Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 10/15 p. 3-4
  • Obi Ụtọ Ihe Aka Na-apụghị Iru Ma Ọlị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Obi Ụtọ Ihe Aka Na-apụghị Iru Ma Ọlị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Isi Ihe Na-eweta Enweghị Obi Ụtọ
  • Ihe Mgbaru Ọsọ Aka Na-apụghị Iru
  • Ọchịchọ A Na-achọ Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Akụ̀ na Ụba Ọ̀ Pụrụ Ime Gị Obi Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ahụ Ike na Obi Ụtọ—Olee Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nweta Ha?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Olee Ebe A Pụrụ Inweta Ezi Obi Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 10/15 p. 3-4

Obi Ụtọ Ihe Aka Na-apụghị Iru Ma Ọlị

IWE, nchegbu, na ịda mbà n’obi abụworịị isiokwu nke nchọpụta sayensị. Otú ọ dị, n’afọ ndị a, ndị ọkà mmụta sayensị a ma ama anọworị na-eche nnyocha ha ihu n’ebe ahụmahụ mmadụ nke dị mma na nke a na-achọsi ike dị—obi ụtọ.

Gịnị pụrụ ime ka ndị mmadụ nwekwuo obi ụtọ? Ọ̀ bụ ma ha bụrụ nwata karị, baa ọgaranya karị, nwee ahụ ike karị, too ogologo karị, ma ọ bụ dị gịrị gịrị karị? Gịnị bụ isi ihe na-eweta ezi obi ụtọ? Ọ na-esiri ihe ka ná ndị mmadụ ike, ma ọ bụ ghara ikwe omume, ịza ajụjụ ahụ. N’ịtụle ọdịda zuru ebe nile nke ịchọta obi ụtọ, ikekwe ọ ga-akara ụfọdụ mfe inye azịza nke ihe na-abụghị isi ihe na-eweta obi ụtọ.

Ruo ogologo oge, ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ a ma ama tụrụ aro nkà ihe ọmụma onwe onye dị ka isi ihe na-eweta obi ụtọ. Ha gbara ndị na-enweghị obi ụtọ ume itinye onwe ha nanị n’igbo mkpa onwe ha. E jiriwo nkebi okwu ndị na-adọrọ mmasị dị ka “cheere onwe gị,” “mara onwe gị,” na “chọpụta onye ị bụ” mee ihe n’usoro ọgwụgwọ mmetụta uche. Ma, ụfọdụ ndị ọkachamara ahụ kwalitere echiche a na-ekwenye ugbu a na ụdị àgwà onye na nke ya ahụ adịghị eweta obi ụtọ na-adịgide adịgide. Oké echiche banyere onwe onye ga-ewetarịrị ihe mgbu na enweghị obi ụtọ. Ịchọ ọdịmma onwe onye nanị abụghị isi ihe na-eweta obi ụtọ.

Isi Ihe Na-eweta Enweghị Obi Ụtọ

Ndị na-ele anya inweta obi ụtọ ná nchụso nke ihe ụtọ na-ele anya n’ebe na-ezighị ezi. Tụlee ihe atụ nke Eze Solomon maara ihe nke Israel oge ochie. N’akwụkwọ Bible bụ́ Eklisiastis, ọ na-akọwa, sị: “Ihe ọ bụla anya m abụọ rịọrọ, anapụghị m ha ihe ahụ: egbochighị m obi m n’ọṅụ ọ bụla, n’ihi na obi m ṅụrịrị ọṅụ site ná ndọgbu nile m dọgburu onwe m n’ọrụ; nke a bụkwa òkè m nke sitere ná ndọgbu nile m dọgburu onwe m n’ọrụ.” (Eklisiastis 2:10) Solomọn wuuru onwe ya ụlọ, kụọ ubi vine, meekwara onwe ya ubi, ogige, na ọdọ mmiri dị iche iche. (Eklisiastis 2:4-6) Otu mgbe ọ jụrụ, sị: “Ònye na-eri ihe, ma ọ bụ ònye na-eme ngwa iri ihe karị m?” (Eklisiastis 2:25) Ndị kasị agụ abụ na ndị kasị agụ egwú meere ya ihe ntụrụndụ, ọ nụkwara ụtọ mkpakọrịta nke ndị inyom makarịsịrị ná mma n’ala ahụ.—Eklisiastis 2:8.

Isi ihe dị na ya bụ, Solomọn alaghị azụ n’ihe banyere ihe omume ndị na-atọ ụtọ. Nkwubi okwu dị aṅaa ka o ruru mgbe o nwesịrị ọtụtụ ihe ụtọ ná ndụ? O kwuru, sị: “Mụ onwe m wee chee ọrụ m nile nke aka m abụọ rụrụ ihu, echekwara m ndọgbu nke m dọgburu onwe m n’ọrụ ime ihu: ma, lee, ihe nile bụ ihe efu na ịchọ ijide ifufe, ọ dịghịkwa ihe fọdụụrụ mmadụ n’okpuru anyanwụ.”—Eklisiastis 2:11.

Nchọpụta nile nke eze ahụ maara ihe ka ziri ezi ruo taa. Were dị ka ihe atụ, mba bara ọgaranya dị ka United States. N’ime afọ 30 gara aga, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị America amụbawo ọnụ ọgụgụ nke ihe onwunwe ha, ndị dị ka ụgbọ na telivishọn, okpukpu abụọ. Ma, dị ka ndị ọkachamara maka ahụ ike uche si kwuo, ndị America enwetụghị obi ụtọ karị. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, “n’ime otu oge ahụ, ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịda mbà n’obi amụbawo. Igbu onwe onye nke ndị nọ n’afọ iri na ụma amụbawo okpukpu atọ. Ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm amụbawo okpukpu abụọ.” Na nso nso a ndị nnyocha eruwo ná nkwubi okwu ndị yiri nke ahụ mgbe ha mụsịrị banyere njikọ dị n’etiti ego na obi ụtọ n’etiti ụba mmadụ nke ihe dị ka mba 50 dị iche iche. Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ị pụghị ịzụta obi ụtọ.

N’ụzọ megidere nke ahụ, a pụrụ n’ụzọ ziri ezi ịkpọ nchụso nke akụ̀ na ụba isi ihe na-eweta enweghị obi ụtọ. Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha, nke na-emerụkwa ahụ, bụ́ ihe na-eme ka mmadụ mikpuo emikpu n’ime mbibi na ịla n’iyi. N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike, e wee duhie ha n’okwukwe anyị, ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:9, 10.

Ma akụ̀ na ụba, ahụ ike, ntorobịa, ịma mma, ike, ma ọ bụ ngwakọta ọ bụla nke ihe ndị a adịghị nke pụrụ ime ka e jide obi ụtọ na-adịgide adịgide n’aka. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị enweghị ike igbochi ihe ọjọọ ime. Eze Solomọn rịbara ama n’ụzọ ziri ezi: “Ọbụna mmadụ adịghị ama mgbe ya: dị ka azụ̀ nke a na-anwụde n’ụgbụ ọjọọ, na dị ka ụmụ nnụnụ nke na-ama n’ọnyà, dị ka ndị a ka ụmụ mmadụ na-ama n’ọnyà na mgbe ọjọọ, mgbe ọ na-adakwasị ha na mberede.”—Eklisiastis 9:12.

Ihe Mgbaru Ọsọ Aka Na-apụghị Iru

Ọ dịghị ọ̀tụ̀tụ̀ nnyocha sayensị nke pụrụ imepụta usoro ma ọ bụ atụmatụ ime ihe nke mmadụ mere maka obi ụtọ. Solomọn kwukwara, sị: “M laghachiri, hụ n’okpuru anyanwụ, na ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ ka ịwụ ọsọ dịịrị, ọ bụghịkwa ndị dị ike ka agha dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nghọta ka akụ̀ dịịrị, ọzọkwa, ọ bụghị ndị nkà ka amara dịịrị; kama mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.”—Eklisiastis 9:11.

Ọtụtụ ndị kwenyere n’okwu ndị dị n’elu ekwubiwo na ịtụ anya ezi ndụ obi ụtọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya. Otu onye ọkà nkụzi a ma ama kwuru na “obi ụtọ bụ ọnọdụ a na-eche n’echiche.” Ndị ọzọ kwere na isi ihe na-eweta obi ụtọ bụ ihe nzuzo dị omimi, na ikike nke ikpughe ihe nzuzo ahụ nwere ike bụrụ nke dịịrị ndị mgbaasị ole na ole nwere onyinye ọgụgụ isi.

N’agbanyeghị nke ahụ, n’ọchịchọ ha na-achọ obi ụtọ, ndị mmadụ nọgidere na-anwale ụdị ụzọ ndụ dịgasị iche iche. N’agbanyeghị ọdịda nke ndị buru ha ụzọ, ọtụtụ ndị taa ka na-achụso akụ̀, ike, ahụ ike, ma ọ bụ ihe ụtọ dị ka ihe ngwọta maka enweghị obi ụtọ ha. Nchụso ahụ na-aga n’ihu n’ihi na n’ime ime ha, ihe ka ná ndị mmadụ kwenyere na obi ụtọ na-adịgide adịgide abụghị nanị ọnọdụ a na-eche n’echiche. Ha nwere olileanya na obi ụtọ abụghị nrọ aka na-apụghị iru. Mgbe ahụ ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee otú m pụrụ isi nweta ya?’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya