Jerome—Onye Na-akpata Esemokwu nke Butere Ụzọ ná Nsụgharị Bible
N’APRIL 8, 1546, Kansụl nke Trent nyere iwu na Latin Vulgate “abụrụwo nke Chọọchị [Katọlik] kwadoro . . . nakwa na ọ dịghị onye ga-anwa anwa ma ọ bụ chọọ ịjụ ya n’agbanyeghị ihe ọ bụla kpatara ya.” Ọ bụ ezie na a sụgharịsịrị Vulgate ahụ n’ihe karịrị otu puku afọ tupu mgbe ahụ, ya na onye sụgharịrị ya, bụ́ Jerome, abụwo ndị na-akpata esemokwu eri oge. Ònye bụ Jerome? Gịnị mere ya na nsụgharị Bible ya ji na-akpata esemokwu? Olee otú ọrụ ya si emetụta nsụgharị Bible taa?
Ịzụlite Ọkà Mmụta
Aha Latin Jerome bụ Eusebius Hieronymus. A mụrụ ya n’ihe dị ka 346 O.A. na Stridon, n’ógbè ndị Rom nke Dalmetia, nke dị nso n’ókèala dị taa n’agbata Itali na Slovenia.a Nne na nna ya batụrụ ọgaranya, ọ nụkwara ụtọ ego mgbe ọ bụ nwata, na-agụ akwụkwọ na Rom n’okpuru ọkà n’ụtọ asụsụ a ma ama bụ́ Donatus. Jerome gosipụtara na ya bụ nwa akwụkwọ nwere onyinye ụtọ asụsụ, ikwu okwu nke ọma, na nkà ihe ọmụma. N’oge a, ọ malitekwara ịmụ Grik.
Mgbe ọ hapụsịrị Rom na 366 O.A., Jerome mere mwagharị, n’ikpeazụ o rutere n’Aquileia, Itali, bụ́ ebe a kụziiri ya echiche nke ịnapụ onwe onye ihe ụtọ nile. N’ịbụ onye echiche a nke mmadụ ịnapụ nnọọ onwe ya ihe masịrị, ya na otu ìgwè ndị enyi ya tinyere ụfọdụ afọ ndị sochirinụ n’ịzụlite ụzọ ndụ nke ịnapụ onwe onye ihe ụtọ nile.
Na 373 O.A., ọgba aghara a na-akọwaghị ihe kpatara ya mere ka ìgwè ahụ kewaa. N’obi nkoropụ, Jerome wagharịrị gaa n’ebe ọwụwa anyanwụ gafee Bitinia, Galetia, na Silisia, mesịakwa rute n’Antiọk, Siria.
Ogologo njem ahụ kpara ya aka. N’ịbụ onye ike gwụchara na onye ahụ na-esighị ike, ahụ ọkụ fọrọ nke nta ka o gbuo Jerome. “Oo, a sị nnọọ na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-akpọta m n’ebe ị nọ na mberede,” ka o kwuru mgbe ọ na-edegara otu enyi ya akwụkwọ. “Ahụ m na-esighị ike, nke na-adịghị ike ọbụna mgbe ahụ dị m mma, akụrisiwo.”
Dị ka a ga-asị na nrịanrịa, owu ọmụma, na ahụ erughị ala ezughị, Jerome chekwuru nsogbu ọzọ ihu n’oge na-adịghị anya—nke ime mmụọ. Ná nrọ, ọ hụrụ onwe ya “ka a kpụgara ya n’ihu oche ikpe” Chineke. Mgbe a gwara ya ka ọ kọwaa onwe ya, Jerome zaghachiri, sị: “Abụ m onye Kraịst.” Ma onye nọ n’isi oche bachiri ya ọnụ, sị: “Ị na-agha ụgha, ị bụ onye na-eso ụzọ Cicero, ọ bụghị Kraịst.”
Ruo mgbe ahụ, mmasị Jerome nwere n’ịmụ ihe bụ n’ụzọ bụ́ isi ịmụ banyere ọdịnala nke ndị na-ekpere arụsị kama ịbụ n’ịmụ Okwu Chineke. O kwuru, sị: “Akọ na uche m mara m ikpe n’ụzọ dị ukwuu.” N’inwe olileanya idozi okwu, Jerome kwere nkwa ná nrọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na m enwee akwụkwọ ụwa ọzọ, ma ọ bụ ọ bụrụ na m agụọ ihe dị otú ahụ ọzọ, agọnahụwo m Gị.”
Mgbe e mesịrị, Jerome rụrụ ụka na ya apụghị ịza ajụjụ maka nkwa ya kwere ná nrọ. Ma o kpebisiri ike imezu nkwa ya—ma ọ dịghị ihe ọzọ, n’ụkpụrụ. Ya mere, Jerome hapụrụ Antiọk ma gaa nọrọ n’ebe dịpụrụ adịpụ na Chalcis dị n’ọzara Siria. N’ịdị ndụ dị ka onye na-anọ nanị ya, o mikpuru onwe ya n’ọmụmụ Bible na akwụkwọ okpukpe. Jerome kwuru, sị: “Eji m ịnụ ọkụ n’obi agụ akwụkwọ Chineke karịa ka m gụworo akwụkwọ ndị mmadụ na mbụ.” Ọ mụtakwara asụsụ Syriac a na-asụ n’ógbè ahụ ma malite ịmụ asụsụ Hibru site n’enyemaka nke onye Juu a tọghataworo gaa n’Iso Ụzọ Kraịst.
Ikike Popu Nyere
Mgbe ihe dị ka afọ ise nke ibi ndụ ndị mọnk gasịrị, Jerome laghachiri Antiọk iji gụrụ akwụkwọ ya gaa n’ihu. Otú ọ dị, mgbe o rutere, ọ hụrụ na chọọchị ahụ kewara nnọọ ekewa. N’ezie, mgbe ọ ka nọ n’ọzara, Jerome arịọwo Popu Damasus maka ndụmọdụ, na-asị: “E kewaala Chọọchị ahụ gaa n’òtù atọ, nke ọ bụla n’ime ndị a nwekwara oké mmasị ime ka m kwadoo nke ya.”
Ka oge na-aga, Jerome kpebiri ịkwado Paulinus, bụ́ otu n’ime ndị ikom atọ ndị sịrị na ha bụ bishọp nke Antiọk. Jerome kwetara ịbụ onye Paulinus chiri echichi n’ọnọdụ abụọ. Nke mbụ, ọ chọrọ inwere onwe ya iji chụsoo ọchịchọ ya nke ịbụ onye mọnk. Nke abụọ kwa, o siri ọnwụ na ya ga-anọgide bụrụ onye a gụpụrụ n’ọrụ ọ bụla nke ijere otu chọọchị ozi dị ka ụkọchukwu.
Na 381 O.A., Jerome sonyeere Paulinus gaa Kansụl nke Constantinople, mesịakwa soro ya gaa Rom. Popu Damasus matara ngwa ngwa banyere nkà mmụta na asụsụ nke Jerome nwere. N’ime otu afọ e buliri Jerome n’ọkwá dị ùgwù nke ịbụ odeakwụkwọ Damasus.
Dị ka odeakwụkwọ, Jerome ezereghị esemokwu. Kama nke ahụ, o yiri ka ọ na-adọta ya adọta. Dị ka ihe atụ, ọ nọgidere na-ebi ndụ dị ka onye na-anapụ onwe ya ihe ụtọ nile n’etiti ndị bi n’ebe obibi popu bụ́ ndị na-eri ọnụ ụtọ. Tụkwasị ná nke a, site n’ịkwalite ụzọ ndụ nke ịnapụ onwe onye ihe nakwa site n’ikwusi okwu ike megide imebiga ihe ókè nke ụwa nke ndị ụkọchukwu na-eme, Jerome nwetara ọtụtụ ndị iro.
Otú ọ dị, n’agbanyeghị ndị na-akatọ ya, Jerome nwetara nkwado zuru ezu nke Popu Damasus. Popu ahụ nwere ezi ihe mere o ji gbaa Jerome ume imere nnyocha Bible ya gaa n’ihu. N’oge ahụ, e nwere ọtụtụ nsụgharị Latin nke Bible e ji eme ihe. Ọtụtụ n’ime ha ka a na-ejighị nlezianya sụgharịa, na-enwe ndehie ndị pụtara ìhè. Nchegbu ọzọ nke Damasus bụ na asụsụ nọ na-ekewa ógbè Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ebe Ọdịda Anyanwụ nke chọọchị ahụ. Ọ bụ ole na ole n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ maara Latin; ndị ka nta n’Ebe Ọdịda Anyanwụ maara Grik.
Ya mere ọ gụsiri Popu Damasus agụụ ike ka e degharịa nsụgharị nke Oziọma ndị ahụ e nwere na Latin. Damasus chọrọ nsụgharị nke ga-eyi nnọọ nke Grik mbụ, ma dị were were n’ọnụ, dookwa anya n’asụsụ Latin e ji sụgharịa ya. Jerome bụ otu n’ime ndị ọkà mmụta ole na ole pụrụ imepụta nsụgharị dị otú ahụ. N’ịbụ onye asụsụ Grik, Latin, na Syriac na-aga were were n’ọnụ, n’ịbụkwa onye nwere ihe ọmụma zuru ezu nke asụsụ Hibru, o ruru nnọọ eru maka ọrụ ahụ. Ya mere n’ịbụ onye Damasus nyere ikike, Jerome malitere otu ọrụ nke ga-ewe ihe karịrị afọ 20 nke ndụ ya.
Esemokwu ahụ Ebiri Ọkụ
Ọ bụ ezie na o ji oké ịdị ngwa na-arụ ọrụ n’ịsụgharị Oziọma ndị ahụ, Jerome gosipụtara nkà doro anya nke ọkà mmụta. N’ịtụle ihe odide Grik nile dị mgbe ahụ, o deziri ihe ụfọdụ dị n’akụkụ ihe odide Latin, ma n’otú e si dee ya ma ihe e dere na ya, iji mee ka ya na akụkụ ihe odide Grik kwekọkwuo.
N’ozuzu, a nabatara nnọọ Oziọma anọ ahụ Jerome sụgharịrị, dịkwa ka a nabatara Abụ Ọma nke o degharịrị na Latin, bụ́ nke dabeere n’akụkụ ihe odide Septuagint Grik. Ka o sina dị, ọ ka nwere ndị nkatọ. “Ụfọdụ ihe e kere eke ndị a na-asọ oyi,” ka Jerome dere, “ma ụma na-ekwutọ m n’ebubo nke bụ́ na mụ anwawo idezi akụkụ okwu ụfọdụ n’oziọma ndị ahụ, n’ụzọ megidere ikike nke ndị oge ochie na echiche nke ụwa nile.” Nkwutọ ndị dị otú ahụ biiri ọkụ mgbe Popu Damasus nwụsịrị na 384 O.A. Mmekọrịta Jerome na popu nke ọhụrụ adịchaghị mma, n’ihi ya, o kpebiri ịhapụ Rom. Ọzọkwa, Jerome tinyere isi n’ebe ọwụwa anyanwụ.
Nzụlite nke Ọkà Mmụta Hibru
Na 386 O.A., Jerome biiri na Betlehem, bụ́ ebe ọ ga-ebi ná ndụ ya nile fọdụrụnụ. Ìgwè nta nke ụmụazụ ya na-ekwenyere ya, gụnyere Paula, bụ́ nwanyị bara ọgaranya nke nwere ùgwù si Rom, sonyeere ya. Paula anabatawo ụzọ ndụ nke ịnapụ onwe onye ihe ụtọ nile n’ihi nkwusa Jerome mere. N’ihi nkwado ya n’ụzọ ego, e wuru ebe obibi ndị mọnk site ná ntụzi Jerome. N’ebe ahụ ka Jerome chụsoro ọrụ nkà mmụta ya ma rụzuo ọrụ kasị ukwuu ọ rụtụrụla ná ndụ ya.
Ibi na Palestine nyere Jerome ohere ime ka nghọta ya nke asụsụ Hibru ka mma. Ọ kwụrụ ụfọdụ ndị nkụzi asụsụ ndị Juu ụgwọ iji nyere ya aka ịghọta akụkụ ndị ka sie ike nke asụsụ ahụ. Ma, ọbụna mgbe o nwere onye nkụzi, ọ dịghịrị ya mfe. Banyere otu onye nkụzi, bụ́ Baraninas nke Taịbirias, Jerome kwuru, sị: “Lee ihe isi ike na ego o furu m inweta Baraninas iji kụziere m ihe n’abalị.” N’ihi gịnị ka ha ji na-amụ ihe n’abalị? N’ihi na Baraninas tụrụ egwu ihe ga-abụ echiche ndị Juu banyere mkpakọrịta ya na “onye Kraịst”!
N’ụbọchị Jerome, ndị Juu na-akwakarị ndị Jentaịl na-asụ asụsụ Hibru emo n’ihi na ha adịghị enwe ike akpọpụta nke ọma okwu ndị a na-akpachi akpịrị akpọpụta. Ma mgbe o tinyesịrị mgbalị dị ukwuu, Jerome nwere ike ịmụta otú e si akpọpụta okwu ndị a. Jerome degharịkwara ọtụtụ okwu Hibru gaa na Latin. Nzọụkwụ a abụghị nanị na o nyeere ya aka icheta okwu ndị ahụ kamakwa o chekwara ụzọ e si akpọ okwu n’asụsụ Hibru nke oge ahụ.
Esemokwu Kasị Ukwuu nke Jerome
Akwụkwọ Bible ole Popu Damasus bu n’uche ka Jerome sụgharịa edoghị anya. Ma e nwere ntakịrị ihe ijuanya banyere otú Jerome si lee okwu ahụ anya. Jerome tụkwasịrị uche n’ihe ma nwee mkpebisi ike. Ọchịchọ ya na-ere ka ọkụ bụ imepụta ihe “ga-abara Chọọchị ahụ uru, nke kwesịrị ịdịru ọgbọ ndị dị n’ihu.” N’ihi ya, o kpebiri idegharị nsụgharị Latin nke Bible dum.
Maka Akwụkwọ Nsọ Hibru, Jerome bu n’uche ime ka nsụgharị ya dabere na Septuagint. Ọtụtụ ndị lere nsụgharị Grik a nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, a sụgharịrị na nke mbụ ya na narị afọ nke atọ T.O.A., anya dị ka nke sitere n’ike Chineke kpọmkwem. N’ihi ya, Septuagint nwere nkesa dị ukwuu n’etiti ndị Kraịst nke oge ahụ na-asụ Grik.
Otú ọ dị, ka Jerome na-aga n’ihu n’ọrụ ya, ọ chọpụtara ekwekọghị ekwekọ ndị dị n’etiti ihe odide Grik ndị ahụ, ndị yiri ndị ahụ ọ hụworo na nke Latin. Nkụda mmụọ Jerome rịrị elu. N’ikpeazụ, o kwubiri na iji mepụta nsụgharị a pụrụ ịdabere na ya, na ya ga-eleghara ihe odide Grik ndị ahụ anya, gụnyere Septuagint ahụ a na-asọpụrụ nke ukwuu, ma gaa kpọmkwem n’akụkụ ihe odide Hibru mbụ.
Mkpebi a kpatara mkpesa dị ukwuu. Ụfọdụ kọwara Jerome dị ka onye na-agwagbu ihe odide ahụ, onye na-ekwulu Chineke, na-agbahapụ ọdịnala nke chọọchị maka ọdịmma ndị Juu. Ọbụna Augustine—ọkà mmụta okpukpe kasị elu nke chọọchị ahụ n’oge ahụ—rịọrọ Jerome ka ọ laghachi n’ihe odide Septuagint, na-asị: “Ọ bụrụ na a malite ịgụ nsụgharị gị n’ọtụtụ chọọchị n’ozuzu ya karị, ọ ga-abụ ihe dị mwute na, mgbe a na-agụ Akwụkwọ Nsọ, ndịrịta iche aghaghị ibilite n’etiti Chọọchị ndị na-asụ Latin na Chọọchị ndị na-asụ Grik.”
Ee, egwu Augustine bụ na chọọchị ahụ pụrụ ikewa ma ọ bụrụ na chọọchị ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ ejiri akụkụ ihe odide Latin nke Jerome mee ihe—nke dabeere n’akụkụ ihe odide Hibru—ebe chọọchị ndị na-asụ Grik nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ ka ji nsụgharị Septuagint mee ihe.b Tụkwasị na nke a, Augustine nwere obi abụọ banyere iwezụga Septuagint ma na-ahọrọ nsụgharị nke nanị Jerome pụrụ ịgbachitere.
Olee otú Jerome si meghachi omume n’ebe ndị mmegide nile a nọ? N’ikwekọ n’àgwà ya, Jerome leghaara ndị na-akatọ ya anya. Ọ nọgidere na-arụ ọrụ site na Hibru kpọmkwem, ka ọ na-erulekwa afọ 405 O.A., ọ sụgharịsịwo Bible Latin ya. Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị a kpọrọ nsụgharị ya Vulgate, nke na-ezo aka ná nsụgharị a kasị nabata (Latin vulgatus bụ́ nke pụtara “ihe zuru ebe nile, ihe na-ewu ewu”).
Nrụzu Ndị Na-adịte Anya
Nsụgharị Jerome nke Akwụkwọ Nsọ Hibru karịrị nnọọ ndegharị nke akụkụ ihe odide dịbu adị. Ruo ọtụtụ ọgbọ dị n’ihu, ọ gbanwere usoro ọmụmụ na nsụgharị Bible. “Vulgate,” ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant kwuru, “ka bụ ndezu akwụkwọ kasị ukwuu na nke a kasị mara amara nke narị afọ nke anọ.”
Ọ bụ ezie na Jerome nwere ire dị nkọ na àgwà ise okwu, nanị ya weghachiri nnyocha Bible gaa n’akụkụ ihe odide Hibru sitere n’ike mmụọ nsọ. O ji anya dị nkọ mụọ ma tụlee ihe odide Bible Hibru na Grik oge ochie ndị anyị na-enwekwaghị taa. Edemede ya bukwa nke ndị Masorete bụ́ ndị Juu ụzọ. N’ihi ya, Vulgate bụ ebe izo aka bara uru maka ịtụle ụzọ ndị ọzọ e si mee nsụgharị nke akụkụ ihe odide Bible dị iche iche.
N’anabataghị akparamàgwà na echiche okpukpe ya gabigara ókè, ndị hụrụ Okwu Chineke n’anya pụrụ inwe ekele maka mgbalị ịdị uchu nke onye a na-akpata esemokwu nke butere ụzọ ná nsụgharị Bible. Ee, Jerome rukwara ihe mgbaru ọsọ ya—o mepụtara ihe “kwesịrị ịdịru ọgbọ ndị dị n’ihu.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụghị ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nile kwekọrịtara n’ihe banyere ụbọchị na usoro ihe ndị mere ná ndụ Jerome ji mee.
b Dị ka ihe si dapụta, nsụgharị Jerome ghọrọ Bible bụ́ isi nye ndị Krisendọm Ebe Ọdịda Anyanwụ, ebe a nọgidere na-eji Septuagint eme ihe na Krisendọm Ebe Ọwụwa Anyanwụ ruo taa.
Garo Nalbandian
[Foto dị na peeji nke 28]
Ihe oyiyi Jerome dị na Betlehem
[Ebe E Si Nweta Foto]
[Ebe e si nweta foto Ndi dị na peeji 26]
N’elu n’aka ekpe, ihe odide Hibru: Site n’ikike nke Shrine of the Book, Israel Museum, Jerusalem; N’ala n’aka ekpe, ihe odide Syriac: Nke e bipụtaghachiri site n’ikike obiọma nke Ndị Nlekọta Chester Beatty Library, Dublin; N’elu n’etiti, ihe odide Grik: Site n’Ikike nke Israel Antiquities Authority