Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 10/15 p. 12-15
  • Jisọs Ọ̀ Pụrụ Inweworị Okwukwe n’Ebe Chineke Nọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jisọs Ọ̀ Pụrụ Inweworị Okwukwe n’Ebe Chineke Nọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ekpere Dị Iche Iche n’Enweghị Okwukwe?
  • E Mee Ka “Onye Mmezu nke Okwukwe Anyị” Zuo Okè
  • Ọ̀ Bụ Na O Kweghị n’Okwu Chineke?
  • Jisọs, Ihe Nlereanya nke Okwukwe A Ga-eṅomi
  • Nwee Okwukwe nke Dabeere n’Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Nwee Okwukwe ná Nkwa Ndị Jehova Kwere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ì Nwere Okwukwe N’ezie N’ozi Ọma Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • ‘Nyere M Aka n’Ebe Ọ Dị M Mkpa Inwekwu Okwukwe!’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 10/15 p. 12-15

Jisọs Ọ̀ Pụrụ Inweworị Okwukwe n’Ebe Chineke Nọ?

Nsogbu Ndị Kwere n’Atọ n’Ime Otu Nọ n’Ime Ya

“OLEE otú Jisọs pụrụ isi nweworị okwukwe? Ọ bụ Chineke; ọ maara ma na-ahụ ihe nile n’adabereghị n’onye ọ bụla ọzọ. Ugbu a ihe dị n’okwukwe bụ kpọmkwem ịdabere n’onye ọzọ na ịnakwere ihe a na-ahụghị anya; n’ihi ya, a na-agụpụ na Jisọs Nke Bụ Chineke pụrụ inweworị okwukwe.”

Dị ka onye ọkà mmụta okpukpe bụ́ onye France bụ́ Jacques Guillet si kwuo, nke ahụ bụ echiche bụ isi n’okpukpe Katọlik. Nkọwa nke a ò juru gị anya? Ị pụrụ icheworị na ebe Jisọs bụ ihe nlereanya nye ndị Kraịst n’ihe nile, ọ ghaghịkwa ịbụ ihe nlereanya nke okwukwe. Ọ bụrụ na i chere otú ahụ, i chebabereghị nkwenkwe Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm echiche.

Okwu banyere okwukwe Jisọs bụ ihe na-edoghị anya nye ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik, Protestant, na Orthodox, bụ́ ndị kwetara n’Atọ n’Ime Otu dị ka “ihe omimi bụ́ isi nke okwukwe na ndụ ndị Kraịst.”a Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile na-agọnarị okwukwe Jisọs. Jacques Guillet kwetara na “ọ gaghị ekwe omume ịghara ịmata na Jisọs nwere okwukwe,” ọ bụ ezie na Guillet kwetara na, ọ bụ “eziokwu yiri ụgha,” dabere ná nghọta nke ozizi Atọ n’Ime Otu.

Onye Jesuit bụ́ onye France bụ́ Jean Galot, na ihe ka ná ndị ọkà mmụta okpukpe ndị dị ka ya, ezoghị ọnụ n’ikwu na ebe ọ bụ “Chineke n’ezie na mmadụ n’ezie, . . . Kraịst apụghị ikweta n’onwe ya.” “Isi ihe dị n’okwukwe bụ ikwere n’onye ọzọ, ọ bụghị ikwere n’onwe onye,” ka akwụkwọ ọgụgụ bụ́ La Civiltà Cattolica na-ekwu. Ihe mgbochi dịzị n’ikweta okwukwe Jisọs bụ nkwenkwe nke Atọ n’Ime Otu ahụ, ebe ọ bụ na ozizi abụọ ahụ na-emegiderịta ibe ha n’ụzọ doro anya.

“Ọ dịghị mgbe ọ bụla Oziọma ndị ahụ kwuru okwu banyere okwukwe Jisọs,” ka ndị ọkà mmụta okpukpe na-ekwu. Ya bụ, okwu ndị e ji mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụ́ pi·steuʹo (kweta, nwee okwukwe) na piʹstis (okwukwe) na-ezo aka n’ozuzu ya n’ebe okwukwe nke ndị na-eso ụzọ nwere n’ebe Chineke ma ọ bụ Kraịst nọ, kama ịbụ okwukwe Jisọs nwere n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ. Ànyị kwesịzịrị ikwubi na Ọkpara Chineke enweghị okwukwe? Gịnị ka anyị pụrụ ịghọta site n’ihe o mere ma kwuo? Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu?

Ekpere Dị Iche Iche n’Enweghị Okwukwe?

Jisọs bụ nwoke na-ekpe ekpere. O kpere ekpere n’ọnọdụ ọ bụla​—⁠mgbe e mere ya baptism (Luk 3:21); abalị nile tupu ọ họta ndị ozi 12 ya (Luk 6:​12, 13); na tupu nnwogha ọrụ ebube ya n’elu ugwu, ka ya na ndị ozi bụ́ Pita, Jọn, na Jemes nọ. (Luk 9:​28, 29) Ọ na-ekpe ekpere mgbe otu n’ime ndị ozi jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, zi anyị ikpe ekpere,” o wee kụziere ha Ekpere Onyenwe Anyị (“Nna Anyị Bi n’Eluigwe”). (Luk 11:​1-⁠4; Matiu 6:​9-⁠13) O kpere ekpere nanị ya, ruokwa ogologo oge n’isi ụtụtụ (Mak 1:​35-⁠39); n’oge uhuruchi, n’elu ugwu, ka o zilagachara ndị na-eso ụzọ ya (Mak 6:​45, 46); ya na ndị na-eso ụzọ ya nakwa maka ndị na-eso ụzọ ya. (Luk 22:32; Jọn 17:​1-⁠26) Ee, ekpere bụ akụkụ dị mkpa nke ndụ Jisọs.

O kpere ekpere tupu ọ rụọ ọrụ ebube dị iche iche, dị ka ihe atụ, tupu ọ kpọlite enyi ya bụ́ Lazarọs n’ọnwụ: “Nna, ekelee m Gị na Ị nụrụ olu m. Ma mụ onwe m matara na Ị na-anụ olu m mgbe nile: ma n’ihi ìgwè mmadụ a nke guzoro gburugburu ka M kwuru ya, ka ha wee kwere na ọ bụ Gị onwe gị zitere m.” (Jọn 11:​41, 42) Ojiji o ji n’aka na Nna ya ga-aza ekpere ahụ na-egosi ịdị ike nke okwukwe ya. Njikọ nke a dị n’etiti ekpere e kpegaara Chineke na okwukwe n’ebe Ọ nọ pụtara ìhè site n’ihe Kraịst gwara ndị ahụ na-eso ụzọ: “Ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-ekpe n’ekpere rịọkwa, kwenụ na unu anatawo ha.”​—⁠Mak 11:24.

Ọ bụrụ na Jisọs enweghị okwukwe, gịnị mere o ji kpegara Chineke ekpere? Nkụzi Atọ n’Ime Otu ahụ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke Krisendọm, na Jisọs bụ ma mmadụ ma Chineke n’otu mgbe ahụ, na-ekpuchi ozi nke Bible. Ọ na-egbochi ndị mmadụ ịghọta ịdị mfe na ike nke Bible. Ònye ka nwoke ahụ bụ́ Jisọs kpọkuru? Ọ̀ bụ onwe ya? Ọ̀ bụ na ọ mataghị na ya bụ Chineke? Ọ bụrụkwa na ọ bụ Chineke, marakwa na ya bụ, gịnị mere o ji kpee ekpere?

Ekpere dị iche iche nke Jisọs n’ụbọchị ikpeazụ nke ndụ elu ala ya na-enye anyị ọbụna nghọta ka omimi n’okwukwe ya siri ike n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ. N’igosipụta olileanya na iji obi ike na-atụ anya ihe, ọ rịọrọ, sị: “Nna, Gị onwe gị werekwa otuto nke M nwere n’ebe Ị nọ mgbe ụwa a ka adịghị nye m otuto ugbu a n’ebe Gị onwe Gị nọ.”​—⁠Jọn 17:5.

N’ịmara na ule ya ndị kasị sie ike na ọnwụ ya dị nso, n’abalị ahụ ọ nọ n’ogige Getsemane n’elu Ugwu Olive, “o wee malite iwute Ya n’obi, obi malitekwara ịlọ Ya mmiri,” o wee sị: “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ruo ọnwụ.” (Matiu 26:​36-⁠38) Mgbe ahụ o gbuo ikpere n’ala wee kpee ekpere, sị: “Nna, ọ bụrụ na ọ dị Gị mma, nara m iko a: otú ọ dị, ka e mee ihe Gị onwe gị na-achọ, ọ bụghị ihe Mụ onwe m na-achọ.” Mgbe ahụ “e wee mee ka Ọ hụ mmụọ ozi nke si n’eluigwe bịa, na-enye Ya ike.” Chineke ṅara ntị n’ekpere ya. N’ihi ịdị ukwuu nke mmetụta uche ya na ịta akpụ nke ule ahụ, “ọsụsọ Ya wee ghọọ ihe dị ka oké ọkpụrụkpụ ọbara na-ada n’ala.”​—⁠Luk 22:​42-⁠44.

Gịnị ka ahụhụ nile nke Jisọs, mkpa ya nke ịbụ onye e nyere ike, na arịrịọ ya nile na-egosi? “Otu ihe doro anya,” ka Jacques Guillet na-ede, “Jisọs kpere ekpere, ekpere bụkwa akụkụ dị mkpa nke ndụ ya na nke ihe ndị o mere. O kpere ekpere otú ndị mmadụ si ekpe, o kpekwara ekpere n’ihi ndị mmadụ. Leenụ, a pụghị iche n’echiche ụmụ mmadụ ikpe ekpere n’enweghị okwukwe. À ga-eche n’echiche Jisọs ikpe ekpere n’enweghị okwukwe?”

Ka ọ kwụ n’elu osisi ịta ahụhụ ntakịrị oge tupu ọnwụ ya, Jisọs jiri oké olu tie mkpu, na-ehota otu abụ ọma nke Devid. Ka e mesịrị, n’okwukwe o ji oké olu tie arịrịọ ikpeazụ ya ná mkpu, sị: “Nna, n’aka Gị ka M na-enye mmụọ m idebe.” (Luk 23:46; Matiu 27:46) Otu nsụgharị nke njikọ okpukpe dị iche iche n’asụsụ Italian bụ́ Parola del Signore, na-asị na Jisọs ‘nyefere ndụ ya’ n’aka Nna ahụ.

Jacques Guillet na-ekwu, sị: “Site n’igosi anyị ebe a kpọgidere Kraịst ahụ n’elu obé, jiri abụ ọma dị iche iche nke Israel na-ebeku Nna ya, ndị dere Oziọma na-eme ka anyị kwenye na ákwá ahụ, ákwá nke Ọkpara a mụrụ nanị ya, ákwá nke oké ihe mgbu, ákwá nke inwe obi ike zuru ezu, bụ ákwá nke okwukwe, ákwá nke ọnwụ n’ime okwukwe.”

N’ịbụ ndị ihe àmà nke a doro anya ma dị ịrịba ama nke okwukwe chere ihu, ụfọdụ ndị ọkà mmụta okpukpe na-anwa ịkpa ókè n’agbata okwukwe na “obi ike.” Otú ọ dị, ụdị ịkpa ókè dị otú ahụ adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ.

Ma gịnị kpọmkwem ka ule siri ike ndị ọ tachiri obi na ha na-ekpughe banyere okwukwe Jisọs?

E Mee Ka “Onye Mmezu nke Okwukwe Anyị” Zuo Okè

N’isi nke 11 nke akwụkwọ ozi ya o degaara ndị Hibru, Pọl onyeozi hotara oké ìgwè nke ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst. O mechiri, na-ezo aka n’ebe onye nlereanya kasị ukwuu nke zukwara okè nke okwukwe nọ: “Na-elegide Jisọs anya, bụ́ onye ndú na onye mmezu nke okwukwe anyị, Onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu Ya na-atachi obi [n’elu osisi ịta ahụhụ, NW] Ya, na-elelị ihere anya . . . Tụgharịanụ uche n’Onye ahụ Nke tachiworo obi ná nkwugide dị otú a, bụ́ nke ndị mmehie na-ekwugide onwe ha, ka ike ghara ịgwụ unu, unu wee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.”​—⁠Ndị Hibru 12:​1-⁠3.

Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ọkà mmụta okpukpe na-asị na amaokwu a adịghị ekwu banyere “okwukwe onwe onye nke Jisọs” kama nke ahụ banyere òkè ya dị ka “onye mmalite ma ọ bụ onye tọrọ ntọala nke okwukwe.” Okwu Grik bụ́ te·lei·ótes nke pụtara n’ahịrị okwu a na-ezo aka n’ebe onye na-eme ka ihe zuo okè, onye na-amata ma ọ bụ na-emezu ihe nọ. Dị ka “Onye Mmezu” ahụ, Jisọs mezuru okwukwe n’echiche nke na ọbịbịa ọ bịara n’elu ala mezuru amụma dị iche iche nke Bible wee si otú a guzobe ihe mgbakwasị ụkwụ ka sie ike maka okwukwe. Ma nke a ọ̀ pụtara na o nweghị okwukwe?

Ihe odide ndị ahụ sitere n’akwụkwọ ozi ahụ e degaara ndị Hibru nke ị pụrụ ịhụ n’igbe dị na peji nke 15 ahapụghị ihe ịrụ ụka ọ bụla. Ahụhụ ya na nrubeisi ya nile mere ka Jisọs zuo okè. Ọ bụ ezie na ọ bụrịị nwoke zuru okè, ahụmahụ ya dị iche iche mere ya ka o zuo okè ma zuo ezu n’ihe nile, ọbụna n’okwukwe, ka o wee ghọọ onye ruru eru n’ụzọ zuru ezu dị ka Onye Isi Nchụàjà maka nzọpụta nke ezi ndị Kraịst. O ji “ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri” rịọ Nna ya, o “kwesịrị ntụkwasị obi” nye Chineke, o nwekwara “egwu Chineke.” (Ndị Hibru 3:1, 2; 5:7-⁠9) A ‘nwara ya n’ihe nile’ n’otu ụzọ ahụ kpọmkwem “a na-anwa anyị,” ka ndị Hibru 4:15 na-asị, ya bụ, dị ka a na-anwa onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi onye okwukwe ya na-ezute “ọnwụnwa dị iche iche.” (Jemes 1:​2, 3) Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na a pụrụ ịnwa Jisọs “n’otu ụzọ ahụ” a na-anwa ndị na-eso ụzọ ya n’abụghị onye a nwara n’okwukwe ya dị ka a na-anwa ha?

Arịrịọ, nrubeisi, ahụhụ, ule, ikwesị ntụkwasị obi, na egwu Chineke na-agba akaebe nke okwukwe zuru ezu nke Jisọs. Ha na-egosi na ọ ghọrọ “Onye Mmezu nke okwukwe anyị” nanị mgbe e mesịrị ka o zuo okè n’okwukwe nke ya. N’ụzọ doro anya, ọ bụghị Chukwu Nwa, dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu na-ekwu.​—⁠1 Jọn 5:5.

Ọ̀ Bụ Na O Kweghị n’Okwu Chineke?

Ozizi Atọ n’Ime Otu na-akpụzi echiche nke ndị ọkà mmụta okpukpe ruo n’ókè nke na ha na-eru n’echiche gabigara ókè nke ikwu na Jisọs “apụghị ikwenye n’Okwu Chineke na ozi ya” n’ihi na “dị ka Okwu Chineke n’onwe ya, ọ pụrụ nanị ikwupụta okwu ahụ.”​—⁠Angelo Amato, Gesù il Signore, nke nwere akara nkwado mbipụta nke ndị ndú chọọchị.

Ma, gịnị ka ozuzo aka Jisọs nọgidere na-ezo n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi n’ezie? Mgbe a nwara ya, o hotara ihe ugboro atọ site n’Akwụkwọ Nsọ. Nzaghachi ya nke atọ gwara Setan na Jisọs fere nanị Chineke. (Matiu 4:​4, 7, 10) Ọtụtụ ugboro Jisọs hotara amụma dị iche iche ndị metụtara ya, na-egosi okwukwe ná mmezu ha. (Mak 14:​21, 27; Luk 18:31-⁠33; 22:37; tụlee Luk 9:22; 24:44-⁠46.) Site ná nnyocha nke a anyị aghaghị ikwubi na Jisọs maara Akwụkwọ Nsọ ahụ sitere n’ike Nna ya, o ji okwukwe debe ha, o nwekwara ntụkwasị obi zuru ezu ná mmezu nke amụma ndị kwuru banyere ule ya dị iche iche, ahụhụ, ọnwụ, na mbilite n’ọnwụ.

Jisọs, Ihe Nlereanya nke Okwukwe A Ga-eṅomi

Jisọs aghaghị ịgba mgba nke okwukwe ruo ná njedebe iji jigide iguzosi ike n’ihe nye Nna ya na iji ‘merie ụwa.’ (Jọn 16:33) E wezụga okwukwe, o siri ike inweta mmeri dị otú ahụ. (Ndị Hibru 11:6; 1 Jọn 5:4) N’ihi okwukwe ahụ nwere mmeri, ọ bụ ihe nlereanya nye ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi. O nwere okwukwe n’ezie n’ebe ezi Chineke ahụ nọ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a A na-achọta ntụle ka saa mbara nke enweghị ihe mgbakwasị ụkwụ nke nkụzi Atọ n’Ime Otu n’ime broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Igbe dị na peeji nke 15]

E Mee Ka Jisọs, “Onye Mmezu,” Zuo Okè

Ndị Hibru 2:10: “O kwesịrị Ya, bụ́ Onye ihe nile dị n’ihi Ya, Onye ihe nile sitekwara n’aka Ya dị, ebe O kubatararị ọtụtụ ụmụ ndị ikom n’ebube, ka O site n’ahụhụ mee ka Onye na-eduba ha ná nzọpụta ha zuo okè.”

Ndị Hibru 2:​17, 18: “O sitere na ya ji ụgwọ ka e mee ka O yie ụmụnna Ya n’ihe nile, ka O wee ghọọ onye isi nchụàjà dị ebere, Onye kwesịkwara ntụkwasị obi, n’ihe nile dịịrị Chineke, ka O wee mee ka obi Chineke jụrụ n’ebe mmehie nile nke ndị nke Ya dị. N’ihi na ebe Ya onwe ya hụworo ahụhụ site n’ọnwụnwa a nwara Ya, Ọ pụrụ inyere ndị a na-anwa aka.”

Ndị Hibru 3:2: “Ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe Onye ahụ nọ, bụ́ Onye mere Ya ka ọ bụrụ Onye . . . dị ka Mosis dịkwa n’ezinụlọ Ya dum.”

Ndị Hibru 4:15: “Anyị enweghị onye isi nchụàjà onye na-apụghị iji obi soro anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị; kama anyị nwere Onye a nwaworo n’ihe nile n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị, ma O mehieghị.”

Ndị Hibru 5:​7-⁠9: “Onye n’ụbọchị nke anụ ahụ Ya, mgbe O weresịịrị ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri chee ekpere na arịrịọ n’ihu Onye ahụ pụrụ ịzọpụta Ya n’ọnwụ, mgbe a nụsịkwara olu Ya n’ihi na Ọ tụrụ egwu Chineke, ọ bụ ezie na Ọ bụ Ọkpara, ma Ọ mụtara ịṅa ntị Ya site n’ahụhụ nile Ọ hụrụ; ebe e mesịrị Ya ka O zuo okè, O wee . . . na-ewetara ha nzọpụta ebighị ebi.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya