“E jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ”
“O LEE ebe m si bịa?” Nke a bụ ajụjụ nke ihe ka ọtụtụ n’ụmụaka na-eto eto na-ajụ n’otu oge ma ọ bụ ọzọ. Mgbe ụmụaka ahụ tolitere, ajụjụ ha na-aghọkarị nke miri emi karị: “Olee ebe ndụ si bịa?” A tụlewo ajụjụ a ruo ọtụtụ puku afọ, ka ọ dị ugbu a ọtụtụ ndị ọkà mmụta sayensị na-ele evolushọn anya dị ka azịza ezi uche kasị dịrị na ya nye ihe mgbagwoju anya ahụ nke mmalite nke ndụ. N’ụzọ bụ isi, nkọwa nke onye kwere n’evolushọn bụ na ndụ malitere na mberede.
Ihe dị ka 3,000 afọ gara aga, Eze Devid dere, sị: “E jiwo ihe dị iche iche dị egwu mee ka m bụrụ oké ọrụ.” (Abụ Ọma 139:14) Ka anyị na-amụtakwu banyere ndụ, otú ahụ ka anyị na-ahụkwu eziokwu nke dị n’okwu ndị ahụ. N’ezie, onye ọkà mmụta physics bụ́ Fred Hoyle dere, sị: “Ka ndị ọkà mmụta mmiri ọgwụ ndị mejupụtara ihe ndị dị ndụ nọgidere na-achọpụtakwu banyere ịdị mgbagwoju anya na-ebu isi nke ndụ, o doro anya na ohere ndị e nwere na ọ malitere na mberede dị ntakịrị nke ukwuu nke na a pụrụ ịkachapụ ha kpam kpam. Ndụ apụghị ịmaliteworị na mberede.”
Ya mere gịnị bụ mmalite nke ndụ? Isiokwu abụọ dị ná mmalite nke magazin a tụlere ajụjụ ahụ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inwetakwu ihe ọmụma, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B 1090, Benin City, Edo State, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 2.