Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 4/15 p. 22-27
  • Mmụba Site ná Ngọzi Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mmụba Site ná Ngọzi Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Usoro Ihe Omume Na-enye Obi Ụtọ
  • Ụlọ Ndị A Raara Nye
  • Ihe Mere E Ji Chọkwuo Ebe Obibi
  • Akụkọ Banyere 90 Sands
  • Ngọzi Jehova Pụtara Ìhè
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 4/15 p. 22-27

Mmụba Site ná Ngọzi Jehova

OTU usoro ihe omume nraranye e nwere n’uhuruchi nke September 18, 1995, mesiri ya ike na Jehova Chineke agọziwo n’ezie mmụba nke Ndịàmà ya n’ebe isi ụlọ ọrụ ụwa nile ha dị na Brooklyn, New York.

Ihe karịrị 6,000 mmadụ ṅara ntị n’usoro ihe omume nraranye ahụ. Ha zukọtara na Brooklyn, bụ́ ebe a nọ mee ihe omume ahụ, tinyekwara n’ebe ndị ọzọ, gụnyere n’ihe owuwu buru ibu nke Ndịàmà Jehova nke dịdewere Patterson na Wallkill, New York, na n’alaka ha dịdewere Toronto, Canada. Ndị nọ n’ebe ndị ọzọ na-abụghị na Brooklyn nụrụ ihe ndị e mere site ná njikọ telifon.

Usoro Ihe Omume Na-enye Obi Ụtọ

Ndị ọrụ Betel, bụ́ ihe a na-akpọ ndị ọrụ afọ ofufo ahụ, bụ́ ndị na-ege ntị n’usoro ihe omume ahụ mejupụtara ezinụlọ Betel zuru ụwa ọnụ nke nwere ihe karịrị 16,400 ndị òtù. Ụdị ndị òtù ahụ na-eje ozi n’ihe dị ka otu narị mba, bụ́ ebe ha na-ebi akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ma na-enye ihe karịrị 78,600 ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile nkwado.

Atụmanya dị elu mgbe usoro ihe omume nraranye ahụ ji abụ malite n’elekere 6.30 nke uhuruchi, nke ekpere Karl Klein kpere sochiri. Onye isi oche nke usoro ihe omume ahụ, bụ́ Lloyd Barry, ji okwu dị mkpirikpi banyere ịdị mkpa nke ihe omume ahụ wee nabata mmadụ nile n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Albert Schroeder tụleghachiri ọmụmụ ihe Ụlọ Nche dịịrị izu ahụ, mgbe ahụ Daniel Sydlik kwuziri okwu n’isiokwu bụ́ “Ozi Dị Nsọ Anyị Na-eje na Betel.” Ndị mbụ a kwuru okwu n’usoro ihe omume ahụ socha n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova.

Akụkụ abụọ ndị sochiri n’usoro ihe omume ahụ—“Igbo Mkpa Anyị Na-amụba Amụba Maka Ebe Obibi, 1974-1995,” na “Ihe Ndị Kasị Adọrọ Mmasị ná Ndozigharị na Iwu Betel na Brooklyn”—gosipụtara ihe ndị kasị adọrọ mmasị n’owuwu ma ọ bụ inweta ụlọ ndị ahụ a raara nye. Okwu ndị ahụ lekwasịrị anya n’ụlọ obibi ahụ e wusịrị na nso nso a nke ihe dị ka otu puku ndị ọrụ Betel bi na ya ugbu a. E jikọtara ebe obibi a dị 115 mita n’elu nke dị na 90 Sands Street na ụlọ obibi akwụkwọ ahụ nwere ọtụtụ akụkụ.

Usoro ihe omume ahụ gosiri okwu nraranye nke Milton Henschel, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Bible and Tract Society, kwuru. O mesiri ike ihe atụ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ maka ịrara ụlọ nye maka iji ya eme ihe n’ozi Jehova. Mgbe a bụsịrị abụ, e mechiri ihe omume ahụ site n’ekpere nke Carey Barber kpere, bụ́ onye sokwa n’Òtù Na-achị Isi. Ma gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị kasị adọrọ mmasị n’usoro ihe omume ahu?

Ụlọ Ndị A Raara Nye

Onye nlekọta Ebe Obibi Betel, bụ́ George Couch, kọwara na a tụkwasịwo ụlọ obibi 17 kemgbe e mesịrị nraranye ikpeazụ nke ụlọ obibi Betel dị na Brooklyn na May 2, 1969.a Ndị a bụ ebe obibi ndị e wuru ọhụrụ ma ọ bụ ụlọ ndị a zụtara ma dozigharịa. Nraranye a bụ n’ezie maka ụlọ obibi 17 ndị a, maka ntakịrị ụlọ abụọ—ndị a zụtara n’afọ ndị 1940 ma rụgharịa dị ka ụlọ obibi Betel—nakwa maka ihe owuwu ụlọ obibi akwụkwọ na nke ọfịs ndị e wuworo ma ọ bụ zụta kemgbe nraranye nke isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova na March 15, 1982.b

Nke kachasị n’ụlọ ndị ahụ a raara nye bụ nke dị na 360 Furman Street. E wuru ya na mbụ na 1928, Ndịàmà Jehova zụụrụ ya na March 15, 1983, dozigharịakwa ya kpam kpam. O nwere ohere dị 93,000 square mita, ma ọ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụru hekta itoolu n’ala ụlọ ya. Ụlọ ndị ọzọ so ná nraranye ahụ bụ ụlọ obibi akwụkwọ dị na 175 Pearl Street na nnukwute ebe ndozi ụgbọ ala ndị e wuru n’afọ ndị na-adịbeghị anya.

Ihe Mere E Ji Chọkwuo Ebe Obibi

Na 1969, mgbe a raara ụlọ obibi ikpeazụ nke Betel dị na Brooklyn nye, e nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 1,336,112 Ndịàmà na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa nile. Ma na 1995 e nwere 5,199,895 na-eme otú ahụ, nke ji ihe karịrị okpukpu atọ na ọkara buo ibu karị! Ya mere, iji nọgide na-egbo mkpa e nwere maka akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, ezinụlọ Betel dị na Brooklyn amụbawo site na 1,042 ndị òtù oge nile na 1969 ruo ihe karịrị 3,360, bụ́ ndị bi ugbu a na 22 ụlọ obibi!

George Couch tụlere otú e si gboo mkpa e nwere maka inwekwu ebe obibi malite na 1974 ruo 1995. Ná mmalite afọ ndị 1970, Ndịàmà Jehova gbazitere ọtụtụ okpukpu ụlọ na Towers Họtel dị nso iji nye ezinụlọ Betel na-eto eto ebe obibi. Na December 1973, Nathan Knorr, bụ́ onye isi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, deere ma Ọfịs Betel ma ndị isi ọrụ nke Towers akwụkwọ ozi, na-asị na Society mere atụmatụ ‘ịkwapụ na Towers Họtel ka ọ na-erule October 1, 1974.’

Nwanna Couch kwuru na o juru ya anya n’ihi na ọ dịghị ebe ndị ọrụ Betel bi na Towers ga-ebi. O jukwara ndị isi ọrụ nke Towers ahụ anya, ebe ọ bụ na ha na-adabere n’ụgwọ ụlọ Society na-akwụ iji nọgide na-aga n’ihu. Ihe si na ya pụta bụ na ndị isi ọrụ nke Towers gbara Ndịàmà Jehova ume ịzụrụ họtel ahụ. “Unu anọwo na-ebuwanye ibu kemgbe anyị nọ n’ógbè a,” ka ha kwuru, “ụlọ ahụ dịkwa unu mkpa.”

“Ndị na-akwụ ụgwọ ụlọ jupụtara na ya,” bụ nzaghachi nke ndị nnọchiteanya Society. “Ọ bụrụ na anyị azụrụ ya, anyị ga-achọ itinye ndị nke anyị n’ebe ahụ.”

“Anyị ga-enye ndị bi n’ụlọ ahụ ebe ọzọ,” ka ndị isi ọrụ nke Towers kwere ná nkwa. Otú ọ dị, ntakịrị oge ka e mesịrị Ndịàmà Jehova zụụrụ ihe owuwu Towers ahụ n’ọnụ ahịa kwesịrị ekwesị. “Gịnị mere Nwanna Knorr ji dee akwụkwọ ozi ahụ?” ka Couch jụrụ ndị na-ege ya ntị a kpaliworo mmasị ha. “Ikekwe ya onwe ya amaghị, ma ọ bụ ihe ahụ mere e ji resị Watch Tower Society Towers Họtel ahụ.”

Onye ọkà okwu ahụ kọwakwara otú Ndịàmà Jehova si zụta 97 Columbia Heights, ebe Margaret Họtel ahụ na-ewu ewu dịbu, nke dị nnọọ n’akụkụ nke ọzọ nke okporo ámá nke Ebe Obibi Betel nke mbụ. Ebe ahụ dị mma, ebe ọ bụ na a pụrụ ijikọta ya na ihe owuwu Betel ahụ nwere ọtụtụ akụkụ n’ụzọ dị mfe site n’ụzọ okpuru ala nke gafere okporo ámá. Na February 1980, mgbe a nọ na-ewugharị ụlọ ahụ, ọkụ gbapịara ya. Mgbe ahụ, n’ihi na o siiri onye nwe ya ike iwu ụlọ ọhụrụ n’ebe ahụ, o resịrị Ndịàmà Jehova ihe owuwu ahụ.

Nwanna Couch kwuru, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ụlọ ndị a nwere akụkọ na-adọrọ mmasị nke ya na ya so nke ga-ezo aka n’otu ihe—na ọ bụ Jehova Chineke duziri nzukọ ya a na-ahụ anya ịzụta ụlọ nke ahụ kpọmkwem.”

Akụkọ Banyere 90 Sands

Ụlọ obibi kasị ọhụrụ, nke kasịkwa buo ibu bụ 90 Sands Street. Mgbe Ndịàmà Jehova zụtara ihe owuwu ahụ na December 1986, o nwere ụlọ obibi akwụkwọ buru ibu nke dị na 160 Jay Street.c A kwaturu ụlọ obibi akwụkwọ ahụ, n’August 30, 1990, a gwakwara ezinụlọ Betel na e nwetawo ikike iwu ụlọ obibi dị 30 okpukpu n’ebe ahụ.

N’otu ịgba ajụjụ ọnụ nke onye so n’Òtù Na-achị Isi bụ́ Theodore Jaracz duziri, onye nlekọta ụlọ obibi akwụkwọ Society nke dị na Brooklyn, bụ́ Max Larson, kọwara otú e si nye ikike maka iwu ụlọ obibi nke 90 Sands Street ahụ. Nwanna Larson kọwara na ihe mere laa azụ na 1965 dị oké mkpa.

Laa azụ n’oge ahụ Society chọrọ iwu ụlọ obibi akwụkwọ nwere okpukpu iri n’otu ala dịdewere ụlọ obibi akwụkwọ ya ndị ọzọ, ma nkebi ebe a gụnyekọtara ala ahụ nyere ohere nanị maka iwu ụlọ nwere okpukpu abụọ. Otu onye na-atụ ụkpụrụ ụlọ kwetara ise ụkpụru ụlọ maka ụlọ obibi akwụkwọ ọhụrụ ahụ e zubere iwu, ma o kwuru, sị: “Agaghị m emenye onwe m ihere site n’igosi ha òtù ahụ.” O kwenyesiri ike na Òtù Na-ahụ Maka Ụkpụrụ na Arịrịọ adịghị mgbe ha ga-agbanwe iwu ha ndị na-achịkwa ebe a gụnyere nkebi ala ahụ. Mgbe a bịanyere aka n’ụkpụrụ ụlọ ahụ, o tiri mkpu, sị: “Ùnu si aṅaa mee ya!”

Larson gara n’ihu ikwu na ihe kpatara ya bụ na mgbe e megharịrị ebe a gụnyere nkebi ala ahụ maka ụlọ obibi akwụkwọ anyị dị okpukpu iri, e megharịkwara ebe a gụnyere nkebi ala ndị dị nso, gụnyere ebe nke ụlọ 160 Jay Street ahụ dị na ya. N’ụzọ na-ejukwa anya, mmegharị nke ebe a gụnyere nkebi ala ahụ nyere ohere maka otu họtel. Ma, ka Larson kwuru, ọ bụ ihe ọ na-adịghị onye chọpụtaranụ ma ọlị—ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo 25 afọ n’ihu, mgbe anyị malitesịworo ịchọ ebe a ga-ewu ebe obibi ọhụrụ nke Betel. Mgbe ahụ a chọpụtaghachiri iwu ahụ nke ike ala ná mpaghara ná mpaghara!

Nwanna Larson kọwara ihe merenụ: “Mgbe anyị sere ụkpụrụ maka ụlọ obibi anyị dị 30 okpukpu wee wegara ya ngalaba na-ahụ maka ihe owuwu, a gwara anyị, sị: ‘Unu apụghị iwu ụlọ obibi n’ebe ahụ. E kenyere ebe ahụ nile dị ka mpaghara mmepụta ihe, ha agaghịkwa agbanwe otú ahụ e si kee ala ná mpaghara ná mpaghara n’ihi unu.’

“‘Ọ dịghị mkpa ka ha gbanwee ya,’ ka anyị gwara ndị isi ahụ. ‘E kenyelarị ya ná mpaghara maka họtel.’ Mgbe ha nyochara ihe ndekọ ha, ọ tụrụ ha nnọọ n’anya! Ị hụla, otú ahụ ka anyị si nweta ụlọ anyị dị 30 okpukpu,” ka Larson kwubiri.

Ngọzi Jehova Pụtara Ìhè

Otu onye ọbụ abụ na Bible dere, sị: “Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.” (Abụ Ọma 127:1) N’ụzọ doro anya, ngọzi Jehova adịkwasịwo ọrụ iwu ihe nke Ndịàmà Jehova iji mee ka ọrụ nkwusa na izi ihe zuru ụwa ọnụ nke Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha mee dị mfe karị.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

Ndị nwere ihe ùgwù nke ịnụrụ usoro ihe omume ahụ na September 18, 1995, nwere obi ụtọ ịhụ ihe àmà nke ngọzi dị otú ahụ ná mmụba a na-enwe n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke ndị ohu Jehova. Ndị Jehova pụrụ inwe obi ike ná ngọzi ya nọgidere na-aga n’ihu ka ha na-aga n’ihu na-eme ihe o nyere ha n’iwu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ụlọ Nche, June 15, 1969 (Bekee), peji nke 379-382.

b Ụlọ Nche, December 1, 1982, peji nke 22-29.

c Teta! nke December 22, 1987 (Bekee), peji nke 16-18.

[Foto dị na peeji nke 23]

90 Sands St. • 1995

[Foto ndị dị na peeji nke 24, 25]

Ụfọdụ n’ime ụlọ obibi ndị ọzọ a raara nye

97 Columbia Hts. • 1986

Bossert Họtel, 98 Montague St. • 1983

34 Orange St. • 1945

Standish Họtel, 169 Columbia Hts. • 1981

67 Livingston St. • 1989

108 Joralemon St. • 1988

Towers Họtel, 79-99 Willow St. • 1975

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

175 Pearl St. • 1983

69 Adams St. • 1991

360 Furman St. • 1983

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya