Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Akụkọ Ihe Mere Eme nke Bible Bụ Eziokwu?
“ANA M ekwu eziokwu, ekwughị m okwu ụgha,” ka otu onye so dee Bible gwara enyi ya bụ́ onye na-eto eto. (1 Timoti 2:7) Okwu ndị dị otú ahụ n’akwụkwọ ozi Pọl na-enye ndị nkatọ Bible ihe ịma aka.a Ihe karịrị 1,900 afọ agafewo kemgbe e desịrị akwụkwọ ozi Pọl. Ka oge ahụ dum gasịrị, ọ dịghị onye pụtaworo ma nwee ihe ịga nke ọma n’igosipụta otu ihe ọ bụla nke na-ezighị ezi n’akwụkwọ ozi ya nile.
Luk so dee Bible kwupụtakwara nchegbu maka izi ezi. O mere otu ndekọ nke ndụ na ozi Jisọs nke ihe ndekọ ya a kpọrọ Ọrụ Ndị Ozi sochiri. “M soro ihe nile nke ọma site na mbụ, ka m degara gị n’usoro,” ka Luk dere.—Luk 1:3.
Akaebe Dị Iche Iche nke Izi Ezi
Ndị nkatọ Bible nke mmalite narị afọ nke 19 mara izi ezi Luk dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme aka. Ọzọkwa, ha mere nzọrọ na e chepụtara akụkọ ihe mere eme dị n’Ọrụ Ndị Ozi n’etiti narị afọ nke abụọ O.A. Onye Britain bụ́ ọkà n’ihe mgbe ochie ndị e gwupụtara n’ala bụ́ Sir William Mitchell Ramsay bụ otu onye kwere na nke a. Ma mgbe e mesịrị nnyocha banyere aha na ebe dị iche iche a kpọrọ aha na Luk, o kwupụtara, sị: “E mere ka o jiri nwayọọ nwayọọ doo m anya na n’akụkụ dị iche iche, akụkọ ahụ gosipụtara ịbụ eziokwu dị ịtụnanya.”
Mgbe Ramsay dere ihe dị n’elu, otu ihe iseokwu banyere izi ezi Luk ka nọgidere bụrụ ihe a na-edozibeghị. O metụtara obodo ndị dịbere onwe ha bụ́ Aịkọniọm, Listra, na Dabe. Luk na-ekwu na Aịkọniọm dị iche site na Listra na Dabe, na-akọwa obodo abụọ ndị ikpeazụ dị ka “obodo nke Laịkaọnia.” (Ọrụ 14:6) Ma, dị ka map e sepụtara na-egosi, Listra dịdebere Aịkọniọm karịa Dabe. Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme oge ochie kọwara Aịkọniọm dị ka akụkụ Laịkaọnia, n’ihi ya, ndị nkatọ mara Luk aka n’ihi na o mekwughị otú ahụ.
E mesịa, na 1910, Ramsay chọpụtara ihe ncheta mgbe ochie e guzobere ná mkpọmkpọ ebe nke Aịkọniọm nke na-egosi na asụsụ obodo ahụ bụ Frijia ọ bụghị Laịkaọnia. “Ọtụtụ ihe ndị ọzọ e dere ndị e nwetara na Aịkọniọm na gburugburu ya na-emesi eziokwu ahụ ike nke bụ na n’ụzọ agbụrụ a pụrụ ịkọwa obodo ahụ dị ka nke Frijia,” ka Dr. Merrill Unger na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ Archaeology and the New Testament. N’ezie, Aịkọniọm nke ụbọchị Pọl bụ nke Frijia n’omenala, ọ dịkwa iche site “n’obodo nke Laịkaọnia,” ebe ndị mmadụ sụrụ ‘asụsụ Laịkaọnia.’—Ọrụ 14:6, 11.
Ndị nkatọ Bible gbaghakwara ojiji Luk ji okwu bụ́ “politarch” mee ihe maka ndị na-achị isi n’obodo Tesalọnaịka. (Ọrụ 17:6, NW, nkọwa ala ala peji) A maghị okwu a n’ihe odide Grik. E wee chọta otu ogidi n’obodo ochie ahụ nke nwere aha ndị chịrị isi n’obodo bụ́ ndị a kọwara dị ka “politarch”—kpọmkwem okwu Luk ji mee ihe. “Izi ezi nke Luk abụrụwo nke e wepụrụ n’ụta site n’iji okwu ahụ mee ihe,” ka W. E. Vine na-akọwa n’akwụkwọ ya bụ́ Expository Dictionary of Old and New Testament Words.
Njem Ụgbọ Mmiri nke Luk
Ndị ọkachamara ná njem ụgbọ mmiri enyochawo ihe ndị e kwuru banyere okpukpu ụgbọ a kọwara n’Ọrụ Ndị Ozi isi nke 27. Dị ka Luk si kọọ, ntiwapụ ikuku si ebe ugwu ọwụwa anyanwụ tikwasịrị nnukwu ụgbọ mmiri ya na Pọl so eme njem na nso otu obere agwaetiti bụ Klọda, egwu tụkwara ndị na-akwọ ya maka ịbụ ndị ọ kwaara gaa n’ájá uzuzu nke ụsọ osimiri ebe ugwu Africa nke dị ize ndụ. (Ọrụ 27:14, 17) Site n’ịkwọ ụgbọ dị ka ọkà, ha gbalịrị chegharịa ụgbọ ahụ ihu pụọ n’Africa na-aga n’akụkụ ọdịda anyanwụ. Ntiwapụ ikuku ahụ nọgidere na-akwụsịghị akwụsị, e mesịa ụgbọ ahụ wee chie ike n’ala ná mpụga agwaetiti Malta, mgbe ọ gaworo ihe dị ka 870 kilomita. Ndị ọkachamara ná njem mmiri mere ngụkọ na ọ ga-ewe nnukwu ụgbọ nke ntiwapụ ikuku na-akwagharị ihe karịrị ụbọchị 13 ịbụ nke a nyaruru ebe ahụ. Ngụkọ ha kwekọrọ n’ihe ndekọ Luk, bụ́ nke kwuru na ụgbọ ahụ kpuru n’ụbọchị nke 14. (Ọrụ 27:27, 33, 39, 41) Mgbe e nyochasịrị ihe nile e kwuru banyere njem ụgbọ mmiri Luk, onye na-anya ụgbọ mmiri bụ́ James Smith kwubiri, sị: “Ọ bụ akụkọ ihe ndị mere eme n’ezie, nke onye so mee ha n’onwe ya dere . . . Ọ dịghị onye na-adịghị eme njem ụgbọ mmiri nke pụrụ ide akụkọ njem ụgbọ mmiri nke kwekọrọ ekwekọ n’akụkụ ya nile otú a, ọ gwụla ma ọ hụrụ ihe ndị ahụ n’onwe ya.”
N’ihi nchọpụta ndị dị otú a, ndị ọkà mmụta okpukpe ụfọdụ dị njikere ịgbachitere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ịbụ akụkọ ihe mere eme nke ziri ezi. Ma gịnị banyere akụkọ ihe mere eme bu ụzọ nke a na-achọta N’Akwụkwọ Nsọ Hibru? Ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-ekwenyere ọkà ihe ọmụma ọgbara ọhụrụ ma na-akpọsa na akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme dị na ya. Otú ọ dị, dị ka ihe mmechuihu nye ndị nkatọ, e gosiwokwa izi ezi nke ọtụtụ ihe ndị e kwuru n’akụkọ ihe mere eme oge ochie nke Bible. Dị ka ihe atụ, tụlee nchọpụta nke Alaeze Ukwu Asiria nke e chezọrọ n’otu oge.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
[Map dị na peeji 3]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
FRIJIA
LAỊKAỌNIA
Aịkọniọm
Listra
Dabe
OSIMIRI MEDITERRANEAN
SAỊPRỌS