Ị Pụrụ Inwe “Obi Ọdụm”
BIBLE mgbe ụfọdụ na-eji ọdụm eme ihe dị ka ihe atụ nke obi ike na ntụkwasị obi. A kọwara ndị ikom dị ike ma ọ bụ nwere obi ike dị ka ndị nwere “obi ọdụm,” e kwukwara na ndị ezi omume “nwere ntụkwasị obi dị ka ọdụm.” (2 Samuel 17:10; Ilu 28:1) Karịsịa mgbe a mara ya aka, ọdụm na-egosi na o ruru eru inweta aha ya dị ka “dike n’etiti anụ nile.”—Ilu 30:30.
Ọ bụ atụghị egwu nke ọdụm ka Jehova Chineke ji mkpebi ya ichebe ndị ya tụnyere. Aịsaịa 31:4, 5 na-ekwu, sị: “Dị ka ọdụm ma ọ bụ nwa ọdụm, nke a na-akpọkọta ìgwè ndị ọzụzụ atụrụ imegide ya, si ede inwù n’elu anụ ọ dọgbutara, ọ dịghị atụ ụjọ olu ha, ọ dịghị ewedakwa onwe ya n’ala n’ihi ụzụ ha: otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha ga-arịdata ibuso ugwu Zaịọn . . . agha. Na-egbochi na-anapụta; na-agabiga na-eme ya ka o wepụga onwe ya.” Jehova si otú a na-emesi ndị ohu ya obi ike banyere nlekọta ya dị irè, karịsịa n’oge ihe isi ike.
Bible ji onye iro kasị ukwuu nke ihe a kpọrọ mmadụ, Setan bụ́ Ekwensu, na-atụnyere ọdụm na-agbọ ụja, nke na-adọgbu adọgbu. Iji zere ịbụ ndị ọ nwụdere, a na-agwa anyị n’ime Akwụkwọ Nsọ, sị: “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche.” (1 Pita 5:8) Otu ụzọ isi mee nke a bụ izere iru ụra ime mmụọ nke na-akpata ọnwụ. Banyere nke a Jisọs kwuru, sị: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya.” (Luk 21:34-36) Ee, ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ na “mgbe ikpeazụ” ndị a pụrụ inye anyị “obi ọdụm,” nke ‘e doziworo, nke na-atụkwasị n’ebe Jehova nọ.’—2 Timoti 3:1; Abụ Ọma 112:7, 8.