụ ma ànyị so n’ọnụ ọgụgụ ahụ dị ukwuu nke atụrụ ọzọ, mmụọ nke imekọ ihe n’otu na-ekekọ anyị ọnụ n’iguzosi ike n’ihe ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-adị ọcha ma bụrụ ndị a na-apụghị ịta ụta n’oge nke a pụrụ iche. N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ dị anyị mkpa inwe ndidi. Jemes dere, sị: “Ya mere, nweenụ ndidi, ụmụnna m, ruo ọnụnọ [pa·rou·siʹa] nke Onyenwe anyị. . . . Meenụ ka obi unu guzosie ike, n’ihi na ọnụnọ [pa·rou·siʹa] nke Onyenwe anyị adịwo nso.”—Jemes 5:7, 8, NW.
19. Olee ịdọ aka ná ntị Pita nyere banyere pa·rou·siʹa ahụ, oleekwa otú anyị kwesịrị isi zaghachi?
19 Pita onyeozi dịkwa ihe o nwere ịgwa anyị bụ́ ndị dị ndụ n’oge nke a dị ugbu a. Ọ dọrọ anyị aka ná ntị banyere ndị na-akwa emo, nke e nwere ọtụtụ n’ime ha n’akụkụ nile nke ụwa. Pita na-asị: “Unu bu ụzọ mara nke a, na ná mgbe ikpeazụ a ga-enwe ndị na-akwa emo na ịkwa emo ha, na-aga n’ihu dị ka ọchịchọ nke aka ha si dị ma na-asị: ‘Ebee ka ọnụnọ [pa·rou·siʹa] ya nke e kwere ná nkwa dị? Leenụ, site n’ụbọchị ndị nna anyị ochie ha dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-aga n’ihu kpọmkwem dị ka ha dị site ná mmalite okike.’” (2 Pita 3:3, 4, NW) N’agbanyeghị njupụta nke ndị na-akwa emo n’oge ọnụnọ Kraịst, ndị Jehova nọgidere na-egbuke dị ka ìhè nke ụwa, maka nzọpụta nke ọtụtụ ndị.
Ajụjụ Maka Ntụleghachi
◻ Olee otú e si nye ndị Jehova ìhè n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu banyere pa·rou·siʹa ahụ?
◻ Olee otú Matiu 24:4-8 siworo naemezu?
◻ Olee otú ndị mmụọ ozi siworo na-ekwenyere Kraịst ahụ e meworo eze?
◻ Ọrụ ebube dị aṅaa nke dị ịtụnanya yiri ka o so pa·rou·siʹa ahụ?
◻ Ọṅụ dị aṅaa ka a na-enwe n’oge a, olè ndị kwa na-ekere òkè na ya?