Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 10/1 p. 26-29
  • Mụta Nrubeisi Site n’Ịnakwere Ịdọ Aka ná Ntị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mụta Nrubeisi Site n’Ịnakwere Ịdọ Aka ná Ntị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Chineke Si Ele Nrubeisi Anya
  • A Ghaghị Ịmụta Ya —N’ihi Gịnị na n’Ụzọ Dị Aṅaa
  • Na-akụzi Nrubeisi Site n’Irube Isi
  • “Na-aṅanụ Ntị . . . n’Ihe Nile”
  • Na-ele Nrubeisi Anya n’Ụzọ Ziri Ezi
  • Nrubeisi—Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mkpa A Na-amụta n’Oge A Bụ Nwata?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • “Ndị Bụ́ Ụmụ, Na-eruberenụ Ndị Mụrụ Unu Isi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • “Ọ Mụtara Nrubeisi”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Jehova Ji Nrubeisi Gị Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 10/1 p. 26-29

Mụta Nrubeisi Site n’Ịnakwere Ịdọ Aka ná Ntị

CHEEDỊ echiche ịbụ onye guzo n’elu nkume dị n’ugwu dị elu, na-enwe mmetụta nke ịbụ onye guzo n’elu ụwa n’ụzọ nkịtị. Lee aha echiche na-enye ọṅụ nnwere onwe nke ahụ bụ!

Ma nnwere onwe gị nwere nnọọ ịkpa ókè. Iwu ike ndọda na-amachibido mmegharị ahụ gị ọ bụla kpam kpam; otu nzọhie ụkwụ pụrụ ịkpata ọdachi. N’aka nke ọzọ, lee ka o si na-enye obi ụtọ ịmara na otu iwu ike ndọda ahụ na-egbochi gị ifegharị ná mbara igwe n’enweghị enyemaka. Ya mere, o doro anya na iwu ahụ bụ maka ọdịmma gị. Ịnakwere ịkpa ókè ọ kpara ná mmegharị ahụ gị n’ebe ahụ n’ọnụ ọnụ elu ugwu ahụ bara uru, ọbụna bụrụ nke na-azọpụta ndụ.

Ee, mgbe ụfọdụ iwu dị iche iche na nrubeisi nye ha pụrụ ịkpara nnwere onwe anyị ókè, ma nke a ọ̀ na-eme ka nrubeisi bụrụ ihe na-adịghị mma?

Ụzọ Chineke Si Ele Nrubeisi Anya

Dị ka ‘Onye Okike Ukwu,’ Jehova bụ “isi iyi ndụ.” N’ihi nke a ihe nile o kere eke ji ya ụgwọ nrubeisi n’ụzọ ziri ezi. N’igosipụta àgwà ziri ezi, onye ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ka anyị kpọọ isiala hurukwa ala; ka anyị gbuo ikpere n’ala n’ihu Jehova Onye meworo anyị: n’ihi na ya onwe ya bụ Chineke anyị: anyị onwe anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dị ka atụrụ, bụrụkwa ìgwè atụrụ nke aka ya.”—Eklisiastis 12:1; Abụ Ọma 36:9; 95:6, 7.

Site ná mmalite Jehova achọwo nrubeisi site n’aka ihe ndị o kere eke. Adam na Iv ịnọgide na-adị ndụ na Paradaịs dabeere ná nrubeisi. (Jenesis 2:16, 17) A tụkwara anya nrubeisi n’aka ndị mmụọ ozi, ọ bụ ezie na ha bụ ụdị ndụ dị elu karịa ụmụ mmadụ. N’ihi na ụfọdụ n’ime mmụọ ndị a e kere eke ‘ekwenyeghị mgbe ogologo ntachi obi Chineke na-echesi ike n’ụbọchị Noa,’ a tara ha ahụhụ site n’ịtụba ha “n’olulu nke ọchịchịrị, ka e wee debe ha ikpe ikpe.”—1 Pita 3:19, 20; 2 Pita 2:4.

N’ikwu ya n’ụzọ doro anya, Chineke na-ele nrubeisi anya dị ka ihe a chọrọ n’aka mmadụ maka inweta nnwapụta ya. Anyị na-agụ, sị: “Àjà nsure ọkụ na àjà ọzọ, hà na-atọ Jehova ụtọ dị ka ige ntị olu Jehova? Lee, ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà, ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebulu.”—1 Samuel 15:22.

A Ghaghị Ịmụta Ya —N’ihi Gịnị na n’Ụzọ Dị Aṅaa

Nrubeisi na-eduga n’inwe nguzo ezi omume n’ebe Chineke nọ, lee ka o si dị oké mkpa ka anyị mụta ya! Dịkwa ka ịmụta asụsụ ala ọzọ, a pụrụ ịmụta àgwà nke nrubeisi mgbe anyị dị na nwata. Nke ahụ mere Bible ji na-emesi ike ọzụzụ nke ụmụntakịrị site n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ.—Joshua 8:35.

Ụfọdụ ndị ọgbara ọhụrụ na-emegide echiche nke Bible, na-asị na ịchọ nrubeisi n’aka ụmụaka bụ otu ihe ahụ dị ka imeso ha ihe ike n’uche. Ha na-arụ ụka na e kwesịrị ịhapụ ụmụaka ka ha zụlite echiche na ụkpụrụ nke onwe ha nke ha ga-eji na-adị ndụ n’enweghị onye toworo eto ga-etinyere ha ọnụ.

Ma n’afọ ndị 1960 mgbe ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ nwere echiche nke a, Wilhelm Hansen, bụ́ onye nkụzi, onye editọ, na prọfesọ nke akparamagwa mmadụ, ekwetaghị na nke ahụ. O dere, sị: “Nye nwatakịrị nọ ná mmalite nke uto ya, n’oge mgbe mmekọrịta nke ya na ndị mụrụ ya ka dị mkpa, ‘ihe ọjọọ’ bụ ihe ndị mụrụ ya na-amachibido ma ‘ihe ọma’ bụ ihe ha na-atụ aro ya ma ọ bụ na-aja mma. Ya mere, nanị nrubeisi na-eduzi nwatakịrị ahụ n’ụzọ nke omume ọma nakwa n’àgwà ndị bụ isi nke ọ bụ site n’inwe ha ka mmekọrịta ya gaa n’usoro omume ọma dabeere.”—Tụlee Ilu 22:15.

Okwu Chineke na-emesi ike mkpa ọ dị ịmụta nrubeisi. Anyị na-agụ, sị: “Gị ONYENWE m, amaara m na ọ bụghị mmadụ nwee ịhọrọ ụzọ nke ya; na ọ bụghịkwa mmadụ ka ọ dịịrị ikpebi ụzọ ndụ ya.” (Jeremaịa 10:23, The New English Bible) Akụkọ ihe mere eme jupụtara n’ihe atụ ebe ụmụ mmadụ haziworo ụzọ ndụ nke ha dị ka ụkpụrụ onwe ha si dị, ha enwewokwa oké ihe isi ike n’ihi ime otú ahụ. N’ihi gịnị ka nke a ji na-eme ọtụtụ mgbe? N’ihi na ụmụ mmadụ enweghị ihe ọmụma, amamihe na nghọta iji hazie ụzọ ndụ ha n’enweghị enyemaka. Dị ka nke dị njọ karịa nke ahụ, ha nwere ọchịchọ ebumpụta ụwa nke ime mkpebi ndị na-ezighị ezi. Ozugbo Iju Mmiri ahụ gasịrị, Jehova kwuru banyere mmadụ, sị: “Nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata.”—Jenesis 8:21.

Ya mere, ọ dịghị onye na-ebu ọchịchọ nke irubere Jehova isi apụta ụwa. Anyị aghaghị ịzụlite ya n’ime ụmụ anyị ma nọgide na-amụ ya ná ndụ anyị nile. Ọ dị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị zụlite ọnọdụ obi nke Eze Devid, bụ́ onye dere, sị: “Jehova, mee ka m mara ụzọ gị nile; zie m okporo ụzọ gị nile. Mee m ka m zọọ ije n’eziokwu gị, gị ziekwa m ihe; n’ihi na gị onwe gị bụ Chineke nke nzọpụta m; gị ka m na-ele anya gị ogologo ụbọchị nile.”—Abụ Ọma 25:4, 5.

Na-akụzi Nrubeisi Site n’Irube Isi

Nne Jisọs na nna kuchiri ya maara nke ọma banyere ọnọdụ ndị gbara ọmụmụ Jisọs gburugburu. Ya mere, ha ghọtara na ọ gaje ikere òkè dị mkpa ná mmezu nke nzube nile nke Jehova. (Tụlee Luk 1:35, 46, 47.) N’ọnọdụ nke ha, okwu ahụ bụ́ “Lee, ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ” nwere ihe ọ pụtara n’ụzọ pụrụ iche. (Abụ Ọma 127:3) Ha ghọtazuru oké ibu ọrụ ha nwere, ha sikwa otú a dị ngwa irube isi ná ntụziaka nile nke Chineke, dị ka mgbe a gwara ha ka ha gbaga n’Ijipt ma ọ bụ mesịa gaa Galili.—Matiu 2:1-23.

Nne na nna Jisọs ghọtakwara ibu ọrụ ha n’ihe banyere ịdọ aka ná ntị. N’eziokwu, n’oge ịdị adị ya tupu ọ ghọọ mmadụ, Jisọs anọworị na-erube isi. Ma mgbe ọ nọ n’elu ala, ọ mụtara irube isi n’okpuru ọnọdụ ndị dị ọhụrụ kpam kpam. Dị ka ihe atụ, o rubeere nne na nna na-ezughị okè isi n’ihi na ọbụna nwatakịrị zuru okè nwere mkpa nke ịdọ aka ná ntị n’ụdị ntụziaka na ọzụzụ. Nke a ka nne na nna ya nyere ya. N’aka nke ọzọ, ịdọ aka ná ntị n’ụdị nke inye ahụhụ adịghị mkpa. Jisọs rubere isi mgbe nile; ọ dịghị mgbe a gwara ya ihe ọ ga-eme ugbo abụọ. Anyị na-agụ, sị: “Mgbe ahụ o sooro ha [nne na nna ya] laa n’ụlọ na Nazaret wee na-erubere ha isi.”—Luk 2:51, Phillips.

Josef na Meri makwaara ụzọ isi kụziere Jisọs ihe site n’ihe nlereanya. Dị ka ihe atụ, anyị na-agụ na “ndị mụrụ ya na-eje Jerusalem kwa afọ n’ememe ngabiga.” (Luk 2:41) Site n’ime ndokwa ịkpọrọ ezinụlọ ya, Josef gosiri na o nwere mmasị n’ọdịmma ime mmụọ ha, na o jikwa ofufe Jehova kpọrọ ihe. Lee ezi ihe nlereanya nke ahụ bụ. N’otu ụzọ ahụ, ndị mụrụ ụmụ site ná nrubeisi nke ha n’ihe ndị metụtara ofufe pụrụ ịkụziri ụmụ ha nrubeisi n’oge a.

N’ihi inye ezi ịdọ aka ná ntị n’ezi omume n’akụkụ nke Josef na Meri, “Jisọs wee na-aga n’ihu n’amamihe na ogologo, na-agakwa n’amara n’ebe Chineke na mmadụ nọ.” Lee ezi ihe nlereanya ọ bụ nye ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst ịgbaso n’oge a!—Luk 2:52.

“Na-aṅanụ Ntị . . . n’Ihe Nile”

“Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ihe nile, n’ihi na nke a bụ ihe na-atọ ezi utọ n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:20) Jisọs pụrụ ịbụ onye na-erubere ndị mụrụ ya isi n’ihe nile n’ihi na nrubeisi ha nye Jehova gbochiri ha ịchọ n’aka Jisọs—ma ọ bụ ụmụnne ya ndị nwoke na ndị nwanyị otu nne ji ha na ya—ihe ọ bụla megidere uche Jehova.

Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ taa na-enwekwa ihe ịga nke ọma n’ịkụziri ụmụ ha irube isi n’ihe nile. Gee ndị nna atọ ntị, bụ́ ndị, n’ịbụ ndị ụbọchị ịzụ ụmụ ha gaworo, na-eje ozi ugbu a n’otu alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society.

Theo na-ekwu banyere ụzọ ya na nwunye ya si zụlite ụmụ ise. Ọ sịrị: “Ọ dị mkpa ime ka ụmụaka mara site ná mmalite na anyị ndị toworo eto na-emejọkwa ihe. N’ụzọ dị mwute, ọbụna na anyị na-emeghachi ha ma nọgide na-arịọ Nna anyị nke eluigwe maka mgbaghara na enyemaka. Anyị ma ụma kwere ka ụmụ anyị na-ahụ kpọmkwem na dị ka ha na-agba mgba maka nchegbu nile nke ndị ntorobịa, anyị na-agba mgba maka nchegbu nile nke ndị toworo eto.”

Ọ bụrụ na nwatakịrị ga-amụta nrubeisi, mmekọrịta ịhụnanya n’etiti ya na ndị mụrụ ya dị mkpa. Hermann kwuru banyere nwunye ya, sị: “Ọ bụghị nanị na ọ bụ nne nke ụmụ anyị nwoke kama ọ bụkwa enyi ha. Nke a ka ha nwere ekele maka ya, ya mere ọ bụghị ihe siri ike nye ha irube isi.” Mgbe ahụ n’ịtụkwasị ndụmọdụ banyere ụzọ isi mee ka mmekọrịta dị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha ka mma, o kwuru, sị: “Anyị ma ụma hapụ inwe ígwè e ji asacha ihe ndị e ji rie nri ruo ọtụtụ afọ, ka e wee jiri aka na-asa ma na-ehicha ihe ndị ahụ. E kenyere ụmụ anyị ọrụ ihicha ha, onye mee taa ibe ya eme echi. Ọ dịghị oge ka nke ahụ mma maka inwe nkwurịta okwu nkịtị.”

Mmekọrịta ịhụnanya dị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha na-arụ ọrụ dị ka ihe nlereanya maka mmekọrịta onye Kraịst na-aghaghị inwe n’ebe Jehova nọ. Rudolf kọwara ụzọ ya na nwunye ya si gbalịa inyere ụmụ ha nwoke abụọ aka iguzobe mmekọrịta dị otú ahụ, sị: “Ihe ndabere anyị bụ ọmụmụ ihe ezinụlọ chiri anya. Anyị na-ekenye ụmụ anyị isiokwu ole na ole kwesịrị ekwesị maka nnyocha. Anyị gụkọkwara ọgụgụ Bible anyị ọnụ, mgbe ahụ tụleekwa isiokwu ahụ. Ụmụ anyị pụrụ ịhụ na Jehova tụrụ anya nrubeisi n’aka ndị mụrụ ụmụ, ọ bụghị nanị n’aka ụmụaka.”

Ndị Kraịst mụrụ ụmụ na-aghọta na akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́ “Ụzọ ndụ ka ịba mba nile nke ịdọ aka ná ntị bụ” metụtara ha nakwa ụmụ ha. Ya mere, ọ bụ ezie na ọ bụ ụmụaka nwere ibu ọrụ irubere ndị mụrụ ha isi n’ihe nile, ndị mụrụ ụmụ aghaghịkwa irube isi n’ihe nile Jehova chọrọ ha n’aka. E wezụga imesi mmekọrịta dị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha ike, ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha ga-achọ ime ka mmekọrịta nke ha na Chineke sie ike.—Ilu 6:23.

Na-ele Nrubeisi Anya n’Ụzọ Ziri Ezi

Lee aha obi ekele anyị pụrụ inwe na Okwu Chineke na-enye ndụmọdụ dị otú ahụ bara uru banyere ịzụlite ụmụaka! (Lee igbe.) Ụmụaka ndị mụtara nrubeisi site n’aka ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị na-adọ ha aka ná ntị n’ezi omume bụ ezi isi iyi nke ọṅụ nye òtù ụmụnna ndị Kraịst dum.

Ebe ọ bụ na nrubeisi nye Chineke pụtara ndụ, anyị kwesịrị izere ichetụ echiche banyere ịhapụ ihe mgbochi nile nke iwu Chineke tụkwasịrị ná nnwere onwe anyị—ọbụna ruo nwa oge. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche na anyị pụrụ ịhapụ ná mkpirikpi, iwu nke ike ndọda. Lee ka anyị ga-esi nwee obi ụtọ ná mkpali nke ifegharị site n’ọnụ ọnụ nke ugwu gaa n’urukpuru n’enweghị ihe ọ bụla na-egbochi nnwere onwe anyị! Ma gịnị ga-eme ozugbo ihe malitere ịdị otú o kwesịrị? Chee echiche banyere ọdịda nke na-echere anyị!

Ịmụta nrubeisi site n’ịnakwere ịdọ aka ná ntị na-ekere òkè n’ịzụlite ọdịdị mmadụ ziri ezi ma na-enyere anyị aka ịmara otú ike anyị hà. Ọ na-enyere anyị aka izere ịbụ ndị na-achọkarị ihe n’aka ndị ọzọ na ndị na-adịghị eche echiche banyere ihe ruuru ndị ọzọ na mkpa ha. Ọ na-enyere anyị aka izere mkpali nke inwe obi abụọ. Ná mkpirikpi, ọ na-arụpụta obi ụtọ.

Ya mere, ma ị̀ bụ onye toworo eto ma ọ bụ nwatakịrị, mụta nrubeisi site n’ịnakwere ịdọ aka ná ntị ka “ihe wee na-agara gị nke ọma,” ka “i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa.” (Ndị Efesọs 6:1-3) Ònye ga-achọ itinye olileanya ya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ihe ize ndụ site n’ịjụ ịmụta nrubeisi site n’anakwereghị ịdọ aka ná ntị?—Jọn 11:26.

[Igbe dị na peeji nke 29]

NDỊ MỤRỤ ỤMỤ, NA-AKỤZINỤ NRUBEISI SITE N’ỊDỌ AKA NÁ NTỊ N’EZI OMUME

1. Na-adọ aka ná ntị ná ndabere nke iwu na ụkpụrụ nile nke Akwụkwọ Nsọ.

2. Na-adọ aka ná ntị ọ bụghị nanị site n’ịchọ nrubeisi kama site n’ịkọwa ihe mere nrubeisi ji bụrụ ụzọ amamihe.—Matiu 11:19b.

3. Na-adọ aka ná ntị ọ bụghị n’iwe ma ọ bụ n’iti mkpu.—Ndị Efesọs 4:31, 32.

4. Jiri ikpo ọkụ nke mmekọrịta ịhụnanya na-egosi mmasị na-adọ aka ná ntị.—Ndị Kọlọsi 3:21; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8; Ndị Hibru 12:5-8.

5. Na-adọ ụmụaka aka ná ntị site na nwata.—2 Timoti 3:14, 15.

6. Na-adọ aka ná ntị mgbe mgbe nakwa n’ụzọ kwekọrọ ekwekọ.—Deuterọnọmi 6:6-9; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:11, 12.

7. Buru ụzọ dọọ onwe gị aka ná ntị, sikwa otú ahụ na-akụzi ihe site n’ihe nlereanya.—Jọn 13:15; tụlee Matiu 23:2, 3.

8. Na-akọ aka ná ntị site n’ịdabere n’ụzọ zuru ezu n’ebe Jehova nọ, na-arịọ maka enyemaka ya n’ekpere.—Ndị Ikpe 13:8-10.

[Foto dị na peeji nke 28]

“Ụzọ ndụ ka ịba mba nile nke ịdọ aka ná ntị bụ”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya