Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 10/10 p. 22-23
  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ?
  • Teta!—2010
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Ndị Mmụọ Ozi Mehierenụ’
  • “Onye Na-eduhie Elu Ụwa Dum Mmadụ Bi”
  • Ekwela Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Nweta Gị
  • Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ike Jizọs Nwere n’Ebe Ndị Mmụọ Ọjọọ Nọ
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Ndị Mmụọ E Kere Eke—Otú Ha Si Emetụta Anyị
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Olee Ihe Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2010
g 10/10 p. 22-23

Echiche Baịbụl

Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ?

N’ỌTỤTỤ ebe, ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche kweere na e nwere ndị mmụọ ndị na-enyere ndị mmadụ aka, nwee ndị nke na-emesi ndị mmadụ ike, nweekwa ndị nke na-enyere ndị mmadụ aka mgbe ụfọdụ ma na-emesi ha ike mgbe ụfọdụ. Ndị ọzọ na-ekwu na e nweghị ndị bụ́ ndị mmụọ, na ihe ndị mmadụ na-akpọ ndị mmụọ bụ ihe ha chepụtara n’obi ha ma ọ bụ ihe ha kweere na ọ dị adị. Gịnị ka Baịbụl kwuru n’okwu a?

Baịbụl kwuru na Onye kere anyị bụ Mmụọ, kwuokwa na ndị mbụ o kere bụ mmụọ. (Jọn 4:24; Ndị Hibru 1:13, 14) Ma Baịbụl kwukwara na e nwere ndị mmụọ ọjọọ. (1 Ndị Kọrịnt 10:20, 21; Jems 2:19) Ma o kwughị na ọ bụ Chineke kere ndị mmụọ ọjọọ. Olee ndị bụ ndị mmụọ ọjọọ, oleekwa otú ha si dịwa?

‘Ndị Mmụọ Ozi Mehierenụ’

Mgbe Chineke kere ndị mmụọ ozi, o kere ha ka ha nwee ike iji aka ha na-ekpebi ma hà ga-eme ihe ọma ma hà ga-eme ihe ọjọọ. Ma, ọ dị mwute na mgbe e kechara ụmụ mmadụ, e nwere ndị mmụọ ozi kpebiri inupụrụ Chineke isi.

Mmụọ ozi mbụ nupụrụ isi, nke kachakwa nwee aha ọjọọ, bụ nke e mechara na-akpọ Setan. Jizọs Kraịst sịrị: “O guzosighịkwa ike n’eziokwu.” (Jọn 8:44) Gịnị mere Setan ji nupụrụ Chineke isi? Ọ malitere ịchọ ka e fewe ya otú e si efe Chineke, n’agbanyeghị na ọ bụ naanị Onye kere anyị ka e kwesịrị ife. O mechara mee onwe ya chi ma na-ama Chineke aka. Otú ahụ ka o si mee onwe ya “Setan,” nke pụtara “onye na-emegide [Chineke].” Ka ọtụtụ narị afọ gachara, tupu Iju Mmiri ụbọchị Noa, ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sonyeere Setan, hapụ eluigwe ebe ha bi yiri ahụ́ mmadụ bịa biri n’ụwa. (Jenesis 6:1-4; Jems 1:13-15) Mgbe Iju Mmiri ahụ bịara, ọ ga-abụ na “ndị mmụọ ozi ahụ mehiere emehie,” bụ́ ndị yiiri ahụ́ mmadụ, yirikwaara ahụ́ mmụọ laghachi n’ógbè ndị bụ́ mmụọ. (2 Pita 2:4; Jenesis 7:17-24) Ọ bụ ha ka e mechara kpọwa ndị mmụọ ọjọọ.—Diuterọnọmi 32:17; Mak 1:34.

Ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi bịaziri chọpụta na a napụla ha ihe ùgwù ndị ha nweburu. Amaokwu nke isii n’akwụkwọ Jud sịrị: “Ndị mmụọ ozi ndị na-anọgideghị n’ọnọdụ mbụ ha, kama ha hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị, ọ bụ ha ka [Chineke] kere agbụ ebighị ebi wee debe ha n’oké ọchịchịrị maka ikpe nke oké ụbọchị ahụ.” N’eziokwu, Chineke ekweghị ka ha nọgide na-enwe ihe ùgwù ha nwere n’eluigwe, kama nke ahụ, o mere ka ha nọrọ “n’olulu nke oké ọchịchịrị,” nke pụtara na ha enweghịzi ike iso n’ihe ọ bụla Chineke na ndị mmụọ ozi ya na-eme.

“Onye Na-eduhie Elu Ụwa Dum Mmadụ Bi”

Ọ bụ eziokwu na Chineke anaghịzi ekwe ka ndị mmụọ ọjọọ gbanwee ghọọ mmadụ, ha ka nwere ike dị ukwuu, na-akpakwa ajọ ike n’obi nakwa ná ndụ ụmụ mmadụ. N’eziokwu, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9; 16:14) Olee otú ha si na-eduhie ha? Ha na-ejikarị “ozizi ndị mmụọ ọjọọ” eduhie ụmụ mmadụ. (1 Timoti 4:1) Ozizi ụgha ndị a, bụ́ nke ndị okpukpe na-akụzikarị, emeela ka uche ọtụtụ nde ụmụ mmadụ kpuo ìsì nke na ha anaghị aghọta eziokwu banyere Chineke. (2 Ndị Kọrịnt 4:4) Legodị ụfọdụ n’ime ha.

● Ndị nwụrụ anwụ ka dị ndụ. Ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka ụmụ mmadụ kweta na mmadụ na ndị nwụrụ anwụ nwere ike ikwurịta okwu. Ihe ha na-eme bụ ime ka ọ na-adị ndị mmadụ ka hà na-ahụ ma ọ bụ na-anụ olu ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ha emee ihe ọ bụla ọzọ iji ghọgbuo ha. Aghụghọ a na-emekwa ka ndị mmadụ kwere nkụzi ụgha bụ́ na mkpụrụ obi na-adịrị ndụ gawa ma mmadụ nwụọ. Ma Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5, 6) Ebe ọ bụ na ha ‘agbadala n’ebe ịnọ duu,’ ha enweghịzi ike ito Chineke.—Abụ Ọma 115:17.a

● Onye ọ bụla mewe otú masịrị ya. 1 Jọn 5:19 sịrị: “Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eme ka e si na tiivi, fim nakwa ihe ndị ọzọ na-akụziri ndị mmadụ na ọ dịghị njọ ime ihe ọ bụla anụ ahụ́ ha chọrọ. (Ndị Efesọs 2:1-3) Ọ bụ ya mere omume rụrụ arụ, ma ụdị nke na-adịghị mma iji ntị anụ, ji ju ebe niile taa. Ndị mmadụ na-eweredị na omume rụrụ arụ enweghị ihe o mere, na-elekwa ihe ndị e kwuru na Baịbụl anya ka ihe mgbe ochie na ihe na-anaghị ekwe mmadụ megharịa ahụ́.

● Ime mgbaasị adịghị njọ. O nwere oge Pọl onyeozi hụrụ otu nwa agbọghọ na-eje ozi, onye nwere “mmụọ ọjọọ nke a na-ajụta ase,” nke na-eme ka ọ “na-ewetara ndị nna ya ukwu uru dị ukwuu site n’ịkọ ọdịnihu.” (Ọrụ 16:16) Ebe ọ bụ na Pọl maara ebe ike nwa agbọghọ ahụ ji akọ ọdịnihu si, ọ jụrụ ige ya ntị. Ihe ọzọkwa bụ na ọ chọghị ịkpasu Chineke iwe n’ihi na ọ maara na ụdị mgbaasị ọ bụla, ma mmadụ ịchọ ihe bụ́ akara aka ya ma ịjụ ndị mmụọ ase, bụ ihe arụ n’anya Jehova.—Diuterọnọmi 18:10-12.

Ekwela Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Nweta Gị

Olee ihe ị ga-eme ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inweta gị? Baịbụl zara, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma na-eguzogidenụ Ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” (Jems 4:7) Otú anyị ga-esi mee ihe a Baịbụl kwuru bụ ịna-ebi ndụ otú Baịbụl si kwuo. Nke a bụ n’ihi na naanị Baịbụl bụ akwụkwọ dị nsọ nke gbara Setan, ndị mmụọ ọjọọ, na “atụmatụ aghụghọ” ha niile n’anwụ. (Ndị Efesọs 6:11; 2 Ndị Kọrịnt 2:11) Baịbụl gwakwara anyị na ndị mmụọ ọjọọ, nakwa ndị niile na-emegide Chineke, agaghị adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Ndị Rom 16:20) Ilu 2:21 sịrị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ị chọọ ịmata ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ nakwa ihe Baịbụl kwuru banyere ịkpọlite ha n’ọnwụ, biko gụọ isi nke 6 na nke 7 nke akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Chineke ò kere ndị mmụọ ọjọọ?​—2 Pita 2:4.

● Ì nwere ike ịgwa ndị nwụrụ anwụ okwu?—Ekliziastis 9:5, 6.

● Olee otú i nwere isi chebe onwe gị ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inweta gị?​—Jems 4:7.

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị mmụọ ọjọọ nwere ọtụtụ ụzọ ha si akpa ike ná ndụ ndị mmadụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya