Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 8/1 p. 18
  • Iji Obi Umeala Na-ekwekọ n’Ụzọ Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Obi Umeala Na-ekwekọ n’Ụzọ Jehova
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chọọ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Chọọnụ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe Ya
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Ndị Jehova E Weghachiri Eweghachi Na-eto Ya n’Ụwa Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • “Ekwela Ka Aka Gị Abụọ Kụdaa”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 8/1 p. 18

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Iji Obi Umeala Na-ekwekọ n’Ụzọ Jehova

“CHỌỌNỤ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa.” A ka na-akpọ ndị mmadụ n’ụwa nile taa òkù a, nke Zefanaịa onye amụma bụ́ onye Hibru kpọsara n’ihe karịrị narị afọ 26 gara aga. (Zefanaịa 2:3) Gịnị ka ịchọ Jehova pụtara? Ime nke a na-amalite site n’ịnara ihe ọmụma banyere nanị otu ezi Chineke ahụ dị ndụ, bụ́ Jehova.—Jeremaịa 10:10; Jọn 17:3.

Otú ọ dị, ịnara ihe ọmụma n’onwe ya adịghị eduga ná nguzo a nwapụtara anwapụta n’ihu Chineke. Iji nweta ihu ọma Chineke, mmadụ aghaghịkwa itinye ihe ọmụma a n’ọrụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iji obi umeala na-eme ka echiche na àgwà ya kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke, dị ka e gosiri n’ahụmahụ na-esonụ sitere Suriname.—Ndị Efesọs 4:22-24.

Eddy, bụ́ onye nkụzi ụlọ akwụkwọ nọ n’etiti afọ ndụ ndị 30 ya, nwere agụụ maka azịza na-eju afọ nye ajụjụ ndị dị ka: ‘Olee ọrụ okpukpe na-arụrụ ọha mmadụ taa?’ na ‘Akwụkwọ ochie, bụ́ Bible, ò kwekọrọ na nkà mmụta sayensị ọgbara ọhụrụ?’ Mgbe Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ ya ma jiri azịza ndị dabeere na Bible zaa ajụjụ ndị a, Eddy ṅara ntị nke ọma. Ọbụna o deturu ihe iji chọpụta ma nkọwa Ndịàmà ahụ o ziri ezi.

Na mbụ, Eddy esonyeworo otu okpukpe kụziiri ya na mmadụ bụ ihe si ná ndozi Chineke dozigharịrị ọzọdimgba pụta. Ya mere mgbe Ndịàmà ahụ nyefere ya mbipụta ahụ bụ Life—How Did It Get Here? By Evolution or by Creation? ọ naara ya ozugbo. Nkọwa doro anya akwụkwọ ahụ nyere banyere ihe ndekọ okike nke Bible masịrị ya. Site n’ọmụmụ Bible ya o kwetara na ya achọtawo eziokwu ahụ!

Ma ugbu a, o chere ule ihu. Eddy bi n’ụlọ ebe e ji izu ohi na akwụwaghị aka ọtọ mere ụzọ ndụ. N’ihi ya, o chere ime nhọrọ ihu: isoro ụzọ ndụ rụrụ arụ nke ndị ya na ha bi ma ọ bụ ịjụ àgwà dị otú ahụ iji nakwere ụzọ ndụ nke na-enye Chineke otuto. N’ụzọ amamihe, Eddy họọrọ nke abụọ. Ọ kwụsịrị mkpakọrịta ọjọọ nile, kwapụkwa n’ụlọ ahụ.—1 Ndị Kọrint 15:33, 34.

Eddy nwere ọganihu dị ngwa mgbe ọ malitesịrị ije nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ gbanwere n’uwe na ejiji ya ma malite ịgwa ndị enyi na ndị ikwu ya banyere ihe ọ na-amụta. E mesịa, ọṅụ ya mụbara mgbe a kwadoro ya ikere òkè n’ikwusa “ozi ọma” n’ihu ọha. (Matiu 24:14; Ọrụ 20:20) Na December 1996 ụbọchị a nọworo eri oge na-eche bịara mgbe o gosipụtara nrara ọ raara onwe ya nye Jehova site na baptism mmiri.

Kwa afọ, ọtụtụ narị puku ụmụ mmadụ nwere obi eziokwu na-azaghachi n’ọkpụkpọ òkù ahụ bụ́ “chọọnụ Jehova.” N’ime otú ahụ, ha na-ahụ ịbụ eziokwu nke Ilu 22:4, bụ́ nke na-asị: “Ọkpụkpụ ọrụ nke obi umeala na egwu Jehova bụ akụ̀, na nsọpụrụ, na ndụ.” Ee, site n’iji obi umeala na-ekwekọ n’ụzọ Jehova, ndị hụrụ eziokwu n’anya na-enweta ngọzi dị otú ahụ ugbu a, jirikwa obi ike na-elepụ anya n’ihu maka ngọzi ebighị ebi n’elu ala ebe a kpọmkwem.—Abụ Ọma 37:29.

[Map dị na peeji nke 18]

Caribbean Sea

SURINAME

GUYANA

FRENCH GUIANA

BRAZIL

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 18]

Ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya