Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w94 12/15 p. 30
  • Ị̀ Na-echeta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-echeta?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nweenụ Obi Ọmịiko
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ghọta na Jehova Na-eguzosi Ike n’Ihe, Na-agbagharakwa Mmehie
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Olee Otú Ị Ga-esi Bụrụ Enyi Chineke?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Job Toro Aha Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
w94 12/15 p. 30

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ chọpụtawo mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche ịbụ ndị baara gị uru? Mgbe ahụ gịnị ma i jiri ajụjụ ndị na-esonụ nwalee ike ncheta gị:

▫ N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji nọgide na-akpọtụrụ ndị agbata obi ha?

Ndịàmà Jehova n’onwe ha chọrọ ngọzi Chineke site n’Alaeze ahụ e kwere ná nkwa, n’ihi ịhụnanya ha nwekwara maka ndị agbata obi ha, ha chọrọ ka ha nweta otu ngọzi ahụ. Otú a, n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs, ha na-enwe echiche nke ịbụ ndị ịhụnanya na-achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-arụgide ileta ndị agbata obi ha. (Matiu 6:9, 10; 22:37-⁠39)​—⁠8/15, peji nke 8, 9.

▫ N’ihi gịnị ka ikwere n’evolushọn ji bụrụ okwu okwukwe?

Ndị ọkà mmụta sayensị ahụtụbeghị ka mgbanwe nke ihe ndị dị ndụ​—⁠ọbụna ndị bara uru⁠—​mepụtara ụdị ihe ndị dị ndụ ndị ọhụrụ, ma ndị kwere n’evolushọn na-azọrọ na ọ bụ otú a ka ụdị ihe ọhụrụ dị iche iche si bịa. Ndị kwere n’evolushọn ahụtụbeghị mpụta ohụrụ nke ndụ site n’ihe ndị na-adịghị ndụ mere n’onwe ya, ma ha na-esi ọnwụ na ọ bụ otú a ka ndụ si malite.​—⁠9/1, peji nke 5.

▫ Olee ụzọ kasị mma anyị pụrụ isi merie nkụda mmụọ nke pụrụ ịbịa site ná mgbochi ndị dị ná ndụ?

N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ anyị, ọ bụrụ na anyị etinye uche n’ihe anyị pụrụ ime kama iwe iwe banyere ihe anyị na-apụghị ime, ndụ ga-abụ ihe na-enye afọ ojuju karị, anyị ga-achọtakwa ọṅụ n’ozi Chineke. (Abụ Ọma 126:​5, 6)​—⁠9/1, peji nke 28.

▫ Gịnị bụ abamuru ndị dị n’ịgbaghara mmehie?

Ịgbaghara ndị ọzọ na-akwalite ezi mmekọrịta (Ndị Efesọs 4:32); ọ bụghị nanị na ọ na-eweta udo n’ebe ụmụ mmadụ ibe anyị nọ kamakwa ọ na-eweta udo nke ime (Ndị Rom 14:19; Ndị Kọlọsi 3:​13-⁠15); ịgbaghara ndị ọzọ na-eme ka o kwe omume ịgbaghara mmehie anyị (Matiu 6:14); ọzọkwa, ọ na-enyere anyị aka icheta na anyị onwe anyị nwerekwara mkpa nke mgbaghara. (Ndị Rom 3:23)​—⁠9/15, peji nke 7.

▫ Olee otú ihe nlereanya nke Emọs onye amụma si enyere anyị aka n’ọrụ nkwusa anyị?

Dị ka Emọs, anyị adịghị agbanwe ma ọ bụ na-agwagbu ozi Chineke. Kama nke ahụ, anyị ji nrubeisi na-akpọsa ya n’agbanyeghị mmeghachi omume nke ndị na-ege anyị ntị.​—⁠9/15, peji nke 17.

▫ Njimara Chineke ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị iṅomi?

Abụọ ndị pụtara ìhè bụ ikike Jehova nwere ime nhazi na obi ụtọ ya. (1 Ndị Kọrint 14:33; 1 Timoti 1:11) Àgwà ndị a nke Chineke dị n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị, ya mere e meghị ka otu n’ime ha pụta ìhè n’ụzọ na-emegide nke ọzọ.​—⁠10/1, peji nke 10.

▫ Olee nzọụkwụ ndị dị mma ndị mụrụ ụmụ werewooro iji nyere ụmụ ha aka ijere Jehova ozi?

Otu isi ihe dị mkpa bụ ịmalite n’oge. Mmetụta ndị e nwere na ihe mmụta ndị a mụtara na nwata ga-adịru oge nile mmadụ na-adị ndụ. (Ilu 22:6) Ọ dị mkpa ịkụziri ha nrubeisi na ịkwanyere Jehova na ofufe ya ùgwù ná nzukọ nile. Ndị mụrụ ụmụ nwere ihe ịga nke ọma na-amụta ịmata àgwà ndị na-adịghị mma, ha na-enyekwara ụmụ ha aka ịgbazi ha. (Ilu 22:15) N’ikpeazụ, malite n’oge isetịpụrụ nwa gị ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke ndị ọ pụrụ iru n’ụzọ ezi uche dị na ya.​—⁠10/1, peji nke 27-⁠28.

▫ Ọdịdị pụrụ iche dị aṅaa nke mgbaghara mmehie Jehova ka anyị kwesịrị ịgbalị itinye n’ọrụ?

Jehova na-agbaghara ma na-echezọ. (Jeremaịa 31:34) Nke a na-esiri ụmụ mmadụ e kere eke ike ime. Jisọs mesiri mkpa ọ dị ime otú a ike, dị ka e dekọrọ na Matiu 6:​14, 15.​—⁠10/15, peji nke 25-⁠26.

▫ Gịnị bụ ihe atọ ndị na-egbochi anyị ịdị ọmịiko?

N’ihi ọdịdị mmadụ anyị nke na-eme mmehie, echiche nke inwe anya ụfụ pụrụ ịgbanye mkpọrọgwụ. Ọ bụrụ na anyị enwee anya ụfụ n’ebe mmadụ nọ, olee otú anyị pụrụ isi mesoo ya n’ụzọ ọmịiko dị nro? Ịbụ onye e kpughere n’ụzọ na-adịghị mkpa nye ime ihe ike bụ ihe mgbochi ọzọ. Nke a na-emekarị ka anyị ghara inwe mmetụta ná nhụjuanya nke ndị ọzọ. Ọzọkwa, o yikarịrị ka onye na-eche maka ọdịmma onwe ya nanị agaghị enwe ọmịiko. (1 Jọn 3:17)​—⁠11/1, peji nke 19, 20.

▫ Ihe mmụta ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ banyere Job?

Ihe ndekọ banyere Job na-eme ka anyị matakwuo banyere ụzọ aghụghọ dị iche iche nke Setan, ma na-enyere anyị aka ịhụ otú e si jikọta ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova na iguzosi ike n’ezi ihe ụmụ mmadụ. Dị ka Job, a ghaghị ile ndị nile hụrụ Chineke n’anya ule. Anyị pụkwara ịtachi obi dị ka Job tachiri, nwapụta Setan ịbụ onye ụgha, ma nụ ụtọ ngọzi dị iche iche nke Alaeze Chineke.​—⁠11/15, peji nke 20.

▫ Olee otú onye isi oche nke òtù ndị okenye pụrụ isi gosi nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị n’ebe okenye ọ bụla nọ?

Mgbe ọ bụla o kwere mee onye isi oche kwesịrị iwepụta ndepụta ihe ndị a ga-atụle n’oge dị anya tupu oge ahụ iji nye ndị okenye ndị ọzọ oge iji nlezianya na ekpere chebara ihe nke ọ bụla e wepụtara echiche. N’oge nzukọ ndị okenye, ọ gaghị agbalị ịkpụzi echiche nke ndị okenye ndị ọzọ kama ọ ga-agba ha ume iji “nkwuwa okwu” mee ihe n’okwu ndị a na-atụle. (1 Timoti 3:13)​—⁠12/1, peji nke 30.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya