Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 4/15 p. 32
  • “Ọ Bụ Ọrụ Jehova”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọ Bụ Ọrụ Jehova”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 4/15 p. 32

“Ọ Bụ Ọrụ Jehova”

Nke ahụ bụ isiokwu nke otu edemede pụtara na El Norte, bụ́ akwụkwọ akụkọ nke Monterrey City, Mexico. Edemede ahụ bụ banyere otu Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ nke Ndịàmà Jehova.

Monterrey bụ obodo ukwu nwere 2,300,000 mmadụ (tinyere ógbè ndị dị ya nso) n’akụkụ ebe ugwu nke Mexico, o nwekwara 19,200 ndị nkwusa Alaeze. Ruo ihe dị ka otu afọ na ọkara, Ndịàmà ahụ ejikọtawo mgbalị ha iji wuo Ụlọ Mgbakọ mara mma ma kwesị ekwesị nke nwere 3,000 oche dị mma ọnụnọ na ntụ oyi. Ndịàmà ógbè ahụ ṅụrịrị ọṅụ mgbe otu onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova kwuru okwu nraranye ya. Usoro ihe omume ya gụnyere akụkọ dị mkpirikpi nke ọrụ ahụ na Monterrey, a gbakwara ndị so kere òkè n’owuwu ihe ahụ ajụjụ ọnụ. Mgbe ahụ 4,500 bịara nzukọ ahụ nụrụ okwu nraranye ahụ.

Nke ahụ bụ nke atọ n’Ụlọ Mgbakọ e wuworo na nso nso a na Mexico n’ihe a kọwaworo dị ka usoro ịrụ ọrụ maka “Inwekwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ Ndị Ka Ukwuu, Ndị Kakwa Mma.”

N’inwe ihe karịrị 443,000 ndị nkwusa na Mexico, na n’inwe 1,492,500 ndị bịara Ememe Ncheta na 1995, Ụlọ Mgbakọ ndị ọhụrụ, dị ka nke ahụ dị na Monterrey, n’ezie ga-emezu nzube Chineke.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya