Iji Ọṅụ Edo Onwe Onye n’Okpuru Ịbụ Isi
“Unu sitere n’obi unu ṅaa ntị.”—NDỊ ROM 6:17.
1, 2. (a) Mmụọ dị aṅaa ka a na-ahụ n’ụwa taa, gịnịkwa bụ isi iyi ya na mmetụta ọ na-enwe? (b) Olee otú ndị ohu Jehova raara onwe ha nye si egosị na ha dị iche?
ANA-AHỤ taa n’ụzọ na-awụ ibubo n’ahụ “mmụọ ahụ nke na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye ugbu a.” Ọ bụ mmụọ nke nnwere onwe a na-achịkwaghị achịkwa, nke na-esite n’aka Setan, “onye isi nke ike nke mbara eluigwe.” Mmụọ nke a, “ikuku” (NW) nke a, ma ọ bụ omume nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na nke nnupụisi nke jupụtara ebe nile, ‘na-achị,’ ma ọ bụ na-akpa ike, n’elu ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ. Nke a bụ otu ihe mere ụwa ji na-enwe ihe a kpọworo ọgba aghara nke ịbụ isi.—Ndị Efesọs 2:2.
2 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ndị ohu Jehova raara onwe ha nye taa adịghị eji “ikuku” nke a e metọrọ emetọ ma ọ bụ mmụọ nke nnụpuisi ekuju akpa ume ime mmụọ ha. Ha maara na “iwe Chineke na-abịakwasị ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye.” Pọl onyeozi na-ekwukwasịkwa, sị: “Ya mere unu esola ha kekọọ ihe.” (Ndị Efesọs 5:6, 7) Kama, ezi ndị Kraịst na-agbalị ịbụ ndị ‘jupụtara na mmụọ nsọ [Jehova],’ ha na-aṅụkwa n’ime “amamihe ahụ nke si n’elu bịa,” nke dị “ọcha, e mesịa ọ dị udo, nwee obi ọma, na-ekwenye okwu nke ọma.”—Ndị Efesọs 5:17, 18; Jemes 3:17.
Iji Obi Anyị Doo Onwe Anyị n’Okpuru Ọkaaka Jehova
3. Gịnị bụ ihe na-eweta iji obi anyị edo onwe anyị n’okpuru, oké ihe mmụta dịkwa aṅaa ka akụkọ ihe mere eme na-ezi anyị?
3 Ihe na-eweta iji obi anyị doo onwe anyị n’okpuru bụ ịmata ịbụ isi ziri ezi. Akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ na-egosi na ịjụ ọkaaka Jehova adịghị eweta obi ụtọ. Ọjụjụ dị otú ahụ ewetaraghị Adam na Iv obi ụtọ, o wetakwaraghị onye kpaliri nnupụisi ha, bụ́ Setan Ekwensu. (Jenesis 3:16-19) Setan na-enwe “oké ọnụma” n’ime ọnọdụ e wedara ala nke ọ nọ n’ime ya ugbu a, n’ihi na ọ maara na oge ya dị mkpirikpi. (Mkpughe 12:12) Udo na obi ụtọ nke ihe a kpọrọ mmadụ, ee, nke eluigwe na ala dum, dabeere na mmata zuru ụwa ọnụ nke ọkaaka ezi omume nke Jehova.—Abụ Ọma 103:19-22.
4. (a) Ụdị ido onwe onye n’okpuru na nrubeisi dị aṅaa ka Jehova chọrọ ka ndị ohu ya na-egosi? (b) Gịnị bụ ihe na-aghaghị ido anyị anya, oleekwa otú onye ọbụ abụ ahụ si kwupụta nke a?
4 Ma, n’ihi àgwà ya ndị guzoziri eguzozi, Jehova adịghị enwe afọ ojuju ná nrubeisi n’esighị n’obi. O nwere ikike, ee! Kama ọ bụghị onye ọchịchị nchịgbu. Ọ bụ Chineke nke ịhụnanya, ọ chọkwara ka ihe ndị o kere eke nwere ọgụgụ isi rubere ya isi site n’obi ha, n’ihi ịhụnanya. Ọ chọrọ ka ha doo onwe ha n’okpuru ọkaaka ya n’ihi na ha ji obi ha dum họrọ ido onwe ha n’okpuru ịbụ isi ezi omume ya nke zikwara ezi, na-abụ ndị o doro anya na ọ dịghị ihe ọzọ ga-akara ha mma karị irubere ya isi ruo mgbe ebighị ebi. Ụdị mmadụ Jehova chọrọ n’ụwa ya bụ ndị nwere ụdị mmetụta nke onye ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachị mkpụrụ obi: ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Ụkpụrụ nile Jehova tọrọ ziri ezi, na-eme ka obi ṅụrịa ọṅụ: ihe nile Jehova nyere n’iwu na-enwu enwu, na-enye anya ìhè. Egwu Jehova dị ọcha, na-eguzo ruo mgbe ebighị ebi: ikpe nile nke Jehova bụ eziokwu, ha nile ziri ezi n’otu.” (Abụ Ọma 19:7-9) Ntụkwasị obi zuru ezu n’izi ezi na n’ezi omume nke ọkaaka Jehova—nke a ga-abụrịrị omume anyị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ nke Jehova.
Iji Ọṅụ Edo Onwe Anyị n’Okpuru Eze Anyị
5. Olee otú e si kwụghachị Jisọs ụgwọ ọrụ maka nrubeisi ya, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị iji obi anyị kweta?
5 Kraịst Jisọs n’onwe ya bụ ihe nlereanya magburu onwe ya nke ịnọ n’okpuru Nna ya nke eluigwe. Anyị na-agụ na “o wedakwara Onwe ya, wee bụrụ onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ; bụ́ ọnwụ nke [osisi ịta ahụhụ, NW].” Pọl na-ekwukwasịkwa, sị: “N’ihi nke a Chineke welikwara Ya elu nke ukwuu, werekwa amara nye Ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu; ka ọ ga-abụ n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala, nke ihe nile dị n’eluigwe na ihe nile dị n’elu ụwa na ihe nile dị n’okpuru ala, ka ire nile ọ bụla wee kwupụtakwa na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e wee nye Chineke bụ́ Nna, otuto.” (Ndị Filipaị 2:8-11) Ee, anyị ji ọṅụ egbu ikpere n’ala n’ihu Onye Ndú na Eze anyị na-achị achị, Kraịst Jisọs.—Matiu 23:10.
6. Olee otú Jisọs siworo gosipụta onwe ya ịbụ onyeàmà na onye ndú nye ìgwè nke mba dị iche iche, oleekwa otú “ịbụ onye isi” ya ga-esi nọgide mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị?
6 Banyere Kraịst dị ka Onye Ndú anyị, Jehova buru amụma, sị: “Lee, enyewo m ya ka ọ bụrụ onyeàmà nye ndị nile dị iche iche, ka ọ bụrụ onye ndú na onye iwu nye ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 55:4) Site n’ije ozi elu ala ya na site na ya iduzi ọrụ nkwusa ahụ site n’eluigwe ka ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, Jisọs egosiwo onwe ya ịbụ “onyeàmà ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke bụkwa onye eziokwu” nke Nna ya nye ndị nke mba nile. (Mkpughe 3:14; Matiu 28:18-20) Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ, ndị ga-alanarị ‘oké mkpagbu ahụ’ n’okpuru idu ndú nke Kraịst na-anọchite anya mba dị iche iche dị otú ahụ ugbu a. (Mkpughe 7:9, 14) Ma idu ndú Jisọs akwụsịghị ebe ahụ. “Ịbụ onye isi” ya ga-adịgide ruo otu puku afọ. Nye ụmụ mmadụ na-erube isi, ọ ga-eme ihe kwekọrọ n’aha ya bụ́ “Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke nke bụ Dike, Nna nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi, Onyeisi Udo.”—Aịsaịa 9:6, 7; Mkpughe 20:6.
7. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Kraịst Jisọs duru anyị gaa “n’isi iyi nke mmiri nke ndu,” gịnị ka anyị na-aghaghị ime n’egbughị oge, gịnịkwa ga-eme ka Jisọs na Jehova hụ anyị n’anya?
7 Ọ bụrụ na anyị chọrọ irite uru site “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ” bụ́ ebe Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs, na-eduga ụmụ mmadụ ndị obi ha ziri ezi, anyị aghaghị igosi n’egbughị oge ọ bụla site n’ụzọ anyị si adị ndụ na anyị ji ọṅụ edo onwe anyị n’okpuru ịbụ isi ya dị ka Eze. (Mkpughe 7:17; 22:1, 2; tụlee Abụ Ọma 2:12.) Jisọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu na-ahụ m n’anya, unu ga-edebe ihe nile M nyere n’iwu. Onye nwere ihe M nyere n’iwu, nke na-edebekwa ha, ọ bụ onye ahụ na-ahụ m n’anya: onye na-ahụ m n’anya, Nna m ga-ahụkwa ya n’anya, Mụ onwe m ga-ahụkwa ya n’anya.” (Jọn 14:15, 21) Ị̀ chọrọ ka Jisọs na Nna ya hụ gị n’anya? Mgbe ahụ debe onwe gị n’okpuru ịbụ isi ha.
Ndị Nlekọta Na-eji Ọṅụ Erube Isi
8, 9. (a) Gịnị ka Kraịst nyeworo maka iwuli elu nke ọgbakọ, n’akụkụ dịkwa aṅaa ka ndị ikom ndị a kwesịrị ịbụ ihe nlereanya nye ìgwè atụrụ ahụ? (b) Olee otú e si gosi ịnọ n’okpuru nke ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst n’ụzọ ihe atụ́ n’akwụkwọ Mkpughe, oleekwa otú ha pụrụ isi chọọ “obi na-anụ ihe” mgbe ha na-eleba anya n’okwu ikpe dị iche iche?
8 “A na-edo nzukọ ahụ n’okpuru Kraịst anyị.” Dị ka Onye Nlekọta ya, ọ họpụtawo ‘onyinye dị iche iche n’ime mmadụ’ maka “iwuli ahụ” nke ọgbakọ elu. (Ndị Efesọs 4:8, 11, 12; 5:24) A gwara ndị a bụ́ ndị okenye n’ụzọ ime mmụọ ka ha ‘na-azụ ìgwè atụrụ nta Chineke nke dị n’etiti ha,’ ọ bụghịkwa dị ka a ga-asị na “unu na-eme ndị bụ ihe nketa dị ka unu bụ ndị nwe ha, kama na-eme onwe unu ihe atụ ìgwè atụrụ nta ahụ ga-eṅomi.” (1 Pita 5:1-3) Ìgwè atụrụ ahụ bụ nke Jehova, Kraịst bụkwa “onye ọzụzụ atụrụ ọma” ya. (Jọn 10:14) Ebe ọ bụ na ndị nlekọta ndị a n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-atụ anya nkwado sitere n’obi nke atụrụ ndị a Jehova na Kraịst nyeworo ha ilekọta, ha onwe ha kwesịrị ịbụ ezi ihe nlereanya nke ido onwe onye n’okpuru.—Ọrụ 20:28.
9 Na narị afọ mbụ, e gosipụtara ndị nlekọta e tere mmanụ n’ụzọ ihe atụ dị ka ndị nọ “n’aka” nri Kraịst, na-egosipụta ịnọ n’okpuru ha nye ya dị ka Isi nke ọgbakọ ahụ. (Mkpughe 1:16, 20; 2:1) N’ịbụ otu ihe ahụ taa, ndị nlekọta nọ n’ime ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova kwesịrị ido onwe ha n’okpuru nduzi Kraịst ma ‘doo onwe ha n’okpuru aka dị ike nke Chineke.’ (1 Pita 5:6) Mgbe a kpọrọ ha ilebara okwu ikpe dị iche iche anya, ha kwesịrị ikpegara Jehova ekpere, dị ka Solomọn n’afọ ndị ahụ o kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ma nye ohu gị obi na-anụ ihe ikpe ndị Gị ikpe, ịghọta ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ.” (1 Ndị Eze 3:9) Obi na-anụ ihe ga-akpali onye okenye ịchọ ịhụ ihe n’ụzọ Jehova na Kraịst Jisọs si ahụ ha, ka mkpebi ndị e mere n’ụwa yie nnọọ ruo n’ókè ọ pụrụ ikwe mee ndị nke e mere n’eluigwe.—Matiu 18:18-20.
10. Olee otú ndị nlekọta nile kwesịrị isi gbalịa iṅomi Jisọs n’ụzọ o si mesoo atụrụ ahụ?
10 Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị okenye ọgbakọ n’otu aka ahụ ga-agbalịkwa iṅomi Kraịst n’ụzọ o si mesoo atụrụ ahụ. N’adịghị ka ndị Farisii, Jisọs atụkwasịghị ọtụtụ ụkpụrụ ndị siri ike ịgbaso. (Matiu 23:2-11) Ọ gwara ndị ahụ yiri atụrụ, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:28-30) Ọ bụ ezie na onye Kraịst ọ bụla aghaghị ‘iburu ibu nke aka ya,’ ndị nlekọta kwesịrị icheta ihe nlereanya nke Jisọs ma nyere ụmụnna ha aka inwe mmetụta na ibu nke ibu ọrụ ndị Kraịst ha “adịghị egbu mgbu,” ‘dị mfe,’ bụrụkwa ihe ọṅụ iburu.—Ndị Galetia 6:5.
Ido Onwe Anyị n’Okpuru n’Ụzọ Ọchịchị Chineke
11. (a) Olee otú mmadụ pụrụ isi na-akwanyere ịbụ isi ùgwù ma bụrụkwa onye na-adịghị eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke n’ezie? Nye ihe atụ. (b) Gịnị ka ọ pụtara ịbụ onye na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke n’ezie?
11 Ọchịchị Chineke bụ ịchịisi nke Chineke. Ọ gụnyere ụkpụrụ nke ịbụ isi nke a kọwapụtara ná 1 Ndị Kọrint 11:3. Ma ọ pụtara ihe karịrị nke ahụ. Mmadụ pụrụ iyi onye na-egosi nkwanye ùgwù maka ịbụ isi ma gharakwa ịbụ onye na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke n’echiche zuru ezu nke okwu ahụ. Nke a pụrụ isi aṅaa mee? Iji mee ihe atụ, ọchịchị onye kwuo uche ya bụ gọọmenti ndị mmadụ họpụtara, a kọwaala onye nkwado nke ọchịchị onye kwuo uche ya dị ka “onye kwere n’echiche dị iche iche nke ọchịchị onye kwuo uche ya.” Mmadụ pụrụ ịzọrọ na ya bụ onye na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya, na-ekere òkè ná ntụli aka elu dị iche iche, ọbụna bụrụkwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arụsi ọrụ ike. Ma ọ bụrụ na ọ na-emebi mmụọ nke ọchịchị onye kwuo uche ya na ụkpụrụ nile ọ gụnyere, site n’ụzọ o si eme omume n’ozuzu ya, à pụrụ ịsị na ọ bụ n’ezie onye na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya? N’otu aka ahụkwa, iji bụrụ onye na-eme ihe kwekọrọ n’ọchịchị Chineke n’ezie, mmadụ aghaghị ime ihe karịrị nanị ido onwe ya n’okpuru ịbụ isi n’ọnụ. Ọ ghaghị iṅomi àgwà na ụzọ nile nke Jehova. Ọ ghaghị ịbụ onye Jehova na-achị n’ezie n’ụzọ nile. Ebe ọ bụkwa na Jehova enyefewo ikike zuru ezu n’aka Ọkpara ya, ịbụ onye na-eme ihe kwekọrọ n’ọchịchị Chineke pụtakwara iṅomi Jisọs.
12, 13. (a) Gịnị ka ịbụ onye na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke gụnyere karịsịa? (b) Ido onwe onye n’okpuru n’ụzọ ọchịchị Chineke ọ̀ gụnyere irube isi n’ọtụtụ ụkpụrụ? Nye ihe atụ.
12 Cheta, Jehova na-achọ ido onwe onye n’okpuru sitere n’obi bụ́ nke ịhụnanya na-akpali. Nke ahụ bụ ụzọ nke o si na-achị eluigwe na ala. Ọ bụ ịhụnanya n’onwe ya. (1 Jọn 4:8) Kraịst Jisọs bụ “nnwupụ nke ebube Ya na onyinyo nke ụdị Ya.” (Ndị Hibru 1:3) Ọ chọrọ n’aka ezi ndị na-eso ụzọ ya ka ha hụrịtaa onwe ha n’anya. (Jọn 15:17) Ya mere ịbụ onye na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke gụnyere ọ bụghị nanị ịbụ onye na-edo onwe onye n’okpuru kamakwa ịbụ onye na-ahụ n’anya. A pụrụ ịchịkọta okwu ahụ n’ụzọ nke a na-esonụ: Ọchịchị Chineke bụ ịchịisi nke Chineke; Chineke bụ ịhụnanya; n’ihi ya ọchịchị Chineke bụ ịchịisi site n’ịhụnanya.
13 Onye bụ okenye pụrụ iche na iji bụrụ ndị na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke, ụmụnna aghaghị irube isi n’ụdị ụkpụrụ nile ọ bụla. Ndị okenye ụfọdụ esitewo n’aro dị iche iche nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-atụ site na mgbe ruo na mgbe mepụta ụkpụrụ dị iche iche. (Matiu 24:45) Dị ka ihe atụ, a tụrụ aro n’otu mgbe na n’ihi iji mata ụmụnna nke ọma n’ime ọgbakọ ngwa ngwa, ọ pụrụ ịdị mma ịhapụ ịnọdụ ala mgbe nile n’otu oche ahụ n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze. E bu n’uche ka nke a bụrụ aro bara uru, ọ bụghị ụkpụrụ na-enweghị mgbanwe. Ma ndị okenye ụfọdụ pụrụ ịchọ imegharị ya ka ọ bụrụ ụkpụrụ wee chee na ndị ahụ na-adịghị agbaso ya adịghị eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke. Otú ọ dị, a pụrụ inwe ọtụtụ ezi ihe kpatara nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị pụrụ iji họrọ ịdị na-anọdụ n’otu ebe. Ọ bụrụ na onye okenye etinyeghị ihe ndị a n’uche n’ụzọ ịhụnanya, ya onwe ya ọ̀ na-eme ihe n’ezie n’ụzọ ọchịchị Chineke? Iji bụrụ onye na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke, “ka e mee ihe unu nile n’ịhụnanya.”—1 Ndị Kọrint 16:14.
Iji Ọṅụ Na-eje Ozi
14, 15. (a) Olee otú onye okenye pụrụ isi napụ ụmụnna nwoke ma ọ bụ ụmụnna nwanyị ụfọdụ ọṅụ ha n’ijere Jehova ozi, gịnịkwa mere na nke a agaghị abụ ime ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke? (b) Olee otú Jisọs si gosị na ya na-enwe mmasị n’ịhụnanya a na-egosipụta site n’ije ozi anyị, kama ịbụ n’otú ọ hà? (ch) Gịnị ka ndị okenye kwesịrị iburu n’uche?
14 Ịbụ onye na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke pụtakwara iji ọṅụ na-ejere Jehova ozi. Jehova bụ “Chineke nke obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11, NW) Ọ chọrọ ka ndị na-efe ya ofufe jiri ọṅụ na-ejere ya ozi. Ndị na-esi ọnwụ maka ụkpụrụ dị iche iche kwesịrị icheta na otu n’ime ụkpụrụ nke mba Israel na-aghaghị “ilezi anya ime” bụ nke a: “Ị ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova, bụ́ Chineke gị, ná nsetị aka gị ọ bụla.” (Deuterọnọmi 12:1, 18) Ihe ọ bụla anyị na-eme n’ozi Jehova kwesịrị ịbụ ihe ọṅụ, ọ bụghị ibu arọ. Ndị nlekọta pụrụ ime ihe dị ukwuu iji mee ka ụmụnna nwee obi ụtọ ime ihe ha pụrụ ime n’ijere Jehova ozi. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ndị okenye elezighị anya, ha pụrụ ịnapụ ụmụnna ụfọdụ ọṅụ ha. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ha emee ntụnyere dị iche iche, na-aja ndị ahụ ruru ma ọ bụ gafeworo nkezi nke hour ọgbakọ tinyere n’ịgba àmà mma ma si n’ụzọ dị otú ahụ na-akatọ ndị ahụ na-erughị ya, olee otú ọ ga-adị ndị ahụ n’obi bụ́ ndị nwere ezi ihe kpatara ha ji nye oge dị nnọọ nta? Nke a ọ̀ pụghị ịkụnye n’ime ha echiche ikpe ọmụma na-adịghị mkpa ma napụkwa ha ọṅụ ha?
15 Hour ole na ole nke ụfọdụ pụrụ itinye n’ịgba àmà ihu ọha pụrụ ịbụ mgbalị ka ukwuu karịa ọtụtụ hour ndị ahụ nke ndị ọzọ tinyere n’ime nkwusa, n’ihi ịbụ ndị na-emebeghị agadi n’afọ ndụ, ndị nwere ahụ ike ka mma, na ọnọdụ ndị ọzọ. N’akụkụ nke a, ndị okenye agaghị ekpe ha ikpe. N’ezie, ọ bụ Jisọs ka Nna ahụ nyeworo “ike ịrụ ọrụ ikpe.” (Jọn 5:27) Jisọs ọ̀ katọrọ nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke bụ ogbenye n’ihi na onyinye ya erughị nkezi? Ee e, ọ matara ihe ego nta abụọ ndị ahụ were nwanyị ahụ n’ezie. Ha bụ “ka ihe nile nke o nwere hà, bụ́ ihe dum o ji biri.” Lee aha ịhụnanya dị omimi nye Jehova nke ha nọchitere anya ya! (Mak 12:41-44) Ó kwesịghị ka ndị okenye dịrị nkọ otú ahụ ịmata mgbalị ịhụnanya dị iche iche nke ndị ahụ ihe nile ha nwere ná ngụkọta na-erughị “nkezi”? A bịa n’okwu ịhụnanya maka Jehova, mgbalị ndị dị otú ahụ pụrụ ịkarị nkezi n’ezie!
16. (a) Ọ bụrụ na ndị nlekọta ejiri ọnụ ọgụgụ dị iche iche mee ihe n’okwu ndị ha na-ekwu, gịnị mere nghọta na ezi uche ji dị ha mkpa? (b) Olee ụzọ kasị mma a pụrụ isi nyere ụmụnna aka ịmụbawanye ije ozi ha?
16 È kwesịrị ịgbanwe okwu ndị a ugbu a ka ha ghọọ “ụkpụrụ” ọhụrụ nke na e kwesịghị ịkpọtụ ọnụ ọgụgụ dị iche iche—ọbụna nkezi dị iche iche aha? Ọ dịghị ma ọlị! Ihe bụ isiokwu bụ na ndị nlekọta kwesịrị inwe uche ziri ezi n’etiti ịgba ụmụnna ume ịmụbawanye ije ozi ha na inyere ha aka iji ọṅụ mee ihe ha nwere ike ime. (Ndị Galetia 6:4) N’ihe atụ Jisọs nke talent ndị ahụ, onyenwe ha raara ihe nile o nwere nye n’aka ndị ohu ya “onye ọ bụla dị ka ike nke aka ya hà.” (Matiu 25:14, 15) Ndị okenye n’otu aka ahụkwa kwesịrị ichebara ikike nke onye nkwusa Alaeze ọ bụla echiche. Nke a na-achọ iji nghọta eme ihe. Ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ chọrọ agbamume n’ezie iji mekwuo ihe. Ha pụrụ inwe obi ekele n’aka e nyeere ha iji hazie ihe omume ha n’ụzọ ka mma. Otú o sina dị, ọ bụrụ na a pụrụ inyere ha aka iji ọṅụ mee ihe ha nwere ike ime, o yikarịrị ka ọṅụ ahụ ọ ga-enyekwu ha ume iji gbasawanye ihe omume ndị Kraịst ha ebe o kwere omume.—Nehemaịa 8:10; Abụ Ọma 59:16; Jeremaịa 20:9.
Udo ahụ nke Na-abịa Site n’Iji Ọṅụ Edo Onwe Onye n’Okpuru
17, 18. (a) Olee otú iji ọṅụ edo onwe onye n’okpuru pụrụ isi wetara anyị udo na ezi omume? (b) Gịnị pụrụ ịbụ nke anyị ma ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị n’ezie n’iwu nile nke Chineke?
17 Iji ọṅụ edo onwe onye n’okpuru ọkaaka iwu ziri ezi nke Jehova na-ewetara anyị udo dị ukwuu. Onye ọbụ abụ ahụ kwuru n’ekpere gwa Jehova, sị: “Udo nke hiri nne ka ndị na-ahụ iwu gị n’anya nwere; ọ dịghịkwa ihe ịsụ ngọngọ ha nwere.” (Abụ Ọma 119:165) Site n’irube isi n’iwu Chineke, anyị na-ewetara onwe anyị abamuru. Jehova gwara mba Israel, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, bụ́ Onye mgbapụta gị na Onye Nsọ Israel: Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ị ṅararị ntị n’ihe nile m nyere n’iwu! Udo gị ewee dịworị ka osimiri, ezi omume gị adịkwa ka mmali mmiri nile nke oké osimiri.”—Aịsaịa 48:17, 18.
18 Àjà mgbapụta nke Kraịst na-ewetara anyị udo n’ebe Chineke nọ. (2 Ndị Kọrint 5:18, 19) Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe n’ọbara mgbapụta Kraịst ma jirikwa akọ na uche anyị nile na-anwa ịlụso adịghị ike anyị nile ọgụ, na-emekwa uche Chineke, anyị ga-enwere onwe anyị pụọ ná mmetụta nke ikpe ọmụma. (1 Jọn 3:19-23) Okwukwe dị otú ahụ, nke e ji ọrụ dị iche iche kwadoo, na-enye anyị nguzo ezi omume n’ihu Jehova, na olileanya dị ịtụnanya nke ịlanarị ‘oké mkpagbu ahụ’ na ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke Jehova. (Mkpughe 7:14-17; Jọn 3:36; Jemes 2:22, 23) Ihe a nile pụrụ ịbụ nke anyị ‘ma a sị na anyị ga-aṅa ntị n’ezie n’ihe nile Chineke nyere n’iwu.’
19. Na gịnị ka obi ụtọ anyị ugbu a na olileanya anyị nke ndụ ebighị ebi dabeere na ya, oleekwa ụzọ Devid si kwupụta ihe anyị kwenyere na ya?
19 Ee, obi ụtọ anyị ugbu a na olileanya anyị nke ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs dabeere na anyị iji ọṅụ doo onwe anyị n’okpuru ịchịisi Jehova dị ka Eze Onyenwe eluigwe na ala. Ka anyị nọgide mgbe nile na-enwe ụdị mmetụta nke Devid, onye kwupụtara, sị: “Jehova, Gị nwe ịdị ukwuu, na ịdị ike, na ịma mma, na mmeri, na ebube: n’ihi na ihe nile dị n’eluigwe na ụwa bụ nke Gị; Jehova, Gị nwe alaeze, Gị bụkwa Onye a na-eweli elu ịbụrụ ihe nile onye isi. Ma ugbu a, Chineke anyị, anyị onwe anyị na-ekele gị, na-etokwa aha gị mara mma.”—1 Ihe Emere 29:11, 13.
Isi Ihe Ndị A Ga-echeta
◻ Ụdị ịnọ n’okpuru na nrubeisi dị aṅaa ka Jehova chọrọ ka ndị ohu ya na-egosi?
◻ Olee otú e si kwụghachi Jisọs ụgwọ ọrụ maka nrubeisi ya, gịnịkwa ka anyị na-aghaghị igosipụta site n’omume anyị?
◻ Olee otú ndị nlekọta nile kwesịrị isi ṅomie Jisọs n’ụzọ o si mesoo atụrụ ahụ?
◻ Gịnị ka ịbụ onye na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke gụnyere?
◻ Ngọzi ndị dị aṅaa ka iji ọṅụ na-edo onwe onye n’okpuru na-ewetara anyị?
[Foto dị na peeji nke 24]
Ndị okenye na-agba ìgwè atụrụ ahụ ume iji ọṅụ mee ihe ọ bụla ha pụrụ ime
[Foto dị na peeji nke 26]
Jehova na-enwe obi ụtọ ná ndị ji obi nile na-erubere ya isi