Ihe Mere O Ji Jiri Aha Ahụ Kasị Ukwuu Mee ihe
“Dị ka otu onye n’ime ndị nnyocha m kwuru, emehiewo m n’iwebata okwu ahụ bụ́ ‘Jehova’ kama ‘Onyenwe anyị,’ bụ́ nke a na-ewerekarị na ya na ya bụ otu ihe ahụ kemgbe ọtụtụ narị afọ.”
Nke a bụ okwu nke J. J. Stewart Perowne n’okwu mmalite dị ná mbipụta nke abụọ nke nsụgharị ya nke akwụkwọ Abụ Ọma, nke e bipụtara mbụ na 1864. Ka ọ na-ede ihe n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Saturday Review nke July 2, 1864, onye nnyocha ahụ jụrụ ojiji e ji aha Chineke mee ihe ná nsụgharị ahụ, ebe ọ bụ na a dịghị ejikwa ya eme ihe ma na chọọchị ndị Juu ma ọ bụ na chọọchị nile nke ndị Kraịst. Ọ zọọrọ na aha ahụ bụ́ Jehova nwere njikọ chiri oké anya n’ebe ndị Juu nọ nakwa na e kwesịrị iji okwu ọzọ eme ihe, dị ka “Onyenwe anyị” ma ọ bụ “Chineke,” “bụ́ nke na-emetụtaghị ógbè ma ọ bụ mba.”
Perowne ekweghị n’arụmụka ndị a, ebe ọ bụ na o ‘nweghị mmasị iwepụ otu mkpụrụ okwu’ nke mkpughe Chineke kpugheere mmadụ. Ọ rụrụ ụka n’ụzọ ziri ezi na ndị nsụgharị na-asụgharị aha Chineke ahụ n’asụsụ Hibru ịbụ “Onyenwe anyị” adịghị ewepụta ọdịiche n’etiti okwu Hibru abụọ.
Ọzọkwa, Perowne kwusiri ike na e nwere ndị ruru eru ọnụ na-eru n’okwu bụ́ ndị nwere mmasị na mweghachi nke aha Chineke. O hotara onye England a ma ama na-ede abụ uri bụ́ Samuel Taylor Coleridge:
“Gịnị mere a ga-eji gaa n’ihu ná nsụgharị nke Hibru gaa na Bekee site n’onye ngabita, site na Septuagint? Ọ̀ bụ na anyị anakwerebeghị okwu Hibru ahụ bụ́ Jehova? Ọ̀ bụ na Κύριος, ma ọ bụ Onyenwe anyị, nke Septuagint, abụghị ihe asụsụ Grik ji dochie n’ọtụtụ ebe a na-apụghị ịgụ ọnụ maka okwu Hibru, bụ́ Jehova? Mgbe ahụ, gịnị mere a gaghị eweghachi okwu mbụ ahụ; n’Agba Ochie kwa jiri ikwesị ntụkwasị obi were Jehova sụgharịa Jehova; n’akụkụ akwụkwọ nsọ ọ bụla dịkwa n’Agba Ọhụrụ, na-ezo aka na nke Ochie, nke jiri okwu Hibru ahụ nke dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ e zoro aka na ya?”
Perowne kwenyere na a maghịkwa otú e si akpọ Tetragrammaton ahụ nke Hibru kpọmkwem, ma o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a kwụsịrị iji aha ahụ na-emekwa ihe na Chọọchị ndị Juu n’ihi obi abụọ nke nkwenkwe ụgha, ọ bụrụkwa na n’ihi idepụtagharị Nsụgharị Grik na Latin n’agbanweghị ihe ọ bụla na Nsụgharị nke [Bekee] anyị atụfuo okwu ahụ, ndị a abụghị ezigbo ihe ọ bụla ga-egbochi nlọghachi n’ojiji mbụ a na-eji ya eme ihe.” Perowne nwere mmasị karịsịa n’ụdị ahụ bụ́ “Jehova” n’ihi na a ma ya nke ọma. Kemgbe ahụ ọtụtụ nsụgharị nke oge a ndị ka ọhụrụ ejiriwokwa aha Chineke ahụ mee ihe. New World Translation of the Holy Scriptures ji aha ahụ bụ́ Jehova mee ihe n’ihe karịrị 7,200 ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na nke Grik nke Ndị Kraịst.
Ná nsụgharị ya nke Abụ Ọma, Perowne gbalịrị ịrapagidesi ike “n’ụzọ chiri anya n’ụdị nke Hibru ahụ, ma n’akpaalaokwu ya ma ná nhazi nke ahịrịokwu ya.” Mgbe ọ na-asụgharị Abụ Ọma 69, amaokwu nke 5 na 6, ọ hụrụ mkpa nke isetịpụ ọdịiche n’etiti okwu Hibru maka “Chineke” (ʼElo·himʹ), “Onyenwe anyị” (ʼAdho·naiʹ), na “Jehova”: “Oo Chineke [Elo·himʹ], Ị maara nzuzu m nile, e zobeghịkwa ọmụma ikpe m pụọ n’ebe Ị nọ. Ekwela ka ihere mee ndị nile na-echere Gị n’ihi m, Oo Onyenwe anyị [ʼAdho·naiʹ], Jehova (Chineke nke) usuu nile nke ndị agha. Ekwela ka ihere mee ha n’ihi m, bụ́ ndị na-achọ Gị, Oo Chineke nke Israel.”