Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 4/15 p. 8-10
  • Mkpọsa Ịgba Àmà nke Gara nke Ọma na Gris

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mkpọsa Ịgba Àmà nke Gara nke Ọma na Gris
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Ndị Ọrụ Gọọmenti Azaghachi
  • Ndị Ikpe Ọha Azaghachi
  • Ndị Nlekọta Ọ́bá Akwụkwọ Azaghachi
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 4/15 p. 8-10

Mkpọsa Ịgba Àmà nke Gara nke Ọma na Gris

ERI ogologo oge Ndịàmà Jehova ezutewo mmegide na Gris. Ụfọdụ ndị ọrụ uwe ojii, ụlọikpe, na gọọmenti akpagbuwo Ndịàmà, ọtụtụ mgbe n’ihi nrụgide site n’aka ndị ụkọchukwu nke chọọchị Grik Orthodox. Mgbe ụfọdụ ihe kpatara ya abụwo iwu Gris nke machibidoro ime ntọghata, n’oge ndị ọzọ ọ bụ ọjụjụ dabeere na Bible nke Ndịàmà na-ajụ ije agha ma ọ bụ ịnakwere mmịnye ọbara.—Aịsaịa 2:2-5; Ọrụ 15:28, 29.

Ná mgbalị iji mee ka e nwee nghọta ka ukwuu n’etiti ndị ọchịchị nwere obi eziokwu nọ na Gris, ihe dị ka 200 Ndịàmà bụ́ ndị gọọmenti Gris maara dị ka ndị ozi okpukpe, tinyekwara ụfọdụ bụ́ ndị ọrụ iwu, mere mkpọsa zuru mba ahụ ọnụ na nso nso a. Ha nyefere broshuọ e mere n’ụzọ pụrụ iche, bụ́ nke a kpọrọ Jehovah’s Witnesses in Greece, tinyekwara akwụkwọ bụ́ Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom. Ha nyefekwara otu paket nke ihe odide dị iche iche ndị na-egosi na e nweghị ezi ihe mgbakwasị ụkwụ iwu kwadoro maka mkpagbu ahụ a na-akpagbu Ndịàmà Jehova. Ndịàmà ahụ jere leta ndị isi uwe ojii, ndị isi obodo, ndị ikpe ọha, na ndị isi ndị ọzọ.

Gịnị bụ mmeghachi omume ha? Ọtụtụ narị ahụmahụ ndị mara mma. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

Onye isi uwe ojii nke otu ụlọ ọrụ ndị uwe ojii n’Ọdịda Anyanwụ Masedọnịa nabatara ụmụnna ahụ wee, sị, “Ọ dịla anya m matara unu, . . . enwekwara m mmasị n’ịdị n’usoro unu. . . . Ekwetaghị m n’iwu ntọghata ahụ, a sịkwa na ọ dị m n’aka, m ga-ewepụ ya.”

Ndị isi uwe ojii nke ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị iche iche n’ọtụtụ obodo ukwu kwuru ihe ndị dị ka: “Ana m aja unu mma maka ọrụ unu na-arụ maka ọdịmma ọha na eze.” “Ọ dịghị mgbe ndị òtù unu na-enye ndị uwe ojii nsogbu; unu na-arụ ọrụ maka ọdịmma ọha na eze.” “Anyị na unu enweghị nsogbu ọ bụla ma ọlị. Anyị na-akwanyere unu ùgwù, nweekwa mmasị n’ebe unu nọ.”

Na Piraeus, otu onye nọ n’ọkwá dị elu n’ọrụ ndị uwe ojii na-echekwa obodo, n’anya mmiri rujuru ya anya, gwara ụmụnna ahụ na ya maara iji aha Chineke kpegara Jehova Chineke ekpere site na Jisọs Kraịst. O mere ọbụna ihe tụrụ ụmụnna ahụ n’anya karị mgbe ọ gwara ha na ya maara na ha na-atụ anya mkpagbu ụfọdụ tupu Amagedọn, ọ na-enwekwa olileanya na Chineke ga-eji ya mee ihe n’oge ahụ inyere ha aka! Ọ nakweere òkù ụmụnna ahụ kpọrọ ya inwekwu nkwurịta okwu.

Ndị Ọrụ Gọọmenti Azaghachi

Otu onye isi obodo na Thessaly kwuru banyere akwụkwọ Proclaimers, sị: “O kwesịrị ịdị n’ọ́bá akwụkwọ obodo—n’ọnọdụ mbụ!” Ozugbo ahụ o kpopụrụ akwụkwọ ndị dị n’elu otu ebe ndebe akwụkwọ wee tinye akwụkwọ Proclaimers ahụ n’ebe ahụ ka e wee nwee ike ịhụ ihu ya.

N’ebe ugwu Gris, otu onye isi obodo nabatara ụmụnna ahụ n’ụzọ na-ekpo ọkụ wee kwuo, sị: “Unu bụ ndị kasị mma m pụrụ ịchọ inwe n’ógbè m.” Otu onye isi obodo nke nwere obi ọma n’ebe ugwu Euboea gwara ụmụnna ahụ, sị: “Abụbu m onye soja. Ma unu—enwere m mmasị nke ukwuu n’ebe unu nọ.” O ji ịnụ ọkụ n’obi kwenye n’ihe Ndịàmà ahụ kwuru. Mgbe ha gosiri ya ìgwè akwụkwọ ndị Watch Tower Society bipụtara, ọ sịrị: “Ọ bụrụ na m kwe unu nkwa ịgụcha ha nile, ùnu ga-enye m ha?” Ha zara, sị: “Eenụ—ha bụ nke gị!” Obi tọrọ ya ụtọ, ọ chọghịkwa ka ụmụnna ahụ laa.

N’otu ógbè dịpụrụ adịpụ n’Attica, otu onye isi obodo ji obi ụtọ nakwere akwụkwọ ndị ụmụnna ahụ nyere ya ma rịọ ha ka ha nọgide na-ewetara ya mbipụta dị iche iche nke Society. Ka ha na-apụ, ọ gwara ha, sị: “Ndị mmadụ enwekwaghị nnọọ olileanya ná ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha na-achọkwa ihe bụ eziokwu n’ezie n’ebe ọzọ. Eji m n’aka na site ugbu a gaa n’ihu unu ga-eji ọrụ n’aka nke ukwuu n’ihi na unu nwere eziokwu.”

Ndị Ikpe Ọha Azaghachi

Ụmụnna ndị jere leta osote onye ikpe ọha n’ebe ugwu nke Gris chetaghachiri, sị: “O nwere mmasị ná mbipụta anyị dị iche iche nakwa n’ihe e kwuru, tinyekwara ná mgbalị ndị anyị na-eme iji hụ na ndị òtù anyị anọghị n’enweghị enyemaka mgbe ha na-ezute okwu ahụ siri ike nke mmịnye ọbara. N’ikpeazụ o kelere anyị ma jaa anyị mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ maka ibu ụzọ bịa leta ya ma gwa ya okwu. Ka e mesịrị, anyị chọpụtara na afọ anọ tupu mgbe ahụ ọ kpọworị ndị uwe ojii ma nye iwu ka e jide ụmụnna abụọ ndị nọ n’ozi ubi.”

Ndị ọkàiwu abụọ bụ́ Ndịàmà bụ́ ndị jere leta ụlọ ọrụ dị iche iche nke ndị ikpe ọha n’Atens nwere ihe ijuanya ịhụ ka otu onye ikpe ọha nke ka mee okenye, nke a ma ama ma na-akwanyere ùgwù n’ụzọ dị ukwuu bịakwutere ha. Ọ kpọpụrụ ha n’akụkụ wee gwa ha na iwu ahụ machibidoro ime ntọghata enweghị ebe mgbakwasị ụkwụ ọ bụla ma na-akpata ọgba aghara n’usoro ụlọikpe nke Gris. O ji ikwe aka na-ekpo ọkụ kelee ha.

N’ebe ugwu nke Gris, otu onye ikpe ọha nwere nnọọ omume enyi ma nata akwụkwọ. Ka ọ na-asape akwụkwọ ahụ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work, ọ tụrụ ya n’anya ịhụ isiokwu dị iche iche dị ná ndepụta ihe ndị dị n’ime ya. O kwuru, sị: “Ahụtụbeghị m ihe ndị akwụkwọ a kọwara n’ime chọọchị nile nke Grik Orthodox.”

Otu onye ikpe ọha na Boeotia kwetara na ya, n’oge gara aga, enyewo iwu maka inye Ndịàmà mmịnye ọbara n’ụzọ megidere ọchịchọ ha. Ma mgbe ụmụnna ahụ sooro ya tụgharịsịa uche n’okwu ahụ, o kwupụtara, sị: “Agaghị m enyekwa ụdị iwu ahụ mgbe ọ bụla ọzọ n’ọdịnihu!” O mere mkpebi siri ike na a ga-akpọtụrụ Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ maka Ndịàmà Jehova nke dị n’ógbè ahụ ka e wee nwee ike ịnwale ihe ndị ọzọ nile a pụrụ iji dochie anya ọbara. O ji obi ụtọ nara otu akwụkwọ Young People Ask.

Ndị Nlekọta Ọ́bá Akwụkwọ Azaghachi

E nyekwara ọtụtụ ndị nlekọta ọ́bá akwụkwọ ihe ọmụma ndị ahụ. N’otu ọ́bá akwụkwọ dị n’Atens, otu onye nlekọta ọ́bá akwụkwọ nwere àgwà nsọpụrụ naara akwụkwọ ma kwuo, sị: “Ọ dị nnọọ mma na unu wetaara anyị akwụkwọ unu n’ihi na ihe ka ukwuu n’akwụkwọ ndị anyị nwere n’ọ́bá akwụkwọ anyị na-emegide unu. . . . Otu onye ụkọchukwu were ezigbo iwe ịhụ akwụkwọ unu n’ọ́bá akwụkwọ ahụ. . . . O nweghị ihe o mere. E kwesịrị ịnụ olu onye ọ bụla.”

Otu onye ọrụ n’ọ́bá akwụkwọ obodo dị na Krit, bụ́ onye nụrụ maka Ndịàmà Jehova n’otu ogige ndị agha, gwara ụmụnna ahụ na ya nwererị mmasị n’ọjụjụ Ndịàmà jụrụ ikere òkè n’agha. Ọ nọwo na-ajụ onwe ya, sị, ‘Gịnị mere ndị a ga-eji na-ata ahụhụ?’ Ọ natara ụmụnna ahụ akwụkwọ ma kwuo banyere mkpọsa ha na-eme mgbe ahụ, sị: “Unu arụọla ọrụ magburu onwe ya, unu gaara emeworị nke a ọtụtụ afọ gara aga. . . . E nwere ịkpọasị dị ukwuu na Gris.” Ọ gwara ụmụnna ahụ ka ha bịa leta ya ọzọ n’oge na-adịghị anya.

N’oge mkpọsa a pụrụ iche, ụmụnna ahụ tinyere ihe gafere 1,000 akwụkwọ Proclaimers, 1,600 broshuọ bụ́ Jehovah’s Witnesses in Greece tinyere ọtụtụ narị akwụkwọ na magazin. Nke bara uru karị, ha sooro ọtụtụ narị ndị isi Gris kwurịta okwu ihu na ihu. Ugbu a ọ bụ olileanya nke ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi nọ na Gris na n’ụwa nile na ndị ọchịchị nwere obi eziokwu nọ na Gris ga-enwe echiche ka zie ezie banyere Ndịàmà Jehova.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya