Malite na Nwa Ọhụrụ Zụwa Ha
NNYOCHA ọgbara ọhụrụ na-egosi na “ahụ ụmụaka e bu n’afọ na-emeghachi omume n’ebe ụda olu dị.” Ndị na-eme nnyocha nke Mahadum North Carolina “chọpụtara na mgbe ndị nne gụsịịrị ụmụ ha ihe mgbe e bu ha n’afọ, ụmụ ọhụrụ ndị ahụ meghachiri omume mgbe a gụghachiri ihe odide ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Winnipeg Free Press na-ekwu. Mgbe ụmụ nwanyị na-agụpụta ihe n’oge ha dị ime, nke a pụrụ nnọọ ịtụnye ụtụ n’ịkụbanye ụkpụrụ omume ọma n’ime nwatakịrị ahụ. Bible na-asị na Timoti ‘matara ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ site n’oge ọ dị na nwa ọhụrụ.’ (2 Timoti 3:14, 15) Dị ka ihe àmà na-egosi, nne ya na nne ya ochie ghọtara uru nke ịzụ ya site na nwa ọhụrụ, bụ́ nke yiri nnọọ ka ọ gụnyere ịgụpụta ihe.
Ịgụ ihe bụ “otu n’ime nkà kasị mkpa ná ndụ nke anyị nwere n’ọha mmadụ anyị taa,” ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ Jim Trelease na-ekwu. A na-emeziwanye nkà asụsụ na ìgwè okwu dị n’asụsụ site n’ịgụpụta ihe.
Ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịmalite ịgụpụta ihe ma ọ dịkarịa ala ngwa ngwa ị malitere ịgwa nwa ọhụrụ gị okwu. Ọ bụ ezie na nwa gị e bu n’afọ ma ọ bụ nwa ọhụrụ gị agaghị aghọta na mbụ ihe ị na-ekwu, uru ndị na-adịte anya ndị pụrụ isi na ya pụta kwesịrị ya. Ilu 22:6 na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”
Olee ihe ị pụrụ ịgụ nke dị irè, baakwa uru? Gụpụtara nwa gị Bible kwa ụbọchị. Gụọkwa akwụkwọ ndị ọzọ bara uru, dị ka Ige Onye-Ozizi Uku Ahu Nti; Akwukwọm nke Akukọ Bible; Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, na isiokwu ndị dị na magazin Ụlọ Nche na Teta!
N’eziokwu, inyefe onwe gị n’ụzọ dị otú ahụ na-achọ oge, ma ọ bụ oge e ji mee ihe n’ụzọ dị mma. Ọ bụ otu ụzọ gbara ọkpụrụkpụ isi gosi na ị na-eche banyere nwa gị, hụkwa ya n’anya.