Ì Nwere “Obi Na-anụ Ihe”?
MGBE Solomọn ghọrọ eze nke Israel oge ochie, o chere na ya erughị eru. Ya mere ọ rịọrọ Chineke maka amamihe na ihe ọmụma. (2 Ihe E Mere 1:10) Solomọn kpekwara ekpere, sị: “Nye ohu Gị obi na-anụ ihe ikpe ndị Gị ikpe.” (1 Ndị Eze 3:9) Ọ bụrụ na Solomọn nwere “obi na-anụ ihe,” ọ ga-agbaso iwu na ụkpụrụ Chineke, ọ ga-enwetakwa ngozi Jehova.
Obi na-anụ ihe abụghị ibu arọ kama isi iyi nke ọṅụ. Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu: ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” (1 Jọn 5:3) N’ezie, anyị kwesịrị irubere Chineke isi. E kwuwerị, Jehova bụ Onye Okike Ukwu anyị. Ọ bụ ya nwe ụwa na ihe nile dị ya n’ime, ọbụna ọlaọcha na ọlaedo nile. Ya mere anyị apụghị inye Chineke ihe ọ bụla n’ezie n’ụzọ ihe onwunwe, ọ bụ ezie na ọ na-ekwe ka anyị jiri ego anyị mee ihe iji gosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ. (1 Ihe E Mere 29:14) Jehova na-atụ anyị anya n’aka ịhụ ya n’anya na iji obi umeala soro ya na-eje ije, na-eme uche ya.—Maịka 6:8.
Mgbe a jụrụ Jisọs Kraịst banyere ihe e nyere n’iwu kasị ukwuu n’ime Iwu ahụ, ọ sịrị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. Nke a bụ ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu.” (Matiu 22:36-38) Otu ụzọ isi gosipụta ịhụnanya ahụ bụ irubere Chineke isi. Ya mere o kwesịrị ịbụ ekpere onye ọ bụla n’ime anyị ka Jehova nye anyị obi na-anụ ihe.
Ha Nwere Obi Na-anụ Ihe
Bible jupụtara n’ihe nlereanya nke ndị nwere obi na-anụ ihe. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara Noa ka o wuo otu akatamkpo ụgbọ iji chebe ndụ. Nke a bụ ọrụ buru oké ibu nke were ihe dị ka afọ 40 ma ọ bụ 50. Ọbụna e jiri ngwá ọrụ nwere ike na ngwá ndị ọzọ dị ugbu a, ọ ga-abụ ọrụ nkà injinịa chọrọ obi ike iwu akatamkpo ihe owuwu dị otú ahụ nke pụrụ ise n’elu mmiri. Ọzọkwa, Noa aghaghị ịdọ ndị mmadụ bụ́ ndị obi abụọ na-adịghị ya na ha kwara ya emo ma jiri ya mere ihe ọchị aka ná ntị. Ma o rubere isi ruo n’ihe kasị nta. Bible na-asị: “Otú a ka o mere.” (Jenesis 6:9, 22; 2 Pita 2:5) Noa gosipụtara ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ site ná nrubeisi ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ. Lee ezi ihe nlereanya ọ bụ nye anyị nile!
Tụleekwa nna ochie ahụ bụ́ Abraham. Chineke gwara ya ka o si na Ua nke ndị Kaldea nwere ụba ihe onwunwe pụọ gaa n’ala nke ọ na-amaghị. Abraham rubere isi n’arụghị ụka. (Ndị Hibru 11:8) Ná ndụ ya nile fọdụrụnụ, ya na ezinụlọ ya biri n’ụlọikwuu. Mgbe ọtụtụ afọ o jiri biri dị ka onye ala ọzọ n’ala ahụ gasịrị, Jehova jiri otu nwa nwoke aha ya bụ Aịsak gọzie ya na nwunye ya na-erube isi, bụ́ Sera. Lee otú Abraham gbara afọ 100 na-aghaghị isiworị hụ nwa nwoke a ọ mụtara n’agadi n’anya! Mgbe afọ ụfọdụ gasịrị, Jehova gwara Abraham ka o jiri Aịsak chụọ àjà dị ka àjà nsure ọkụ. (Jenesis 22:1, 2) Nanị icheta n’echiche ime nke ahụ ga-ewuteworị Abraham. Ka o sina dị, ọ gara n’ihu irube isi n’ihi na ọ hụrụ Jehova n’anya ma nwee okwukwe na mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-abịa site n’Aịsak, ọ bụrụgodị na Chineke aghaghị ime ka o si n’ọnwụ bilie. (Ndị Hibru 11:17- 19) Otú ọ dị, mgbe Abraham na-achọ igbu nwa ya nwoke, Jehova kwụsịrị ya ma sị: “Ugbu a ka M maara na onye na-atụ egwu Chineke ka ị bụ, n’ihi na i gbochighị nwa gi nwoke, nke i nwere nanị ya, iwere ya nye m.” (Jenesis 22:12) N’ihi nrubeisi ya, Abraham na-atụ egwu Chineke ghọrọ onye a maara dị ka “enyi nke Chineke.”—Jemes 2:23.
Jisọs Kraịst bụ ihe nlereanya anyị kasị mma nke nrubeisi. N’oge ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, o nwere obi ụtọ n’ijere Nna ya nke eluigwe ozi ná nrubeisi. (Ilu 8:22-31) Dị ka mmadụ, Jisọs rubeere Jehova isi n’ihe nile, na-enwe obi ụtọ mgbe nile ime uche ya. (Abụ Ọma 40:8; Ndị Hibru 10:9) N’ihi ya, Jisọs pụrụ ikwu n’eziokwu, sị: “Ọ dịghịkwa ihe M na-eme n’Onwe m, kama dị ka Nna m ziri m, otú a ka m na-ekwu ihe ndị a. Mụ na Onye zitere m nọkwa; Ọ hapụghị nanị Mụ; n’ihi na Mụ onwe m na-eme ihe na-atọ Ya ụtọ mgbe nile.” (Jọn 8:28, 29) N’ikpeazụ, iji wepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta na ịnapụta ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi, Jisọs n’afọ ofufo nyere ndụ ya, na-anwụ ọnwụ kasị eweta ihere na ihe mgbu. N’ezie, “ebe a hụrụ Ya ka Ọ dị ka mmadụ n’oyiyi Ya, O wedakwara onwe ya wee bụrụ Onye na-aṅa ntị ruo ọnwụ, bụ́ ọnwụ nke [osisi ịta ahụhụ, NW].” (Ndị Filipaị 2:8) Lee ihe nlereanya ọ bụ n’igosipụta obi na-anụ ihe!
Nrubeisi Na-erughị n’Isi Ezughị
Ọ bụghị ndị nile zọrọwooro na ha na-erubere Chineke isi rubewooro ya isi n’ezie. Tụlee Eze Sọl nke Israel oge ochie. Chineke nyere ya iwu ikpochapụ ndị ajọ omume bụ́ ndị Amalek. (1 Samuel 15:1-3) Ọ bụ ezie na Sọl bibiri ha dị ka otu mba, ọ hapụrụ eze ha, o chebekwara ụfọdụ n’ime atụrụ na ehi ha. Samuel jụrụ, sị: ‘N’ihi gịnị ka ị na-egeghị ntị olu Jehova’? Ná nzaghachi, Sọl sịrị: “N’ezie egewo m ntị olu Jehova . . . Ndị Israel chịịrị ụfọdụ n’ime ihe nkwata ịchụrụ Jehova . . . àjà, . . . bụ́ ìgwè ewu na atụrụ na ìgwè ehi, isi ihe.” N’imesi mkpa maka nrubeisi zuru ezu ike, Samuel zaghachiri, sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà ọzọ, hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka ige ntị olu Jehova? Lee, ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà, ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebulu. N’ihi na mmehie nke ịjụ ase n’aka ndị mmụọ ka nnupụisi bụ, ikpere arụsị na terafim ka isi ike bụkwa. N’ihi na ị jụwo okwu Jehova, Ọ jụwokwa gị ka ị ghara ịbụ eze.” (1 Samuel 15:17-23) Lee ihe dị ukwuu funahụrụ Sọl n’ihi na o nweghị obi na-anụ ihe!
Ọbụna Eze Solomọn maara ihe, bụ́ onye kpeworo ekpere maka obi na-anụ ihe, anọgideghị na-erubere Jehova isi. N’ụzọ megidere uche Chineke, ọ lụrụ ndị inyom ala ọzọ bụ́ ndị mere ka o mehie megide Chineke. (Nehemaịa 13:23, 26) Solomọn tufuru ihu ọma Chineke n’ihi na ọ nọgideghị na-enwe obi na-anụ ihe. Lee ihe ịdọ aka ná ntị nke a bụ nye anyị!
Nke a apụtaghị na Jehova na-achọ izu okè n’aka ndị ohu ya bụ́ mmadụ. Ọ “na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:14) Anyị nile na-ehie ụzọ mgbe ụfọdụ, ma Chineke pụrụ ịhụ ma anyị nwere n’ezie ọchịchọ si n’obi ime ihe na-amasị ya. (2 Ihe E Mere 16:9) Ọ bụrụ na anyị ejehie n’ihi ezughị okè mmadụ ma nwee nchegharị, anyị pụrụ ịrịọ mgbaghara ná ndabere nke àjà mgbapụta Kraịst, na-enwe obi ike na Jehova ‘ga-agbaghara anyị mmehie anyị n’ụba.’ (Aịsaịa 55:7; 1 Jọn 2:1, 2) Enyemaka ndị okenye bụ́ ndị Kraịst na-ahụ n’anya pụkwara ịdị mkpa ka anyị wee nwee ike ịgbake n’ụzọ ime mmụọ ma nwee okwukwe ziri ezi na obi na-anụ ihe.—Taịtọs 2:2; Jemes 5:13-15.
Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Nrubeisi Gị Zuru Ezu?
Dị ka ndị ohu Jehova, obi abụọ adịghị ya na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị na-eche na anyị nwere obi na-anụ ihe. Anyị pụrụ iche, sị, Ọ̀ bụ na adịghị m ekere oke n’ọrụ nkwusa Alaeze? Ọ̀ bụ na adịghị m eguzosi ike mgbe okwu ndị bụ́ isi dị ka nnọpụiche bilitere? Ọ̀ bụ na adịghị m ejechikwa nzukọ ndị Kraịst anya, dị ka Pọl onyeozi gbara ume ya? (Matiu 24:14; 28:19, 20; Jọn 17:16; Ndị Hibru 10:24, 25) N’ezie, ndị Jehova n’ozuzu ha na-egosipụta nrubeisi sitere n’obi n’akụkụ ndị dị mkpa otú a.
Ma gịnị banyere àgwà anyị n’ihe omume anyị na-eme kwa ụbọchị, ikekwe n’okwu ndị yiri ndị dị nta? Jisọs sịrị: “Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi n’ihe dịkarịsịrị nta kwesịkwara ka a tụkwasị ya obi n’oké ihe: onye bụkwa onye ajọ omume n’ihe dịkarịsịrị nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.” (Luk 16:10) Ya mere onye ọ bụla n’ime anyị ga-eme nke ọma ịjụ onwe ya, sị, Ènwere m obi na-anụ ihe mgbe a bịara n’ihe ndị dị nta ma ọ bụ okwu nke ọbụna ndị ọzọ na-amaghị banyere ha?
Ọbụ abụ ahụ gosipụtara na ọbụna n’ime ụlọ ya, ebe ndị ọzọ na-ahụghị ya, o ‘jegharịrị n’izu okè nke obi ya.’ (Abụ Ọma 101:2) Mgbe ị na-anọdụ ala n’ụlọ gị, ị pụrụ ịgbanye telivishọn ma malite ikiri otu ihe nkiri. Kpọmkwem n’ebe ahụ, a pụrụ itinye nrubeisi gị n’ule. Ihe mejupụtara ihe nkiri ahụ pụrụ ịghọ nke rụrụ arụ. Ị̀ ga-anọgide na-ekiri, na-ewere ya na nke a bụ ụdị ihe nkiri ndị a na-egosi n’ụbọchị ndị a? Ka obi gị nke na-anụ ihe ọ̀ ga-akpali gị irube isi n’iwu Akwụkwọ Nsọ bụ́, ‘unu ekwela ka a kpọọ ọbụna ịkwa iko na adịghị ọcha aha n’etiti unu’? (Ndị Efesọs 5:3-5) Ị̀ ga-agbanyụ TV ahụ, ọ bụrụgodị na akụkọ ahụ na-akpali mmasị? Ka ị̀ ga-agbanye ebe ọzọ ma ọ bụrụ na ihe omume ahụ aghọọ nke ime ihe ike? “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ, “na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụru obi Ya na-akpọ asị.”—Abụ Ọma 11:5.
Obi Na-anụ Ihe Na-eweta Ngọzi
N’ezie, e nwere ọtụtụ akụkụ nke ndụ ebe anyị pụrụ inyocha onwe anyị n’ụzọ bara uru iji hụ ma anyị na-esite n’obi na-erubere Chineke isi n’ezie. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ kwesịrị ịkwali anyị ime ihe na-amasị ya na ime ihe ọ na-agwa anyị n’Okwu ya, bụ́ Bible. Obi na-anụ ihe ga-enyere anyị aka ime ka anyị na Jehova nọgide na-enwe mmekọrịta dị mma. N’ezie, ọ bụrụ na anyị na-erube isi n’ụzọ zuru ezu, ‘okwu nile nke ọnụ anyị na ntụgharị nke obi anyị ga-abụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Jehova.’—Abụ Ọma 19:14.
N’ihi na Jehova hụrụ anyị n’anya, ọ na-akụziri anyị nrubeisi maka ọdịmma nke onwe anyị. Anyị na-abakwara onwe anyị uru n’ụzọ dị ukwu site n’iji obi dum na-aṅa ntị ná nkụzi Chineke. (Aịsaịa 48:17, 18) Ya mere, ka anyị were ọṅụ nara enyemaka nke Nna anyị nke eluigwe na-enye site n’Okwu ya, mmụọ ya, na nzukọ ya. A na-akụziri anyị nnọọ ihe nke ọma nke na o yiri ka anyị na-anụ olu n’azụ anyị nke na-asị: “Nke a bụ ụzọ, jeenụ ije n’ime ya.” (Aịsaịa 30:21) Ka Jehova na-akụziri anyị ihe site na Bible, mbipụta ndị Kraịst, na nzukọ ọgbakọ, ka anyị ṅaa ntị, tinye ihe ndị anyị na-amụta n’ọrụ, ma “na-aṅa ntị ruo ihe nile.”—2 Ndị Kọrint 2:9.
Obi na-anụ ihe ga-arụpụta ọṅụ dị ukwuu na ọtụtụ ngọzi. Ọ ga-ewetara anyị udo nke uche, n’ihi na anyị ga-amata na ihe anyị na-atọ Jehova Chineke ezi ụtọ, na-emekwa ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Obi nke na-anụ ihe ga-abụ ihe nchebe nye anyị mgbe a nwara anyị ime ihe ọjọọ. N’ezie, mgbe ahụ, anyị kwesịrị irubere Nna anyị nke eluigwe isi, kwesịkwa ikpe ekpere, sị: “Nye ohu gị obi na-anụ ihe.”
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]
Site na Self-Pronouncing Edition of the Holy Bible, nke nwere nsụgharị King James na Revised