Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 10 p. 57-61
  • Ike Jizọs Nwere n’Ebe Ndị Mmụọ Ọjọọ Nọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ike Jizọs Nwere n’Ebe Ndị Mmụọ Ọjọọ Nọ
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Olee Ihe Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ọjọọ?
    Teta!—2010
  • Olee Otú Ihe Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ Na-eme Si Gbasa Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 10 p. 57-61

ISI NKE 10

Ike Jizọs Nwere n’Ebe Ndị Mmụọ Ọjọọ Nọ

Ì CHETARA ihe mere otu n’ime ndị mmụọ ozi Chineke ji ghọọ Setan bụ́ Ekwensu?— Ọ bụ ọchịchọ onwe onye nanị o nwere ka a na-efe ya ofufe mere o ji gbakụta Chineke azụ. È nwere ndị mmụọ ozi ọzọ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Setan?— Ee, e nwere. Bible kpọrọ ha ‘ndị mmụọ ozi Setan,’ ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ.—Mkpughe 12:9.

Ajọ ndị mmụọ ozi a, ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ, hà kwere na Chineke?— Bible na-ekwu na ‘ndị mmụọ ọjọọ kwere na Chineke dị.’ (Jems 2:19) Ma ugbu a, egwu na-atụ ha. N’ihi na ha ma na Chineke ga-enye ha ntaramahụhụ maka ihe ọjọọ ndị ha mere. Olee ihe ọjọọ ndị ha mere?—

Bible na-ekwu na ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ebe obibi kwesịịrị ha n’eluigwe wee bịa biri n’ụwa dị ka mmadụ. Ha bịara biri n’ụwa n’ihi na ha chọrọ iso ụmụ nwanyị mara mma nọ n’ụwa na-enwe mmekọahụ. (Jenesis 6:1, 2; Jud 6) Gịnị ka ị maara banyere inwe mmekọahụ?—

Mmekọahụ bụ mgbe nwoke na nwanyị bịara nọkọta ọnụ n’ụzọ chiri anya n’ụdị pụrụ nnọọ iche. Mgbe e mesịrị, nwa ọhụrụ pụrụ itolite n’ime afọ nne ya. Ma ọ bụ ihe na-ezighị ezi bụ́ ndị mmụọ ozi inwe mmekọahụ. Chineke chọrọ ka ọ bụrụ nanị nwoke na nwanyị bụ́ di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ọ bụrụ na ha amụọ nwa, di na nwunye ahụ ga-enwe ike ilekọta ya.

[Foto dị na peeji nke 57]

Olee ihe ọjọọ ndị mmụọ ozi a mere?

Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ yikwasịrị ahụ́ mmadụ ma soro ụmụ nwanyị nọ n’ụwa nwee mmekọahụ, ụmụ ha tolitere ma ghọọ ndị dike. Ha nwere nnọọ obi ọjọọ, ha na-emerụkwa ndị mmadụ ahụ́. Ya mere, Chineke mere ka e nwee oké iju mmiri iji bibie ndị dike ahụ na ndị ọjọọ nile. Ma, o mere ka Noa wuo otu nnukwute ụgbọ iji zọpụta mmadụ ole na ole ndị na-eme ihe ziri ezi. Onye Ozizi Ukwu ahụ kwuru na ọ dị mkpa ịdị na-echeta ihe ahụ mere n’oge Iju Mmiri ahụ.—Jenesis 6:3, 4, 13, 14; Luk 17:26, 27.

Ị̀ ma ihe mere ndị mmụọ ozi ọjọọ ahụ mgbe Iju Mmiri ahụ bịara?— Ha yipụrụ ahụ́ mmadụ ha meere onwe ha, laghachi n’eluigwe. Ma, ha apụkwaghị ịbụ ndị mmụọ ozi Chineke, ya mere, ha ghọrọ ndị mmụọ ozi Setan, ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ. Gịnị mekwaranụ ụmụ ha, ndị dike ahụ?— Iju Mmiri ahụ gbagburu ha. Ọ gbagbukwara ndị ọzọ nile na-erubereghị Chineke isi.

[Foto dị na peeji nke 58]

N’ihi gịnị ka nsogbu ji dị n’ụwa ugbu a otú ọ na-adịtụbeghị?

Kemgbe Iju Mmiri ahụ, Chineke ekwebeghị ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ ghọọ ụmụ mmadụ ọzọ. Ma, ọ bụ ezie na anyị apụghị ịhụ ha anya, ndị mmụọ ọjọọ ahụ ka na-agbalị ime ka ndị mmadụ na-eme ihe ndị dị nnọọ njọ. Ha na-eme ka e nwee nsogbu ka ukwuu karịa otú e nwetụworo. Nke a bụ n’ihi na e siwo n’eluigwe chụda ha n’ụwa.

Ị̀ ma ihe mere na anyị apụghị ịhụ ndị mmụọ ọjọọ anya?— Ọ bụ n’ihi na ha bụ mmụọ. Ma o doro anyị anya na ha dị ndụ. Bible na-ekwu na Setan ‘na-eduhie ndị mmadụ n’ụwa nile,’ ndị mmụọ ọjọọ ya na-enyekwara ya aka.—Mkpughe 12:9, 12.

Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya hà pụrụ iduhiekwa anyị?— Ee, ha pụrụ ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya. Ma ọ dịghị mkpa ka egwu tụwa anyị. Onye Ozizi Ukwu ahụ sịrị: ‘Ekwensu enweghị ike n’ebe m nọ.’ Ọ bụrụ na anyị anọrọ Chineke nso, ọ ga-echebe anyị pụọ n’aka Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya.—Jọn 14:30.

Ọ dị mkpa ka anyị mata ihe ọjọọ ndị mmụọ ọjọọ ga-agbalị ime ka anyị mee. Ya mere, chebara ya echiche. Olee ihe ọjọọ ndị mmụọ ọjọọ ahụ mere mgbe ha bịara n’ụwa?— Tupu Iju Mmiri ahụ, ha sooro ụmụ nwanyị nwee mmekọahụ, bụ́ ihe na-ezighị ezi ka ndị mmụọ ozi mee. Taa, ọ na-atọ ndị mmụọ ọjọọ ụtọ mgbe ndị mmadụ na-adịghị erubere iwu Chineke banyere mmekọahụ isi. Ka m jụọ gị, Olee ndị ọ bụ nanị ha kwesịrị inwe mmekọahụ?— Ị zatara ya, ọ bụ nanị ndị di na nwunye.

Taa, ụfọdụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na-eto eto na-enwe mmekọahụ, ma o zighị ezi ka ha na-enwe mmekọahụ. Bible kwuru okwu banyere ‘akụkụ ahụ́ nwoke e ji enwe mmekọahụ,’ ma ọ bụ amụ. (Deuterọnọmi 23:1) A na-akpọ akụkụ ahụ́ nwanyị ji enwe mmekọahụ ọtụ. Jehova kere akụkụ ahụ́ ndị a maka nzube pụrụ iche nke dịịrị nanị ndị di na nwunye. Ndị mmụọ ọjọọ na-enwe obi ụtọ mgbe ndị mmadụ na-eme ihe ndị Jehova machibidoro iwu. Dị ka ihe atụ, ọ na-atọ ndị mmụọ ọjọọ ụtọ mgbe nwatakịrị nwoke na nwatakịrị nwanyị ji amụ ma ọ bụ ọtụ ibe ha na-egwuri egwu. Anyị achọghị ime ihe ga na-atọ ndị mmụọ ọjọọ ụtọ, ka ànyị chọrọ?—

Ọ dị ihe ọzọ na-atọ ndị mmụọ ọjọọ ụtọ, bụ́ ihe Jehova kpọrọ asị. Ị̀ ma ihe ọ bụ?— Ime ihe ike. (Abụ Ọma 11:5) Ime ihe ike bụ mgbe ndị mmadụ nwere obi ọjọọ ma na-emerụ ndị ọzọ ahụ́. Cheta na ọ bụ ihe ndị dike ahụ, bụ́ ụmụ nke ndị mmụọ ọjọọ ahụ, mere.

Ndị mmụọ ọjọọ na-enwekwa mmasị imenye ndị mmadụ ụjọ. Mgbe ụfọdụ, ha na-eme dị ka ha bụ ndị nwụrụ anwụ. Ha pụrụ ọbụna iṅomi ụda olu nke ndị nwụrụ anwụ. N’ụzọ dị otú a, ndị mmụọ ọjọọ na-aghọgbu ọtụtụ ndị ikwere na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ, nakwa na ha pụrụ iso ndị dị ndụ kwurịta okwu. Ee, ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka ọtụtụ mmadụ kweta na e nwere mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ.

Ya mere, anyị aghaghị ịnọ na nche ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ghara ịghọgbu anyị. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: ‘Setan na-agbalị ime onwe ya ka o yie ezigbo mmụọ ozi, ndị na-ejere ya ozi na-emekwa otu ihe ahụ.’ (2 Ndị Kọrint 11:14, 15) Ma, n’ezie, ndị mmụọ ọjọọ dị njọ. Ka anyị hụ ụzọ ha pụrụ isi gbalịa ime ka anyị dị ka ha.

Olee ebe ndị mmadụ na-amụta ihe dị ukwuu banyere ime ihe ike na mmekọahụ na-ezighị ezi, ndị mmụọ, nakwa mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ?— Ọ́ bụghị site n’ikiri ụfọdụ ihe ndị a na-egosi na telivishọn na ihe nkiri sịnịma, egwuregwu vidio na kọmputa, na ịgụ akwụkwọ ndị na-akpa ọchị? Ime ihe ndị a hà na-eme ka anyị bịarukwuo Chineke nso ka ọ̀ bụ ka anyị bịarukwuo Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya nso? Olee ihe i chere?—

[Foto ndị dị na peeji nke 60]

Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị na-ekiri ime ihe ike?

Ole ndị ka i chere na-achọ ka anyị na-egere ma ọ bụ na-ekiri ihe ndị na-adịghị mma?— Ee, ọ bụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. Ya mere, gịnị ka ọ dị mkpa ka mụ na gị mee?— Ọ dị mkpa ka anyị na-agụ, na-egere, ma na-ekiri ihe ndị ga-abara anyị uru, ndị ga-enyekwara anyị aka ijere Jehova ozi. Ị̀ pụrụ icheta ụfọdụ n’ime ihe ọma ndị a anyị pụrụ ime?—

[Foto dị na peeji nke 61]

Olee ihe ọ dị mma ka anyị mee?

Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ọma, ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji na-atụ ndị mmụọ ọjọọ egwu. Jizọs ka ha ike, ha na-atụkwa ya ụjọ. Otu ụbọchị, ndị mmụọ ọjọọ tiri mkpu wee sị Jizọs: “Ị̀ bịara ibibi anyị?” (Mak 1:24) Ọ̀ bụ na anyị agaghị enwe obi ụtọ mgbe oge ruru ka Jizọs bibie Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya?— Ka ọ dịgodị, anyị pụrụ ijide n’aka na Jizọs ga-echebe anyị pụọ n’aka ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụrụ na anyị anọrọ ya na Nna ya nke eluigwe nso.

Ka anyị gụọ ihe ndị ọ dị mkpa ka anyị mee, ná 1 Pita 5:8, 9 nakwa na Jems 4:7, 8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya