“Obo Ihe Àmà” n’Ala “Ugwu Chineke”
NA MAP nke kọntinent ahụ, ọ bụrụ na i soro ụsọ oké osimiri nke Ọdịda Anyanwụ Africa gawa n’akụkụ ọwụwa anyanwụ n’ebe Gulf of Guinea, n’ebe ụsọ oké osimiri ahụ gbagọrọ chee ihu n’ebe ndịda, ị ga-ahụ Cameroon. Ọ bụrụ na ị nọgide na-aga n’akụkụ ndịda nke ụsọ oké osimiri ahụ, ị ga-erute n’ụsọ mmiri sara mbara nke nwere ájá ojii. Ájá ojii ahụ bụ n’ihi mgbọwa nke Ugwu Cameroon.
Ọnụ ugwu a pịrị apị, nke dị mita 4,070 kachasị n’ebe ahụ nile. Mgbe anyanwụ na-ada ada na-achakwasị mkpọda nke Ugwu Cameroon, ọ na-egbukepụ àgwà ndị mara mma ikiri—àgwà odo odo, oroma oroma, ọlaedo ọlaedo, na uhie uhie. Osimiri na ala mmiri ndị dịdewere ya na-egbukepụ àgwà ndị a nile dị ka enyo, na-eme ka ọ fọ nke nta ka a ghara ịma ihe dị iche n’eluigwe na ụwa. Ọ dị mfe ịghọta ihe mere ebo ndị dị n’ógbè ahụ bụ́ ndị na-ekpe okpukpe ọdịnala ji kpọọ ugwu ahụ Mongo Ma Loba, nke a sụgharịrị ịbụ “Ụgbọ ịnyịnya nke chi dị iche iche,” ma ọ bụ ọtụtụ mgbe karị, “Ugwu Chineke.”
Ịgatụkwu n’ebe ndịda, e nwere ọtụtụ mile nke ụsọ mmiri ndị nwere ájá ọcha, ndị jupụtara n’osisi akị oyibo. E wezụga ụsọ oké osimiri ahụ mara mma, akụkụ dị ukwuu nke mba ahụ bụ nke oké ọhịa gbachiri agbachi nke dị n’ebe ụwa kewara abụọ kpuchiri, na-agbatịru n’ókèala ya na Congo na Central African Republic na n’ebe ugwu ruo Nigeria na akụkụ Chad dị n’akụkụ ndịda Sahara. Akụkụ ọdịda anyanwụ nke mba ahụ bụ ugwu ugwu, na-echetara onye na-eme njem akụkụ ụfọdụ nke Europe. Otú ọ dị, ihu igwe ya na-ekpo ọkụ agaghị ekwe ka i chezọọ na ị nọ nnọọ nso n’ebe ụwa kewara abụọ. Ime obodo ya nke nwere ọdịdị dịgasị iche iche na-eme ka ọtụtụ ndị na-edugharị ndị nleta kọwaa Cameroon dị ka ntakịrị Africa. Agbụrụ dị iche iche na ihe karịrị asụsụ na ire okwu 220 ndị a ma ama na-emesi echiche a ike.
Ọ bụrụ na ị ga-eme nleta na Cameroon, ị pụrụ ịnọ n’otu n’ime nnukwute họtel dị n’ọdụ ụgbọ mmiri nke Doula, ma ọ bụ n’isi obodo, bụ́ Yaoundé. Ma ohere nke ịmata ihe ụfọdụ banyere ndụ ndị obodo ahụ pụrụ ifunahụ gị, karịsịa nke ihe karịrị Ndịàmà Jehova 24,000, bụ́ ndị jiworị ọrụ n’aka na-ewulite “obo ihe àmà” n’akụkụ nile nke ala a nke “Ugwu Chineke.”a Gịnị ma i mee njem gaa ná mba ahụ iji hụ ụfọdụ n’ime ha? Gị ime njem n’ala Ọdịda Anyanwụ Africa a ga-abụ n’ezie nke e nyeghachiri ụgwọ ọrụ n’ụba.
Site n’Iji Ụgbọ Epeepe, Obere Bọs, Ka Ọ Bụ Ịnyịnya Ígwè?
Ebe Sanaga, bụ́ osimiri kasị too ogologo na Cameroon, banyere n’oké osimiri, o nukọtara nnukwute ájá mmiri. Iji rute ndị nile bi n’ógbè a sara mbara, ọtụtụ mgbe, Ndịàmà Jehova aghaghị iji ụgbọ epeepe mee njem. Nke a bụ ihe ndị nkwusa Alaeze itoolu so ná ntakịrị ìgwè ahụ nọ na Mbiako na-eme. Abụọ n’ime ha bi kilomita 25 site n’ebe ahụ, n’ime obodo bụ́ Yoyo. Ka ha wee ruo Mbiako ọ chọrọ ịkpasi ụgbọ ike, ma n’agbanyeghị nke ahụ ha na-anọ mgbe nile ná nzukọ ndị Kraịst. N’oge ọ na-eleta ìgwè a, otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị tụrụ aro igosi ihe nkiri vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—The Organization Behind the Name. Ma ọ dị mfe ikwu ya n’ọnụ karịa ime ya eme. N’ime obodo dịmiri adịmi otú a, ebee ka ọ ga-ahụ ígwè e ji akpọ vidio, telivishọn, na ọkụ eletrik iji gosi ya?
N’izu ahụ ọ na-eme nleta, ụfọdụ ndị nkwusa kpọtụụrụ pastọ nke otu chọọchị dị n’ebe ahụ. N’ụzọ tụrụ ha n’anya pastọ ahụ nabatara ha n’ụzọ na-ekpo ọkụ, ha na ya nwekwara mkparịta ụka na-ekpo ọkụ na Bible. N’ịchọpụta na pastọ ahụ nwere ọ bụghị nanị VCR kamakwa ígwè ọkụ eletrik, ụmụnna ahụ nwere obi ike iji jụọ ma ha pụrụ ịgbaziri ngwá ọrụ ya. Ebe mkparịta ụka Bible ahụ ha bu ụzọ nwee masịrị ya, pastọ ahụ kwetara inye aka. Ná mgbede Saturday 102 mmadụ bịara ihe ngosi ahụ, tinyere pastọ ahụ na ihe ka ukwuu ná ndị òtù chọọchị ya. Ndịàmà abụọ ahụ si Yoyo ji ụgbọ epeepe abụọ bute ọtụtụ ndị nwere mmasị. Ha echeghị na ọ ga-esibiga ike oké ịkpa ụgbọ chee ihu n’ebe mmiri ahụ na-ebuwanye ibu si asọdata. Mgbe ha kirisịrị vidio ahụ, o metụrụ ha n’ahụ nke ukwuu, gbaakwa ha ume, ha nwekwara obi ụtọ iso ná nzukọ ukwu dị otú ahụ nke nzube ya bụ ịsọpụrụ Jehova.
Iji gaa n’ebe ụgbọ epeepe na-apụghị iru, mmadụ pụrụ iji obere bọs gaa. Ebe obere bọs ndị a na-anọ eche ndị njem na-ekwo ekwo mgbe nile. N’ịbụ onye ndị na-ere mmiri oyi, ndị na-ere unere, na ndị na-eso bọs gbara gburugburu, ọ dị mfe inwe nnọọ mgbagwoju anya. Ọrụ ndị na-eso bọs bụ ịkpọ ndị njem ka ha banye n’obere bọs ndị na-echere, bụ́ ndị ha nile, dị ka ha na-ekwu, “dị njikere ịpụ.” Otú ọ dị, e kwesịghị ịghọta “dị njikere” n’echiche nke ihe okwu ahụ pụtara kpọmkwem. Ndị njem aghaghị ịnọ ọtụtụ hour, mgbe ụfọdụ ọbụna ọtụtụ ụbọchị, na-echere. Ozugbo a fakpunyechara ndị njem nile n’ime ya, onye na-akwọ ụgbọ ala ahụ akwazichaakwa ibu, ọtụtụ akpa nke ihe ubi, na mgbe ụfọdụ ọbụna ọkụkọ na ewu ndị dị ndụ n’ihe e ji ebu ibu dị n’elu ya, obere bọs ahụ na-abanye n’ụzọ uzuzu, ndị na-adịghị larịị.
Otu onye ozi na-ejegharị ejegharị, onye isi otú a eme njem gwụworo ike, kpebiri iji nke ya eje. Ugbu a ọ na-eji ịnyịnya ígwè eme njem ya nile. Ọ na-ekwu, sị: “Kemgbe m kpebiri iji ịnyịnya ígwè na-eje site n’ọgbakọ ruo n’ọgbakọ, m na-abịarute n’oge mgbe nile maka nleta ahụ. N’eziokwu, njem ahụ pụrụ iwe ọtụtụ hour, ma ma ọ dịghị ihe ọzọ agaghị m anọ otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ na-echere obere bọs ndị ahụ. N’oge udu mmiri, ọ na-afọ nke nta ka ụzọ ụfọdụ pụọ n’anya kpam kpam n’ihi idei. Ị ghaghị iyipụ akpụkpọ ụkwụ gị iji gafere ebe a bụ apịtị apịtị na mmiri mmiri. Otu ụbọchị otu akpụkpọ ụkwụ m danyere n’otu iyi, e nwetaghịkwa ya ruo ọtụtụ izu n’ihu, mgbe nwa nwanyị nke otu n’ime Ndịàmà nwetara ya na mberede ka ọ na-akụ azụ! Obi dị m ụtọ inwe ike iyikwa akpụkpọ ụkwụ a ọzọ, mgbe otu ụkwụ ya na azụ nọworo ruo oge ụfọdụ. Mgbe ụfọdụ ana m agafeta ógbè Ndịàmà Jehova na-emetụbeghị nkwusa na ya mbụ. Mgbe nile ndị obodo ahụ na-ajụ m ihe m ji bịa. Ya mere ana m edowe magazin na broshuọ ebe aka m ga-eru ha ngwa ngwa. Mgbe ọ bụla m kwụsịrị, m na-enyefe akwụkwọ ndị a dabeere na Bible ma gbaa àmà dị mkpirikpi. Ekwere m na Jehova ga-eme ka mkpụrụ ndị a nke eziokwu too.”
N’ime Ime Obodo
Ndịàmà Jehova na-agbalịsi ike isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma Alaeze ahụ ọbụna n’ime ime etiti Cameroon, n’ime obodo ndị zoro n’ime ime oké ọhịa. Nke a na-achọ oké mgbalị, ma ihe ndị ọ na-arụpụta na-enye obi ụtọ.
Marie, bụ́ onye ozi oge nile, maliteere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Arlette ọmụmụ Bible. Ka ha nwesịrị ọmụmụ ihe nke mbụ, Marie jụrụ Arlette ma ọ ga-edupụ ya, ebe ọ bụ omenala n’akụkụ a nke Africa. Otú ọ dị, nwa agbọghọ ahụ kọwara na ya apụghị ịga ije n’ihi ụkwụ na-egbu ya mgbu. Otu ụdị akpịrị nke nke nne na-abanye n’ime ahụ na-ata Arlette n’ụkwụ, na-akpata ịgba abụ. Marie ji obi ike wepụsịa akpịrị ahụ otu otu. Ka e mesịrị, ọ chọpụtakwara na ndị mmụọ ọjọọ na-emekpa nwa agbọghọ a ahụ n’abalị. Marie ji ndidi kọwaa otú mmadụ pụrụ isi tinye ntụkwasị obi ya n’ebe Jehova nọ, karịsịa site n’ịkpọku aha ya n’olu dara ụda n’ekpere.—Ilu 18:10.
Arlette nwere ọganihu dị ngwa. Na mbụ ezinụlọ ya ahụghị ihe dị njọ n’ọmụmụ ihe ahụ n’ihi ọganihu dị ịrịba ama ọ na-enwe ma n’anụ ahụ ma n’ọgụgụ isi. Ma mgbe ha chọpụtara na ọ chọrọ ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ha machiri ya ịga n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ. Izu atọ n’ihu, mama Arlette, n’ịchọpụta otú o si na-ewute nwa ya, kpọtụụrụ Marie wee gwa ya ka ọ maliteghachi ọmụmụ ihe ahụ.
Mgbe oge ruru maka ije mgbakọ sekit, Marie kwụrụ otu onye ọkwọ ụgbọ ala ụgwọ ije bute Arlette ụbọchị abụọ ahụ. Otú ọ dị, ọkwọ ụgbọ ala ahụ jụrụ iru n’ụlọ Arlette, ebe o kpebiworo na ntakịrị ụzọ e si aga ebe ahụ agaghị ekwe ngafe. Ya mere Marie jisiri ike kpọpụta nwa agbọghọ ahụ n’ụzọ. Jehova gọziri mgbalị ndị a n’ezie. Taa Arlette na-eje nzukọ nile nke ọgbakọ. Iji nyere ya aka ime nke a, Marie na-abịa akpọrọ ya n’enweghị ike ọgwụgwụ. Ha abụọ na-eji ụkwụ mee njem na-ewe 75 minit n’ojije na n’ụla. Ebe ọ bụ na nzukọ Sunday na-amalite n’elekere 8:30 n’ụtụtụ, Marie aghaghị ịhapụ ụlọ n’elekere 6:30; n’agbanyeghị nke ahụ ha na-ejisi ike erute n’oge. Arlette na-atụ anya igosipụta nraranye ya site na baptism ime mmiri n’isi nso. Marie na-ekwu, sị: “Onye ọ bụla na-ahụghị ya mgbe ọ malitere ịmụ ihe apụghị iche n’echiche otú ọ gbanweruworo. Ana m ekele Jehova nke ukwuu n’ụzọ o siworo gọzie ya.” Marie bụ n’ezie ihe nlereanya ọma nke ịhụnanya iji onwe onye achụ àjà.
N’ime Ime Ebe Ugwu
Ebe Ugwu Cameroon jupụtara n’ọdịiche na ihe ijuanya. N’oge udu mmiri, ọ na-aghọ nnukwute ubi jupụtara n’ahịhịa ndụ. Ma mgbe anwụ malitere ịchasi ike, ahịhịa ahụ na-akpọnwụ. N’ehihie, mgbe anyanwụ nọ n’uju ya, mgbe o sikwara ike ịchọta ndò, atụrụ ga-abịagide onwe ha n’ahụ mgbidi ụlọ ndị na-acha ọbara ọbara. N’etiti ájá na ahịhịa ahụ kpọrọ nkụ, nanị ahịhịa na-acha akwụkwọ ndụ nke na-afọdụ bụ ibe akwụkwọ baobab ole na ole. Ọ bụ ezie na ndị a adịghị ebucha ibu ka ụmụnne ha ndị dị n’oké ọhịa dị n’ebe ụwa kewara abụọ, ha siri ike ka ha. Ikike ha nwere ịnagide ebe ahụ tara akpụ na-eme nnọọ ihe atụ nke ịnụ ọkụ n’obi na obi ike nke Ndịàmà ole na ole kwagaworo n’ógbè a ije biri iji mee ka ìhè nke eziokwu na-enwu.
Ụfọdụ n’ime ọgbakọ dị n’ógbè a dị kilomita 500 ruo 800 site n’ebe ibe ha dị, mmetụta nke nnọpụ iche dịkwa adị n’ezie. Ma e nwere ọtụtụ ndị nwere mmasị. Ndịàmà si n’ógbè ndị ọzọ na-akwafeta ebe a iji nye aka. Iji dị irè n’ozi, ha aghaghị ịmụta Foufouldé, bụ́ ire okwu nke ógbè ahụ.
Otu Onyeàmà si Garoua kpebiri iji ụbọchị ole na ole mee nkwusa n’obodo ya, nke dị ihe dị ka kilomita 160 site n’ebe ahụ. Ọ hụrụ ndị ụfọdụ nwere mmasị, ma oké ọnụ nke ịgba ụgbọ gbochiri ya ịdị na-agaghachi mgbe nile. Izu ole na ole n’ihu, Onyeàmà ahụ natara akwụkwọ ozi site n’aka otu n’ime ndị ahụ nwere mmasị na-arịọ ya ka ọ bịa leta ha ọzọ. Ma ebe ọ bụ na o nwetabeghị ego ụgbọ, o nweghị ike ịga. Lee ka Onyeàmà ahụ si nwee ihe ijuanya mgbe onye ahụ bịara n’ụlọ ya na Garoua ịgwa ya na mmadụ iri n’ime obodo ahụ nọ na-echere maka nleta ya!
N’ime obodo ọzọ, na nso nso ókèala ya na Chad, otu ìgwè nke mmadụ 50 nwere mmasị ahaziwo ọmụmụ Bible nke ha. Ha mere ndokwa ka mmadụ atọ n’ime ha na-abịa nzukọ n’ọgbakọ kasị nso na Chad. Mgbe ha lọtara, ndị a ga-eduziziri ìgwè ahụ dum ọmụmụ Bible. N’ezie, okwu Jisọs pụrụ nnọọ imetụta ebe a: “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.”—Matiu 9:37, 38.
Ịgba Àmà n’Obodo Ukwu Dị Iche Iche
Mgbe ọtụtụ afọ nke ịnọ n’ụkọ gasịrị, ihe dị ka afọ abụọ gara aga, magazin Ụlọ Nche na Teta! ghọrọ nke a pụrụ inweta na Cameroon n’ezoghị ya ezo. E nwere oké ịnụ ọkụ n’obi maka na mmasị na magazin ndị a ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị na-agụ ha nke mbụ ha. Otu di na nwunye na-emebeghị agadi bụ́ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche e kenyere ọrụ n’otu n’ime obodo ukwu ndị ahụ tinyere magazin 86 n’ụtụtụ mbụ ha mere nkwusa n’ókèala ọhụrụ ha. Ụfọdụ ndị nkwusa na-etinye ihe ruru magazin 250 n’otu ọnwa! Gịnị kpatara ihe ịga nke ọma ha? Nyefee onye ọ bụla magazin.
Otu Onyeàmà nke na-arụ ọrụ n’otu ọfịs ghere oghe nye ọha na eze na-ahapụ magazin mgbe nile n’ebe a ga-ahụ ya. Otu nwanyị lere magazin ndị ahụ anya ma ọ dịghị nke o weere. Onyeàmà ahụ chọpụtara mmasị o nwere wee nye ya otu, bụ́ nke ọ nakweere. O juru ya anya ịhụ ka ọ bịaghachiri echi ya. Ọ bụghị nanị na ọ chọrọ ịkwụ ụgwọ maka magazin ahụ o weere kama o kwuru ka e nyekwuo ya ọzọ. N’ihi gịnị? Ebe ọ bụ onye e dinaworo n’ike, ọ họrọwo magazin kwuru okwu n’isiokwu ahụ. O jiriwo abalị nile gụọ ma gụgharịa okwu ndụmọdụ e nyere. N’inweta ahụ efe dị ukwuu, ọ chọrọ ịmatakwu banyere Ndịàmà Jehova.
Ọbụna obere ụmụaka pụrụ ikere òkè n’ịgbasa ozi olileanya nke Bible. Mgbe onye nkụzi na-akụziri ya ihe gwara otu nwatakịrị nwanyị bụ́ Onyeàmà nke dị afọ isii ka o kwee ukwe ndị Katọlik, ọ jụrụ, na-ekwu na ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Onye nkụzi ahụ gwaziri ya ka ọ bụọ otu n’ime abụ okpukpe ya ka o wee nwee ike iji ya nye ya akara. Ọ họọrọ abụ a kpọrọ “Nkwa Chineke Maka Paradaịs” wee bụọ ya n’ejighị akwụkwọ. Onye nkụzi ahụ jụrụ ya ajụjụ, na-asị: “I kwuru okwu paradaịs n’ime abụ gị. Ebee ka paradaịs a dị?” Nwatakịrị nwanyị ahụ kọwara nzube Chineke iguzobe Paradaịs n’elu ala n’isi nso. N’ịbụ onye azịza ya juru anya, ọ gwara ndị mụrụ ya ka ha wetara ya akwụkwọ ọ na-amụ. Ọ dị njikere iji nke a nye ya akara kama ịbụ n’ihe a na-akụziri ya n’oge ihe ọmụmụ okpukpe. Ndị mụrụ ya tụụrụ onye nkụzi ahụ aro na ọ bụrụ na ọ chọrọ inye ya akara n’ụzọ ziri ezi, o kwesịrị ibu ụzọ mụọ ya n’onwe ya. A maliteere ya ọmụmụ Bible.
Ị̀ Na-eme Atụmatụ Ije Nleta
N’ọtụtụ akụkụ nke ụwa taa, ndị mmadụ nwere omume ọ̀ gbasara m n’ebe ozi ọma Alaeze ahụ dị. Ma Chineke ma Bible amasịghị ha. Ụjọ na-ejikpa ndị ọzọ, ha na-ajụkwa nnọọ ịza onye ọbịa ọ bụla na-akụ aka n’ọnụ ụzọ. Ihe a nile bụ ihe ịma aka n’ezie nye Ndịàmà Jehova. Ma lee ọdịiche e nwere na Cameroon!
Ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ ihe obi ụtọ n’ebe a. Kama ịkụ aka, ihe a na-emekarị bụ ịsị, “Kong, kong, kong.” Mgbe ahụ olu na-esi n’ime zaa, sị, “Ọ̀ bụ ònye?,” anyị na-akọwazi onwe anyị dị ka Ndịàmà Jehova. Dị ka ọ na-adịkarị, ndị mụrụ ụmụ na-agwa ụmụ ha ka ha jee bute oche ogologo ma dọsa ha na ndò osisi, ikekwe osisi mango. Mgbe ahụ a na-etinye oge dị ụtọ n’ịkọwa ihe Alaeze Chineke bụ na ihe ọ ga-eme iji belata ọnọdụ ọjọọ nke ihe a kpọrọ mmadụ.
Mgbe otu nkwurịta okwu dị otú ahụ gasịrị nnọọ, otu nwanyị kwupụtara obi ya, na-asị: “Ọ dị m mwute ịhụ na a pụghị ịchọta eziokwu ahụ m nọworo na-achọgharị n’ime okpukpe a mụnyere m na ya nke m nọkwa n’ime ya kaa nká. Ana m ekele Chineke na o gosiwo m eziokwu ahụ. Abụ m dikọn na chọọchị m. Ihe oyiyi nke Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri na-anọ otu izu n’ụlọ dikọn nke ọ bụla ka onye nke ọ bụla nwee ike ime ka ọ mara arịrịọ ha. Nye m, ana m arịọ Meri mgbe nile ka o nyere m aka ịmata eziokwu ahụ. Ugbu a Chineke egosiwo m na o nweghị eziokwu ahụ. Ana m ekele Jehova.”
Ya mere ọ bụrụ na o nwee ụbọchị i chere na ọ dị gị mkpa inweta ọṅụ dị ukwuu nke a pụrụ inweta n’ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke, gịnị ma i jee leta akụkụ a nke Ọdịda Anyanwụ Africa? E wezụga ịchọpụta “ntakịrị Africa,” site n’iji ụgbọ epeepe, obere bọs, ma ọ bụ ịnyịnya ígwè, ị ga na-atụnyekwa ụtụ ‘n’obo ihe àmà’ ahụ a na-ewulite n’ala nke “Ugwu Chineke.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a “Obo Ihe Àmà” bụ ihe okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “Gilead” pụtara ma eleghị anya. Kemgbe 1943, ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead anọwo na-ezipụ ndị ozi ala ọzọ imeghe ọrụ nkwusa ahụ n’ụwa nile, tinyere na Cameroon.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 22]
Map: Mountain High Maps® Ike mbipụtaghachi © 1995 Digital Wisdom, Inc.