Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 2/15 p. 30
  • Echiche Ziri Ezi Banyere Nnwere Onwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Echiche Ziri Ezi Banyere Nnwere Onwe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Chineke nke Nnwere Onwe
  • Nnwere Onwe nke Na-esite na Kraịst
  • Iji Nnwere Onwe Ndị Kraịst Eme Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
  • Ọgụ Onye Kraịst na Olileanya Ihe A Kpọrọ Mmadụ
  • Iji Ya Eme Ihe Atụ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 2/15 p. 30

Echiche Ziri Ezi Banyere Nnwere Onwe

EBE Jehova Chineke bụ Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, Onye Ọchịchị Kasị Elu nke eluigwe na ala, na Onye Okike nke ihe nile, nanị ya nwere nnwere onwe kasịnụ, a na-akparaghị ókè. (Jenesis 17:1; Jeremaịa 10:7, 10; Daniel 4:34, 35; Mkpughe 4:11) Ndị ọzọ nile aghaghị ijegharị na ime ihe n’ime ókè nile nke ikike e nyere ha, dookwa onwe ha n’okpuru iwu ya nile nke eluigwe na ala. (Aịsaịa 45:9; Ndị Rom 9:20, 21) Dị ka ihe atụ, tụlee ike ndọda, na iwu ndị na-achịkwa ịkpa ike nke mmiri ọgwụ, mmetụta nke anyanwụ, na uto; iwu omume; ikike na omume nke ndị ọzọ ndị na-emetụta nnwere onwe mmadụ. Ya mere nnwere onwe nke ihe nile Chineke kere bụ nnwere onwe a kpaara ókè.

E nwere ọdịiche n’etiti nnwere onwe a kpaara ókè na ịnọ n’agbụ. Nnwere onwe n’ime ókè ndị Chineke kpara na-eweta obi ụtọ; ịnọ n’agbụ nye ihe ndị e kere eke, ezughị okè, adịghị ike, ma ọ bụ echiche ndị na-ezighị ezi na-eweta mmegbu na obi ilu. Nnwere onwe dịkwa iche n’ebe mkpebisi ike onwe onye, ya bụ, ileghara iwu Chineke anya na ikpebiri onwe onye ihe bụ ezi ihe na ihe bụ ajọ ihe dị. Ihe dị otú ahụ na-eduje n’ịwabanye n’ikike ndị ọzọ ma na-akpata nsogbu, dị ka a pụrụ ịhụ ná mmetụta nile nke mmụọ adabereghị n’onye ọzọ, nke ime ihe masịrị onwe onye nanị nke Agwọ ahụ n’Iden mere ka Adam na Iv nwee. (Jenesis 3:4, 6, 11-19) E ji iwu, iwu Chineke, kpaara ezi nnwere onwe ókè, bụ́ nke na-enye ohere ngosipụta zuru ezu nke mmadụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, na-ewuli elu, ma baa uru, na nke na-anakwere ikike ndị ọzọ, na-etinye ihe n’obi ụtọ mmadụ nile.—Abụ Ọma 144:15; Luk 11:28; Jemes 1:25.

Chineke nke Nnwere Onwe

Jehova bụ Chineke nke nnwere onwe. O si n’agbụ n’Ijipt tọhapụ mba Israel. Ọ gwara ha na ọ bụrụhaala na ha erube isi n’iwu ya ha ga-enwere onwe ha pụọ n’ụkọ. (Deuterọnọmi 15:4, 5) Devid kwuru banyere “nnwere onwe pụọ na nchegbu” n’ime ụlọ elu nile nke Jerusalem. (Abụ Ọma 122:6, 7, NW) Otú ọ dị, Iwu ahụ kwuru na ọ bụrụ na mmadụ adaa ogbenye ọ pụrụ irenye onwe ya n’ohu iji nweta ihe ndị dị ya na ezinụlọ ya mkpa. Ma Iwu ahụ nyere onye Hibru a nnwere onwe n’afọ nke asaa nke ịgba ohu ya. (Ọpụpụ 21:2) Na Jubile (nke na-eme kwa afọ 50 ọ bụla), a kpọsara nnwere onwe n’ala ahụ nye ndị nile bi na ya. A tọhapụrụ onye Hibru ọ bụla bụ ohu, nwoke ọ bụla na-alaghachikwa n’ala nketa ya.—Levitikọs 25:10-19.

Nnwere Onwe nke Na-esite na Kraịst

Pọl onyeozi kwuru banyere mkpa nke ime ka ihe a kpọrọ mmadụ pụọ “n’ịbụ ohu mmebi.” (Ndị Rom 8:21) Jisọs Kraịst gwara ndị Juu kwere na ya: “Ọ bụrụ na unu onwe unu anọgide n’okwu m, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’ezie; unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” Nye ndị chere na ha nwere nnwere onwe nanị n’ihi na ha bụ ụmụ Abraham n’anụ ahụ, ọ kọwapụtara na ha bụ ndị ohu mmehie, o wee sị: “Ya mere ọ bụrụ na Ọkpara ga-eme ka unu pụọ n’ohu, unu ga-abụ ndị pụworo n’ohu n’ezie.”—Jọn 8:31-36; tụlee Ndị Rom 6:18, 22.

Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst na-ekwu banyere ụmụazụ Kraịst dị ka ndị nweere onwe ha. Pọl gosiri na ha ‘abụghị ụmụ nke ohu nwanyị, kama ụmụ nke nwanyị ahụ nweere onwe ya,’ onye ọ na-ezo aka n’ebe ọ nọ dị ka “Jerusalem nke dị n’elu.” (Ndị Galetia 4:26, 31) Ọ gbaziri ume, sị: “Kraịst mere ka anyị pụọ n’ohu ka anyị wee nwee onwe anyị: ya mere na-eguzosinụ ike, unu ekwela ka e were yoke nke bụ ịbụ ohu tụhịa unu ọzọ.” (Ndị Galetia 5:1) N’oge ahụ ndị ikom ụfọdụ ji ụgha na-azọrọ ịbụ ndị Kraịst esonyerewo ọgbakọ ndị dị na Galetia. Ha na-eme mgbalị ime ka ndị Kraịst nọ na Galetia gbahapụ nnwere onwe ha n’ime Kraịst site n’ịnwa inweta ezi omume site n’ọrụ nke Iwu ahụ, kama ịbụ site n’okwukwe na Kraịst. Pọl dọrọ aka ná ntị na ha ga-esi otú ahụ dapụ n’ebere Kraịst na-erughịrị mmadụ.—Ndị Galetia 5:2-6; 6:12, 13.

E mere ihe atụ nke nnwere onwe ndị Kraịst mbụ nwere pụọ n’agbụ mmehie na ọnwụ na pụọ n’egwu (“N’ihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ; kama ọ bụ nke ike na ịhụnanya na ime ka uche zuo okè”) ná nkwuwa okwu na ezoghị ọnụ n’okwu nke ndị ozi ahụ n’ịkpọsa ozi ọma ahụ. (2 Timoti 1:7; Ọrụ 4:13; Ndị Filipaị 1:18-20) Ha ghọtara ezoghị ọnụ a n’okwu banyere Kraịst ịbụ ihe onwunwe bara uru, nke a na-aghaghị iwulite, chebe, ma lekọta iji nweta nnwapụta Chineke. Ọ bụkwa isiokwu kwesịrị ekwesị maka ekpere.—1 Timoti 3:13; Ndị Hibru 3:6; Ndị Efesọs 6:18-20.

Iji Nnwere Onwe Ndị Kraịst Eme Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Ndị Kraịst dere ihe n’ike mmụọ nsọ, n’inwe ekele maka nzube Chineke n’igosi ebere na-erughịrị mmadụ site na Kraịst (“N’ihi na unu onwe unu, ụmụnna m, ka a kpọrọ ka unu nwee onwe unu”), dụrụ ndị Kraịst ọdụ ugboro ugboro ichebe nnwere onwe ha na ka ha ghara iwere nnwere onwe ahụ dị ka ikike ime ihe ọjọọ ma ọ bụ iji ya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi dị ka ohere imikpu n’ọrụ nke anụ ahụ ma ọ bụ dị ka ihe mkpuchi ime ihe ọjọọ. (Ndị Galetia 5:13; 1 Pita 2:16) Jemes kwuru banyere ‘inyocha n’ime iwu zuru okè nke inwe onwe’ ma gosipụta na onye na-abụghị onye na-anụ anụ nke na-echezọ, kama na-anọgidesi ike dị ka onye na-eme eme, ga-enwe obi ụtọ.—Jemes 1:25.

Pọl onyeozi nwere ọṅụ ná nnwere onwe o nwetara site na Kraịst ma jụ iji nnwere onwe ya mee ihe na-atọ onwe ya ụtọ ma ọ bụ iji ya eme ihe ruo n’ókè nke imejọ ndị ọzọ. N’akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ dị na Kọrint, o gosiri na ya agaghị emejọ akọ na uche onye ọzọ site n’ime ihe o nwere nnwere onwe Akwụkwọ Nsọ kwadoro ime ma nwee ike bụrụ nke onye ọzọ na-enwechaghị ihe ọmụma, bụ́ onye ihe Pọl mere pụrụ imejọ akọ na uche ya, ga-ajụ ajụjụ banyere ya. O hotara dị ka ihe atụ iri anụ a chụrụ n’àjà n’ihu arụsị tupu e wepụta ya ire n’ahịa. Iri anụ dị otú ahụ pụrụ ime ka onye nwere akọ na uche na-esighị ike katọọ ihe kwesịrị ekwesị Pọl ji nnwere onwe ya mee wee si otú ahụ mee dị ka onye na-ekpe Pọl ikpe, nke ga-abụ ihe na-ezighị ezi. Ya mere, Pọl sịrị: “Gịnị mere akọ na uche ọzọ na-ekpe inwe onwe m ikpe? Ọ bụrụ na mụ onwe m ji ekele keta, gịnị mere a na-ekwulu m n’ihi ihe ahụ nke mụ onwe m na-ekelere ekele?” Ka o sina dị, onyeozi ahụ kpebisiri ike iji nnwere onwe ya eme ihe n’ụzọ na-ewuli elu, ọ bụghị n’ụzọ na-emerụ ahụ.—1 Ndị Kọrint 10:23-33.

Ọgụ Onye Kraịst na Olileanya Ihe A Kpọrọ Mmadụ

Pọl gosiri na e nwere ihe ize ndụ nye nnwere onwe onye Kraịst n’ihi na, ọ bụ ezie na “iwu nke Mmụọ nke ndụ n’ime Kraịst Jisọs mere ka m pụọ n’aka iwu nke mmehie na nke ọnwụ,” iwu nke mmehie na nke ọnwụ na-arụ ọrụ n’ahụ onye Kraịst na-alụ ọgụ ịdọba onye ahụ n’agbụ ọzọ. (Ndị Rom 8:1, 2) Ya mere onye Kraịst aghaghị ịtụkwasị uche ya n’ihe ndị nke mmụọ iji wee merie.—Ndị Rom 7:21-25; 8:5-8.

Mgbe o depụtasịrị ọgụ onye Kraịst, Pọl gara n’ihu ikwu banyere ndị nketakọ Kraịst dị ka “ụmụ ndị ikom Chineke.” Mgbe ahụ o zoro aka n’ebe ndị ọzọ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ nọ dị ka “ihe e kere eke” wee setịpụ nzube ahụ dị ebube nke Chineke na “a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:12-21.

Iji Ya Eme Ihe Atụ

Mgbe Job, n’ahụhụ ya, chọrọ ntọhapụ n’ọnwụ, o ji ọnwụ tụnyere nnwere onwe maka ndị nọ n’ihe otiti. Ihe àmà na-egosi na o bu n’uche ndụ ihe isi ike nke ndị ohu, na-asị: “[N’ọnwụ] ohu apụwokwa n’aka onye nwe ya nwere onwe ya.”—Job 3:19; tụlee amaokwu nke 21 na 22.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya