Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 7/15 p. 32
  • ‘Ihe Atụ nke Njikọ na Òtù Ụmụnna’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ihe Atụ nke Njikọ na Òtù Ụmụnna’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 7/15 p. 32

‘Ihe Atụ nke Njikọ na Òtù Ụmụnna’

Otú ahụ ka otu nwanyị si kọwaa omume Ndịàmà Jehova mgbe otu onye òtù ezinụlọ ya nwụnahụrụ ya. Ọ na-akọwa, sị:

“N’aha mụ na ndị ezinụlọ m, ọ ga-amasị m ikele Ndịàmà nke ọgbakọ na-asụ asụsụ Italian n’ime Freiburg, Germany. E wezụga nwanne m nwoke bụ́ Antonio na nwunye ya, bụ́ Anna, ezinụlọ m abụghị Ndịàmà Jehova. Anyị akatọwo nhọrọ okpukpe ha ruo ogologo oge, ọ bụ ezie na anyị akwanyeworo ya ùgwù mgbe nile.

“Otú ọ dị, ugbu a anyị aghaghị ịgbanwe obi anyị. N’eziokwu, anyị ahụwo ihe atụ nke òtù ụmụnna na ịhụnanya nke anyị na-agaraghị atụ anya ya ma ọlị.

“N’ụzọ dị mwute, Anna nwụchuru ọnwụ n’ihe mberede okporo ụzọ. Ebe anyị bi n’Itali, anyị nwere ike ịnọ nwanne m nwoke bụ́ Antonio na ụmụ ya nso nanị ruo n’ókè ụfọdụ. Otú ọ dị, ụmụnna ya bụ́ Ndịàmà abịawo inye aka. Ha enyeworo ya aka site n’ọnụnọ ha nọ ya, okwu ha, okwukwe ha, nkwado ihe onwunwe, omume, na nke ego ha. Ebe m na-apụghị ikele ọgbakọ ahụ n’onwe m, m ga-achọ ikele ha site na magazin unu maka ihe atụ ha nke njikọ na òtù ụmụnna nke anyị na-agaghị echefu.”

E nwere obi ekele maka okwu obiọma nke nwanyị a. Dị ka o kwuru, Ndịàmà Jehova bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. (1 Pita 2:17) Ha na-azụlite mmekọrịta ịhụnanya siri ike n’etiti onwe ha, na-amara na ịhụnanya bụ “ihe nkekọ nke izu okè.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Ọbụna n’ọnọdụ ọdachi kasịnụ, bụ́ nke pụrụ ịdakwasị anyị nile, Ndịàmà Jehova na-araparasi ike n’ebe Chineke na ndị ya nọ.—Ilu 18:24; Eklisiastis 9:11; Jọn 13:34, 35.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya