Ṅomie Jehova—Gosipụta Ikpe Ziri Ezi na Ezi Omume
“Mụ onwe m bụ Jehova Nke na-eme ebere na ikpe ziri ezi na ezi omume n’ụwa: n’ihi na ihe ndị a atọwo m ụtọ.”—JEREMAỊA 9:24.
1. Olee atụmanya magburu onwe ya Jehova na-esetịpụ?
JEHOVA kwere nkwa na oge ga-abịa mgbe onye ọ bụla ga-amara ya. Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịsaịa, o kwuru, sị: “Ha agaghị eme ihe ọjọọ, ha agaghị ebibikwa, n’ugwu nsọ m nile: n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Lee atụmanya magburu onwe ya nke ahụ bụ!
2. Gịnị ka ịmara Jehova na-agụnye? N’ihi gịnị?
2 Otú ọ dị, gịnị ka ịmara Jehova pụtara? Jehova kpugheere Jeremaịa ihe kasị mkpa: ‘Inwe uche n’ebe M nọ, wee mara m, na Mụ onwe m bụ Jehova Nke na-eme ebere na ikpe ziri ezi na ezi omume n’ụwa: n’ihi na ihe ndị a atọwo m ụtọ.’ (Jeremaịa 9:24) Ya mere, ịmara Jehova na-agụnye ịmara ụzọ o si egosipụta ikpe ziri ezi na ezi omume. Ọ bụrụ na anyị egosipụtazie àgwà ndị ahụ, ọ ga-enwe obi ụtọ n’ebe anyị nọ. Olee ụzọ anyị pụrụ isi eme otú ahụ? N’Okwu ya, bụ́ Bible, Jehova echekwawo ihe ndekọ nke otú o si mesoo ụmụ mmadụ na-ezughị okè omume n’ime ọtụtụ afọ ndị gaworo aga. Site n’ịmụ ya, anyị ga-amara ụzọ ikpe ziri ezi na ezi omume nke Jehova wee ṅomizie ya.—Ndị Rom 15:4.
Onye Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi ma Dị Ọmịiko
3, 4. N’ihi gịnị ka Jehova ji zie ezie ibibi Sọdọm na Gọmọra?
3 Ikpe Chineke kpere Sọdọm na Gọmọra bụ ihe atụ magburu onwe ya nke na-egosi akụkụ dị iche iche nke ikpe ziri ezi nke Jehova. Ọ bụghị nanị na Jehova nyere ntaramahụhụ dị mkpa kamakwa o nyere nzọpụta maka ndị kwesịrị ya. Mbibi nke obodo ndị ahụ ò kwesịrị ekwesị n’ezie? Abraham, bụ́ onye ihe ama na-egosi na ọ maara ihe dị nta banyere ókè ajọ omume nke Sọdọm haruru, echeghị otú ahụ na mbụ. Jehova mesiri Abraham obi ike na ọ bụrụ na a pụrụ ịchọta nanị mmadụ iri na-eme ezi omume, ọ gaghị ebibi obodo ahụ. N’ụzọ doro anya, ọ dịghị mgbe ikpe ziri ezi nke Jehova na-abịa ọkụ ọkụ ma ọ bụ n’ụzọ enweghị obi ebere.—Jenesis 18:20-32.
4 Nnyocha nke mmụọ ozi abụọ ahụ mere nyere ihe akaebe doro anya nke nretọ omume nke Sọdọm. Mgbe ndị ikom nke obodo ahụ, “ma okorobịa ma agadi,” nụrụ na ndị ikom abụọ abịawo ịnọ n’ụlọ Lọt, ha nuuru bịa n’ụlọ ya ná nzube nke ịgbakọta aka dinaa ụmụ nwoke ibe ha n’ike. Ịrụ arụ ha adịwo nnọọ oké njọ! N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, ikpe Jehova kpere obodo ahụ bụ nke ezi omume.—Jenesis 19:1-5, 24, 25.
5. Olee otú Chineke si gbapụta Lọt na ezinụlọ ya site na Sọdọm?
5 Mgbe o zosịrị aka ná mbibi nke Sọdọm na Gọmọra dị ka ihe atụ ịdọ aka ná ntị, Pita onyeozi dere, sị: “Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 2:6-9) A garaghị emezu ikpe ziri ezi ma ọ bụrụ na e kpochapụkọtara Lọt onye ezi omume na ezinụlọ ya tinyere ndị Sọdọm na-adịghị asọpụrụ Chineke. N’ihi ya, mmụọ ozi Jehova dọrọ Lọt aka ná ntị banyere mbibi nke na-abịanụ. Mgbe Lọt gburu oge, ndị mmụọ ozi ahụ “n’ihi na Jehova nwere ọmịiko n’ahụ ya,” jidere ya, nwunye ya, na ụmụ ya ndị inyom abụọ n’aka ma duru ha pụọ n’obodo ahụ. (Jenesis 19:12-16) Anyị pụrụ ijide n’aka na Jehova ga-egosi nchebara echiche yiri nke ahụ maka ndị ezi omume ná mbibi na-abịanụ nke ajọ usoro ihe a.
6. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji na-echegbubiga onwe anyị ókè banyere mbibi na-abịanụ nke ajọ usoro ihe a?
6 Ọ bụ ezie na ọgwụgwụ nke usoro ihe a ga-abụ oge “imezu ihe e kpere n’ikpe,” ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji na-echegbubiga onwe anyị ókè. (Luk 21:22, NW) Ikpe nke Chineke ga-ekpe n’Amagedọn ga-abụ ihe “ziri ezi n’otu.” (Abụ Ọma 19:9) Dị ka Abraham mụtara, anyi bụ́ mmadụ pụrụ inwe ntụkwasị obi kpam kpam n’ikpe ziri ezi nke Jehova, bụ́ nke dị elu nke ukwuu karịa nke anyị. Abraham jụrụ, sị: “Onyeikpe ụwa nile, Ọ́ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe?” (Jenesis 18:25; tụlee Job 34:10.) Ma ọ bụ dị ka Aịsaịa tinyere ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, “ònye ziri [Jehova] ihe n’okporo ụzọ ikpe?”—Aịsaịa 40:14.
Ime Ihe Ezi Omume Iji Zọpụta Ihe A Kpọrọ Mmadụ
7. Njikọ dị aṅaa dị n’etiti ikpe ziri ezi nke Chineke na ebere ya?
7 Ikpe ziri ezi nke Chineke adịghị apụta ìhè nanị n’ụzọ o si enye ndị mere ihe ọjọọ ntaramahụhụ. Jehova na-akọwa onwe ya dị ka “Chineke Nke na-eme ezi omume na onye nzọpụta.” (Aịsaịa 45:21) N’ụzọ pụtara ìhè, e nwere njikọ chiri anya dị n’etiti ezi omume, ma ọ bụ ikpe ziri ezi, nke Chineke na ọchịchọ ya ịzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ site n’ihe ndị si ná mmehie pụta. N’ịkọwa akụkụ akwụkwọ nsọ a, The International Standard Bible Encyclopedia, Mbipụta nke 1982, na-ekwu na “ikpe ziri ezi nke Chineke na-achọ ụzọ gbara ọkpụrụkpụ ọ ga-esi gosipụta ebere Ya na imezu nzọpụta Ya.” Ọ bụghị na ọ dị mkpa ka e jiri ebere mee ka ikpe ziri ezi nke Chineke dị nro ma, kama nke ahụ, na ebere bụ ngosipụta nke ikpe ziri ezi Chineke. Ndokwa Chineke maka ihe mgbapụta maka nzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ bụ ihe atụ kasị dị ịrịba ama nke akụkụ a nke ikpe ziri ezi Chineke.
8, 9. (a) Gịnị ka ịkwụ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ na nkọwa nke ‘otu ọrụ ezi omume’ gụnyere? N’ihi gịnị? (b) Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka anyị?
8 Ụgwọ ihe mgbapụta ahụ n’onwe ya—ndụ dị oké ọnụ ahịa nke Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst—bụ nke dị elu n’ihi na ụkpụrụ Jehova enweghị onye ọ gụpụrụ, ya onwe ya kwa na-eme ihe kwekọrọ na ha. (Matiu 20:28) A tụfuwo ndụ zuru okè, bụ́ nke Adam, n’ihi ya a chọrọ ndụ zuru okè iji gbata ndụ maka ụmụ Adam. (Ndị Rom 5:19-21) Pọl onyeozi na-akọwa ụzọ iguzosi ike n’ihe nke Jisọs, tinyere ịkwụ ihe mgbapụta ahụ, dị ka ‘otu ọrụ ezi omume.’ (Ndị Rom 5:18) N’ihi gịnị? N’ihi na site n’ụzọ Jehova si ele ihe anya, ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ bụ ihe ziri ezi, bụrụkwa ime ihe n’ụzọ ikpe ziri ezi, ọbụna ọ bụ ezie na ọ ga-efu ya oké ihe ime ya. Ụmụ Adam dị ka “amị a pịara apịa,” bụ́ nke Chineke na-enweghị mmasị ịkpaji, ma ọ bụ dị ka “ogho oriọna na-akwụ anwụrụ ọkụ,” bụ́ nke ọ na-achọghị imenyụ. (Matiu 12:20) Chineke nwere obi ike na ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi ga-ebilite n’etiti ụmụ Adam.—Tụlee Matiu 25:34.
9 Olee otú anyị kwesịrị isi zaghachi n’omume ịhụnanya na ikpe ziri ezi a kasị ukwuu? Otu n’ime ihe ndị Jehova chọrọ n’aka anyị bụ ka anyị ‘mee ihe e kpere n’ikpe.’ (Maịka 6:8) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a?
Chọọ Ikpe Ziri Ezi, Gbasoo Ezi Omume
10. (a) Gịnị bụ otu ụzọ anyị si egosipụta ikpe ziri ezi? (b) Olee otú anyị pụrụ isi buru ụzọ chọọ ezi omume Chineke?
10 Nke mbụ, anyị ga-ekwekọrịrị n’ụkpụrụ omume nke Chineke. N’ihi na ụkpụrụ Chineke bụ nke ikpe ziri ezi na nke ezi omume, anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi mgbe anyị na-ebi ndụ kwekọrọ na ha. Nke ahụ bụ ihe Jehova na-atụ anya n’aka ndị ya. “Mụtanụ ime ezi ihe; chọọnụ ikpe ziri ezi,” ka Jehova gwara ụmụ Israel. (Aịsaịa 1:17) Jisọs nyere ndị na-ege ya ntị ndụmọdụ yiri nke ahụ n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, mgbe ọ gwara ha ka ha ‘buru ụzọ chọọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.’ (Matiu 6:33) Pọl gbara Timoti ume ‘ịgbaso ezi omume.’ (1 Timoti 6:11) Mgbe anyị biri ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ omume nke Chineke ma yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, anyị na-agbaso ezi ikpe na ezi omume. (Ndị Efesọs 4:23, 24) N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, anyị na-achọ ikpe ziri ezi site n’ime ihe n’ụzọ Chineke.
11. N’ihi gịnị, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị isi gbasoo mmehie ịbụ onye nwe anyị mgba?
11 Dị ka anyị maara nke ọma, ọ naghị adịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe mgbe nile ime ihe kwekọrọ n’ikpe ziri ezi, ziekwa ezie. (Ndị Rom 7:14-20) Pọl gbara ndị Kraịst bụ́ ndị Rom ume ịgba mgba megide mmehie ịbụ onye nwe ha, ka ha wee nwee ike iche ahụ ha a raara nye n’ihu Chineke dị ka “ihe agha ezi omume,” nke ga-abara Chineke uru n’imezu nzube ya. (Ndị Rom 6:12-14) N’otu aka ahụ, site n’ịmụ na itinye Okwu Chineke n’ọrụ mgbe nile, anyị ga-aghọta “ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị” ma bụrụ ndị a ‘zụpụtara ná nzụpụta nke dị n’ezi omume.’—Ndị Efesọs 6:4; 2 Timoti 3:16, 17.
12. Gịnị ka anyị kwesịrị izere ma ọ bụrụ na anyị ga-emeso ndị ọzọ otú anyị chọrọ ka Jehova si mesoo anyị?
12 Nke abụọ, anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi mgbe anyị na-emeso ndị ọzọ ihe n’ụzọ anyị chọrọ ka Jehova mesoo anyị. Ọ dị mfe inwe ụkpụrụ abụọ—nke dị nro maka anyị onwe anyị ma nke siri ike maka ndị ọzọ. Anyị na-agọpụ emezighị emezi anyị ngwa ngwa, ma anyị na-adị ngwa ịkatọ mmejọ nke ndị ọzọ, bụ́ nke nwere ike ịdị nnọọ nta ma e jiri ya tụnyere nke anyị. Jisọs jụrụ kpọmkwem, sị: “Ma gịnị mere i ji lee irighiri ahịhịa nke dị n’anya nwanna gị, ma ị tụgharịghị uche ná ntụhie nke dị n’anya nke gị?” (Matiu 7:1-3) Anyị ekwesịghị ichezọ mgbe ọ bụla na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ iguzo ma ọ bụrụ na Jehova ga-atụchawa mmejọ anyị. (Abụ Ọma 130:3, 4) Ọ bụrụ na ikpe ziri ezi nke Jehova kwere ya ka o leghara adịghị ike nke ụmụnna anyị anya, olee ndị anyị bụ ịma ha ikpe?—Ndị Rom 14:4, 10.
13. N’ihi gịnị ka onye ezi omume ga-eji ewere ya dị ka ibu ọrụ ya ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ?
13 Nke atọ, anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke mgbe anyị ji ịdị uchu na-arụ ọrụ nkwusa ahụ. “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya,” ka Jehova na-adụ anyị ọdụ. (Ilu 3:27) Ọ gaghị ezi ezi idebere onwe anyị ihe ọmụma ahụ na-enye ndụ nke Chineke nyeworo anyị n’ụba otú a. N’eziokwu, ọtụtụ ndị pụrụ ịjụ ozi anyị, ma ruo ogologo oge Chineke nọgidere na-emere ha ebere, anyị ga-adị njikere ịnọgide na-enye ha ohere nke ‘ịbịa ruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9) Dịkwa ka Jisọs, anyị na-enwe obi ụtọ mgbe anyị nwere ike inyere mmadụ aka ichigharịkwuru ikpe ziri ezi na ezi omume. (Luk 15:7) Ugbu a bụ oge kwesịrị ekwesị nye anyị ‘ịgha mkpụrụ n’ezi omume.’—Hosea 10:12.
“N’ikpe Ziri Ezi Ka Ha Ga-abụ Ndị Isi”
14. Ọrụ dị aṅaa ka ndị okenye na-arụ n’ihe banyere ikpe ziri ezi?
14 Anyị nile aghaghị ije ije n’ụzọ nke ezi omume, ma ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst nwere ibu ọrụ pụrụ iche n’akụkụ a. Ịchịisi Jisọs dị ka eze ‘bụ nke a kwagidere n’ikpe ziri ezi na n’ezi omume.’ N’ihi ya, ụkpụrụ ga-eduzi ndị okenye bụ ikpe ziri ezi nke Chineke. (Aịsaịa 9:7) Ha na-eburu n’uche ihe a kọwara n’ụzọ amụma n’Aịsaịa 32:1: “Lee, n’ezi omume ka otu eze ga-abụ eze, ndị isi kwa, n’ikpe ziri ezi ka ha ga-abụ ndị isi.” Dị ka ndị nlekọta, ma ọ bụ ‘ndị na-achị ezinụlọ Chineke,’ e ji mmụọ nsọ họpụta, ndị okenye kwesịrị ime ihe n’ụzọ Chineke.—Taịtọs 1:7.
15, 16. (a) Olee otú ndị okenye si eṅomi onye ọzụzụ atụrụ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi dị n’ilu Jisọs? (b) Olee mmetụta ndị okenye na-enwe banyere ndị furu efu n’ụzọ ime mmụọ?
15 Jisọs gosiri na ikpe ziri ezi nke Jehova dị ọmịiko, dị ebere, ma nwee ezi uche. Nke ka nke, ọ gbalịrị inyere ndị nwere nsogbu aka na “ịchọ na ịzọpụta ihe nke furu efu.” (Luk 19:10) Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ nọ n’ilu Jisọs bụ́ onye chọkatara otu atụrụ furu efu n’enweghị ike ọgwụgwụ ruo mgbe ọ hụrụ ya, ndị okenye na-achọ ndị kpafuworonụ n’ụzọ ime mmụọ ma na-agbalị idughachi ha n’ìgwè atụrụ ahụ.—Matiu 18:12, 13.
16 Kama ịma ndị pụrụ imewo mmehie dị oké njọ ikpe, ndị okenye na-achọ ịgwọ na iduje ha ná nchegharị ma o kwe omume. Ha na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha pụrụ inyere onye kpafuworonụ aka. Otú ọ dị, ọ na-ewute ha mgbe onye mere ihe ọjọọ na-echegharịghị. Mgbe ahụ ụkpụrụ ezi omume Chineke na-achọ n’aka ha ịchụpụ onye ahụ na-enweghị nchegharị. Ọbụna mgbe ahụ, dị ka nna nwa mmefu ahụ, ha na-enwe olileanya na otu ụbọchị onye mmehie ahụ ‘ga-amara onwe ya.’ (Luk 15:17, 18) N’ihi ya, ndị okenye na-ebute ụzọ ije leta ụfọdụ ndị a chụpụworo iji chetara ha otú ha pụrụ isi lọghachi ná nzukọ Jehova.a
17. Olee ihe mgbaru ọsọ ndị okenye nwere mgbe ha na-eleba anya n’okwu metụtara ihe ọjọọ, àgwà dịkwa aṅaa ga-enyere ha aka iru ihe mgbaru ọsọ ahụ?
17 Ọ dị ndị okenye mkpa karịsịa iṅomi ikpe ziri ezi nke Jehova mgbe ha na-elebara okwu onye mere ihe ọjọọ anya. Ndị mmehie “na-abịaru [Jisọs] nso” n’ihi na ha matara na ọ ga-aghọta ma nyere ha aka. (Luk 15:1; Matiu 9:12, 13) Otú ọ dị, Jisọs anabataghị ihe ọjọọ. Otu oge o sooro Jisọs rie nri kwaliri Zakịọs, bụ́ onye a ma ama na-anara mmadụ ihe ya n’ike, ichegharị ma kwụọ ụgwọ maka ahụhụ nile o wetawooro ndị ọzọ. (Luk 19:8-10) Ndị okenye taa nwere otu ihe mgbaru ọsọ ahụ ná nnọkọ ikpe ha—iduje onye mmehie ná nchegharị. Ọ bụru na ha bụ ndị a pụrụ ijekwuru dị ka Jisọs bụ, ọ ga-adịrị ọtụtụ ndị mere ihe ọjọọ mfe karị ịchọ enyemaka ha.
18. Gịnị ga-eme ka ndị okenye nwee ike ịdị ka “ebe izonarị ifufe”?
18 Obi na-aghọta mmetụta ga-enyere ndị okenye aka ikpe ikpe ziri ezi nke Chineke, bụ́ nke na-adịghị aka ike, ọ bụghịkwa nke na-adịghị enwe mmetụta. N’ụzọ na-akpali mmasị, Ezra kwadebere obi ya, ọ bụghị nanị uche ya, iji kụziere ụmụ Israel ikpe ziri ezi. (Ezra 7:10) Obi nke na-aghọta ihe ga-enyere ndị okenye aka itinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwesịrị ekwesị n’ọrụ na ịtụle ọnọdụ nke onye ọ bụla. Mgbe Jisọs gwọrọ nwanyị ahụ nwere oruru ọbara, o gosiri na ikpe ziri ezi nke Jehova pụtara ịghọta ihe nile e nyere n’iwu na ihe mere e ji nye ha. (Luk 8:43-48) A pụrụ iji ndị okenye bụ́ ndị na-egosipụta ikpe ziri ezi n’ọmịiko tụnyere “ebe izonarị ifufe” maka ndị adịghị ike nke onwe ha ma ọ bụ ajọ usoro ihe a nke anyị bi n’ime ya tijasịrị.—Aịsaịa 32:2.
19. Olee otú otu nwanna nwanyị si meghachi omume nye ntinye nke ikpe ziri ezi Chineke n’ọrụ?
19 Otu nwanna nwanyị bụ́ onye meworo mmehie dị oké njọ bịara ghọta n’onwe ya ikpe ziri ezi nke Chineke. “N’eziokwu, ụjọ tụrụ m ịgakwuru ndị okenye,” ka o kwetara. “Ma ha mesoro m omume n’ọmịiko na n’ụzọ nkwanye ùgwù. Ndị okenye ahụ dị ka ndị nna kama ịdị ka ndị ikpe aka ike. Ha nyeere m aka ịghọta na Jehova agaghị ajụ m ma ọ bụrụ na mụ ekpebie idozi ụzọ m nile. Amụtara m n’onwe m otú o si adọ anyị aka ná ntị dị ka Nna na-ahụ n’anya. Emeghere m obi m nye Jehova, na-enwe obi ike na ọ ga-anụ arịrịọ m. N’ileghachi anya azụ, apụrụ m ikwu n’eziokwu na nnọkọ mụ na ndị okenye ahụ n’afọ asaa gara aga bụ ngọzi sitere n’aka Jehova. Kemgbe ahụ, mmekọrịta mụ na ya esikwuolarị ike.”
Debe Ikpe Ziri Ezi, Meekwa Ezi Omume
20. Gịnị bụgasị abamuru nke ịghọta na igosipụta ikpe ziri ezi na ezi omume?
20 Obi dị anyị ụtọ na ikpe ziri ezi nke Chineke pụtara nnọọ ihe karịrị inye onye ọ bụla ihe kwesịrị ya. Ikpe ziri ezi nke Jehova akwaliwo ya inye ndị na-egosi okwukwe ndụ ebighị ebi. (Abụ Ọma 103:10; Ndị Rom 5:15, 18) Chineke na-emeso anyị ihe n’ụzọ dị otú a n’ihi na ikpe ziri ezi ya na-atụle ọnọdụ anyị, ọ na-achọkwa ịzọpụta karịa ịma ikpe. N’ezie, nghọta ka mma nke otú ikpe ziri ezi nke Jehova hà na-adọta anyị nso n’ebe ọ nọ. Ka anyị na-agbalịkwa iṅomi akụkụ a nke ụdị onye ọ bụ, a ga-agọzi ndụ anyị na ndụ ndị ọzọ n’ụba. Nna anyị nke bi n’eluigwe ga-ahụrịrị mgbaso anyị na-agbaso ikpe ziri ezi. Jehova na-ekwe anyị nkwa, sị: “Debenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume: n’ihi na nzọpụta m dị nso ịbịa, ezi omume m dịkwa nso ka e kpughee ya. Onye ihe na-agara nke ọma ka onye na-eme nke a . . . bụ.”—Aịsaịa 56:1, 2.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị ka mbibi nke Sọdọm na Gọmọra na-akụziri anyị banyere ikpe ziri ezi nke Jehova?
◻ N’ihi gịnị ka ihe mgbapụta ahụ ji bụrụ ngosipụta pụtara ìhè nke ikpe ziri ezi na ịhụnanya Chineke?
◻ Gịnị bụ ụzọ atọ anyị pụrụ isi gosipụta ikpe ziri ezi?
◻ N’ụzọ dị aṅaa pụrụ iche ka ndị okenye pụrụ isi ṅomie ikpe ziri ezi nke Chineke?
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Site n’ọrụ nkwusa anyị, anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke
[Foto dị na peeji nke 16]
Mgbe ndị okenye na-egosipụta ikpe ziri ezi nke Chineke, ọ na-adịrị ndị nwere nsogbu mfe ịchọ enyemaka ha