Eziokwu Banyere Hel
OTU akụkọ sitere n’aka òtù na-ahụ maka ozizi na Chọọchị nke England na-ekwu na hel abụghịdị ebe na-ere ọkụ; kama nke ahụ, ọ bụ ebe e chepụtara echepụta nke na-adịghị adị. “E nwere ọtụtụ ihe kpatara mgbanwe a,” ka akụkọ ahụ na-akọwa. “Ma ihe so na ha abụrụwo mkpesa metụtara omume nke sitere ma n’ime ma n’èzí nke okpukpe ndị Kraịst megide okpukpe nke ịnọ n’egwu, nakwa echiche na-arị elu bụ́ na nghọta nke Chineke onye tinyere ọtụtụ nde ná mmekpa ahụ ebighị ebi megidere nnọọ mkpughe e kpughere ịhụnanya Chineke n’ime Kraịst.”
Ahụ erughị ala a e nwere n’ebe echiche ọdịnala nke hel dị emetụtaghị nanị Chọọchị nke England. Ọ na-esiri ndị nọ n’òtù okpukpe dị iche iche ike ife Chineke na-abọ ọ́bọ̀ nke na-akpọ ndị mmehie ọkụ. “Ndị mmadụ chọrọ Chineke nke nwere omume enyi ma dị nro,” ka Jackson Carroll, prọfesọ okpukpe na ọha mmadụ n’Ụlọ Akwụkwọ Nkà Mmụta Okpukpe nke Mahadum Duke na-ekwu. “Ikwu banyere mmehie na ikpe ọmụma megidere ọdịbendị nke oge a.”
O tewo anya Ndịàmà Jehova kweere na hel, dị ka Bible na-akụzi ya, bụ nanị ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ nwụrụ anwụ—ọ bụghị ebe ịta ahụhụ n’ime ọkụ. Ha nwere echiche a, ọ bụghị n’ihi na ọ na-ewu ewu, kama n’ihi ihe Bible na-ekwu, sị: “Banyere ndị nwụrụ anwụ, ha amaghị ihe ọ bụla . . . Ọ dịghị ọrụ ma ọ bụ iche echiche ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe dị na Sheol [“hel,” Douay Version nke Katọlik].”—Eklisiastis 9:5, 10, NW.
N’inwe nghọta a doro anya banyere ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ, Charles Taze Russell, onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society, dere laa azụ na 1896, sị: “Anyị adịghị achọta [n’ime Bible] ụdị ebe ịta ahụhụ ebighị ebi dị ka ụkpụrụ okwukwe na akwụkwọ ukwe, na ọtụtụ ndị na-ekwu okwuchukwu, na-akụzi n’ụzọ na-ezighị ezi. Ma anyị achọtawo ‘hel,’ sheol, hedis, ebe a mara agbụrụ anyị nile ikpe ịga n’ihi mmehie Adam, nakwa ebe e sitere na ha gbapụta mmadụ nile site n’ọnwụ Onyenwe anyị; nakwa na ‘hel’ bụ ili—ọnọdụ ọnwụ.”
Otú a, kemgbe ihe karịrị otu narị afọ, Ndịàmà Jehova akụziwo eziokwu Bible banyere hel.
[Foto dị na peeji nke 32]
Charles T. Russell