Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 12/15 p. 25-29
  • Ime Ka Anya Anyị ‘Na-ele Otu Ebe’ n’Ọrụ Alaeze

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Ka Anya Anyị ‘Na-ele Otu Ebe’ n’Ọrụ Alaeze
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Ime Ka Anya Na-elekwasị nke Ọma
  • Ọrụ Alaeze E Mere Ka Ọ Mụbaa
  • Ekele Maka Akwụkwọ Anyị
  • Iwu Ihe Maka Mmụba
  • Anya E Lekwasịrị n’Alaeze Chineke
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 12/15 p. 25-29

Ime Ka Anya Anyị ‘Na-ele Otu Ebe’ n’Ọrụ Alaeze

MBA German Democratic Republic (G.D.R.), ma ọ bụ ihe a mabu dị ka East Germany, jisiri ike ruo iri afọ anọ. Ịdị adị ya 41 afọ gwụsịrị n’October 3, 1990, mgbe e jikọrọ ókèala ya, nke hàwara ka Liberia ma ọ bụ steti Tennessee dị na United States, na Federal Republic of Germany, nke a kpọworo West Germany.

Njikọghachi nke Germany abụọ ahụ apụtawo ọtụtụ nnukwute mgbanwe. Ihe kewaburu mba abụọ ahụ abụghị nanị ókèala ụmụ mmadụ guzobere, kama nkewa nke usoro echiche. Gịnị ka ihe a dum pụtaara ndị bi n’ebe ahụ, oleekwa ụzọ ndụ siworo gbanweere Ndịàmà Jehova?

Wende ahụ, mgbanwe ọchịchị na November 1989 nke mere ka njikọghachi ahụ kwe omume, sochiri nnọọ ịrị afọ anọ nke usoro ọchịchị socialism nke siri ike. N’ime oge ahụ, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu, mkpagbu ha mgbe ụfọdụ na-esikwa ike.a Mgbe nnwere onwe bịara na G.D.R., oké ọṅụ jupụtara mmadụ nile bi n’ebe ahụ obi. Ma ka oké mkpali ahụ na-adanyụ, ọtụtụ amakwaghị ka ahụ dị ha, e mezughịkwa olileanya ha, ọbụna ha nwee nkụda obi. Ọrụ nke ijikọta Germany abụọ ahụ n’otu usoro ọha na eze, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na akụ na ụba na-aghọ ihe siri oké ike.

Dị ka e kwuru n’akụkọ ahụ pụrụ iche bụ́ “162 Tage Deutsche Geschichte” (162 Ụbọchị nke Akụkọ Ihe Mere Eme na Germany) na Der Spiegel, mgbe njikọghachi ahụ gasịrị e nwere ịtụ egwu zuru ebe nile nke enweghị ọrụ, oké ịrị elu nke ọnụ ahịa, na ịrị elu n’ụgwọ ụlọ. “M̀ ga-enwe ụgwọ ezumike nká zuru ezu?” ka ọtụtụ ndị bi na G.D.R. oge mbụ jụrụ. Gịnị banyere ụlọ? “N’akụkụ nile nke G.D.R., ụlọ ndị ochie na-erekasị, okporo ámá ụfọdụ dum na-aghọ ebe a na-apụghị ibi ebi.” Mmetọ mbara ruru ọ̀tụ̀tụ̀ na-eweta ụjọ.

Ebe ọgba aghara ndị dị otú a n’usoro ọha mmadụ na akụ na ụba na-eche ha ihu, olee otú ihe si gaara Ndịàmà Jehova nọ na G.D.R. oge mbụ?

Ime Ka Anya Na-elekwasị nke Ọma

Ndịàmà Jehova enweghị nkewa ọ bụla n’usoro echiche. Okwukwe ha dabeere na Bible bụ otu ihe ahụ, ma ọ bụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ma ọ bụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ. Ka ọnọdụ ọha na eze ha na-agbanwe, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná Ndịàmà jigidere nguzo ime mmụọ ha site n’ime ka anya ha na-elekwasị ihe mgbaru ọsọ bụ isi nke ijere Jehova ozi. N’ihi gịnị ka nke a ji dị mkpa?

N’ihi na “ụwa nke a ka e si ahụ ya anya na-agabiga agabiga.” (1 Ndị Kọrint 7:31) Otu okenye bụ́ onye Kraịst kwuru na ime nkwusa n’okpuru mmachibido iwu tupu Wende ahụ chọrọ obi ike; ọ kụziiri Ndịàmà ahụ ịdabere na Jehova ma zụọ ha n’iji Bible eme ihe. Ma ugbu a, “anyị aghaghị ilezi anya ka ịhụ ihe onwunwe n’anya na nchegbu nile nke ndụ ghara ịkpapụ uche anyị.”

A na-ejikarị ihe ndị a na-ahụ anya atụ nnwere onwe na ọganihu n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Ọtụtụ mmadụ n’ógbè a na-ahụ mkpa ọ dị ha ime ihe maka oge a tụfuworo ma ọ bụ ihe ụtọ ndị a na-enwetaghị. Nke a na-apụta ìhè mgbe mmadụ ji ụgbọ na-agbafe n’ụzọ ndị a wụrụ nkume ajịrịja n’obodo ukwu na obodo nta dị iche iche nke Thuringia na Saxony n’ebe ndịda. Ọ pụrụ ịbụ na ụzọ ndị ahụ chọrọ nrụzi, ụlọ ndị ahụ adịchakwaghị mma, ma leenụ njubiga ókè nke efere ụzarị ozi telivishọn e nwere! Ọ dị mfe mmadụ ịbụ onye e megharịrị anya gaa n’ikwere na ịnọ ná ntụkwasị obi na obi ụtọ na-esite n’inwe ihe nile anya na-ahụ. Leenụ ajọ ọnyà nke ahụ bụ!

N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs kwuru banyere ihe ize ndụ nke itinyebiga uche ókè n’ihe ndị a na-ahụ anya na ná nchegbu nile nke ndụ. “Unu akpadola akụ̀ n’ụwa nye onwe unu,” ka ọ dọrọ aka ná ntị ya. O kwukwara, sị: “Oriọna nke ahụ bụ anya: ya mere ọ bụrụ na anya gị elee otu ebe, ahụ gị dum ga-ejupụta n’ìhè.” (Matiu 6:19, 22) Gịnị ka o bu n’uche? Anya na-ele otu ebe bụ nke na-elekwasị ihe nke ọma ma na-ewebata onyinyo ndị gbara nke ọma n’uche. Anya ime mmụọ nke na-ele otu ebe na-eme ka onyinyo Alaeze Chineke gbaa nke ọma. Ya mere mkpebi onye Kraịst ime ka anya ya na-ele otu ebe, na-elegide Alaeze Chineke nke ọma, na iwezụga nchegbu nile nke ndụ n’azụ na-enye aka ime ka ọ nọgide n’ezi nguzo n’ụzọ ime mmụọ.

A pụrụ ime ihe atụ nke a site n’ahụmahụ nke otu di na nwunye sitere Zwickau, Saxony, ndị gosiri mmasị na Bible n’oge Wende ahụ. Azụmahịa ha na-eri oge nke ukwuu, ma ha debere ihe ime mmụọ n’ọnọdụ mbụ, na-aga nzukọ nile nke ndị Kraịst. “Site n’ụzọ ile ihe anya nke azụmahịa anyị, anyị apụghị iwepụta oge,” ka ha kwetara, “ma n’ụzọ ime mmụọ, ọ dị anyị mkpa.” Leenụ mkpebi amamihe dị na ya nke ahụ bụ!

Tụleekwa otu ezinụlọ bi na Plauen, nke dịkwa na Saxony. Onye nke bụ di bụ onye na-arụ mgbaaka elekere, ezi onye ọkà n’ọrụ ya. Mgbe Wende ahụ gasịrị, ụgwọ ụlọ maka ebe ọ na-arụ ọrụ rịrị oké elu. Gịnị ka o kwesịrị ime? “Ọ ga-efu oké ego, m mụtakwara eziokwu ahụ ka m wee were eziokwu ahụ dị ka ihe kasị mkpa ná ndụ.” Ya mere ọ kwafere n’ụlọ na-adịchaghị n’ebe kwesịrị ekwesị maka ọrụ ya ma bụrụ nke ụgwọ ụlọ ya dị ala karị. Ee, onye ahụ na-arụ mgbaaka elekere mụtara ngwa ngwa banyere ime ka anya ya na-ele otu ebe.

Otú ọ dị, ole na ole mụtara ya mgbe oge gaworo nke ukwuu. Otu okenye bụ́ onye Kraịst, n’iche na usoro azụmahịa onye ọ bụla ịkpatara onwe ya akụ̀ jupụtara n’ihe ịga nke ọma, malitere azụmahịa. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị ji obi ọma gbaa ya ume ka ọ ghara ikwe ka ihe azụmahịa kpachapụ ọnọdụ ime mmụọ. Ma, ọ bụ ihe mwute na nke ahụ mere. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị nwanna ahụ kwụsịrị ịbụ onye okenye. O mesịrị dee, sị: “Na-adabere n’ahụmahụ nke m, m ga-adụ nwanna ọ bụla na-agbaso ihe ùgwù ije ozi ọdụ ka ọ ghara ịbanye n’azụmahịa nke onwe ya.” Nke a apụtaghị na ịrụrụ onwe onye ọrụ dị njọ nye onye Kraịst. Kama ma ànyị nwere azụmahịa nke anyị ma ọ̀ bụ na anyị enweghị, itinyebiga uche ókè ná nchegbu nile nke ọnọdụ akụ na ụba pụrụ ime anyị ohu nke akụ̀ n’amaghị ama. Jisọs gosiri ihe ga-esi na ya pụta: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbụ ohu nke nna abụọ: n’ihi na ọ ga-akpọ otu onye n’ime ha asị, hụ ibe ya n’anya; ma ọ bụghị otú a ọ ga-ejide otu, lelịa ibe ya anya.” (Matiu 6:24) Onye Germany na-ede abụ uri bụ́ Goethe kwuru, sị: “Ọ dịghị ndị ọzọ nọ n’ohu na-eme ihere karịa ndị na-ekwere n’ụzọ na-ezighị ezi na ha nweere onwe ha.”

Ịbụ onye oké ifufe nkịtị fekwasịrị pụrụ ịchọ ka anyị mechitụ anya anyị ma ọ bụ kpuchitụ anya anyị aka iji legide ihe a na-ele anya. Mgbe ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọnọdụ akụ na ụba, ma ọ bụ nke ọha na eze gbara anyị gburugburu, itinye uche n’ihe dị mkpa iji legide ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ anyị anya. Gịnị ka ụfọdụ ndị Kraịst na-eme iji mee ka anya ha na-ele otu ebe n’ọrụ Alaeze?

Ọrụ Alaeze E Mere Ka Ọ Mụbaa

N’akụkụ nile nke G.D.R. oge mbụ, Ndịàmà na-etinyekwu oge n’ime nkwusa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. N’afọ abụọ ikpeazụ gara aga, nkezi oge e tinyere n’ozi ubi ji 21 pasent rịa elu. Ihe ọ rụpụtara bụ ịrị elu dị ịrịba ama nke 34 pasent ọmụmụ Bible ebe obibi. Ọzọkwa, ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ oge nile ji okpukpu anọ ugbu a karịa ihe ọ bụ nanị afọ abụọ gara aga! Ka ndị ọzọ na-enwe nchekasị ma na-eme mkpesa, ihe karịrị 23,000 ndị Kraịst n’ihe bụbu G.D.R. na-anagide ọnọdụ dịnụ site n’ime ka anya ha na-ele otu ebe. Nke a esowo kpata ịrị elu dị ịtụnanya n’ọrụ Alaeze.—Tụlee Joshua 6:15.

Ọrụ a gbasawanyere agbawanye pụtara na a na-ahụ maka ókèala ahụ nke ọma n’ebe ndịda, ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná Ndịàmà ahụ bi. Ọtụtụ n’ime aha ógbè ndị dị n’ebe ahụ na-echeta ihe ndị mere eme. Ọ bụrụ na ị na-enwe mmasị n’arịa nri ndị e ji ụrọ kpụọ, ị ga-amata obodo Meissen, nso Dresden, dị ka ebe e si enweta ụfọdụ n’ime ihe ndị kasị maa mma e ji ụrọ kpụọ n’ụwa. Meissen bụ ugbu a ebe ihe dị ka 130 ndị nkwusa Alaeze bi. Ma ọ bụ tụlee Weimar, “isi obodo magburu onwe ya nke Germany.” Ụlọ Goethe-Schiller Memorial dị n’etiti obodo ahụ na-agba akaebe nke oké ihe jikọrọ Weimar na mmadụ abụọ ahụ na-ede ihe, ọ bụkwa ihe na-eme ka ọtụtụ ndị nọ n’ebe ahụ na-eme nganga. Taa Weimar pụrụ ịnya isi n’ihi ihe karịrị 150 ndị nkwusa ozi ọma bi na ya.

Otú ọ dị, n’ebe ugwu, ihe dịwaga nnọọ iche, na-enwe ndị nkwusa ole na ole na ogologo ụzọ n’agbata ọgbakọ dị iche iche. Ọrụ kasị dị ụkọ. Ọtụtụ ndị nwere ọrụ nọ n’okpuru nrụgide ịrụfe ọrụ oge iji nọgide n’ọrụ ha. Otu nwanna nwoke na-eje ozi dị ka onye nkwusa oge nile n’ebe ugwu na-akọwa, sị: “N’okpuru mmachibido iwu nwanna ọ bụla nwere mkpa maka nchebe Jehova n’ozi ubi, ma ịchọta ọrụ esighị ike. Ugbu a ihe atụgharịwo. Anyị nwere nnwere onwe ime nkwusa, ma anyị chọrọ nduzi ya n’ihe banyere ọrụ. Mgbanwe dị otú ahụ chọrọ nnọọ mmadụ ime ka ihe mara ya ahụ.”

Ndị nkwusa hà nwere obi ụtọ inwe ike ime nkwusa ọtụtụ ugboro karị? Echiche Wolfgang bụ: “Ọ ka nnọọ mma ka otu onye nkwusa ahụ rụọ ọrụ n’otu ókèala ahụ ugboro ugboro. Ndị mmadụ na-amalite ịtụkwasị ya obi ma na-ekwunyere ya okwu karị.” E wezụga nke ahụ, ndị nwe ụlọ “adịghịkwa enwe mmechuihu ikwu okwu banyere okpukpe n’ọnụ ụzọ, ọbụna mgbe ndị na-agafe n’okporo ụzọ pụrụ ịnụ ihe ha na-ekwu. Okpukpe abụkwaghị isiokwu a na-asọ asọ.” Ralf na Martina kwenyere. “Ọ na-amasị anyị ịru ọrụ n’ókèala anyị ọtụtụ ugboro karị. Anyị pụrụ ịmata ndị ahụ n’onwe anyị, nweekwa obi ụtọ banyere ụdị akwụkwọ dị iche iche e nwere.”

Ekele Maka Akwụkwọ Anyị

Ralf na Martina nwere ekele karịsịa maka akwụkwọ ahụ bụ́ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? Nye ọtụtụ ndị nakweere echiche ekweghị na Chineke na G.D.R. oge mbụ, akwụkwọ a na-aghọ ihe enyemaka dị ebube maka ịmụ Bible. Ha na-elekwa anya maka akwụkwọ dị nta karị nke na-atụle otu ihe ahụ. “Lee ka o si kpalie anyị mgbe e wepụtara akwụkwọ nta bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? ná Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Na-enye Ìhè’ nke 1992 na Dresden. Ọ bụ azịza nye ekpere anyị.”

Ọtụtụ ndị na-abụghị Ndịàmà na-enwe mmasị n’akwụkwọ dị iche iche nke Watch Tower. Na July 1992 otu onye nkụzi nke mmụta usoro ọha mmadụ kwupụtara “oké ùgwù na ezi ekele” o nwere maka akwụkwọ ndị a, nke o ji akwadebe ihe ọ na-akụzi. Na January 1992 otu nwanyị na Rostock naara otu akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala site n’aka Ndịàmà abụọ bịara n’ọnụ ụzọ ya. O degaara alaka ụlọ ọrụ Germany akwụkwọ, sị: “M nọ na Chọọchị Luther. Enwere m oké nkwanye ùgwù maka ọrụ nke nzukọ Ndịàmà Jehova. Ha na-ekwusi ike na mmadụ apụkwaghị ịnọgide na-adị ndụ n’enweghị nduzi Chineke.”

Nduzi ime mmụọ hà aṅaa ka chọọchị nile nke Krisendọm nyeworo ndị òtù ha? Akwụkwọ akụkọ ahụ a na-akwanyere ùgwù bụ́ Die Zeit kwuru na December 1991 na ka Chọọchị Luther “nọworo n’ebube ruo nwa oge dị ka nne nke mbili iweta mgbanwe nke e mere n’udo, otú ndị mmadụ si were ya yiri ka o ji oké ọsọ na-adalata ala.” N’ezie, otu onye na-anọchite anya Chọọchị Luther kwara arịrị kwuo, sị: “Ndị mmadụ chere na usoro azụmahịa onye ọ bụla ịkpatara onwe ya akụ̀ bụ paradaịs ahụ.” Otu onye chọọchị bi na Magdeburg detara akwụkwọ na-arịọ maka ihe ọmụma. N’ihi gịnị? “Mgbe ọtụtụ afọ nke inwe ọṅụ n’ekweghị ekwe,” ka nwa okoro ahụ kwuru, “o dowo m anya n’ụzọ siri ike na ụwa nke a eruwela nnọọ n’ọgwụgwụ ya nakwa na anyị ga-ezute nnukwute nsogbu dị iche iche n’ọdịnihu dị nso.”—2 Timoti 3:1-5.

Iwu Ihe Maka Mmụba

Tupu Wende ahụ, e kweghị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze dịrị na G.D.R. Ugbu a a chọsiri ha ike; a na-edebe iwu ha n’ọnọdụ mbụ. Nke a bụ akụkụ ọzọ nke ezi ofufe nke gbanweworo n’ụzọ dị ịrịba ama. Ahụmahụ nke otu nwanna nwoke na-eme ihe atụ nke otú mgbanwe a siworo nnọọ gaa ngwa ngwa.

Na March 1990, nanị hour ole na ole mgbe Ndịàmà Jehova nwetara nkwado iwu na G.D.R., a kpọrọ otu nwanna nwoke òkù ịgwa otu ìgwè Ndịàmà okwu, na-eji ígwè okwu eme ihe na nke mbụ ya ná ndụ ya. Mgbe afọ abụọ na nkera gasịrị, ọgbakọ ọ nọ na ya raara Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ ya nye. Ka ọ na-eru ngwụsị 1992, e wuwo Ụlọ Nzukọ Alaeze asaa maka ọgbakọ 16. A na-eme atụmatụ ihe karịrị 30 ndị ọzọ, nakwa otu Ụlọ Mgbakọ mara mma.

Anya E Lekwasịrị n’Alaeze Chineke

“Ná mkpirikpi oge mgbe Wende ahụ gasịrị,” ka otu onye okenye bụ́ onye Kraịst kwuru, “ọtụtụ mmadụ jụrụ Bible. Ha tinyere olileanya ha na gọọmenti ọhụrụ ahụ, nke kwere nkwa ọnọdụ ndị ka mma n’ikpeazụ.” È mezuru olileanya ha? “N’ime afọ abụọ ha gbanwere uche ha. Ndị mmadụ ugbu a na-ekwenyere anyị na gọọmenti mmadụ apụghị ma ọlị iweta udo na ezi omume.”

Oké ìgwè mmadụ ṅụrịrị ọṅụ n’ọpụpụ nke usoro ọchịchị socialism siri ike na G.D.R., na-anabata ihe ha lere anya ịbụ oge oké obi ụtọ nke usoro echiche Ọdịda Anyanwụ. Ma e mechuru ha ihu. N’agbanyeghị gọọmenti na-achịnụ, Ndịàmà Jehova na-eme ka anya ha na-ele otu ebe ma legidesie ya ike n’Alaeze Chineke, nke na-egbukepụ egbukepụ dị ka kpakpando n’eluigwe. Ọ dịghị mgbe olileanya ahụ ga-eduje ná mmechuihu.—Ndị Rom 5:5.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee “Jehova Lekọtara Anyị n’Okpuru Mmachibido,” Akụkụ nke 1-3, ná mbipụta Ụlọ Nche ndị nke April 15, May 1, and May 15, 1992.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ndịàmà na Germany na-eji nnwere onwe ha na-eme ka ọtụtụ mmadụ karị tinye aka n’ọrụ Alaeze

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya