Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ndị Efesọs 3:14, 15 na-ekwu na e sitere na Chineke “gụọ eriri nna nile ọ bụla n’eluigwe na n’elu ụwa aha.” È nwere ezinụlọ dị iche iche n’eluigwe, ezinụlọ nile nke mmadụ hà sikwara n’aka Jehova nweta aha ha n’ụzọ ụfọdụ?
E nweghị ezinụlọ dị iche iche n’eluigwe dị ka e nwere n’elu ụwa, na-enwe nna, nne, na ụmụaka—ha nile na-enwe njikọ n’ụzọ anụ ahụ. (Luk 24:39; 1 Ndị Kọrint 15:50) Jisọs gosiri n’ụzọ doro anya na ndị mmụọ ozi adịghị alụ nwunye, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla na-egosi na ha pụrụ ịmụ ụmụ n’ụzọ ọ bụla.—Matiu 22:30.
Otú ọ dị, Bible na-ekwu okwu n’ụzọ ihe atụ banyere Jehova Chineke dị ka onye na-alụ nzukọ ya nke eluigwe; o nwere nwunye n’ụzọ ime mmụọ. (Aịsaịa 54:5) Nzukọ eluigwe ahụ na-amụpụta ụmụ, dị ka ndị mmụọ ozi. (Job 1:6; 2:1; 38:4-7) N’ihi ya, n’echiche nke a, e nwere ezinụlọ ime mmụọ dị ebube n’eluigwe.
Ọzọkwa, ezinụlọ ọhụrụ nke ihe atụ na-etolite n’eluigwe, nke Jisọs Kraịst na ọgbakọ ya nke nwanyị a na-alụ ọhụrụ dị 144,000 mejupụtara. (2 Ndị Kọrint 11:2) Ihe ka ọtụtụ ná ndị a e tere mmanụ anwụọlarị, na-enwe olileanya nke ndụ eluigwe. Ụfọdụ ka dị ndụ n’ụwa. Ha nile ji ịnụ ọkụ n’obi na-elepụ anya n’ihu maka “ọlụlụ nwunye nke Nwa atụrụ ahụ” n’eluigwe. Bible na-ejikọta alụmdi na nwunye ahụ na oge oké mkpagbu ukwu ahụ na-abịa nso—mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ, e mesịakwa mkpochapụ nke ihe fọdụrụ n’usoro ihe Setan.—Mkpughe 18:2-5; 19:2, 7, 11-21; Matiu 24:21.
Banyere ezinụlọ dị iche iche nke elu ụwa, Pọl onyeozi adịghị egosi ná Ndị Efesọs 3:15 na ìgwè ezinụlọ ọ bụla na-enweta aha ya kpọmkwem site n’aka Jehova. Kama nke ahụ, dị ka ihe àmà na-egosi Pọl bu n’uche eriri ezinụlọ gbatịpụrụ agbatịpụ ndị na-echekwa aha. Joshua 7:16-19 na-enye otu ihe atụ. N’ebe ahụ Jehova na-ekpughe mmehie Ekan. Na mbụ, e mere ka ikpe ọmụma ahụ jedebe ma ọ bụ kpaara ya ókè n’ebo Juda. Mgbe ahụ e wetukwuru ya n’ezinụlọ nke ndị Zera. N’ikpeazụ, e kpughere ezinụlọ Ekan. E lere Ekan tinyere nwunye ya na ụmụ ya anya, ma ọ bụ kwuo okwu banyere ha, dị ka otu akụkụ nke ezinụlọ Zabdi, bụ́ nna ochie Ekan. Ezinụlọ ahụ, n’aka nke ya, bụ ìgwè gbatịpụrụ agbatịpụ nke chekwara aha nna nna ha bụ́ Zera.
N’etiti ndị Hibru, eriri ezinụlọ ndị dị otú ahụ dị mkpa nke ukwuu, bụrụ nke e depụtara ọtụtụ n’ime ha n’ime Bible. Chineke kwadoro nchekwa ha site n’ime ndokwa, n’ebe ọ dị mkpa, ka ndị nketa nyefee ndị ọzọ aha ezinụlọ ahụ site n’alụmdi na nwunye nkuchi, ma ọ bụ nke nwanne di.—Jenesis 38:8, 9; Deuterọnọmi 25:5, 6.
Dị ka ihe atụ ọzọ nke ụdị ezinụlọ a buru ibu ma ọ bụ nke gbatịpụrụ agbatịpụ karị, tụlee banyere Jisọs dị ka nwa Devid. O doro anya na ọ bụghị Eze Devid mụrụ ya n’onwe ya, ebe a na-amụghị ya ruo ọtụtụ narị afọ mgbe ọnwụ Devid gasịrị. Ma, akara a ga-eji mara Mesaịa ahụ bụ na ọ gaje isite n’ezinụlọ Devid, dị ka ndị Juu maara n’ozuzu ha. (Matiu 22:42) Jisọs sitere n’eriri Devid site n’aka ma nne ya ma nna kuchiri ya.—Matiu 1:1; Luk 2:4.
Ma olee otú ezinụlọ ndị dị otú ahụ si enweta aha ha site n’aka Jehova? Ihe bụ eziokwu bụ na e nwere ọnọdụ ole na ole—dị ka n’ihe banyere Abraham na Aịsak—mgbe Jehova nyere onye isi ezinụlọ aha n’ụzọ nkịtị. (Jenesis 17:5, 19) Ndị ahụ bụ ọnọdụ ndị pụrụ iche. N’ọnọdụ ka ukwuu, Jehova adịghị enye ezinụlọ nke ọ bụla aha nke ọ na-enyefe ụmụaka.
Otú ọ dị, Jehova malitere njikọ ezinụlọ mmadụ mgbe o nyere Adam na Iv iwu ‘ịmụ ọmụmụ, baa ụba, jupụta ụwa.’ (Jenesis 1:28) Jehova kwekwara ka Adam na Iv na-ezughị okè mụpụta ụmụ, si otú a na-atọ ntọala maka ezinụlọ nile nke mmadụ. (Jenesis 5:3) Ya mere n’ihe karịrị otu echiche, a pụrụ ịkpọ Chineke Onye Malitere aha nke ezinụlọ dị iche iche.
Ọtụtụ ọdịbendị taa adịghịzi ahụ mkpa nke ime ka aha ezinụlọ dịgide ruo ọtụtụ ọgbọ. Otú o sina dị, n’ala nile ndị Kraịst na-ekele Jehova maka ndokwa ezinụlọ ma na-asọpụrụ ya site n’ịrụsi ọrụ ike ime ka njikọ ezinụlọ ha n’otu n’otu nwee ihe ịga nke ọma.