Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 3/15 p. 8-9
  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Mba Bahamas

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Mba Bahamas
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Maa Okwukwe Ọhụrụ Aka
  • Ndị Bịara Abịa Anụ Abụ Ọhụrụ Ahụ
  • Inwe Ọṅụ na Ekele n’Agbanyeghị Mfu Na-agbawa Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 3/15 p. 8-9

Ndịàmà Jehova Gburugburu Ụwa—Mba Bahamas

MBA Commonwealth bụ́ Bahamas​—⁠ìgwè nke 3,000 agwaetiti ndị ukwu na ndị nta⁠—​nọ dị ka ihe olu coral gbasapụrụ gabiga 900 kilomita nke osimiri na-acha ka nkume turquoise n’agbata Florida na Cuba. N’etiti 267,000 ndị bi na ya e nwere ìgwè ndị ukwe nke ndị nkwusa Alaeze na-abawanye ụba. Abụ otuto ha na-eme ka e cheta Aịsaịa 42:​10-⁠12: “Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ, kwusaanụ otuto Ya site ná nsọtụ ụwa; unu ndị na-arịda n’oké osimiri, na ùjú ya, agwaetiti nile, na ndị bi ha. . . . Ka ha si n’elu ugwu nile tisie mkpu ike. Ka ha nye Jehova nsọpụrụ, gosikwa otuto Ya n’agwaetiti nile.”

A Maa Okwukwe Ọhụrụ Aka

Na July 1992, otu onye ọsụ ụzọ oge nile (onye nkwusa oge nile nke Alaeze) nyefere onye ya na ya na-emekọ ihe n’azụmahịa akwụkwọ na-enye aka ịmụ Bible bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Mgbe nwoke ahụ gụsịrị akwụkwọ ahụ, ọ gwara onwe ya, ‘Okpukpe a bụ ihe m na-aghaghị ileba anya na ya.’ Na Sunday abụọ na-eso ya, ọ gara nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova. Ọzọ, a maliteere ya ọmụmụ Bible. Otú ọ dị, mgbe ọmụmụ Bible ya gaworo nanị izu isii, otu ihe ịma aka bilitere bụ́ nke ga-anwale okwukwe ọhụrụ ya​—⁠ememe ncheta ọmụmụ.

Ezinụlọ nwoke oji ego achụ ego ahụ ji ememe ndị dị otú ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu, ma ịhụnanya ya maka Okwu Chineke kpaliri ya ịga n’ihu n’ọmụmụ Bible ya. Ka ihe ọmụma ya nke eziokwu Akwụkwọ Nsọ na-arị elu, otú ahụ ka nghọta ya nke ememe ncheta ọmụmụ na ụbọchị ezumike dị iche iche nke ụwa na ụzọ Jehova si ele ha anya na-arịkwa.

Mgbe nwunye nwoke a haziri nnọkọ oriri maka Ụbọchị Ndị Nna, o ji nkwanye ùgwù jụ ịga. Otú ọ dị, nwunye ya chere na ọ hụkwaghị ya n’anya, na ọ na-ebutekwa okpukpe ya ụzọ tupu ya na ezinụlọ ya. O ji obi ọma kọwaa na itinye ihe ọ na-amụta site na Bible n’ọrụ na-enye aka inwogha ya gaa n’ịbụ di na nna ka mma. N’ikpeazụ, nwunye ahụ malitere inwe nghọta kanụ maka ịhụnanya ya maka eziokwu Akwụkwọ Nsọ ma kwere ịmụ Bible. Ugbu a ọ na-eduziri ezinụlọ ya ọmụmụ Bible. Leekwa ọṅụ o nwere ná Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke” n’afọ a gara aga! Nwunye ya na ada ya nọ na ya, hụkwa ka e mere ya baptism.

Ndị Bịara Abịa Anụ Abụ Ọhụrụ Ahụ

Ọtụtụ puku ndị Haiti bịara abịa na-eme mgbanwe ikwekọ n’ọha mmadụ nke Bahamas. Ọ dịkwa ha onwe ha mkpa ịnụ abụ ọhụrụ nke eziokwu Alaeze. Ndịàmà bi na Bahamas nwere obi ekele na di na nwunye abụọ ndị Haiti bi n’America abịarutewo. Mmadụ ndị a enyewo aka ime ka ìgwè ndị Haiti bụ́ ndị e hiwere ọhụrụ gbasie ike Grand Bahama na Abaco.

Dị ka ihe enyemaka ọzọ maka ndị Haiti nwere mmasị n’ozi Alaeze, mgbakọ distrikti mbụ n’asụsụ Creole e nwetụrụla na Bahamas weere ọnọdụ malite July 31 ruo August 1, 1993. Ọnụ ọgụgụ ndị bịara ruru 214, na-enwe atọ ndị ọhụrụ raara onwe ha nye e mere baptism. Ọtụtụ ndị Haiti mụtara eziokwu ahụ na Bahamas alaghachiworị n’agwaetiti nke ha ma ọ bụ kwaga n’ebe ndị ọzọ iji tinye olu ha na nke Ndịàmà e nwere n’ebe ndị ahụ n’ịbụku Jehova abụ otuto.

[Igbe dị na peeji nke 8]

IHE ỌMỤMA BANYERE MBA AHỤ

Afọ Ije Ozi 1993a

ỌNỤ ỌGỤGỤ KASỊ ELU NKE NDỊ NA-AGBA ÀMÀ: 1,294

NKEZI: 1 Onyeàmà Maka 197

NDỊ BỊARA EMEME NCHETA: 3,794

NKEZI NKE NDỊ NKWUSA BỤ́ ỌSỤ ỤZỌ: 186

NKEZI ỌMỤMỤ BIBLE: 1,715

ỌNỤ ỌGỤGỤ E MERE BAPTISM: 79

ỌNỤ ỌGỤGỤ ỌGBAKỌ: 22

ALAKA ỤLỌ ỌRỤ: NASSAU

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee 1994 Calendar of Jehovah’s Witnesses.

[Foto dị na peeji nke 9]

Ụlọ Nzukọ Alaeze nke mbụ, ya na alaka ụlọ ọrụ na ebe obibi ndị ozi ala ọzọ

[Foto dị na peeji nke 9]

Ndịàmà ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 9]

Milton G. Henschel na Nathan H. Knorr ha na ndị ozi ala ọzọ na Nassau ihe dị ka 45 afọ gara aga

[Foto dị na peeji nke 9]

Alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ, a raara ya nye na February 8, 1992

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya