Ha Mere Uche Jehova
Otu Omume Mgbaghara Emeghee Ụzọ Maka Nzọpụta
ỤMỤ iri Jekọb bụ́ ndị guzo n’ihu praịm minista Ijipt nwere otu ihe nzuzo jọgburu onwe ya. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ, ha erenyewo onye otu nna ji ha na ya bụ́ Josef n’ohu, na-eme atụmatụ ịgwa nna ha na anụ ọhịa egbuwo ya.—Jenesis 37:18-35.
Ugbu a, ihe dị ka afọ 20 mgbe e mesịrị, oké ụnwụ amanyewo ndị ikom iri a ịbịa Ijipt ịzụrụ ọka. Ma ihe agachaghị were were. Praịm minista ahụ, bụ́ onye jekwara ozi dị ka onye nlekọta ihe oriri, boro ha ebubo ịbụ ndị nledo. Ọ tụrụ otu n’ime ha mkpọrọ ma gwa ndị ọzọ ka ha laghachi n’ụlọ ha ma kpọta nwanne ha nwoke nke kasị nta, bụ́ Benjamin. Mgbe ha mere otú ahụ, praịm minista ahụ mere atụmatụ ijide Benjamin.—Jenesis 42:1–44:12.
Juda, bụ́ otu n’ime ụmụ ndị ikom Jekọb, mere mkpesa. ‘Ọ bụrụ na anyị akpọghị Benjamin laghachi,’ ka o kwuru, ‘nna anyị ga-anwụ.’ Mgbe ahụ otu ihe mere nke ma Juda ma ndị ya na ha so bịa na-atụghị anya ya. Mgbe o nyesịrị iwu ka mmadụ nile ma e wezụga ụmụ Jekọb, si n’ime ụlọ ahụ pụọ, praịm minista ahụ bere ákwá n’olu dara ụda. Mgbe ahụ, n’ijikọta onwe ya, o kwupụtara, sị: “Mụ onwe m bụ Josef.”—Jenesis 44:18–45:3.
Obi Ebere na Mgbapụta
“Nna m, ọ̀ nọ ndụ ugbu a?” ka Josef jụrụ ndị otu nna ji ha na ya. Ọ dịghị onye zaghachiri ya. N’ezie, ndị otu nna ji ha na Josef enweghị ọnụ okwu. Ọ̀ bụ ha ṅụrịwa, ka ọ̀ bụ ha tụwa egwu? E kwuwerị, n’afọ 20 gara aga, ha erenyewo nwoke a n’ohu. Josef nwere ikike ịtụ ha mkpọrọ, izilaga ha n’enyeghị ha nri, ma ọ bụ—nke ka njọ—igbu ha! Ndị nna ji ha na Josef nwere ezi ihe mere na ha “apụghị ịza ya; n’ihi na ha mara jijiji n’ihu ya.”—Jenesis 45:3.
Josef mere ka obi ruo ndị ikom a ala ngwa ngwa. “Biko, bịakwutenụ m nso,” ka o kwuru. Ha mere otú ahụ. Mgbe ahụ o kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Josef nwanne unu, onye unu rere jee n’Ijipt. Ma ugbu a ya ewutela unu, ya abụkwala ihe iwe iwe dị ọkụ n’anya unu, na unu rere m bịa n’ebe a: n’ihi na ọ bụ idebe ndụ ka Chineke ziri m gaa n’ihu unu.”—Jenesis 45:4, 5.
Obi ebere Josef abụghị nke e gosipụtara n’enweghị ihe ndabere. Ọ dịla mbụ chọpụta ihe àmà nke nchegharị ha. Dị ka ihe atụ, mgbe Josef boro ndị nna ji ha na ya ebubo ịbụ ndị nledo, ọ nụpeere ka ha na-ekwu n’etiti onwe ha, sị: “N’ezie ndị ikpe maworo banyere nwanne anyị ka anyị bụ, . . . n’ihi ya ka mkpagbu a bịakwasịworo anyị.” (Jenesis 42:21) Ọzọkwa, Juda ewepụtawo onwe ya ịbụ ohu n’ọnọdụ Benjamin ka e wee nwee ike ịkpọghachiri nna ya nwa okoro ahụ.—Jenesis 44:33, 34.
N’ihi ya, ebere Josef mere ziri ezi. N’ezie, ọ ghọtara na ime otú ahụ pụrụ iwetara ezinụlọ ya dum nzọpụta. Ya mere, Josef gwara ndị nna ji ha na ya ka ha laghachikwuru nna ha, bụ́ Jekọb, ma gwa ya, sị: “Otú a ka nwa gị Josef sịrị, Chineke emewo m ka m ghọọ onyenwe Ijipt nile: rịdakwute m, atụla nguzo: ị ga-ebi n’ala Goshen, nọrọkwa m nso, gị onwe gị, na ụmụ gị, na ụmụ ụmụ gị, na ìgwè ewu na atụrụ gị, na ìgwè ehi gị, na ndị nile i nwere: m ga-azụkwa gị n’ebe ahụ.”—Jenesis 45:9-11.
Josef Ka Ukwuu
A pụrụ ịkpọ Jisọs Kraịst Josef Ka Ukwuu, n’ihi na e nwere myirịta dị ịrịba ama n’etiti ndị ikom abụọ a. Dị ka Josef, ụmụnne Jisọs, bụ́ ụmụ Abraham ibe ya, mesoro ya ihe n’ụzọ jọgburu onwe ya. (Tụlee Ọrụ 2:14, 29, 37.) Ma, ndị ikom abụọ a nwere mgbanwe pụrụ iche. Ka oge na-aga, a gbanwere ọnọdụ Josef nke ịbụ ohu gaa n’ịbụ praịm minista, bụ́ onye na-esote Fero. N’ụzọ yiri nke ahụ, Jehova kpọlitere Jisọs n’ọnwụ, bugookwa ya n’ọnọdụ dị elu “n’aka nri Chineke.”—Ọrụ 2:33; Ndị Filipaị 2:9-11.
Dị ka praịm minista, Josef pụrụ ikesa nri nye ndị nile bịara ịzụrụ ọka n’Ijipt. Taa, Josef Ka Ukwuu ahụ nwere òtù ohu kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche bụ́ nke o si n’aka ya na-ekesa nri ime mmụọ “n’oge ya.” (Matiu 24:45-47; Luk 12:42-44) N’ezie, ndị bịakwutere Jisọs, “agụụ agaghị agụ ha ọzọ, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ ọzọ . . . n’ihi na Nwa atụrụ ahụ Nke nọ n’etiti ocheeze ahụ ga-azụ ha dị ka atụrụ, Ọ ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.”—Mkpughe 7:16, 17
Ihe Mmụta Nye Anyị
Josef na-enye ihe nlereanya pụtara ìhè nke obi ebere. Ikpe emeghị ebere gaara achọwo ka ọ taa ndị ahụ renyere ya n’ohu, ahụhụ. N’ụzọ megidere nke ahụ, mmetụta pụrụ ịkpaliwo ya nnọọ ileghara njehie ha anya. Josef emeghị ha abụọ. Kama nke ahụ, o lere nchegharị nke ndị ahụ nna ji ha na ya ule. Mgbe ahụ, mgbe ọ hụrụ na iru újú ha bụ nke ezigbo ya, ọ gbaghaara ha.
Anyị pụrụ iṅomi Josef. Mgbe onye mehieworo megide anyị na-egosipụta ezi mgbanwe obi, anyị kwesịrị ịgbaghara ya. N’ezie, anyị ekwesịghị ikwe mgbe ọ bụla ka mmetụta efu mee ka anyị ghara ịhụ mmehie jọgburu onwe ya. N’aka nke ọzọ, anyị ekwesịghị ikwe ka ibu iwe n’obi mee ka anyị ghara ịhụ ezi nchegharị. Ya mere ka anyị ‘na-anagiderịta ibe anyị, werekwa amara gbaghara onwe anyị.’ (Ndị Kọlọsi 3:13) N’ime otú ahụ, anyị ga na-eṅomi Chineke anyị, bụ́ Jehova, bụ́ “onye na-agbaghara mmehie.”—Abụ Ọma 86:5; Maịka 7:18, 19.