Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Eziokwu Bible Ejikọọ Ezinụlọ Ọnụ
TAA, n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, ịdị n’otu ezinụlọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke gabigaworo agabiga. Otú ọ dị, Bible na-ekpughe ihe a chọrọ maka ịdị n’otu ezinụlọ. Tụlee okwu Jisọs: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a, na-emekwa ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nwere uche, onye wuru ụlọ ya n’elu oké nkume.” (Matiu 7:24) Ọtụtụ puku ezinụlọ n’etiti Ndịàmà Jehova enwewo ịdị n’otu site n’itinye okwu ndị a n’ọrụ na iji Bible eme ihe dị ka ntọala iji wulite ezinụlọ dị n’otu n’ụzọ chiri anya. Ndị ọzọ na-enwetakwa ịdị n’otu dị otú ahụ, dị ka ahụmahụ na-esonụ na-egosi.
Ka Daniel na-eje ozi n’ìgwè ndị agha na France, ụkọchukwu ndị agha tụrụ aro ka Daniel zụta Bible, bụ́ nke o mere, ọ malitekwara ịgụ ya mgbe nile. E mesịrị ziga ya Tahiti. Ụfọdụ ndị soja ibe Daniel bụ ndị Adventist, ebe ndị ọzọ bụ ndị Mormon. Nkwurịta okwu ha na-echigharịkarị ihu gaa n’isiokwu okpukpe. Otu ụbọchị, otu onye sajenti nọ n’ọkwá ukwu mere ka Daniel mara nwunye ya, onye bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. O jiri otu oge ehihie dum zaa ọtụtụ ajụjụ nke Daniel ma mee ka ọ mata otu n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Tahiti. N’oge na-adịghị anya ọ malitere ọmụmụ Bible chiri anya.
Ndị mụrụ Daniel bụ́ ndị bi na France ji Katọlik kpọrọ ihe nke ukwuu. Nna ya bụ onye ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ, ọ na-ahụkwa maka ozizi okpukpe n’otu ụlọ akwụkwọ ndị Katọlik. N’ịchọ ka ya na ndị mụrụ ya kerịta akụ̀ ime mmụọ ndị ọ na-amụta, Daniel malitere iji nwayọọ nwayọọ na-agbakwụnye echiche ụfọdụ nke Bible n’akwụkwọ ozi ndị ọ na-ezigara ha.
Ná mmalite nne Daniel nwere obi ụtọ, ma a gbaghasịrị ya isi mgbe ọ hụrụ aha ahụ bụ Jehova n’otu n’ime akwụkwọ ozi nwa ya nwoke. Ụbọchị ole na ole n’ihu, ọ nụrụ otu ihe omume redio nke kọwara Ndịàmà Jehova dị ka “ịrọ òtù dị ize ndụ.” O degaara Daniel akwụkwọ, na-agwa ya ka ọ kwụsị mkpakọrịta nile nke ya na Ndịàmà ozugbo. Otú ọ dị, Daniel nọgidere na-enwe ọganihu n’ọmụmụ Bible ya, n’oge na-adịghịkwa anya, mee ndokwa ịhapụ ọrụ agha ma laghachi France.
Mgbe ọ laruru ụlọ, Daniel ji uhuruchi ọ bụla—mgbe ụfọdụ ruo n’ime abalị—soro nne ya na-enwe nkwurịta okwu dị ogologo na Bible. N’ikpeazụ o kwetara iso Daniel jee otu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe o jere nzukọ nke mbụ ya, ọ masịrị ya nke ukwuu nke na ọ maiitere ọmụmụ Bible chiri anya nke ya. O nwere ọganihu ngwa ngwa, n’oge na-adịghịkwa anya e mere ya baptism.
Nna Daniel bụ nwoke na-ekwenyere echiche ndị ọzọ ma ọ bụ onye mikpuru onwe ya nke ukwuu n’ọrụ ya na ihe omume okpukpe ya. Ma, n’otu mgbe o bujere nwunye ya na Daniel otu mgbakọ distrikti. Ọ bụ na July 14, o bukwa n’uche ikiri ịkwụ n’ahịrị nke Ụbọchị Bastille n’obodo ahụ. Ka ọ nọ na-echere o kpebiri, site n’ọchịchọ ịmata ihe, ileba anya n’ime ụlọ mgbakọ ahụ. Ịdị n’usoro na udo ọ hụrụ n’etiti ndị Jehova masịrị ya, ka ọ na-agagharịkwa ná ngalaba dị iche iche nke mgbakọ ahụ, onye ọ bụla nọgidere na-akpọ ya “nwanna.” O chefuru ihe nile banyere ịkwụ n’ahịrị ahụ nke Ụbọchị Bastille ma nọgide ruo ọgwụgwụ nke mgbakọ ahụ. Ọ rịọrọ maka ọmụmụ Bible ma nwee ọganihu ngwa ngwa n’ịmụ eziokwu ahụ. Otú ọ dị, ka ọ na-amụta ihe karị, otú ahụ ka ọ na-enwe ahụ erughị ala karị n’ihi ọnọdụ ọrụ ya, ya mere n’afọ ndụ nke 58, ọ hapụrụ ọrụ ya. Ugbu a mmadụ atọ dum n’ime ezinụlọ ahụ raara onwe ha nye, e meekwa ha baptism, bụrụkwa ndị e jikọrọ ọnụ n’ijere Jehova ozi.
Ọ bụ eziokwu Bible jikọrọ ezinụlọ Daniel ọnụ. Ọ pụkwara ijikọ ezinụlọ ndị ọzọ ọnụ ma ha jiri obi ha dum mụọ ma tinye ya n’ọrụ.