“Ndị Topụrụ Etopụ Dị Ka Osisi Cedar Dị Na Lebanọn”
N’UGWU ndị mara mma nke Lebanọn ka osisi a maara dị ka Arz Ar-rab, nke pụtara “Osisi Cedar nke Onyenwe Anyị” na-eto. E hotara nnukwu osisi a na-adịghị ama ọkọchị, bụ́ nke kpuchiburu ugwu ndị ahụ, ihe dị ka ugboro 70 n’ime Bible—karịa osisi ọ bụla ọzọ.
Iji kọwaa osisi cedar ndị dị ebube nke Lebanọn, Akwụkwọ Nsọ na-eji okwu ndị bụ́ “mara mma nke ukwuu” na “magburu onwe ya” eme ihe. (Abụ nke Abụ 5:15; Ezikiel 17:23) Otú osisi cedar hà na ndịte anya nke osisi ya emewo ka ọ bụrụ ihe a ma ama eri ogologo oge gara aga maka iwu ụlọ na ụgbọ mmiri nakwa maka ịrụ arịa. Isisi ọma nke osisi ahụ na ọbara ọbara ọ na-achatụ, na-adọrọ adọrọ nke ukwuu, resin o nwere hie nne na-emekwa ka ọ ghara ire ure na ịgba ụtụ. Osisi ahụ na-etopụ etopụ, na-agbakwa agba n’ụzọ dị ịrịba ama, na-eru ihe ruru mita 37 n’ịdị ogologo na ihe ruru mita 12 n’ibu, ha na-enwekwa mkpọrọgwụ ndị miri emi, sie ike. Ka a sịkwa ihe mere ndị nlekọta ọhịa nke oge a jiworo kọwaa ya dị ka “ebube kasị elu nke ihe a kpọrọ osisi”!
Onye so dee Bible bụ́ Ezikiel ji Mesaịa tụnyere ọnụ alaka osisi cedar n’ụzọ amụma, bụ́ nke Chineke n’onwe ya na-akụ. (Ezikiel 17:22) N’ezie, okwu Hibru e ji eme ihe maka “osisi cedar” sitere n’ihe bụ́ isi ọ pụtara bụ́ “iguzosi ike.” Taa, ọ dịkwa ụmụazụ Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, mkpa ‘iguzosi ike n’okwukwe ha, na-adị ike,’ dị ka osisi cedar topụrụ etopụ ma sie ike. (1 Ndị Kọrint 16:13) Olee otú a pụrụ isi rụzuo nke a? Site n’iguzogidesi mmetụta ndị na-abụghị nke ndị Kraịst ike na ịtachisi obi ike n’ụzọ nke iguzosi ike n’ezi ihe na nsọpụrụ Chineke. A kọwara ndị na-eme otú ahụ n’ime Bible dị ka “ndị ezi omume . . . [bụ́ ndị] topụrụ etopụ dị ka osisi cedar dị na Lebanọn.”—Abụ Ọma 92:12, The New English Bible.