Olè Ndị Kwere ná Ndị Mmụọ Ọjọọ?
ÌKWERE na ndị mmụọ anya na-adịghị ahụ pụrụ inwe mmetụta ná ndụ gị? Ọtụtụ ga-aza mba n’olu dị ike. Ọ bụ ezie na ha kwenyere n’ịdị adị nke Chineke, ha na-akwa echiche nke ndị ọrụ ihe ọjọọ karịrị mmadụ emo.
Ekwenyeghị ná mmụọ bụ́ nke jupụtara ebe nile n’akụkụ ụwa Ebe Ọdịda Anyanwụ bụ n’akụkụ ụfọdụ n’ihi mmetụta nke Krisendọm, nke kụziri ruo ọtụtụ narị afọ na ụwa bụ etiti eluigwe na ala dum, nke dị n’etiti eluigwe na hell dị n’okpuru. Dị ka nkụzi nke a na-egosi, ndị mmụọ ozi na-enweta oké ọṅụ nke eluigwe ebe ndị mmụọ ọjọọ na-ahụ maka ihe ndị na-eme na hell.
Ka nchọpụta dị iche iche nke nkà mmụta sayensị na-eme ka ndị mmadụ jụ echiche ndị na-ezighị ezi banyere otú eluigwe na ala dị, nkwenkwe ná ndị mmụọ e kere eke ghọrọ ihe na-enweghị isi. Akwụkwọ bụ́ The New Encyclopædia Britannica na-asị: “Mgbe mgbanwe Copernicus nke narị afọ nke 16 (nke dabeere ná nchepụta dị iche iche nke onye Poland na-enyocha mbara igwe bụ́ Copernicus) gasịrị, ebe . . . a na-elekwaghị Ụwa anya dị ka ebe etiti nke gburugburu eluigwe na ala, kama, nanị dị ka mbara ala nke otu usoro mbara igwe nke bụ akụkụ dị nnọọ ntakịrị n’otu usoro ụyọkọ kpakpando n’eluigwe na ala nke yiri ihe na-enweghị nsọtụ—echiche nke ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ eyikwaghị ihe kwesịrị ekwesị.”
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ekwenyeghị ná ndị mmụọ ọjọọ, e nwere ọtụtụ nde ndị kwenyere. Ndị mmụọ ozi e wepụrụ n’ọnọdụ ha dị n’ọtụtụ okpukpe, ma n’oge ochie ma n’oge a. E wezụga òkè ha na-ekere dị ka ndị na-emerụ ọnọdụ ime mmụọ, a na-ele ajọ ndị mmụọ ozi ndị a anya dị ka ndị ọrụ nke ọdachi, dị ka agha, ụnwụ nri, na ala ọma jijiji, nakwa ndị nkwalite nke ọrịa, uche ezughị okè, na ọnwụ.
Setan Ekwensu, mmụọ ọjọọ bụ́ isi n’Iso Ụzọ Kraịst na okpukpe ndị Juu, ka ndị Alakụba na-akpọ Iblis. N’okpukpe oge ochie nke ndị Peasia bụ́ Zoroaster, ọ pụtara dị ka Angra Mainyu. N’okpukpe Gnostic, nke wuru ewu na narị afọ nke abụọ na nke atọ O.A., a hụrụ ya dị ka Demiurge, aha e nyere otu chi na-ekwo ekworo, nke dịkwa ala karị, onye ihe ka ukwuu n’ihe a kpọrọ mmadụ na-efe ofufe n’amaghị ama.
Ndị mmụọ ihe ọjọọ dị ala karị pụtara nke ukwuu n’okpukpe dị iche iche nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ndị Hindu kwenyere na asura (ndị mmụọ ọjọọ) na-emegide deva (chi dị iche iche). Ndị a kasị atụ egwu n’etiti asura bụ rakshasa, ndị mmụọ arụrụala na-anọkarị n’ebe a na-eli ozu.
Ndị Buddha na-ewere ndị mmụọ ọjọọ dị ka ikike ndị dị n’ụdị mmadụ bụ́ ndị na-egbochi mmadụ inweta Nirvana, bụ́ mwepụsị nke ọchịchọ. Onye ọnwụnwa bụ isi n’etiti ha bụ Mara, ya na ụmụ ya ndị inyom atọ bụ́ Rati (Ọchịchọ), Raga (Obi Ụtọ), na Tanha (Ezughị Ike).
Ndị China na-efe ofufe na-eji ọkụ a mụnyere n’èzí, tọọchị, na egbu ọkụ echebe onwe ha megide kuei, ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ sitere n’okike. Okpukpe ndị dị na Japan kwekwara na e nwere ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ, gụnyere tengu a na-atụ egwu, mmụọ ndị na-abanye n’ime ụmụ mmadụ ruo mgbe onye nchụàjà chụpụrụ ya.
N’etiti ndị na-amaghị akwụkwọ na-ekpe okpukpe n’Esia, Africa, Oceania, na kọntinenti ndị dị n’America, e kwenyere na ndị mmụọ e kere eke pụrụ inye aka ma ọ bụ imerụ mmadụ ahụ na-adabere n’ọnọdụ dịnụ na ọnọdụ uche ha nọ na ya. Ndị mmadụ na-efe mmụọ ndị a ofufe iji zere ọdachi na iji nata ihu ọma.
Tinyere ihe a dum, mmasị gbasapụrụ agbasapụ e nwere na majik na mgbaasị, o wee doo anya na nkwenkwe ná ndị mmụọ ọjọọ nwere akụkọ ihe mere eme dị ogologo ma rụọ arụ. Ma ezi uche ọ̀ dị n’ikwere na ihe e kere eke ndị dị otú ahụ dị adị? Bible na-asị na ha dị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ha dị, n’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ha nwee ike n’ahụ mmadụ imerụ ya ahụ?