Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 8/15 p. 21-24
  • Ibi na Ime Nkwusa Gburugburu Otu Ugwu Na-agbawa Agbawa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ibi na Ime Nkwusa Gburugburu Otu Ugwu Na-agbawa Agbawa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Iyi Egwu nke Ugwu ahụ Na-agbawa Agbawa
  • Ndịàmà Jehova Nọgidere Na-arụsi Ọrụ Ike
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Dị Njikere?
  • Ịdọ Aka ná Ntị n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Ka Ukwuu
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 8/15 p. 21-24

Ibi na Ime Nkwusa Gburugburu Otu Ugwu Na-agbawa Agbawa

“Ọ BỤ ahụmahụ na-atụ ụjọ. Ọ pụrụ ịdị nnọọ ka ọgwụgwụ ụwa nke Bible na-ekwu maka ya. Anyị aghaghị ịnọrọ na nche ma nwee nguzo dị mma n’ihu Jehova Chineke mgbe nile.” Ndị ahụ bụ okwu Víctor, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, mgbe ọ na-akọ ahụmahụ ya nke ibi nnọọ nso n’ugwu Popocatépetl ahụ na-agbawa agbawa, nke a na-akpọkarị Popo, na Mexico.

Ugwu mgbawa a na-eme mkpọtụ anọwo n’akụkọ mba nile kemgbe 1994.a Ndị ọchịchị kwubiri na ihe ọ bụla nke nọ kilomita 30 gburugburu òkòkòrò ahụ nọ n’ógbè dị oké ize ndụ. Akụkụ ebe ndịda nke ugwu ahụ na-agbawa agbawa kasị nọrọ n’ihe ize ndụ n’ihi na òkòkòrò ahụ gara n’akụkụ ahụ, e nwekwara ndagwurugwu miri emi bụ́ ndị nkume na ụrọ pụrụ isi na ha wụpụta site n’òkòkòro ahụ.

Dị ka o kwesịrị ịdị, ọtụtụ na-eche ihe ga-eme Mexico City ma ọ bụrụ na ugwu mgbawa ahụ agbawaa n’ụzọ dị ukwuu. Obodo ukwu ahụ ọ̀ nọ n’ihe ize ndụ? E nwekwara mmadụ ndị bi na steeti nke Morelos n’ebe ndịda nke ugwu ahụ na-agbawa agbawa. Ndị nile bi n’ógbè ahụ, hà sokwu nọrọ n’ihe ize ndụ? Gịnịkwa ka ọ dị ka ya bụ́ ibi gburugburu ugwu ahụ na-agbawa agbawa, n’amaghị ihe pụrụ ime site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị?

Iyi Egwu nke Ugwu ahụ Na-agbawa Agbawa

Ebe ndịda Mexico City dị ihe dị ka kilomita 70 n’ọdịda anyanwụ nke ebe ugwu Popocatépetl, ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime ógbè ndị dịpụrụ adịpụ nọ nso ruo ihe dị ka kilomita 40. N’ịdabere n’ihe iwu kwuru, ógbè obodo ukwu ahụ nile, na ụba mmadụ nde 20 ya, anọghị n’ógbè ahụ dị ize ndụ. Otú ọ dị, n’ịdabere n’ebe ikuku na-eche ihu, ọ pụrụ imetụta ógbè a ma ọ bụrụ na ugwu ahụ na-agbawa agbawa enupụta ntụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu.

Mmetụta nke ntụ si n’ugwu mgbawa na-adịkarị njọ n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ nke ugwu ahụ na-agbawa agbawa. Ógbè a na-agụnye obodo ukwu Puebla na ọtụtụ obodo na obodo nta ndị ọzọ, na-enwe ihe dị ka mmadụ 200,000 bi gburugburu ógbè ahụ kasị dịrị ize ndụ. Na Sunday, May 11, 1997, ugwu ahụ na-agbawa agbawa gbọliri ikpo ntụ n’ikuku ma fesasịa ha gburugburu ógbè a nile, ọbụna na-eru na steeti nke Veracruz, ihe karịrị kilomita 300 n’ebe ọwụwa anyanwụ. N’ógbè dị n’ebe ndịda nke ugwu ahụ na-agbawa agbawa, na steeti nke Morelos, e nwere ọtụtụ obodo ukwu na obodo nta ndị nwere ngụkọta ụba mmadụ ruru ihe dị ka 40,000 bụ́ ndị pụkwara ịnọ n’oké ihe ize ndụ.

N’etiti ihe ndị a nile, ka Ndịàmà Jehova bi ma na-arụ ọrụ. Na Mexico City, ha dị ihe karịrị 90,000 nọ n’ihe dị ka ọgbakọ 1,700. Alaka Watch Tower Society dị ná mpụga nke Mexico City n’ebe ugwu nke ọwụwa anyanwụ, gburugburu ihe dị ka kilomita 100 site n’ugwu ahụ na-agbawa agbawa. E nwere ihe karịrị ndị ọrụ afọ ofufo 800 na-eje ozi n’alaka ahụ, e wezụga ihe dị ka ndị ọrụ afọ ofufo 500 na-arụ ọrụ n’otu ọrụ ihe owuwu buru ibu. Ha nile enweghị nke nọ n’ógbè ahụ dị ize ndụ.

Na steeti nke Morelos, e nwere ihe dị ka ọgbakọ 50 nke Ndịàmà Jehova na ihe karịrị ndị nkwusa Alaeze 2,000. Ụfọdụ n’ime ọgbakọ ndị a, bụ́ ndị dị na Tetela del Volcán na Hueyapan, dị nso ruo ihe dị ka kilomita 20 site n’òkòkòrò ahụ. Ọzọkwa, n’ebe ọwụwa anyanwụ na steeti nke Puebla, e nwere ọgbakọ ndị nwere ihe dị ka ndị nkwusa 600 bi gburugburu kilomita 20 ruo 30 site n’ugwu ahụ na-agbawa agbawa. N’ezie, ndị a pụrụ ịnọ n’oké ihe ize ndụ.

Ndịàmà Jehova Nọgidere Na-arụsi Ọrụ Ike

N’agbanyeghị iyi egwu ahụ dị mgbe nile, Ndịàmà Jehova akwụsịbeghị ọrụ nkwusa ha n’ógbè a. Ha anọgidewokwa n’usoro ihe omume ha nke ịga nzukọ ndị Kraịst, bụ́ nke na-enye ha echiche nke ịdị n’otu na obi ike n’okpuru ọnọdụ ọjọọ ndị a. (Ndị Hibru 10:24, 25) Otu akụkọ si n’otu n’ime ọgbakọ ndị ahụ na-ekwu, sị: “E nwewo mgbanwe pụtara ìhè n’omume ndị mmadụ n’ebe ozi ọma Alaeze ahụ dị. Dị ka ihe atụ, n’otu obodo nta, mmadụ 18 anakwerewo ọmụmụ Bible ebe obibi n’oge na-adịbeghị anya.”

Ọgbakọ ọzọ, nke dị kilomita 20 site n’ugwu ahụ na-agbawa agbawa, na-akọ, sị: “Uto ahụ abụrụwo nke pụtara ìhè. E guzobere ọgbakọ a na November 1996. N’ime ọnwa isii sochirinụ, mmadụ 10 ghọrọ ndị ruru eru ikere òkè n’ozi ubi. Ụfọdụ ndị nkwusa bi nanị kilomita 20 site n’òkòkòrò ahụ. A na-enwe nzukọ ndị Kraịst n’ebe ahụ, ha nwekwara ihe dị ka mmadụ 40 na-abịa.”

Magdalena, onye bi na San Agustín Ixtahuixtla, Puebla, nanị kilomita 25 site n’ugwu ahụ na-agbawa agbawa, anọgidewo na-arụsi ọrụ ike n’iduzi ọmụmụ Bible. Ọ kọrọ ihe mere mgbe otu mgbawa kpụ ọkụ n’ọnụ gasịrị.

“A gbaara anyị àmà na anyị kwesịrị ịhapụ ụlọ anyị, bụ́ nke anyị mere—n’okpuru ntụ na-ezo ka mmiri. N’agbanyeghị ọnọdụ ahụ dị oké ngwa, echere m banyere ezinụlọ Dorado bụ́ ndị m na-amụrụ Bible. Mụ na ụfọdụ ụmụnna gara n’ụlọ ezinụlọ Dorado iji nyere ha aka ịga n’ebe na-adịchaghị ize ndụ. N’obodo ukwu dị nso nke Puebla, kọmitii enyemaka nke Ndịàmà Jehova amalitelarị ịrụ ọrụ. Ezinụlọ Dorado nwere mmasị nke ukwuu n’ụzọ e si mesoo anyị nile ebe ahụ. E nyere anyị ụlọ n’ọtụtụ ebe dị iche iche, bụ́ nke ụmụnna anyị ndị Kraịst kwadebeere anyị tupu mgbe ahụ. Ọ dịghị ihe kọrọ anyị, ọ bụ ezie na anyị nọ n’ebe dị anya site n’ụlọ. Ezinụlọ a abịawo nzukọ ụfọdụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ịhụnanya ụmụnna ndị ha na-ezutetụbeghị mbụ gosiri ha tụrụ ha n’anya. Izu ole na ole mgbe anyị lọtasịrị n’ụlọ anyị, ezinụlọ a malitere ịbịachi nzụkọ nile anya. N’oge na-adịghị anya ha ruru eru ịbụ ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ. Ha abụọ abụrụwo ndị e mere baptism ugbu a. Ha ejewo ozi dị ka ndị ozi ọsụ ụzọ inyeaka ruo ọnwa ụfọdụ, ha na-emekwa atụmatụ ịbanye n’ọrụ ọsụ ụzọ oge nile.”

Martha, nwa agbọghọ dị afọ 20 nke bi kilomita 21 site n’òkòkòrò ahụ, ekweghị ka nkwarụ gbochie ya iji ohere ọ bụla dapụtaranụ mee nkwusa. Ọ mụtara eziokwu ahụ afọ atọ gara aga mgbe ugwu ahụ na-agbawa agbawa bidokwara mgbawa ya ọzọ. Kama iji oche nkwagharị eme ihe, bụ́ nke ga-esi ike nkwagharị n’ala mkpọda ahụ o bi, ọ na-agba ịnyịnya ibu iji kere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ. Ọ na-agbakwa ịnyịnya ibu ahụ eje nzukọ. Martha nwere ekele miri emi n’ebe Jehova nọ maka ịbụ akụkụ nke òtù ụmụnna ahụ na-ahụ n’anya, ebe ọ bụ na ọ na-adabere n’enyemaka nke ụmụnna nwanyị ndị nọ n’ọgbakọ ahụ iji nọkwasị ma rịtuo n’elu ịnyịnya ibu ahụ. Kwa ọnwa, ọ na-etinye ihe karịrị hour 15 n’ozi.

N’ógbè ndị a dịpụrụ iche, Ndịàmà Jehova na-echekarị nrụgide sitere n’aka ndị agbata obi ha isoro ha n’ime ememe ụbọchị ezumike okpukpe ihu. Na Tulcingo, otu obodo nta nke dị ihe dị ka kilomita 20 site n’ugwu ahụ na-agbawa agbawa, e nyere otu nwoke ọrụ ịga n’ụlọ Ndịàmà iji nata ha onyinye maka ememe ndị ahụ. Ụmụnna ahụ ji ndidi kọwaa ihe mere na ha apụghị ikere òkè n’ụbọchị ezumike okpukpe ndị ahụ. Nwoke ahụ nọgidesiri ike n’ịchọ inweta ego site n’aka ụmụnna ahụ nke na ọ malitere iso ha na-akpakọrịta, na-amata ụfọdụ n’ime nkwenkwe ha. O nwere ọṅụ n’ịchọta azịza nye ajụjụ ya na Bible Katọlik nke ya. Ọ nọwo na-abịachi nzukọ anya ruo otu afọ ugbu a, tinyere nwunye ya na nwa ya nwanyị, o kwupụtawokwa mmasị ya ịghọ onye nkwusa ozi ọma ahụ.

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Dị Njikere?

Ndị ọkà banyere ugwu mgbawa na-eme nchọpụta ha, na-edekwa akụkọ banyere Popocatépetl ahụ na-eyi egwu, ma ọ dịghị onye maara n’ezie ihe ga-eme ma ọ bụ mgbe ọ ga-eme. Dị ka usoro mgbasa ozi na mmadụ ndị bi nso si kwuo, ugwu ahụ na-agbawa agbawa pụrụ ịgbawa mgbe ọ bụla. Ihe iyi egwu ahụ dị adị. N’ezie, ndị ọchịchị na-echegbu onwe ha banyere nke a, ha chọkwara ime ihe ọ bụla ha nwere ike ime iji dị njikere a dịghị ama ama maka ọnọdụ mberede. Ma o doro anya na ha aghaghị ịkpachapụ anya banyere inye ịdọ aka ná ntị, ebe ọ bụ na ha achọghị ịkpata ọpụpụ n’ìgwè ma ọ bụrụ na e nweghị ihe ize ndụ na-achọ ime. Gịnịzi ka mmadụ kwesịrị ime?

“Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha,” ka otu ilu Bible na-ekwu. (Ilu 22:3) Ya mere, ihe amamihe dị na ya bụ mmadụ iwere nzọụkwụ ndị dị mkpa maka nchebe mgbe ohere ka dị, ọ bụghị ‘ịgabiga’ dị ka a ga-asị na ọ dịghị ihe ga-eme ma ọlị, jiri ụdị ike okike ndị ahụ na-atụ ụjọ na-egwuri egwu. Otú a ka Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè ahụ si ele okwu ahụ anya.

N’oge na-adịbeghị anya, ndị nnọchiteanya si n’alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society sooro ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na steeti nke Puebla zukọọ, bụ́ ndị ha na ọgbakọ ndị dị n’ógbè ihe ize ndụ ahụ na-enwe mmekọrịta chiri anya. E mere atụmatụ ka ndị nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị na ndị òtù nke otu kọmitii enyemaka gaa leta nke ọ bụla n’ime ezinụlọ ndị bi gburugburu kilomita 25 site n’òkòkòrò ahụ. E nyeere ezinụlọ ndị a aka ịtụle isi n’ógbè ahụ dị ize ndụ pụọ tupu ọ na-akpọtụ. E mere ndokwa maka ụgbọ njem na ebe obibi iji kpọfee mmadụ 1,500 n’obodo ukwu nke Puebla. Ụfọdụ ezinụlọ gara ibinyere ndị ikwu ha bi n’obodo ukwu ndị ọzọ.

Ịdọ Aka ná Ntị n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Ka Ukwuu

Anwụrụ ọkụ, ọkụ, na mkpọtụ ndị si na Popocatépetl apụta bụ ihe àmà ndị doro anya na mgbawa adịla nso. Ndị nile chọrọ ịlanarị aghaghị ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị ọchịchị nyere ma mee ihe ha kwesịrị ime. Ndịàmà Jehova bi kpọmkwem n’ógbè ugwu ahụ na-agbawa agbawa na-anọ na nche mgbe nile iji hụ na ha nọ ná nchebe nakwa iji nyere ndị ọzọ aka ịhụ ihe ize ndụ ahụ na ime ihe banyere ya tupu oge agabiga.

N’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu, Ndịàmà Jehova mụkwa anya banyere ihe omume ụwa site n’ìhè nke amụma Bible. Agha, ala ọma jijiji, ụnwụ nri, ọrịa, na mpụ dị nnọọ ịrịba ama dị ka ugwu mgbawa. Ha bụ akụkụ nke ihe ịrịba ama nke ọtụtụ ihe mejupụtara nke Jisọs Kraịst buru amụma na ọ ga-aka “ọgwụgwụ oge a” akara. Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye maara kpọmkwem mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-abịa, obi abụọ ọ bụla adịghị ya na ọ na-abịa nakwa na ọ dị ezi nso.—Matiu 24:3, 7-14, 32-39.

Mkpa dị ngwa taa bụ ka ndị mmadụ n’ebe nile jiri ịdọ aka ná ntị Jisọs kpọrọ ihe: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma e leghị anya, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede dị ka ọnyà.” (Luk 21:34) O doro anya na nke a bụ ihe amamihe dị na ya ime. Dị nnọọ ka a na-agaghị eji ihe àmà ịdọ aka ná ntị nke ugwu ahụ na-agbawa agbawa gwurie egwu, anyị agatụghị eleghara nrute nso nke Nwa nke mmadụ, bụ́ Jisọs Kraịst, anya bụ́ onye gbara ume, sị: “N’ihi nke a unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—Matiu 24:44.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Magazin Teta! (Bekee) nke March 8, 1997, kọrọ banyere ugwu mgbawa a na-eyi egwu.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Martha (n’elu ịnyịnya ibu) na ndị ọzọ na-agba àmà na gburugburu Popocatépetl

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya